Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 15

“M Ga-akwụsị Akwụna Ị Na-agba”

“M Ga-akwụsị Akwụna Ị Na-agba”

EZIKIEL 16:41

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe anyị mụtara n’otú e si kọwaa ndị akwụna n’akwụkwọ Ezikiel na Mkpughe

1, 2. Olee ụdị akwụna ihe ya kacha ewe anyị ezigbo iwe?

 OBI anaghị adị anyị mma ma anyị hụ nwaanyị akwụna. Anyị nwere ike ichewe ihe mere o ji malite ibi ndụ ọjọọ ahụ. Ọ̀ ga-abụ tigbuo zọgbuo dị n’ezinụlọ ha ma ọ bụ mmetọ onye ezinụlọ ha metọrọ ya mere o ji bido na nwata gbawa akwụna? Ọ̀ ga-abụ na ọ gbawara akwụna maka na ha dara ogbenye? Ka ọ̀ ga-abụ otú di ya si akụ ya isi aba okpu mere ka ọ hapụ ya gbawa akwụna? Ụdị ihe a emeela ka ọtụtụ ndị gbawa akwụna n’ụwa ọjọọ a. Ọ bụ ya mere Jizọs Kraịst ji metara ụfọdụ ndị akwụna ebere n’oge ọ nọ n’ụwa. O kwuru na ndị chegharịrị n’ime ha ma gbanwee otú ha si ebi ndụ nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi.—Mat. 21:28-32; Luk 7:36-50.

2 Ma, ka anyị kwuo banyere ụdị ịgba akwụna ọzọ. Chegodị banyere nwaanyị kpachaara anya gbawa akwụna. Ọ naghị ele ịgba akwụna anya ka ihe ọjọọ, kama o ji ya akpa nganga. Mkpa ya bụ ego ọ na-enweta nakwa na a ma ya ama n’ihi akwụna ọ na-agba. Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na nwaanyị a nwere ezigbo di na-elekọta ya, ma ya ahapụ di ya gbawa akwụna? O doro anya na otú nwaanyị a si na-ebi ndụ ga na-ewe gị ezigbo iwe. Ọ bụ otú a obi dị gị ka ihe gbasara okpukpe ụgha na-adị Jehova. Ọ bụ ya mere o ji ejikarị okpukpe ụgha atụnyere nwaanyị akwụna.

3. Olee ebe ndị anyị ga-eleba anya na Baịbụl n’isi nke 16 a?

3 N’akwụkwọ Ezikiel, e nwere ebe abụọ a kacha kwuo gbasara ndị akwụna. Ha gosiri otú ndị Chineke n’Izrel nakwa na Juda si mee omume jọrọ njọ ma hapụ Chineke. (Ezik., isi 16 na 23) Ma, tupu anyị eleruo ebe ndị ahụ anya, ka anyị buru ụzọ kwuo banyere akwụna ọzọ e jikwa maa atụ. O teela ọ gbawara akwụna nke ya. Ọ gbawala ya tupu oge Ezikiel nakwa tupudị e nwee mba Izrel. Ọ ka na-agbakwa ya ruo taa. E kwuru banyere akwụna a n’akwụkwọ ikpeazụ dị na Baịbụl, ya bụ, akwụkwọ Mkpughe.

“Nne Ụmụ Nwaanyị Akwụna”

4, 5. Gịnị bụ “Babịlọn Ukwu,” oleekwa otú anyị si mara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 N’ọhụụ Jọn onyeozi dere n’akwụkwọ Mkpughe, ọ hụrụ ihe riri ya ọnụ. Ọ bụ nwaanyị a kpọrọ “oké nwaanyị akwụna” na “Babịlọn Ukwu, nne ụmụ nwaanyị akwụna.” (Mkpu. 17:1, 5) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị isi okpukpe na ndị ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl enwebeghị ike ịmata onye nwaanyị a bụ. Ọtụtụ n’ime ha ekwuola na ọ nọchiri anya obodo Babịlọn, Rom, ma ọ bụ Chọọchị Katọlik. Ma kemgbe ọtụtụ iri afọ, Ndịàmà Jehova amatala onye “oké nwaanyị akwụna ahụ” bụ. Ọ bụ okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. Olee otú anyị si mara?

