Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Unu Ndị Hụrụ Jehova n’Anya:

N’afọ 1971, obi tọrọ ndị bịara Mgbakọ Distrikti “Aha Nsọ” e nwere n’asụsụ Bekee n’afọ ahụ ụtọ inweta ọtụtụ akwụkwọ ọhụrụ e wepụtara. Akwụkwọ mgbaafọ nke afọ 1972 sịrị na akwụkwọ ndị ahụ “tụrụ mmadụ niile n’anya.” Otu nwanna kwuru gbasara otu n’ime akwukwọ ndị ahụ, sị: “Ọ bụ akwụkwọ a kacha tụpenye anyị azụ̀ gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu!” Olee akwụkwọ ọ na-ekwu? Ọ bụ akwụkwọ aha ya bụ “The Nations Shall Know That I Am Jehovah”​—How? Ma, gịnị mere akwụkwọ a ji masị ụmụnna anyị? Ọ bụ maka na e nwere ihe ọhụrụ ndị a kọwara na ya gbasara amụma ndị dị n’akwụkwọ Ezikiel, ya bụ, amụma ndị gbasara ihe ndị ga-eme mmadụ niile n’ọdịnihu.

Kemgbe e wepụtara akwụkwọ ahụ, ndị na-efe Chineke adịla ọtụtụ. Ha esila n’ihe dị ka otu nde mmadụ na ọkara (1,500,000) ruo ihe karịrị nnọọ nde mmadụ asatọ (8,000,000). (Aịza. 60:22) A gụkọta asụsụ ndị a na-efe Jehova na-asụ, ọ karịrị otu puku (1,000) asụsụ. (Zek. 8:23) Ọtụtụ n’ime ha enwebeghị ike ịmụ akwụkwọ ọ bụla kọwara amụma dị iche iche Ezikiel onye amụma si n’ike mmụọ nsọ dee.

Ihe ọzọ bụ na kemgbe afọ 1971, anyị aghọtakwuola ọtụtụ eziokwu ndị dị na Baịbụl n’ihi otú ìhè nke si n’Okwu Chineke si na-ekwusikwu ike. (Ilu 4:18) N’afọ 1985, anyị ghọtaziri na a kpọrọ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ndị ezi omume na ndị enyi Chineke. (Jọn 10:16; Rom 5:18; Jems 2:23) N’afọ 1995, anyị ghọtaziri nke mbụ ya na ọ bụ n’oge “oké mkpagbu” na-abịanụ ka a ga-ekpe ikpe ikpeazụ, kpebie ndị bụ́ “atụrụ” na ndị bụ́ “ewu.” (Mat. 24:21; 25:31, 32) Ihe ndị a anyị ghọtakwuru gbanwere otú anyị si ghọta akwụkwọ Ezikiel.

“Nwa nke mmadụ, anya ruo gị ala, geekwa ntị nke ọma, obi gị dịrịkwa n’ihe niile m ga-egosi gị, n’ihi na m kpọtara gị ebe a ka m gosi gị ihe ndị a.”​—EZIKIEL 40:4

Na nso nso a, ìhè nke si n’Okwu Chineke na-enwusikwu ike. Chegodị ihe ndị anyị mụtara n’ihe atụ ndị Jizọs mere. Ihe ndị anyị ghọtakwuru emeela ka ihe Jizọs ji ihe atụ ndị ahụ na-akụziri anyị doo anyị anya nke ọma. Ihe Jizọs kwuru n’ọtụtụ n’ime ha bụ ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya n’oge oké mkpagbu nke ji ọsọ na-abịa. Otú ahụ ka ọ dịkwa ụfọdụ amụma ndị dị n’akwụkwọ Ezikiel. Anyị aghọtakwuola ha nke ọma. Ụfọdụ n’ime ha bụ nke e buru gbasara Gọg onye Megọg (isi nke 38 na 39), gbasara ọrụ nwoke ji mpi ịnk odeakwụkwọ na-arụ (isi nke 9), gbasara ndagwurugwu ọkpụkpụ juru nakwa gbasara ijikọta osisi abụọ ọnụ (isi nke 37). N’ihi ihe ndị a anyị ghọtakwuru, ụfọdụ ihe e dere ọtụtụ afọ gara aga n’akwụkwọ “The Nations Shall Know That I Am Jehovah”​—How? adabaghịzi adaba.

Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị na-efe Jehova jirila jụọ, sị, “Olee mgbe anyị ga-enweta akwụkwọ kwuru otú anyị sizi ghọta amụma ndị dị n’akwụkwọ Ezikiel?” Anyị enwetala ya. Aha ya bụ A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe. Akwụkwọ a nwere isi iri abụọ na abụọ. Ị gụwa ha, chebara ọmarịcha ihe atụ ndị e mere na ha echiche. Obi ga-atọ gị ụtọ ịhụ na a sara anya na mmiri mee nchọnchọ mgbe a na-ede akwụkwọ a. Anyị chebaara ọtụtụ ihe echiche ma kpesie ekpere ike ka anyị nwee ike ịghọta ihe mere Jehova ji mee ka e dee akwụkwọ Ezikiel, bụ́ akwụkwọ dị ụtọ ọgụgụ. Anyị chebaara ajụjụ ndị a na ndị yiri ha echiche: Gịnị ka akwụkwọ Ezikiel na-akụziri ndị dịrị ndụ n’oge Ezikiel, gịnịkwa ka ọ na-akụziri anyị n’oge a? Olee amụma ndị nke kwuru ihe ndị ka ga-eme n’ọdịnihu? Ànyị kwesịrị ịchọwa ka anyị hụ ihe ihe ndị Ezikiel kwuru n’amụma ndị o buru nọchiri anya ha? Azịza ajụjụ ndị a mere ka anyị ghọtakwuo akwụkwọ Baịbụl a na-atọ ụtọ ọgụgụ nke ọma karịa otú a ghọtaburu ya.

Ka ị na-agụ akwụkwọ Ezikiel malite n’isi ruo ná ngwụcha, ihe ị ga-amụta gbasara ndị nọ ná nzukọ Jehova n’eluigwe ga-amasị gị. O doro anya na ọ ga-amasịkwa gị ịmụ gbasara ihe ndị Jehova chọrọ n’aka ndị bi n’eluigwe na ndị bi n’ụwa bụ́ ndị chọrọ ife ya otú o kwuru ka e si na-efe ya. Akwụkwọ Ezigbo Ofufe ga-enyere gị aka ịghọtakwu ihe Jehova meerela ndị na-efe ya nakwa ihe ọ ga-emere ha n’oge na-adịghị anya. Ị ga-achọpụta na e nwere ihe abụọ gbara ọkpụrụkpụ e kwuru ugboro ugboro n’akwụkwọ a. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ịma na Jehova bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ala, gosikwa na anyị kwetara na ọ bụ Ọkaakaa. Nke abụọ bụ na anyị kwesịrị ịna-efe ya otú o kwuru ka e si na-efe ya, na-ebikwa ndụ otú ọ chọrọ ka ndị na-efe ya ezigbo ofufe na-ebi.

Ekpere anyị bụ ka akwụkwọ a mee ka i kpebisikwuo ike na ị ga na-efe Jehova otú gosiri na ị na-akwanyere aha ya dị ebube ma dị nsọ ùgwù. Anyị na-arịọkwa Chineke ka o mee ka akwụkwọ a nyere gị aka ịna-atụ anya mgbe mba niile ga-amara na ọ bụ Jehova.​—Ezik. 36:23; 38:23.

Ka Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova, gọzie mbọ niile ị na-agba ka ị ghọta akwụkwọ o ji mmụọ nsọ ya mee ka Ezikiel onye amụma dee.

Ụmụnna unu,

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova