Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 17

“Gọg, . . . M Ga-eme Gị Ihe”

“Gọg, . . . M Ga-eme Gị Ihe”

EZIKIEL 38:3

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: A kọwara onye bụ́ “Gọg” nakwa “obodo” ma ọ bụ “ala” ọ ga-eji ike banye

1, 2. Olee agha dị egwu a ga-alụ n’oge na-adịghị anya? Oleekwa ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

 KEMGBE ọtụtụ puku afọ, agha ndị a lụrụ n’ụwa ataala isi ọtụtụ ndị, ma agha ụwa nke mbụ ma nke abụọ a lụrụ n’agbata afọ 1914 na 1945. Ma n’oge na-adịghị anya, a ga-alụ agha kacha agha niile a lụtụrụla kemgbe ndị mmadụ dịwara ndụ. Agha a abụghị agha ụmụ mmadụ nkịtị ga-alụ, ya bụ, agha mba na mba ga-alụ maka na ha na-azọ ihe ga-abara naanị mba ha uru. Kama, ọ bụ “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpu. 16:14) Ihe ga-eme ka a lụọ agha a bụ na otu onye iro Chineke onwe ya na-ebu isi ga-abanye n’ike n’obodo ma ọ bụ n’ala Chineke na-ejighị egwu egwu. Ihe a ọ ga-eme ga-eme ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova jiri ike ya na-enweghị atụ bibie ya. Mbibi a ga-abụ mbibi kachanụ o bibitụrụla ndị iro ya n’ụwa.

2 Ajụjụ ụfọdụ dị mkpa anyị nweziri ike ịjụ bụ: Ònye bụ onye iro a? Olee obodo ma ọ bụ ala ọ ga-eji ike banye? Olee mgbe ọ ga-abanye na ya? Gịnị mere ọ ga-eji abanye? Oleekwa otú ọ ga-esi abanye? Anyị kwesịrị ịmata azịza ajụjụ ndị a n’ihi na ihe ndị a ga-eme n’ọdịnihu ga-agbasa anyị bụ́ ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe n’ụwa taa. A zara ajụjụ ndị a n’amụma na-eme obi ụtọ e dere n’Ezikiel isi 38 na 39.

Onye Iro Bụ́ Gọg Onye Megọg

3. Kọọ isi ihe e kwuru n’amụma Ezikiel buru gbasara Gọg onye Megọg.

 3 Gụọ Ezikiel 38:1, 2, 8, 18; 39:4, 11. Isi ihe e kwuru n’amụma a bụ na “n’oge ikpeazụ,” otu onye iro a kpọrọ “Gog . . . onye Megọg” ga-eji ike banye “n’obodo” ma ọ bụ “n’ala” ndị Chineke. Ihe a ga-akpasu Jehova “ezigbo iwe.” Jehova ga-abịazi merie Gọg. a Jehova merichaa onye iro ya a na ndị niile ya na ha so, ọ ga-eme ka ‘nnụnụ na-eri anụ na anụ ọhịa jiri ha mere anụ oriri.’ N’ikpeazụ, Jehova “ga-enye Gọg otu ebe a na-eli ozu.” Anyị ga-aghọta otú amụma a ga-esi emezu n’oge na-adịghị anya n’ọdịnihu ma anyị buru ụzọ mata onye bụ Gọg.

4. Gịnị ka anyị mụtara gbasara Gọg onye Megọg?

4 Onyezi bụ Gọg onye Megọg? Ihe Ezikiel kwuru gbasara Gọg gosiri na ọ bụ onye iro nke na-achọghị ka a na-efe Chineke ezigbo ofufe. Gọg ọ̀ bụ aha ọzọ a kpọrọ Setan, bụ́ onye iro kacha eme ka a ghara ife Chineke ezigbo ofufe? Ọ bụ ihe e kwuru n’akwụkwọ anyị ruo ọtụtụ afọ. Ma, mgbe anyị lebakwuru anya n’amụma a Ezikiel buru, anyị gbanwere otú anyị sibu ghọta ya. Ụlọ Nche kwuru na Gọg onye Megọg abụghị aha a na-akpọ mmụọ a na-anaghị ahụ anya, kama ọ bụ aha ndị iro a na-ahụ anya bụ́ mmadụ, ya bụ, ọtụtụ mba ndị ga-agbakọ aka ọnụ lụso ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe ọgụ. b Tupu anyị eleba anya n’ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe abụọ e kwuru n’amụma Ezikiel ndị gosiri na Gọg abụghị mmụọ a na-anaghị ahụ anya.

5, 6. Olee ihe ndị e kwuru n’amụma Ezikiel gosiri na Gọg onye Megog abụghị mmụọ?

5 “M ga-eme ka nnụnụ na-eri anụ . . . jiri gị mere anụ oriri.” (Ezik. 39:4) Na Baịbụl, a na-ekwukarị na nnunu ga-eri anụ ndị mmadụ mgbe a na-adọ ha aka ná ntị maka ikpe Chineke ga-ama ha. Chineke dọrọ ndị Izrel oge ochie na mba ndị ọzọ ụdị aka ná ntị a. (Diut. 28:26; Jere. 7:33; Ezik. 29:3, 5) Ma, buru n’obi na ọ bụghị ndị mmụọ ka Chineke dọrọ aka ná ntị a, kama ọ bụ ndị mmadụ nwere anụ ahụ́ na ọbara. A si ka e kwuwe, ihe nnụnụ ndị na-eri anụ na anụ ọhịa na-eri bụ anụ ahụ́, ọ bụghị mmụọ. N’ihi ya, aka ná ntị a Chineke dọrọ Gọg n’amụma Ezikiel na-egosi na Gọg abụghị mmụọ.

6 “M ga-enye Gọg otu ebe a na-eli ozu n’Izrel.” (Ezik. 39:11) E nwetụbeghị mgbe Akwụkwọ Nsọ kwuru na a ga-eli ndị mmụọ n’ụwa. Kama, o kwuru na a ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis, ha anọọ otu puku (1,000) afọ. E mechazie, a tụba ha n’ọdọ ọkụ, nke pụtara mbibi ebighị ebi. (Luk 8:31; Mkpu. 20:1-3, 10) Ebe ọ bụ na e kwuru na a ga-enye Gọg “ebe a na-eli ozu” n’ụwa, anyị nwere ike ikwu na Gọg abụghị mmụọ.

7, 8. Olee mgbe a ga-ala “eze ugwu” n’iyi? Olee otú o si yie ihe ga-eme Gọg onye Megọg?

7 Ọ bụrụ na Gọg abụghị mmụọ, ònyezi ma ọ bụ gịnị bụ Gọg a, bụ́ onye iro ga-alụso ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe ọgụ ikpeazụ? Ka anyị leba anya n’amụma abụọ e buru na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịmata onye bụ́ Gọg onye Megọg.

8 “Eze ugwu.” (Gụọ Daniel 11:40-45.) Daniel buru amụma gbasara ndị ọchịchị ndị ga-achị ụwa malite n’oge ya ruo n’oge anyị a. Amụma ahụ kwukwara gbasara ndị eze abụọ ndị ga na-amarịta aka, ya bụ, “eze ndịda” na “eze ugwu.” Otú ọtụtụ ndị eze ma ọ bụ ọtụtụ mba si na-azọ ndị ka ibe ha kemgbe ọtụtụ narị afọ emeela ka a mata ndị bụ́ “eze ndịda” na “eze ugwu” n’oge dị iche iche. Daniel kwuru gbasara ọgụ ikpeazụ eze ugwu ga-alụ “n’oge ikpeazụ.” Ọ sịrị: “Ọ ga-ejikwa iwe na ọnụma gawa ka o kpochapụ ọtụtụ ndị ma laa ha n’iyi.” Ọ bụ ndị na-efe Jehova ka eze ugwu ga-alụso ọgụ a. c Ma mgbe eze ugwu gbalịchara ka o kpochapụ ndị Chineke ma ihe o bu n’obi emeghị, ‘a ga-ala ya n’iyi’ otú e kwuru na a ga-eme Gọg onye Megọg.