5 A katọrọ nwaanyị a maka na ya na “ndị eze ụwa,” ma ọ bụ ndị ọchịchị, na-akwa iko. N’ihi ya, o doro anya na nwaanyị a abụghị onye ọchịchị. Akwụkwọ Mkpughe gosikwara na “ndị ahịa ụwa,” ma ọ bụ ndị achụmnta ego e nwere n’ụwa, ruru uju mgbe e bibiri Babịlọn Ukwu ahụ. N’ihi ya, Babịlọn Ukwu ahụ abụghị ndị achụmnta ego e nwere n’ụwa. Ònyezi bụ nwaanyị a? Ọ na-eme “mgbaasị,” na-ekpere arụsị, na-eduhiekwa ndị mmadụ. Ọ̀ bụ na ihe ndị a ọ na-eme abụghị ihe okpukpe ụgha dị iche iche e nwere n’ụwa na-eme? E kwukwara na nwaanyị a nọ n’elu ndị ọchịchị ụwa ma ọ bụ na ọ na-agwa ha ihe ha na-eme. Ọ na-akpagbukwa ndị na-efe Jehova Chineke. (Mkpu. 17:2, 3; 18:11, 23, 24) Ọ́ bụghị ihe a ka okpukpe ụgha na-eme kemgbe ụwa, ruokwa n’oge anyị a?

Okpukpe ụgha dị iche iche, nkụzi dị iche iche, na òtù dị iche iche si na Babel, bụ́ ebe e mechara kpọwazie Babịlọn (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Olee otú o si bụrụ na Babịlọn Ukwu bụ “nne ụmụ nwaanyị akwụna”?

6 Ma, gịnị mere e ji kpọọ Babịlọn Ukwu ahụ “oké nwaanyị akwụna,” kpọọkwa ya “nne ụmụ nwaanyị akwụna”? Ọ bụ maka na okpukpe ụgha ekewaala, nwee òtù dị iche iche na chọọchị dị iche iche a na-enweghị ike ịgụta ọnụ. Kemgbe a ghagburu asụsụ n’obodo Babel oge ochie, ma ọ bụ Babịlọn, a kụziela ụgha dị iche iche. Nkụzi ndị a agbasaala ebe niile n’ụwa, mezie ka e nwee okpukpe dị iche iche. Ị̀ hụla ihe mere o ji daba adaba na ọ bụ n’obodo Babịlọn ka e si nweta aha bụ́ “Babịlọn Ukwu ahụ” n’ihi na ọ bụ na Babịlọn ka ọtụtụ okpukpe ụgha si malite? (Jen. 11:1-9) N’ihi ya, e nwere ike ịsị na okpukpe ndị a niile bụ “ụmụ” oké nwaanyị akwụna ahụ. Setan na-ejikarị okpukpe ndị a arata ndị mmadụ ka ha na-eme mgbaasị, na-ekpere arụsị, ma ọ bụ na-ekwere nkụzi ụgha na omenala ndị ọzọ na-emebi aha Chineke. Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji dọọ ndị ya aka ná ntị gbasara okpukpe ụgha a zuru ụwa ọnụ. Ọ sịdịrị ha: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya mehie.”—Gụọ Mkpughe 18:4, 5.

