Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE ANỌ

“M Ga-eji Ịnụ Ọkụ n’Obi Mee Ka A Mara na Aha M Dị Nsọ”—Ezigbo Ofufe Akwụsịghị n’Agbanyeghị Ọgụ A Lụsoro Ya

“M Ga-eji Ịnụ Ọkụ n’Obi Mee Ka A Mara na Aha M Dị Nsọ”—Ezigbo Ofufe Akwụsịghị n’Agbanyeghị Ọgụ A Lụsoro Ya

EZIKIEL 39:25

IHE NKEBI A NA-EKWU: Jehova ga-echebe ndị ya n’oké mkpagbu

Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ma, anyị ga-aza ya ajụjụ maka ihe ọ bụla anyị mere. Olee otú obi na-adị ya ma ndị sị na ha na-efe ya na-akpa àgwà ndị gosiri na e nweghị ihe ha ji ya kpọrọ? Olee otú Jehova ga-esi ekpebi ndị ọ ga-echebe n’oge oké mkpagbu? Gịnị mere Jehova, bụ́ Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, ga-eji bibie ọtụtụ nde mmadụ ndị na-eme ihe ọjọọ?

NÁ NKEBI A

ISI NKE 15

“M Ga-akwụsị Akwụna Ị Na-agba”

Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe e kwuru banyere ndị akwụna n’akwụkwọ Ezikiel na Mkpughe?

ISI NKE 16

“Kaa Ha Akara n’Egedege Ihu”

Otú e si kaa ndị na-erubere Chineke isi n’oge Ezikiel akara ka a zọpụta ha ga-abara anyị uru taa.

ISI NKE 17

“Gọg, . . . M Ga-eme Gị Ihe”

Ònye bụ Gọg onye Megọg, oleekwa ala ma ọ bụ obodo ọ ga-eji ike banye?

ISI NKE 18

“M Ga-ewe Ezigbo Iwe”

Ọgụ Gọg ga-alụso ndị Jehova ga-akpasu Jehova iwe, mezie ka Chineke chebe ndị na-efe ya.