9. Olee otú ihe ga-eme Gọg onye Megọg na ihe ga-eme “ndị eze niile nọ n’ụwa” si yie?

9 “Ndị eze niile nọ n’ụwa.” (Gụọ Mkpughe 16:14, 16; 17:14; 19:19, 20.) Akwụkwọ Mkpughe buru amụma na “ndị eze ụwa” ga-alụso “Eze ndị eze,” bụ́ Jizọs onye nọ n’eluigwe, ọgụ. Ma ebe ndị nnupụisi a na-enweghị ike iru n’ebe Jizọs nọ n’eluigwe, ha ga-alụso ndị nọ n’ụwa na-akwado Alaeze Chineke ọgụ. A ga-emeri ndị eze ụwa n’agha Amagedọn. Baịbụl gosiri na a ga-ebibi ha mgbe ha ga-alụso ndị Jehova ọgụ. Ihe a yiri ihe e kwuru ga-eme Gọg onye Megọg. d

10. Gịnị ka anyị nwere ike ikwu gbasara onye Gọg onye Megọg bụ?

10 N’ihi ihe ndị a anyị kwuru, gịnị ka anyị nwere ike ikwu gbasara onye Gọg bụ? Nke mbụ bụ na Gọg abụghị mmụọ. Nke abụọ bụ na Gọg bụ mba dị iche iche e nwere n’ụwa ndị ga-alụso ndị Chineke ọgụ n’oge na-adịghị anya n’ọdịnihu. O doro anya na mba ndị ahụ ga-ejikọ aka ọnụ, ya bụ, a ga-enwe otú ha ga-esi agbakọ aka bịa ọgụ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ebe ọ bụ na ndị na-efe Chineke nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa, mba ndị ahụ ga-ejikọtarịrị aka ma nwee otu olu ka ha nwee ike ịlụso ndị Chineke ọgụ. (Mat. 24:9) Ma buru n’obi na ọ bụ Setan ga-eme ka mba ndị a lụso ndị Chineke ọgụ. O teela o mewere ka ndị ọchịchị ụwa na-agba ezi ofufe ụkwụ. (1 Jọn 5:19; Mkpu. 12:17) Ma, isi ihe amụma Ezikiel buru gbasara Gọg onye Megọg bụ otú mba dị iche iche e nwere n’ụwa ga-esi alụso ndị Jehova ọgụ. e

Ebee Bụ “Obodo” Ma Ọ Bụ “Ala” Ahụ?

11. Gịnị ka amụma Ezikiel kwuru gbasara “obodo” ma ọ bụ “ala” Gọg ga-eji ike abanye?

11 Anyị mụtara na  paragraf nke 3 na Jehova ga-ewe ezigbo iwe mgbe Gọg onye Megọg ga-eji ike banye n’obodo ma ọ bụ ala nke Jehova na-ejighị egwu egwu. Ebee bụ obodo a? Ka anyị leba anya ọzọ n’amụma Ezikiel buru. (Gụọ Ezikiel 38:8-12.) Amụma ahụ kwuru na Gọg “ga-eji ike banye n’obodo a napụtara ndị bi na ya,” “ndị e si ná mba dị iche iche kpọlata.” Ihe ọzọ o kwuru banyere ndị na-efe Chineke a kpọlatara n’obodo a bụ na ‘obi ruru ha ala n’ebe ha bi,’ na ha “bi ebe na-enweghị mgbidi, ibo ụzọ, na ihe e ji atụchi ụzọ,” nakwa na ha “na-akpata akụ̀.” Ọ bụ n’obodo a ma ọ bụ n’ala a ka ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe n’ụwa niile bi. Olee otú anyị ga-esi amata ebe bụ obodo a?