7. Gịnị mere anyị ji kwesị ige ntị n’aka ná ntị Chineke dọrọ anyị ka anyị si na Babịlọn Ukwu “pụta”?

7 Ì meela ihe a Chineke gwara anyị? Cheta na ọ bụ Jehova kere anyị ka ọ na-agụ anyị agụụ ka ‘o duzie anyị.’ (Mat. 5:3) Ọ bụ naanị mgbe anyị na-efe Jehova ezigbo ofufe ka ọ ga na-eduzi anyị. N’ihi ya, ndị na-efe Jehova kwesịrị izere ihe ọ bụla ga-ejikọ ha na okpukpe ụgha. Ma, ihe Setan bụ́ Ekwensu chọrọ ka anyị mee dị iche. Ọ chọrọ ịrata ndị na-efe Chineke ka ha hapụ Chineke kpewe okpukpe ụgha. Ọtụtụ mgbe, ọnyá ọ na-esi na-amata ndị na-efe Chineke. Tupu oge Ezikiel, e nweela ọtụtụ ugboro ndị Chineke hapụrụ ya fewe chi ọzọ. Anyị kwesịrị ileba ihe a Baịbụl kọọrọ anyị anya n’ihi na ọ ga-akụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya, otú o si ekpe ikpe ziri ezi, na otú o si eme ebere.

‘I Bidoro Gbawa Akwụna’

8-10. Olee otu ihe dị mkpa ga-eme ka Chineke nabata ofufe anyị na-efe ya nke mere ka anyị ghọta otú obi na-adị Jehova ma ndị na-efe ya tinye aka n’okpukpe ụgha? Mee ihe atụ.

8 N’akwụkwọ Ezikiel, Jehova ji nwaanyị akwụna mee ihe atụ gosiri otú obi dị ya. O si n’ike mmụọ nsọ mee ka Ezikiel dee akụkọ abụọ gosiri otú obi si gbawaa ya maka na ndị ya mewere ka ndị akwụna, hapụ ya fewe chi ọzọ. Gịnị mere o ji jiri ha tụnyere ndị akwụna?

9 Iji mata azịza ajụjụ a, anyị kwesịrị icheta otu ihe dị ezigbo mkpa na-eme ka Chineke nabata ofufe mmadụ. Anyị kwuru gbasara ya n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a. N’Iwu Jehova nyere ndị Izrel, ọ sirị ha: “Enwela chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m. . . . Mụnwa bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.” (Ọpụ. 20:3, 5) O mechakwara mee ka ihe a o kwuru dokwuo ha anya mgbe ọ sịrị: “Akpọrọla chi ọzọ isiala, n’ihi na ihe e ji mara Jehova bụ na ọ chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe. N’eziokwu, ọ bụ Chineke onye chọrọ ka a na-efe naanị ya.” (Ọpụ. 34:14) Ihe a Jehova kwuru doro anya. Naanị ihe ga-eme ka Jehova nabata ofufe anyị bụ ma ọ bụrụ naanị ya ka anyị na-efe.

10 Ka anyị jirigodị di na nwunye mee ihe atụ. Di na nwunye nwere ihe ha na-atụ anya na ha ga na-emere ibe ha nke ha na-agaghị emere onye ọzọ. Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị agbawa n’èzí ma ọ bụ malite ịchụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, obi ga-agbawa nwunye ya ma ọ bụ di ya. (Gụọ Ndị Hibru 13:4.) Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe gbasara ife Chineke. Obi na-agbawa Chineke ma ndị ya nyefere ya onwe ha hapụ ya fewe chi ọzọ. N’Ezikiel isi 16, Jehova gosiri na a kpasuru ya ezigbo iwe mgbe ndị ya fewere chi ọzọ.

11. Olee akụkọ Jehova kọrọ gbasara Jeruselem na otú o si malite?

11 N’Ezikiel isi 16, Jehova kwuru okwu kacha ogologo o kwuru otu mgbe n’akwụkwọ Ezikiel. Ọ bụ otu n’ime amụma kacha ogologo Jehova buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ bụ Jeruselem ka o kwuru gbasara ya n’amụma a. Obodo a nọchiri anya ndị Juda kwụsịrị ife ya. Ọ kọrọ akụkọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ma na-agbawa obi banyere otú obodo a si malite na otú ndị bi na ya si mechaa hapụ Jehova. Mgbe ọ malitere, o yiri nwa ọhụrụ ruru unyi nke na-enweghị onye na-elekọta ya. Ndị mụrụ ya bụ ndị Kenan na-ekpere arụsị. N’eziokwu, ndị Jebus, ndị si n’agbụrụ ndị Kenan, nọ na-achị Jeruselem ruo mgbe Devid weghaara obodo a. Jehova meere nwa ọhụrụ a ebere, sachaa ya ma na-elekọta ya. Jehova mechara were nwa a ka nwunye ya. N’eziokwu, ndị Izrel ndị mechara biri n’obodo ahụ na Jehova gbara ndụ. Ọ bụ n’oge Mosis ka ha ji obi ha niile kweta ka ha na Jehova gbaa ndụ a. (Ọpụ. 24:7, 8) Mgbe Jeruselem ghọchara isi obodo ndị Chineke, Jehova gọziri ha, mee ka ha baa ọgaranya, chọọkwa ha mma, otú nwoke bụ́ aka ji akụ̀ nwere ike iji ọla ndị mara ezigbo mma chọọ nwunye ya mma.—Ezik. 16:1-14.

