IHE ỌMỤMỤ NKE 9
Olee Ndị Bụ Ndị Enyi Chineke?
Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Jehova na onye kasị bụrụ enyi ya, nke ọ hụkarịsịrị n’anya. Tupu o bie ndụ n’elu ala dị ka mmadụ, Jisọs biri ndụ n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke nke dị ike. (Jọn 17:5) Ọ bịaziri n’ụwa ịkụziri ndị mmadụ ihe bụ eziokwu banyere Chineke. (Jọn 18:37) O nyekwara ndụ ya dị ka mmadụ iji zọpụta ụmụ mmadụ na-erube isi pụọ ná mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 6:23) Ugbu a Jisọs bụ Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị eluigwe nke ga-eweta Paradaịs n’ụwa a.—Mkpughe 19:16.
Ndị mmụọ ozi bụkwa ndị enyi Chineke. Ndị mmụọ ozi amaliteghị ndụ ha n’elu ala dị ka ụmụ mmadụ. E kere ha n’eluigwe tupu Chineke ekee ụwa. (Job 38:4-7) E nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi. (Daniel 7:10) Ndị enyi Chineke ndị a nọ n’eluigwe chọrọ ka ndị mmadụ mụta ihe bụ eziokwu banyere Jehova.—Mkpughe 14:6, 7.
Chineke nwekwara ndị enyi n’ụwa; ọ na-akpọ ha ndị àmà ya. Onye àmà n’ụlọikpe na-ekwu ihe ọ maara banyere mmadụ ma ọ bụ otu ihe. Ndịàmà Jehova na-agwa ndị ọzọ ihe ha maara banyere Jehova na nzube ya. (Aịsaịa 43:10) Dị ka ndị mmụọ ozi, Ndịàmà chọrọ inyere gị aka ịmụta ihe bụ eziokwu banyere Jehova. Ha chọrọ ka gị onwe gị kwa bụrụ enyi Chineke.