Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 18

“M Ga-ewe Ezigbo Iwe”

“M Ga-ewe Ezigbo Iwe”

EZIKIEL 38:18

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ọgụ Gọg ga-alụso ndị Jehova ga-akpasu Jehova ezigbo iwe; Jehova ga-agbachitere ndị ya n’agha Amagedọn

1-3. (a) Mgbe Jehova “ga-ewe ezigbo iwe,” gịnị ga-eme? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya ugbu a?

 ỤMỤ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka guzo ọtọ na-abụ abụ Alaeze. Mgbe ha bụchara, otu okenye si n’ala ala obi ya kpee ekpere, rịọ Jehova ka o chebe ha. Obi siri ụmụnna nọ n’ọgbakọ ahụ ike na Jehova ga-elekọta ha. Ma a ka kwesịrị ịkasi ha obi, meekwa ka obi sie ha ike. Ha na-anụ nnukwu ụzụ ndị na-alụ agha n’èzí na-eme. Agha Amagedọn ebidola.—Mkpu. 16:14, 16.

2 N’agha Amagedọn, Jehova “ga-ewe ezigbo iwe” ma bibie ndị mmadụ. (Gụọ Ezikiel 38:18.) Ọ bụghị naanị otu ìgwè ndị agha ma ọ bụ otu mba ka ọ ga-ewesa iwe a, kama ọ bụ ndị a na-enweghị ike ịgụta ọnụ bi n’ebe dị iche iche n’ụwa. N’ụbọchị ahụ, “ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa.”—Jere. 25:29, 33.

3 Gịnị mere Jehova, Chineke hụrụ ndị mmadụ n’anya, onye a kpọrọ onye “nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,” ga-eji ewe “ezigbo iwe” ma mee ụdị ihe a? (Ọpụ. 34:6; 1 Jọn 4:16) Ka anyị hụ otú azịza ajụjụ a ga-esi akasi anyị obi, mee ka anyị nwee obi ike, meekwa ka ikwusa ozi ọma na-agụsi anyị agụụ ike taa.

Gịnị Ga-eme Ka Jehova Wee “Ezigbo Iwe”?

4, 5. Olee otú iwe Chineke si dị iche n’iwe ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ewe?

4 Ihe mbụ anyị kwesịrị ịghọta bụ na Jehova anaghị ewe iwe ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ọ bụrụ na mmadụ ewee nnukwu iwe ma mee ihe mgbe iwe ka ji ya, ọ na-emefekarị ihe ókè, ọ na-emebikarịkwa ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova na-anabataghị àjà Ken, bụ́ ọkpara Adam, ma nabata onyinye Ebel, Ken ‘were ezigbo iwe.’ Gịnị ka iwe ahụ kpatara? O mere ka o gbuo Ebel nwanne ya, onye ezi omume. (Jen. 4:3-8; Hib. 11:4) Ọ̀ kwa i chetara Devid? Baịbụl kwuru na ọ bụ nwoke obi Jehova nabatara. (Ọrụ 13:22) N’agbanyeghị na ọ bụ ezigbo mmadụ, ọ fọrọ obere ka o mee ihe jọgburu onwe ya mgbe ọ nụrụ na Nebal, bụ́ ọgaranya nwere ọtụtụ ala, kparịrị ya na ụmụ nwoke o ziri ozi. Devid na ndị agha ya were ezigbo iwe, ha wee ‘kee mma agha ha n’úkwù.’ Ha bu n’obi igbu Nebal na nwoke ọ bụla bi n’ụlọ ya. Ma ọ dabara na nwunye Nebal bụ́ Abigel gwara Devid okwu mere ka ya na ndị agha ya ghara igbu ọchụ. (1 Sam. 25:9-14, 32, 33) N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere Jehova ji si n’ike mmụọ nsọ mee ka Jems dee, sị: “Onye na-ewe iwe anaghị eme ezi omume Chineke chọrọ ka anyị na-eme.”—Jems 1:20.