Solomọn kwere ka ndị nwunye ya, bụ́ ndị mba ọzọ, mee ka o kwe ka e fewe arụsị na Jeruselem (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otú ndị bi na Jeruselem si jiri nwayọọ nwayọọ hapụ Jehova fewe arụsị?

12 Lezie ihe merenụ. Jehova sịrị: “Mma ị mara mechara buwe gị isi, gị ebido gbawa akwụna n’ihi ude aha gị na-ede. Gị na onye ọ bụla na-agafe agafe na-akwa iko. I sikwa otú ahụ na-enye ha onwe gị.” (Ezik. 16:15) N’oge Solomọn, Jehova gọziri nnọọ ndị ya, mee ka ha baa ọgaranya nke na Jeruselem ghọrọ obodo mara ezigbo mma. O doro anya na obodo a pụrụ iche n’obodo niile e nwere n’oge ochie. (1 Eze 10:23, 27) Ma ndị na-efe Chineke ji nwayọọ nwayọọ malite ikpere arụsị na Jeruselem. Dị ka ihe atụ, Solomọn mere ka a malite ife arụsị na Jeruselem n’ihi na ọ chọrọ ime ka obi dị ọtụtụ ụmụ nwaanyị o si mba ọzọ lụta mma. (1 Eze 11:1-8) Ụfọdụ n’ime ndị eze chịrị mgbe Solomọn chịchara medịrị ihe ka njọ. Ha mere ka a na-ekpere arụsị ná mba Izrel niile. Olee otú obi dị Jehova maka na ndị ya mere ka ndị akwụna, hapụ ya fewe chi ọzọ? Ọ sịrị: “Ụdị ihe ndị ahụ ekwesịghị ịdị. E kwesịghịkwa ime ha ọzọ.” (Ezik. 16:16) Ma, ndị Chineke nọ na-emekwu ihe ọjọọ.

Ụfọdụ ndị Izrel ji ụmụ ha chụọrọ chi ụgha dị iche iche àjà, dị ka chi Molek

13. Olee ụdị ihe ọjọọ ndị Chineke bi na Jeruselem mere?

13 Chegodị otú o si na-ewute Jehova na otú obi si gbawaa ya mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ọjọọ ndị ọ họọrọ mere. Ọ sịrị: “I ji ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị ị mụụrụ m na-achụrụ arụsị ndị ahụ àjà. Akwụna ị na-agba ó zubereghị gị? Ị na-egbu ụmụ m. Ị na-akpọ ha ọkụ, jiri ha na-achụrụ arụsị ndị ahụ àjà.” (Ezik. 16:20, 21) Ụdị ihe ọjọọ a ndị Chineke nọ na-eme gosiri otú obi si kpọọ Setan nkụ. Ọ na-atọ ya ụtọ ịrafu ndị Jehova ka ha mewe ụdị ihe ọjọọ ahụ. Ma Jehova na-ahụ ihe niile Setan na-eme. Ọ ga-eme ka arụ niile Setan na-akpa kwụsị, kpọlitekwa ụmụaka niile ahụ e gburu. Ọ ga-ekpekwa Setan na ndị ajọ omume niile ikpe.—Gụọ Job 34:24.