12. Olee otú e si maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’Izrel oge ochie?

12 Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ya bụ ileba anya n’ihe mere n’Izrel oge ochie mgbe a kpọghachiri ndị Chineke họọrọ n’ala ha bibu, bụ́ ebe ha nọ rụọ ọrụ ma fee Chineke ọtụtụ narị afọ. Mgbe ndị Izrel nupụụrụ Jehova isi, o si n’ọnụ Ezikiel buo amụma na a ga-ebibi obodo ha ma mee ka ala ha tọgbọrọ nkịtị. (Ezik. 33:27-29) Ma Jehova bukwara amụma na ụfọdụ ndị Izrel ga-echegharị ma si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn lọta, fewe Chineke ezigbo ofufe n’obodo ha. Jehova ga-agọzi ndị Izrel, mee ka ala ha mewekwa nri nke ọma, nke na ọ ‘ga-adịzi ka ogige Iden.’ (Ezik. 36:34-36) Amụma a malitere imezu n’afọ 537 T.O.N.K. mgbe ndị Juu laghachiri Jeruselem ma maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’ala ha.

13, 14. (a) Gịnị bụ ala ndị Chineke bi na ya? (b) Gịnị mere na Jehova ejighị ala a egwu egwu?

13 Ụdị ihe ahụ emeekwala n’oge anyị a. N’Isi nke 9 n’akwụkwọ a, anyị mụtara na e si na Babịlọn Ukwu, bụ́ ebe a dọọrọ ndị Chineke n’agha kemgbe, tọhapụ ha n’afọ 1919. N’afọ ahụ, Jehova mere ka ha malite ibi n’ala ha, ya bụ, o mere ka ha dị ọcha nke na ha nweziri ike ifewe ya ezigbo ofufe. Ọ bụ naanị ya, bụ́ ezi Chineke, ka ha na-efe. Kemgbe ahụ, ha na Chineke dị n’ezigbo mma, obi ruru ha ala, ha na ibe ha dịkwa n’otu. (Ilu 1:33) Nri si n’Okwu Chineke anyị na-eri juru eju bara abara, anyị nwekwara ọtụtụ ihe na-eme anyị obi ụtọ anyị na-arụ n’ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Anyị achọpụtala n’eziokwu na “ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, e nweghịkwa nsogbu ya na ya na-eso.” (Ilu 10:22) N’agbanyeghị ebe anyị bi n’ụwa a, anyị nọ n’ala a ma ọ bụrụhaala na anyị ji obi anyị niile si n’ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme na-akwado ezigbo ofufe.

14 Jehova ejighị ala a egwu egwu. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jehova weere ndị bi n’ala a, bụ́ ndị ọ dọtara ka ha fewe ya ezigbo ofufe, ka “ihe ndị bara ezigbo uru nke mba niile.” (Hag. 2:7; Jọn 6:44) Ha na-agbasi mbọ ike ka ha yiri àgwà ọhụrụ, bụ́ àgwà ndị e ji mara Chineke. (Efe. 4:23, 24; 5:1, 2) Ebe ha na-efe Chineke ezigbo ofufe, ha ji obi ha niile na-eje ozi ya otú na-eme ka e too ya na otú na-egosi na ha hụrụ ya n’anya. (Rom 12:1, 2; 1 Jọn 5:3) Anyị ma na obi na-atọ Jehova ezigbo ụtọ mgbe ọ na-ahụ ka ndị na-efe ya na-agbalịsi ike na-eme ka ala a na-amakwu mma. Chegodị ihe a: Ọ bụrụ na ife Chineke abụrụ ihe kacha gị mkpa ná ndụ, ị na-eme ka ala a makwuo mma, na-emekwa Jehova obi ụtọ.—Ilu 27:11.

N’agbanyeghị ebe anyị bi, anyị nọ n’ala a ma ọ bụrụhaala na anyị ji obi anyị niile na-akwado ezigbo ofufe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13, 14)

Olee Mgbe Gọg Ga-eji Ike Banye n’Ala Ahụ? Gịnị Mere Ọ Ga-eji Banye na Ya? Oleekwa Otú Ọ Ga-esi Abanye?

15, 16. Olee mgbe Gọg onye Megọg ga-eji ike banye n’ala ndị na-efe Chineke?