Mgbe ọ bụla Jehova were iwe, ọ naghị ewebiga ya ókè, anyị na-ahụkwa ihe mere o ji wee ya

5 Jehova anaghị ewe iwe ka ụmụ mmadụ. Mgbe ọ bụla o were iwe, ọ naghị ewebiga ya ókè, anyị na-ahụkwa ihe mere o ji wee ya. Jehova wegodị ezigbo iwe, ọ naghị eme ihe na-adịghị mma. Ọ lụsowe ndị iro ya agha, ọ naghị ekpochapụkọta “ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Jen. 18:22-25) Ihe ọzọ bụ na ọ bụ naanị ihe ndị kwesịrị ịkpasu Jehova iwe na-eme ka o wee iwe. Ka anyị kwuo abụọ n’ime ha na ihe ha nwere ike ịkụziri anyị.

6. Gịnị ka Jehova na-eme ma e mebie aha ya?

6 Ihe mere o ji ewe iwe: Jehova na-ewe iwe ma e mebie aha ya. Ọ bụrụ na ndị sịrị na ha na-anọchite anya Jehova ana-eme ihe ọjọọ, ha na-emebi aha Jehova ma na-akpasu ya iwe. (Ezik. 36:23) N’isiokwu ndị bu nke a ụzọ, anyị kwuru na mba Izrel mere ka a kọchaa aha Jehova. Ọ bụ ya mere omume ha na àgwà ha ji kpasuo Jehova iwe. Ma o wefeghị iwe ókè. Ọ dọrọ ndị ya aka ná ntị naanị otú kwesịrị ekwesị. (Jere. 30:11) Ozugbo Jehova were iwe ma taa ndị kpasuru ya iwe ahụhụ, ọ na-akwụsị iwe iwe, ọ naghịkwa eburu ha iwe n’obi.—Ọma 103:9.

7, 8. Olee ihe ndị anyị mụtara n’otú Jehova si meso ndị Izrel?

7 Ihe anyị mụtara: Otú Jehova si meso ndị Izrel na-akụziri anyị ihe dị ezigbo mkpa. Jehova meere anyị ihe ọma kwe ka anyị zawa aha ya otú o meere ndị Izrel oge ochie. Anyị bụ Ndịàmà Jehova. (Aịza. 43:10) Ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme nwere ike ime ka ndị mmadụ chọọ ife Jehova ma ọ bụ ghara ịchọ ife ya. Anyị ekwesịghị ime ihe ọjọọ n’asọghị anya, wee mee ka a kọchaa aha Jehova. Ime omume ihu abụọ a ga-akpasu Jehova iwe, ọ ga-emekwa ihe ka a kwụsị imebi aha ya.—Hib. 3:13, 15; 2 Pita 2:1, 2.

8 Ịmata na Jehova nwere ike iwesa ndị mmadụ “ezigbo iwe,” ò kwesịrị igbochi anyị ịbịarụ ya nso? Mba. Anyị ma na Jehova na-enwe ndidi ma na-agbaghara mmehie. (Aịza. 55:7; Rom 2:4) Ma anyị makwa na ọ na-ata ndị mmadụ ahụhụ mgbe o kwesịrị ime otú ahụ. N’eziokwu, anyị na-atụ egwu Jehova maka na anyị ma na ọ ga-ewesa ndị kpọchiri obi na-eme ihe ọjọọ iwe, marakwa na ọ gaghị ahapụ ha ka ha soro ná ndị ya. (1 Kọr. 5:11-13) Jehova agwala anyị hoo haa ihe ndị na-akpasu ya iwe. Ọ bụzi anyị ka ọ dịịrị ikpebi ma ànyị ga-ezere àgwà na omume ndị ahụ na-akpasu ya iwe.—Jọn 3:36; Rom 1:26-32; Jems 4:8.

9, 10. Gịnị ka Jehova na-eme ma ndị iro chọọ ibibi ndị na-efe ya? Mee ihe atụ.