14. Ole ndị bụ ụmụnne Jeruselem abụọ Jehova ji mee ihe atụ? Ònye kacha mee ihe ọjọọ n’ime ha atọ?

14 Ihe ọjọọ ndị bi na Jeruselem na-eme kwesịrị iwute ha, ma o wuteghị ha. Ha akwụsịghị ịgba akwụna. Jehova kwuru na ndị ọzọ na-agba akwụna kadị ya mma, na ihere anaghịdị eme ya n’ihi na ọ bụ yanwa na-akwụ ndị ọzọ ụgwọ ka ya na ha kwaa iko. (Ezik. 16:34) Chineke kwuru na Jeruselem na-eme ka “nne” ya, ya bụ, agbụrụ dị iche iche na-ekpere arụsị bibu n’obodo ahụ. (Ezik. 16:44, 45) E nwekwara ihe ọzọ Jehova kwuru banyere Jeruselem. Ọ sịrị na nwanne ya nwaanyị nke tọrọ ya bụ Sameria nakwa na nwanne ya a bu ya ụzọ hapụ Jehova fewe chi ọzọ. Chineke kwukwara na Jeruselem nwere nwanne nwaanyị ọzọ bụ́ Sọdọm. Sọdọm a Chineke kpọrọ aha na-echetara mmadụ niile gbasara obodo dịrị n’oge ochie aha ya bụ Sọdọm. E bibiri obodo a n’ihi na ndị bi na ya dị mpako, omume ha jọgbukwara onwe ya. Ihe Jehova na-ekwu bụ na Jeruselem mere ihe ọjọọ karịa ụmụnne ya ndị nwaanyị bụ́ Sameria na Sọdọm. (Ezik. 16:46-50) Ndị Chineke jụrụ aka ná ntị niile ọ nọ na-adọ ha. Ha ekweghị akwụsị ihe ọjọọ ha na-eme.

15. Gịnị mere Jehova ji taa ndị bi na Jeruselem ahụhụ? Gịnịkwa bụ olileanya ndị ya nwere?

15 Gịnịzi ka Jehova ga-eme? Ọ gwara Jeruselem, sị: “M ga-akpọkọta ndị enyi gị niile, bụ́ ndị ị na-eme obi ụtọ.” Ọ sịkwara ya: “M ga-enyefe gị n’aka ndị enyi gị.” Ndị ahụ na-ekpere arụsị ha na ndị Chineke na-akpabu ga-ebibi obodo ha, napụ ha ihe niile bara uru ha nwere na ihe ndị e ji chọọ ha mma. Jehova sịrị Jeruselem: “Ha ga-atụ gị nkume, jirikwa mma agha ha gbuo gị.” Gịnị mere Jehova ga-eji taa ndị ya ụdị ahụhụ a? Ọ bụghị ka o kpochapụ ha. Kama, o kwuru ihe o bu n’obi, sị: “M ga-akwụsị akwụna ị na-agba.” Chineke sịkwara: “M ga-eme ka iwe m na-ewesa gị dajụọ. M ga-akwụsịkwa iwesa gị iwe dị ọkụ. M ga-anọ jii. Agaghịzi m ewere gị iwe.” N’Isi nke 9 n’akwụkwọ a, anyị mụtara na Jehova bu n’obi na ọ ga-emecha mee ka ndị ya lọghachi n’ala ha mgbe ha nọchara n’ebe a dọọrọ ha n’agha. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ sịrị: “Mụnwa ga-echeta ndụ mụ na gị gbara n’oge ị bụ nwa agbọghọ.” (Ezik. 16:37-42, 60) Jehova agaghị eme otú ndị ya mere. Ọ gaghị ahapụ ha.—Gụọ Mkpughe 15:4.

16, 17. (a) Gịnị mere na anyị anaghịzi ekwu na Ohola na Oholiba nọchiri anya ndị chọọchị sị na ha bụ Ndị Kraịst? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ụmụnne Abụọ Bụ́ Ndị Akwụna.”) (b) Gịnị na gịnị ka anyị na-amụta n’Ezikiel isi 16 na 23?

