Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 2

“Chineke Nabatara Onyinye” Ha

“Chineke Nabatara Onyinye” Ha

NDỊ HIBRU 11:4

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Akụkọ otú Jehova si mee ka ndị mmadụ mara otú ha ga-esi na-efe ya ezigbo ofufe

1-3. (a) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha? (b) Olee ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya anyị ga-eleba anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

 EBEL nọ na-eleru ìgwè atụrụ ya anya. Ọ malitere ịzụ atụrụ ndị a kemgbe a mụrụ ha. Ugbu a, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ha, gbuo ha ma jiri ha nye Chineke onyinye. Jehova ọ̀ ga-anabata otú a mmadụ na-ezughị okè si fee ya ofufe?

2 Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee banyere Ebel, sị: “Chineke nabatara onyinye ya.” Ma, Jehova anabataghị onyinye Ken. (Gụọ Ndị Hibru 11:4.) Ihe a Baịbụl kwuru nwere ike ime ka mmadụ jụọ ajụjụ ndị a anyị kwesịrị ilebara anya: Gịnị mere Chineke ji nabata ofufe Ebel fere ya ma jụ nke Ken? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Ken na Ebel mere nakwa n’ihe ndị ọzọ e kwuru gbasara ha ná Ndị Hibru isi 11 mere? Ịmata azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka anyị ghọtakwuo ihe ife Chineke ezigbo ofufe pụtara.

3 Ka anyị na-elebatụ anya n’ihe ndị mere malite n’oge Ebel ruo n’oge Ezikiel, chọpụta ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya: Onye a na-efe ga-abụrịrị Jehova. Ofufe a na-efe ya ga-abụrịrị nke kacha mma. Otú e si efe ya ga-abụ otú ọ chọrọ. Ihe onye na-efe ya bu n’obi efe ya ga-abụ ezigbo ihe.

Gịnị Mere Chineke Anabataghị Ofufe Ken?

4, 5.  Olee ihe ndị mere ka Ken ghọta na ọ bụ Jehova ka o kwesịrị inye onyinye ya?

4 Gụọ Jenesis 4:​2-5. Ken ma na ọ bụ Jehova bụ onye ọ ga-enye onyinye ya. Ken nwere ọtụtụ ohere na oge buru ibu ọ ga-eji mụọ banyere Jehova. Ọ ga-abụ na ya na Ebel nwanne ya eruwela otu narị afọ otu narị afọ mgbe ha nyere Chineke onyinye. a Ha abụọ ma gbasara ogige Iden mgbe ha na-eto. O nwedịrị ike ịbụ na ha na-anọ n’ebe dị anya na-ahụ ogige Iden ahụ na-eme nri nke ọma. Ọ ga-abụkwa na ha hụrụ ndị cherob ahụ nọchiri ebe e si abanye n’ogige ahụ. (Jen. 3:24) O doro anya na nne na nna ha gwara ha na ọ bụ Jehova kere ihe niile, gwakwa ha na otú ihe dịzi, ya bụ, na mmadụ ga-atagide ahụhụ nwụọ, abụghị ihe Jehova bu n’obi kee mmadụ. (Jen. 1:​24-28) Ọ ga-abụ ihe ndị a Ken ma mere ka ọ ghọta na ọ bụ Chineke ka o kwesịrị inye onyinye ya.

5 Olee ihe ọzọ o nwere ike ịbụ ya mere Ken ji chụọrọ Chineke àjà? Jehova ebuola amụma na e nwere “nwa” a ga-amụ. Nwa ahụ ga-egwepịa isi “agwọ ahụ” duhiere Iv, nke mere Iv ji mee ihe kpataara ya nsogbu. (Jen. 3:​4-6, 14, 15) O nwere ike ịbụ na Ken chere na ọ bụ ya bụ “nwa” ahụ e kwere ná nkwa maka na ọ bụ ọkpara. (Jen. 4:1) Ihe ọzọ bụ na Jehova akwụsịchaghị ịgwa ndị mmadụ okwu n’agbanyeghị na ha bụzi ndị mmehie. Chineke gwadịrị Adam okwu mgbe Adam mehierela. O nwere ike ịbụ mmụọ ozi ka o ji gwa Adam okwu. (Jen. 3:​8-10) Jehova gwakwara Ken okwu mgbe Ken chụchara àjà ya. (Jen. 4:6) O doro anya na Ken ma na ọ bụ Jehova ka e kwesịrị ife ofufe.

6, 7.  È nwere ihe dị njọ n’ihe Ken nyere n’onyinye ma ọ bụ n’otú o si nye ya? Kọwaa.

6 Gịnịzi mere na Jehova eleghị onyinye Ken anya ọma? Ọ̀ ga-abụ na onyinye Ken nyere adịchaghị mma? Baịbụl ekwughị otú ahụ. Naanị ihe Baịbụl kwuru bụ na Ken wetara “ụfọdụ mkpụrụ ala mịrị.” Iwu Jehova mechara si n’aka Mosis nye ndị Izrel gosiri na Jehova na-anabata ụdị àjà a. (Ọnụ Ọgụ. 15:​8, 9) Ka anyị chebakwara otú ihe dị n’oge ahụ echiche. Naanị ihe ndị mmadụ na-eri n’oge ahụ bụ ihe ala mepụtara. (Jen. 1:29) Ebe ọ bụkwa na Chineke bụrụ ala ndị na-esoghị n’ogige Iden ọnụ, o doro anya na Ken rụsiri ọrụ ike kọpụta ihe ndị ahụ o ji chụọ àjà. (Jen. 3:​17-19) Ihe Ken chụrụ n’àjà bụ ihe oriri ọ tara ahụhụ nweta. N’agbanyeghị ya, Jehova anabataghị onyinye ya.