9 Ihe mere o ji ewe iwe: Jehova na-ewe iwe ma a chọọ ibibi ndị na-efe ya. Jehova na-ewe iwe ma ndị iro lụso ndị ji ya mere ebe mgbaba ọgụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt, Fero na ndị agha ya siri ezigbo ike chụụrụ ha gawa n’ebe ha nọ n’ụsọ Oké Osimiri Uhie. N’oge ahụ, ha yiri ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka. Ma mgbe ndị agha ahụ siri ezigbo ike chụụrụ ha banye n’ala nkịtị n’ime osimiri ahụ, Jehova kwụpụsịrị ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ndị Ijipt ma tụba ndị Ijipt n’osimiri ahụ. “E nweghị otu onye n’ime ha fọrọ ndụ.” (Ọpụ. 14:25-28) Jehova wesara ndị Ijipt ezigbo iwe n’ihi ‘ịhụnaya pụrụ iche’ o nwere n’ebe ndị ya nọ.—Gụọ Ọpụpụ 15:9-13.

Ndị mmụọ ozi ga-echebe anyị otú mmụọ ozi chebere ndị Chineke n’oge Hezekaya ka ndị Asiria ghara ibibi ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10, 23)

10 N’oge Eze Hezekaya, Jehova gbachitekwaara ndị ya maka na ọ hụrụ ha n’anya. Ndị Asiria, bụ́ ndị agha kacha ike obi tara mmiri e nwere n’oge ahụ, bịara ịlụso ndị bi na Jeruselem agha. Ha nọchibidoro ndị Jehova. Ihe a gaara eme ka agụụ nyụọ ndị Jehova ịkpakwụ, ha ejiri anya ha hụ ọnwụ ha. (2 Eze 18:27) Ma Jehova zitere otu mmụọ ozi, ya egbuo ndị agha Asiria dị otu narị puku na puku iri asatọ na puku ise (185,000) n’otu abalị. (2 Eze 19:34, 35) Chegodị otú ebe ahụ ndị agha Asiria mara ụlọikwuu dị n’ụtụtụ. Ọta ha, ube ha, na mma agha ha tọgbọcha n’ala. A fụgodị opi, ha agaghị eteta. A kpọgodị ha òkù, ha agaghị agbakọta. Ebe niile dara jụụ, bụrụkwa ozu ozu.

11. Olee otú akụkọ ndị dị na Baịbụl, ndị gosiri ihe Jehova mere mgbe a chọrọ ibibi ndị ya, si akasi anyị obi ma na-eme ka anyị nwee obi ike?

11 Ihe anyị mụtara: Jehova ji akụkọ ndị ahụ dị na Baịbụl, ndị gosiri ihe o mere mgbe a chọrọ ibibi ndị ya, na-adọ ndị iro anyị aka ná ntị na “mmadụ daba n’aka Chineke dị ndụ, nke ya agwụla.” (Hib. 10:31) Ma, akụkọ ndị ahụ na-akasi anyị obi, na-emekwa ka anyị nwekwuo obi ike. Ịmata na ihe agaghị agaziri Setan, bụ́ onyeisi ndị iro anyị, na-akasi anyị obi. N’oge na-adịghị anya, “oge ya fọrọ ntakịrị” o ji na-achị ga-agwụ. (Mkpu. 12:12) Ma tupu ọ gwụ, anyị kwesịrị iji obi ike na-efe Jehova, obi esiekwa anyị ike na e nweghị mmadụ ọ bụla, òtù, ma ọ bụ ọchịchị nwere ike igbochi anyị ime uche Chineke. (Gụọ Abụ Ọma 118:6-9.) Pọl onyeozi kọwara ụdị obi ike anyị nwere mgbe o si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?”—Rom 8:31.

12. N’oge oké mkpagbu, gịnị ga-eme ka Jehova wee ezigbo iwe?

12 N’oge oké mkpagbu, Jehova ga-eme ihe iji chebe anyị otú o mere mgbe o yiri ka ndị Ijipt akparala ndị Izrel aka nakwa mgbe ndị Asiria nọchibidoro ndị Juu bi na Jeruselem. Mgbe ndị iro anyị ga-agbalị ka ha bibie anyị, ezigbo iwe ga-ewe Jehova n’ihi otú o si hụ anyị n’anya. E nwere ike ikwu na ndị zuzuuru lụso anyị agha na-emetụ mkpụrụ anya Jehova aka. Jehova ga-emekwa ihe n’egbughị oge. (Zek. 2:8, 9) Ọ ga-ebibi ndị iro ya otú ọ na-emetụbeghị. Ma, mgbe Chineke ga-ewesa ha iwe, o kwesịghị iju ha anya. Ọ bụ maka gịnị?