16 Jehova si n’ogologo okwu dị mkpa o kwuru, ndị e dere n’Ezikiel isi 16, na-akụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara otú ọ chọrọ ka e si na-efe ya, otú o si ekpe ikpe ziri ezi, nakwa otú na-enweghị atụ o si eme ebere. Ezikiel isi 23 na-akụzikwara anyị otu ihe ahụ. Ezigbo Ndị Kraịst taa anaghị echefu ihe a doro anya gbasara otú ndị ya si hapụ ya fewe chi ọzọ. Anyị ekwesịghị ịnwa anwa mee ka obi jọọ Jehova njọ otú ndị bi na Juda na Jeruselem mere. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbara ikpere arụsị ọsọ. Anyaukwu na ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ sokwa n’ihe ndị anyị ga-agbara ọsọ n’ihi na ha so n’ikpere arụsị. (Mat. 6:24; Kọl. 3:5) Anyị kwesịrị ịna-egosi mgbe niile na obi dị anyị ụtọ na Jehova meere anyị ebere mee ka anyị maliteghachi ife ya ezigbo ofufe n’oge ikpeazụ a nakwa na ọ gaghị ekwe ka e merụọ ezigbo ofufe ya ọzọ. Jehova na Izrel nke Chineke agbaala “ndụ ga-adịru mgbe ebighị ebi,” nke a na-agaghị emebi emebi. Ha agaghị enupụrụ Chineke isi ma ọ bụ hapụ ya fewe chi ọzọ. (Ezik. 16:60) N’ihi ya, ka anyị jiri ihe ọma Chineke meere anyị kpọrọ ihe, nke bụ́ na anyị so ná ndị na-efe ya ezigbo ofufe n’oge a.

17 Ma, gịnị ka ihe Jehova gwara ndị akwụna ahụ e kwuru gbasara ha n’akwụkwọ Ezikiel na-akụziri anyị gbasara “oké nwaanyị akwụna,” bụ́ Babịlọn Ukwu ahụ? Ka anyị chọpụta.

“A Gaghịzi Ahụ Ya Ọzọ”

18, 19. Olee otú ndị akwụna e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Ezikiel si yie ụdị akwụna e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe?

18 Jehova anaghị agbanwe agbanwe. (Jems. 1:17) Otú o si were okpukpe ụgha, ya bụ, “oké nwaanyị akwụna” ahụ, kemgbe ụwa ka o sikwa were ya ugbu a. N’ihi ya, o jughị anyị anya na ọtụtụ ihe Chineke kwuru ọ ga-eme ndị akwụna e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Ezikiel yiri ihe ọ ga-eme “oké nwaanyị akwụna” e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe.

19 Dị ka ihe atụ, ị̀ hụrụ na ọ bụghị Jehova n’onwe ya tara ndị akwụna e kwuru okwu ha n’amụma Ezikiel ahụhụ? Kama, ọ bụ mba ndị ha na ndị Chineke kwara iko tara ha ahụhụ. A katọkwara okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa maka na ya na “ndị eze ụwa” na-akwa iko. Ònye kwanụ ka Chineke ga-eji taa ya ahụhụ? Baịbụl gwara anyị na ndị ọchịchị “ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị, nara ya ihe niile o nwere ma gbaa ya ọtọ. Ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam.” Gịnị mere ndị ọchịchị ụwa a ga-eji eme ihe a ga-eju ndị mmadụ anya? Ọ bụ n’ihi na Chineke ga-eme “ka imezu nzube ya dịrị ha n’obi.”—Mkpu. 17:1-3, 15-17.

