IHE ỌMỤMỤ NKE 6
Paradaịs dị nso!
Ihe ọjọọ ndị na-eme ugbu a n’ụwa na-egosi na Paradaịs dị nso. Bible kwuru na anyị ga-ahụ oge ndị dị oké egwu kpọmkwem tupu Paradaịs abịa. Anyị na-ebi n’oge ndị dị otú ahụ ugbu a! Lee ụfọdụ n’ime ihe ndị Bible kwuru na ha ga-eme:
Oké agha dị iche iche. “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” (Matiu 24:7) Amụma a emezuwo. Kemgbe afọ 1914, a lụwo agha ụwa abụọ na ọtụtụ agha ndị dị nta karị. Ọtụtụ nde mmadụ anwụọla na ha.
Ọrịa nke zuru ebe nile. “Ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:11) Nke a ò mezuwo? Ee. Ọrịa cancer, ọrịa obi, ụkwara nta, ịba, ọrịa AIDS, na ọrịa ndị ọzọ egbuwo ọtụtụ nde mmadụ.
Ụkọ nri. Gbaa ụwa gburugburu e nwere ndị na-enweghị ihe oriri zuuru ha iri. Kwa afọ, ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ n’ihi agụụ. Nke a bụ ihe àmà ọzọ na-egosi na Paradaịs ga-abịa n’isi nso. Bible na-ekwu, sị: “Oké ụnwụ dị iche iche ga-adị.”—Mak 13:8.
Matiu 24:7) Nke a emezuwokwa n’oge anyị. Ihe karịrị otu nde mmadụ anwụọla n’ala ọma jijiji kemgbe 1914.
Ala ọma jijiji. “Ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Ndị ajọ mmadụ. Ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ ego n’anya” na “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya.” Ha ga-abụ “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” Ụmụaka ga-abụ “ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha.” (2 Timoti 3:1-5) Ọ̀ bụ na i kweghị na e nwere ọtụtụ ndị dị otú ahụ taa? Ha adịghị asọpụrụ Chineke, ha na-enyekwa ndị na-agbalị ịmụ banyere Chineke nsogbu.
Mpụ. ‘Mmebi iwu ga-abakwa ụba.’ (Matiu 24:12) Ikekwe ị ga-ekweta na mpụ adịla njọ karịa otú ọ dị ọtụtụ afọ gara aga. N’ebe nile, ndị mmadụ nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e zuru ohi, ndị a ghọgburu, ma ọ bụ merụọ ahụ.
Ihe ndị a nile na-egosi na Alaeze Chineke dị nso. Bible na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) Gịnị bụ Alaeze Chineke? Ọ bụ ọchịchị eluigwe nke Chineke nke ga-eweta Paradaịs n’ụwa a. Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ.—Daniel 2:44.