Olee Aka ná Ntị Jehova Dọrọla Ndị Mmadụ?

13. Olee aka ná ntị Jehova dọrọla ndị mmadụ?

13 Jehova anaghị “ewe iwe ọsọ ọsọ,” ọ dọọkwala ndị mmadụ aka ná ntị ugboro ugboro na ya ga-ebibi ndị na-emegbu ndị ya ma na-achọ ibibi ha. (Ọpụ. 34:6, 7) Jehova ejirila ndị amụma ndị dị ka Jeremaya, Ezikiel, Daniel, Kraịst Jizọs, jirikwa ụfọdụ ndịozi Jizọs, dị ka Pita, Pọl, na Jọn, dọọ ndị mmadụ aka ná ntị gbasara ọgụ ikpeazụ kpụ ọkụ n’ọnụ a ga-alụ.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Jehova Na-adọ Ndị Mmadụ Aka ná Ntị Maka Ọgụ Dị Egwu A Ga-alụ.”

14, 15. Gịnị na gịnị ka Jehova merela, gịnịkwa mere o ji mee ha?

14 Jehova mere ka e dee aka ná ntị ndị ọ dọrọ ndị mmadụ na Baịbụl. O mekwara ka Baịbụl bụrụ akwụkwọ a kacha asụgharị ma na-ekesa kemgbe ụwa. N’ebe niile n’ụwa, Chineke emeela ka e nwee ọtụtụ ndị wepụtara onwe ha na-enyere ndị ọzọ aka ka ha na ya dịrị ná mma ma na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị gbasara “oké ụbọchị Jehova” nke na-abịanụ. (Zef. 1:14; Ọma 2:10-12; 110:3) O mere ka ndị ya na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ narị asụsụ, meekwa ka ha na-eji ọtụtụ narị nde awa kwa afọ na-agwa ndị mmadụ banyere nkwa ndị o kwere. Ha jikwa Baịbụl na-adọ ha aka ná ntị.

15 Jehova mere ihe a niile maka “na o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pet. 3:9) Ọ bụ ihe ọma ka Chineke anyị, onye hụrụ anyị n’anya ma na-enwe ndidi, meere anyị kwe ka anyị na-anọchite anya ya ma na-ezisa ozi ya. Ma n’oge na-adịghị anya, oge ga-agwụnahụ ndị na-achọghị ige nti n’aka ná ntị Chineke na-adọ ha.

Olee Mgbe Jehova “Ga-ewe Ezigbo Iwe”?

16, 17. Jehova ò kpebiela ụbọchị a ga-alụ agha ikpeazụ? Kọwaa.

16 Jehova ekpebiela ụbọchị a ga-alụ agha ikpeazụ. O teela ọ matara mgbe a ga-alụso ndị na-efe ya ọgụ. (Mat. 24:36) Olee otú Jehova si mara mgbe ndị iro ya ga-alụso ndị na-efe ya ọgụ?

17 N’Isi nke 17 n’akwụkwọ a, anyị mụtara na Jehova ga-agwa Gọg, sị: ‘M ga-etinye nko n’agba gị.’ Jehova ga-arata mba dị iche iche ka ha gaa lụọ agha. (Ezik. 38:4) Ma ọ pụtaghị na Jehova ga-ebu ụzọ lụso ndị iro ya agha ma ọ bụ na ọ ga-amanye ha ka ha lụso ya ọgụ. Kama ọ pụtara na Jehova ma ihe dị ndị mmadụ n’obi, ọ makwa ihe ndị iro ya ga-eme ma ihe ụfọdụ mee.—Ọma 94:11; Aịza. 46:9, 10; Jere. 17:10.