20. Gịnị gosiri na mbibi a ga-ebibi Babịlọn ga-abụ mbibi ebighị ebi?

20 Jehova ga-eji mba dị iche iche e nwere n’ụwa a bibie okpukpe ụgha niile, ma Ndị Kraịst adịgboroja. Mbibi a ga-abụ mbibi ebighị ebi. A gaghị agbaghara ya, ọ gaghịkwa enwe ohere ọzọ ichegharị. Akwụkwọ Mkpughe kwuru na ‘a gaghịzi ahụ Babịlọn ọzọ.’ (Mkpu. 18:21) Ndị mmụọ ozi Chineke ga-aṅụrị ọṅụ mgbe a ga-ebibi ya. Ha ga-asị: “Toonụ Jaa! Anwụrụ ọkụ nke si n’ahụ́ ya ga na-akwụgo ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Mkpu. 19:3) Mbibi a ga-eme ka Babịlọn gharazie ịdị ruo mgbe ebighị ebi. E nweghịzi mgbe a ga-enwe okpukpe ụgha nke ga-emerụ ezigbo ofufe a na-efe Chineke. E nwere ike ịsị na anwụrụ ọkụ si na Babịlọn ga na-akwụgo elu ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ikpe e kpere ya na mbibi e bibiri ya.

Mba ndị Babịlọn Ukwu nọ na-eduhie kemgbe ma na-agwa ihe ha na-eme ga-alụso ya ọgụ, bibiekwa ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19, 20)

21. Gịnị ga-amalite ma e bibie okpukpe ụgha niile? Oleekwa ihe ga-eme ná ngwụcha oge ahụ?

21 Mgbe ndị ọchịchị ụwa a ga-alụso Babịlọn Ukwu ọgụ, ha ga-emezu uche Chineke nke bụ́ ibibi Babịlọn Ukwu ahụ. Ihe a ha ga-eme so n’ihe gbara ọkpụrụkpụ ga-emezu uche Jehova. Ọ ga-abụ mbido oké mkpagbu, bụ́ oge a ga-enwe nsogbu a na-enwetụbeghị ụdị ya. (Mat. 24:21) Oké mkpagbu ahụ ga-ebi n’agha Amagedọn, ya bụ, agha Jehova ga-eji bibie ụwa ochie a. (Mkpu. 16:14, 16) E nwere ọtụtụ ihe akwụkwọ Ezikiel kwuru gbasara ihe ndị ga-eme n’oge oké mkpagbu. Anyị ga-ahụ ha n’isiokwu ndị anyị ka ga-amụ n’akwụkwọ a. Ma, olee ihe ndị anyị mụtara n’akwụkwọ Ezikiel isi 16 na 23, bụ́ ndị anyị kwesịrị ịna-echeta ma na-eme?

Ndị ọchịchị ụwa a ga-alụso Babịlọn Ukwu ọgụ iji mezuo nzube Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 21)

22, 23. Olee otú ileba anya n’ihe e kwuru gbasara ndị akwụna n’akwụkwọ Ezikiel na Mkpughe ga-esi mee ka anyị jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe?

22 Ọ na-atọ Setan ụtọ ime ka ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe kpawa àgwà ọjọọ. Ọ ga-atọgbu ya atọgbu ma o nwee ike ime ka anyị kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe, kpawazie àgwà ka ndị ahụ e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Ezikiel. Anyị kwesịrị icheta na ezigbo iwe na-ewe Jehova ma a hapụ ya fewe chi ọzọ. Ọ chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe. (Ọnụ Ọgụ. 25:11) Anyị na-akpachara anya ka anyị gbaara okpukpe ụgha ọsọ, ghara ‘imetụ ihe na-adịghị ọcha n’anya Chineke aka.’ (Aịza. 52:11) O so n’ihe mere na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’esemokwu juru n’ụwa a. (Jọn 15:19) Anyị ghọtara na mmadụ ịhụ mba ya n’anya bụ okpukpe ụgha ọzọ Setan na-akwado. Aka anyị adịghịkwa na ya.

23 Nke kachanụ bụ na anyị kwesịrị ịna-echeta na ọ bụ ihe ọma kachanụ ka Jehova meere anyị kwe ka anyị na-efe ya ezigbo ofufe n’ụlọ nsọ ihe atụ ya. Anyị ekwesịghị iji ihe ọma a Jehova meere anyị gwuo egwu. Anyị kwesịkwara ikpebisi ike na e nweghị ihe ga-ejikọ anyị na okpukpe ụgha nakwa na anyị agaghị eme ka nwaanyị akwụna a.