15 N’oge na-adịghị anya, mba dị iche iche jikọtara aka ọnụ ga-abata n’ike n’ala anyị nke Jehova ji kpọrọ ihe. Anyị kwesịrị ichebara ihe a ezigbo echiche. Ebe ọ bụ anyị, bụ́ ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe, ka a ga-alụso ọgụ a, anyị kwesịrị ịmatakwu gbasara ya. Ka anyị leba anya n’ajụjụ atọ anyị nwere ike ịjụ.

16 Olee mgbe Gọg onye Megọg ga-eji ike bata n’ala anyị nke bụ́ ezigbo ofufe anyị na-efe Chineke? Amụma Ezikiel kwuru na ọ ga-abụ “n’oge ikpeazụ, mgbe afọ ndị ahụ gachara.” (Ezik. 38:8) Ihe ọ pụtara bụ na ihe a ga-eme ná ngwụcha ụwa ochie a. Cheta na oké mkpagbu ahụ ga-amalite mgbe a ga-ebibi Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. E bibichaa okpukpe ụgha niile, Gọg ga-alụso ndị niile na-efe Chineke ezigbo ofufe ọgụ ikpeazụ. Gọg ga-alụso ha ọgụ a tupu agha Amagedọn amalite.

17, 18. Olee otú Jehova ga-esi eme ka ihe gaa n’oge oké mkpagbu?

17 Gịnị mere Gọg ga-eji banye n’ike n’ala ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe? Amụma Ezikiel kwuru ihe abụọ. Nke mbụ bụ na e nwere ihe Jehova ga-eme. Nke abụọ abụrụ ihe ọjọọ Gọg bu n’obi.

18 E nwere ihe Jehova ga-eme. (Gụọ Ezikiel 38:4, 16.) Ị̀ hụrụ na Jehova gwara Gọg, sị: ‘M ga-etinye nko n’agba gị,’ gwakwa ya, sị: “M ga-eme ka ị bịa lụso obodo m agha”? Ihe a ọ̀ putara na Jehova ga-amanye mba dị iche iche ka ha lụso ndị na-efe ya ọgụ? Mba. E nweghị mgbe ọ ga-akpatara ndị ya ihe ọjọọ. (Job 34:12) Ma, Jehova ma ndị iro ya nke ọma. Ọ ma na ha kpọrọ ndị na-efe ya asị, marakwa na ha ga-agbalị ikpochapụ ha mgbe ọ bụla ha nwetara ohere. (1 Jọn 3:13) Jehova ga-eme ka ihe ndị na-eme n’ụwa mezuo uche ya n’oge o bu n’obi. Ọ ga-adị ka à ga-asị na o ji nko koro Gọg n’agba, dọrọ ya na-aga. E bibichaa Babịlọn Ukwu, Jehova ga-arata mba dị iche iche ka ha mezuo ihe dị ha n’obi. Ọ bụ otú Jehova ga-esi eme ka Gọg lụso ndị ya ọgụ, agha Amagedọn amalitezie. Ọ bụ agha kachanụ a ga-alụ n’ụwa. Ọ ga-azọpụtazi ndị ya, mee ka a mara na ọ bụ Ọkaakaa ma doo aha ya nsọ.—Ezik. 38:23.

Mba dị iche iche ga-agbalị ime ka a kwụsị ife Jehova ezigbo ofufe maka na ha kpọrọ ezigbo ofufe na ndị na-akwado ya asị

19. Gịnị mere Gọg ga-eji achọ ime ka a kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe?

19 Ihe ọjọọ Gọg bu n’obi. Mba dị iche iche ‘ga-akpa nkata ọjọọ.’ Ha ga-achọ otú ha ga-esi ewesa ndị na-efe Jehova iwe ha buuru ha n’obi kemgbe maka na ha kpọrọ ha asị. Ha ga-eche na ọ gaghị esiri ha ike imemila ha maka na ha yiri ndị bi “ebe na-enweghị mgbidi, ibo ụzọ, na ihe e ji atụchi ụzọ.” Mba ndị ahụ ga-achọ isi na nke ndị “na-akpata akụ̀” “kwakọrọ ọtụtụ ihe, bukọrọkwa nnukwu ihe.” (Ezik. 38:10-12) Olee “akụ̀” ha ga-akwakọrọ? Ndị na-efe Jehova nwejuru akụ̀ enwejụ. Akụ̀ kacha mkpa anyị nwere bụ na anyị na-efe naanị Jehova ezigbo ofufe. Mba ndị ahụ ga-agbalị ime ka a kwụsị ife Jehova ezigbo ofufe maka na ha kpọrọ ezigbo ofufe na ndị na-akwado ya asị.