18. Gịnị mere ụmụ mmadụ ga-eji lụso Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọgụ?

18 Ọ bụrụ na ọ bụghị Jehova ga-ebu ụzọ lụso ndị iro ya agha ma ọ bụ manye ha ịlụ agha, oleezi otú mmadụ nkịtị ga-esi lụso Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọgụ? Ọ ga-abụ na n’oge ahụ, obi esiela ha ike na Chineke adịghị ma ọ bụ na ọ gaghị etinye aka n’ihe gbasara ndị mmadụ. O nwere ike ịbụ na ihe mere ha ga-eji chee otú ahụ bụ na ọ dịbeghị anya ha bibiri okpukpe ụgha niile dị n’ụwa. Ha nwere ike ịna-eche na ọ bụrụ na Chineke dị, ọ gaara agbachitere okpukpe ndị ahụ sịrị na ha na-anọchite anya ya. Ha agaghị aghọta na ọ bụ Chineke mere ka ọ bata ha n’obi ka ha bibie okpukpe ndị terela aha ya unyi.—Mkpu. 17:16, 17.

19. Gịnị nwere ike ime ma e bibichaa okpukpe ụgha?

19 Obere oge e bibichara okpukpe ụgha, Jehova nwere ike ime ka ndị na-efe ya zisaa ozi na-agba agba ná ntị. N’akwụkwọ Mkpughe, e ji ozi a tụnyere akụ́ mmiri ígwé mkpụrụ ya nke ọ bụla dị ihe dị ka kilogram iri abụọ n’arọ. (Ihe e dere n’ala ala peeji Mkpu. 16:21.) Ebe ọ bụ na ozi a a ga-ezisa nwere ike ịbụ na oge a ga-ebibi ndị ọchịchị na ndị azụmahịa ụwa eruwela, ọ ga-agba ndị na-anụ ya agba ná ntị nke na ha ga-ekwulu Chineke. Ọ ga-abụ ozi a a ga-ezisa ga-akpasu mba dị iche iche iwe, ha alụso ndị Chineke ọgụ ka ha gbuchapụ ha. Ha nwere ike iche na anyị bụ anụ oriri, na e nweghị onye ga-azọpụta anyị. Ma, ihe a ha ga-eme ga-aghọ ha ahịa.

Olee Otú Jehova Ga-esi Egosi Iwe Ya?

20, 21. Ole ndị bụ Gọg, gịnịkwa ga-eme ha?

20 N’Isi nke 17, anyị mụtara na ọ bụ mba dị iche iche ndị ga-agbakọ aka lụso anyị ọgụ ka Ezikiel kpọrọ “Gọg bụ́ onye Megọg.” (Ezik. 38:2) Ma, aka ha gbakọrọ ọnụ apụtaghị na ha dị n’otu n’eziokwu. N’agbanyeghị na ọ ga-adị ka hà na-emekọ ihe ọnụ, ha ka ga na-amarịta aka, onwe ha ka ga na-ebu ha isi, mba nke ọ bụla ka ga na-achọkwa ịka ibe ya. N’ihi ya, ọ gaghị esiri Jehova ike ime ka ha jiri mma agha ha ‘gburịta ibe ha.’ (Ezik. 38:21) Ma, ọ bụghị mmadụ ga-akpata ọdachi ahụ ga-adakwasị mba dị iche iche.

21 Tupu e bibie ndị iro anyị, ha ga-ahụ ihe àmà Nwa nke mmadụ. Ihe àmà a nwere ike ịbụ ihe ga-egosi ike dị egwu Jehova na Jizọs nwere. Ndị iro anyị ga-ahụ ihe ndị ga-eme ka obi koro ha n’elu. Amụma Jizọs buru ga-emezu. Ọ sịrị na “ndị mmadụ ga-atụbọkwa n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-eme n’ụwa.” (Luk 21:25-27) Ezigbo ụjọ ga-ejide ha n’ihi na ha ga-aghọta na ọgụ ha lụsoro ndị Jehova bụ ịkpa nwa agụ aka n’ọdụ. Ha ga-amatazi na Onye kere anyị bụ ọchịagha, bụrụkwa Jehova nke ụsụụ ndị agha. (Ọma 46:6-11; Ezik. 38:23) O doro anya na Jehova ga-eji ndị agha nọ n’eluigwe na ihe ndị dị n’eluigwe chebe ndị na-erubere ya isi ma kpochapụ ndị iro ya.—Gụọ 2 Pita 2:9.

