IHE ỌMỤMỤ NKE 8
Olee Ndị Bụ Ndị Iro Chineke?
Onye iro kasịnụ nke Chineke bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ọ bụ mmụọ e kere eke nke nupụụrụ Jehova isi. Setan ka nọgidere na-alụso Chineke ọgụ ma na-akpatara ụmụ mmadụ oké nsogbu. Setan dị njọ. Ọ bụ onye ụgha na ogbu mmadụ.—Jọn 8:44.
Ndị mmụọ ndị ọzọ e kere eke sonyeere Setan ná nnupụisi ya megide Chineke. Bible kpọrọ ha ndị mmụọ ọjọọ. Dị ka Setan, ndị mmụọ ọjọọ ahụ bụ ndị iro nke ụmụ mmadụ. Ha na-enwe mmasị imerụ ndị mmadụ ahụ. (Matiu 9:32, 33; 12:22) Jehova ga-ebibi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ha nwere nanị ntakịrị oge fọdụrụ ha ga-eji nye ụmụ mmadụ nsogbu.—Mkpughe 12:12.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke, ị ghaghị izere ime ihe Setan chọrọ ka i mee. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya kpọrọ Jehova asị. Ha bụ ndị iro Chineke, ha chọkwara ime ka ị bụrụ onye iro Chineke. Ị ghaghị ịhọrọ onye ị ga-eme ihe na-atọ ya ụtọ—Setan ma ọ bụ Jehova. Ọ bụrụ na ị chọrọ ndụ ebighị ebi, ị ghaghị ịhọrọ ime uche Chineke. Setan nwere ọtụtụ aghụghọ na ụzọ isi na-eduhie ndị mmadụ. Ọ na-aghọgbu ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ.—Mkpughe 12:9.