Gọg ‘ga-akpa nkata ọjọọ’ ka o kpochapụ ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe. Ma atụmatụ ya ga-akụ afọ n’ala (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

20. Olee otú Gọg ga-esi eji ike abanye n’ala ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe?

20 Olee otú Gọg ga-esi eji ike abanye n’ala ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe? Mba ndị ahụ nwere ike ịgbalị ime ka anyị kwụsị ịna-eme ihe ndị e ji mara Ndị Kraịst, kwụsịkwa ife Chineke. Otú ha nwere ike isi eme ya bụ ime ka nri si n’Okwu Chineke ghara ịna-eru anyị aka, ka anyị kwụsị ịna-ezukọta ọnụ, ka anyị ghara ịdị n’otu ma ọ bụkwanụ ka ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke ghara ịna-anụ anyị ọkụ n’obi. Ihe niile a so n’ihe mere anyị na Chineke ji dịrị ná mma, anyị na ụmụnna anyị adịrịkwa n’otu. Setan ga-eme ka mba ndị a gbalịa ka ha kpochapụ ma ezigbo ofufe a na-efe Chineke n’ụwa ma ndị na-efe ya.

21. Gịnị mere obi ji dị gị ụtọ na Jehova agwala anyị ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya?

21 Ọgụ Gọg onye Megọg ga-alụso ndị niile na-efe Chineke ezigbo ofufe ga-agbasa anyị niile nọ n’ala Chineke nyere anyị. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova agwala anyị ihe ndị a ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ma, ka anyị na-eche ka oké mkpagbu malite, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-akwado ezigbo ofufe, jiri ya kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ. Anyị mee otú ahụ, anyị so na-eme ka obodo ma ọ bụ ala ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe na-amakwu mma ugbu a. Ime otú ahụ ga-emekwa ka anyị soro ná ndị ga-ahụ ihe pụrụ iche ga-eme n’oge na-adịghị anya, ya bụ, ịhụ otú Jehova ga-esi gbachitere ndị ya na aha nsọ ya n’agha Amagedọn. Anyị ga-eleba ya anya n’Isi nke 18.

a N’Isi nke 18, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova ga-esi wesa Gọg onye Megọg ezigbo iwe nakwa mgbe ọ ga-ewesa ya iwe. Anyị ga-amatakwa otú ihe ga-adịrị ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe mgbe ahụ.

b Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche Mee 15, 2015, peeji nke 29-30.

c Daniel 11:45 gosiri na ọ bụ ndị Chineke ka eze ugwu ga-alụso ọgụ. Amaokwu a sịrị na eze a “ga-ama ụlọikwuu ya nke dị ka obí eze n’agbata nnukwu oké osimiri [ya bụ, osimiri Mediterenian] na ugwu nsọ nke Ala Mara Mma [bụ́ ebe ụlọ Chineke dịbu nakwa ebe ndị Chineke nọbu na-efe ya ofufe].”

d Baịbụl kwukwara na “onye Asiria” nke oge a ga-alụso ndị Chineke ọgụ, gbalịa ka o kpochapụ ha. (Maị. 5:5) E nwere ọgụ anọ e buru amụma na a ga-alụso ndị Chineke, ya bụ, nke Gọg onye Megọg ga-alụso ha, nke eze ugwu ga-alụso ha, nke ndị eze ụwa ga-alụso ha, na nke onye Asiria ga-alụso ha. Ma, ọ ga-abụ na ha niile bụ otu ọgụ a kpọrọ aha dị iche iche.

e Gụọ Isi nke 22 n’akwụkwọ a ka ị hụ ebe a kọwara ndị bụ́ “Gọg na Megọg” e kwuru okwu ha ná Mkpughe 20:7-9.