Mgbe ndị iro ga-achọ ikpochapụ ndị Jehova, Jehova ga-eji ndị agha ya nọ n’eluigwe lụso ha ọgụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 21)

22, 23. Ole ndị ga-echebe ndị Chineke? Oleekwa otú obi ga-adị ha ịrụ ọrụ a?

Gịnị ka ihe anyị ma gbasara ụbọchị Jehova kwesịrị ime ka anyị na-eme?

22 Chegodị otú ọ ga-esi na-enu Jizọs enu n’obi iduru ndị agha Chineke lụso ndị iro ya agha ma chebe ndị hụrụ Nna ya n’anya ma na-ejere ya ozi. Cheekwa otú obi ga-adị ndị e tere mmanụ n’oge ahụ. Tupu agha Amagedọn amalite, a ga-akpọrọ ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa laa eluigwe ka ndị niile so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) soro Jizọs lụọ agha ahụ. (Mkpu. 17:12-14) O doro anya na ọtụtụ ndị so ná ndị e tere mmanụ na ndị so n’atụrụ ọzọ adịla n’ezigbo mma ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ n’oge ikpeazụ a. Mgbe a ga-alụ agha Amagedọn, ndị e tere mmanụ ga-enwezi ike ha ga-eji gbachitere ndị ji obi ha niile kwado ha n’oge ha na ọnwụnwa na-alụ.—Mat. 25:31-40.

23 Ndị mmụọ ozi ga-eso ná ndị agha nọ n’eluigwe ha na Jizọs ga-eso gaa agha. (2 Tesa. 1:7; Mkpu. 19:14) Ha enyerela ya aka si n’eluigwe chụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mkpu. 12:7-9) Ha sokwa chịkọta ndị nọ n’ụwa chọrọ ife Jehova. (Mkpụ. 14:6, 7) Ọ dabara nnọọ adaba na Jehova ga-ekwe ka ndị mmụọ ozi ya chebe ndị na-efe ya. N’eziokwu, obi ga-atọ ndị niile so ná ndị agha Jehova ezigbo ụtọ iso mee ka e doo aha ya nsọ. Otú ha ga-esi eme ya bụ iso bibie ndị iro Jehova.—Mat. 6:9, 10.

24. Gịnị mere na ụjọ ekwesịghị ịtụ oké ìgwè mmadụ ndị so n’atụrụ ọzọ?

24 Ụjọ ekwesịghị ịtụ oké ìgwè mmadụ ndị so n’atụrụ ọzọ maka na e nwere ndị agha siri ezigbo ike ọ na-enu enu n’obi ichebe ha. N’eziokwu, oké ìgwè mmadụ ‘ga-eguzo kwem, weliekwa isi ha elu, n’ihi na oge Chineke ga-anapụta ha eruola nso.’ (Luk 21:28) Ị̀ hụla ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị gbaa mbọ tupu ụbọchị Jehova eruo nyere ọtụtụ ndị aka ka ha mata Nna anyị hụrụ anyị n’anya, onye na-eme ebere ma na-echebe ndị na-efe ya?—Gụọ Zefanaya 2:2, 3.

Ndị na-efe Jehova n’ụwa agaghị eso lụọ agha Amagedọn. Ndị mmụọ ozi ga-echebe ha mgbe ndị iro ha ga na-egburịta ibe ha.—Ezik. 38:21 (A ga-akọwa ya na paragraf nke 22-24)

25. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’Isi nke 19?

25 Ọ na-abụ ndị mmadụ lụchaa agha, ọgba aghara na-adị ebe niile. Ma, a lụchaa agha Amagedọn, ọgba aghara agaghị adị, obi ga-adịkwa onye ọ bụla ụtọ. Olee otú ụwa ga-adị ma Jehova bibichaa ndị iro ya, kwụsị iwe iwe, ndị agha ya amịbakwa mma agha ha n’ọbọ? N’Isi nke 19, anyị ga-eleba anya n’ihe ọma ndị ga-eme mgbe ahụ.