7 È nwerenụ ihe dị njọ n’otú Ken si nye onyinye ahụ? Ọ̀ bụ na ọ chụghị àjà ahụ otú Chineke chọrọ? Ọ gaghị abụ ya bụ nsogbu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na mgbe Jehova jụrụ onyinye Ken, Jehova asịghị na otú o si nye onyinye ahụ adịghị mma. N’eziokwu, e kwughịdị otú Ken na Ebel si nye onyinye ha. Oleezi ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ?

Ken ebughị ezigbo ihe n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8, 9)

8, 9. (a) Gịnị mere na Jehova eleghị ma Ken ma onyinye ya anya ọma? (b) Gịnị ka ị chọpụtara n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara Ken na Ebel?

8 Akwụkwọ ozi Pọl si n’ike mmụọ nsọ degara ndị Hibru gosiri na Ken ebughị ezigbo ihe n’obi nye Chineke onyinye ahụ. O nweghị okwukwe. (Hib. 11:4; 1 Jọn 3:​11, 12) Ọ bụ ya mere na Jehova eleghị ma Ken ma onyinye ya anya ọma. (Jen. 4:​5-8) Jehova bụ Nna hụrụ ụmụ ya n’anya. N’ihi ya, o ji obiọma gbalịa ka o nyere Ken nwa ya aka. Ma, Ken ekweghị anabata aka Jehova chọrọ inyere ya. Ọrụ ndị e ji mara anụ ahụ́ na-ezughị okè, dị ka “ibu iro, esemokwu, ekworo,” gbanyeziri mgbọrọgwụ n’obi Ken. (Gal. 5:​19, 20) Ebe ọ bụ na Ken ebughị ezigbo ihe n’obi, ihe ndị ọzọ dị mma n’ofufe ya abaghịzi uru. Ihe Ken mere na-akụziri anyị na ọ bụghị naanị ihe a na-ahụ anya mmadụ mere na-egosi na onye ahụ na-efe Jehova ezigbo ofufe.

9 Baịbụl kọọrọ anyị ọtụtụ ihe gbasara Ken. Ọ gwara anyị ihe Jehova gwara Ken na ihe Ken zara ya, gwakwa anyị aha ụmụ Ken na ihe ụfọdụ ha mere. (Jen. 4:​17-24) Ma Baịbụl agwaghị anyị ma Ebel ọ̀ mụrụ ụmụ ka ọ̀ bụ na ọ mụghị, e nweghịkwa ihe Ebel kwuru e dere na Baịbụl. N’agbanyeghị ya, Ebel si n’ihe o mere na-agwa anyị okwu taa. Olee otú o si eme ya?

Ebel Gosiri Anyị Otú E Si Efe Chineke Ezigbo Ofufe

10. Olee otú Ebel si gosi anyị otú e si efe Chineke ezigbo ofufe?

10 Ọ bụ Jehova ka Ebel nyere onyinye ya. Ọ ma na ọ bụ naanị Jehova bụ onye e kwesịrị inye ya. Onyinye o nyere bụ onyinye kacha mma o nwere. Ebel si n’ìgwè atụrụ ya họrọ “ụfọdụ atụrụ e bu ụzọ mụọ.” Ọ bụ eziokwu na Baịbụl agwaghị anyị ma ọ̀ chụrụ àjà ya n’ebe ịchụàjà ka ọ̀ chụrụ ya n’ebe ọzọ, o doro anya na otú o si nye Chineke onyinye ya dị Chineke mma. Ma, ihe kacha pụọ iche n’onyinye Ebel nyere bụ ihe o bu n’obi nye ya. Anyị ka na-amụta ihe n’ihe ahụ o mere n’ihe dị ka puku afọ isii (6,000) gara aga. O nyere onyinye ahụ maka na o nwere okwukwe na Chineke, jirikwa ntụziaka ya kpọrọ ihe. Olee otú anyị si mara?

Ebel mere ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

11. Gịnị mere Jizọs ji kpọọ Ebel onye ezi omume?

11 Ihe mbụ anyị ga-eleba anya bụ ihe Jizọs kwuru gbasara Ebel. Ọ ma Ebel nke ọma. Jizọs nọ n’eluigwe mgbe Ebel nọ ndụ n’ụwa. Ihe gbasara Ebel, nwa Adam, masịrị nnọọ Jizọs. (Ilu 8:​22, 30, 31; Jọn 8:58; Kọl. 1:​15, 16) Ihe ọ pụtara bụ na mgbe Jizọs kpọrọ Ebel onye ezi omume, ọ na-ekwu ihe o ji anya ya hụ. (Mat. 23:35) Onye ezi omume bụ onye kwetara na ọ bụ Jehova kwesịrị ịna-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, ọ bụghị ebe okwu biri. Ihe onye ahụ na-ekwu na ihe ọ na-eme na-egosikwa na o kwetara na ihe Chineke kpọrọ ihe ọjọọ bụ ihe ọjọọ nakwa na ihe ọ kpọrọ ihe ọma bụ ihe ọma. (I nwere ike ịtụle Luk 1:​5, 6.) Ọ na-ewe oge tupu ya edoo anya na mmadụ bụ onye ezi omume. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na Ebel ebiwela ndụ otú gosiri na ọ na-erubere Chineke isi tupu ya enye Chineke onyinye ya. O doro anya na ọ dịrịghị ya mfe ime otú ahụ. E nweghị ezigbo ihe ọ ga-amụta n’aka Ken, onye tọrọ ya, ebe ọ bụ na obi Ken ajọọla njọ. (1 Jọn 3:12) Mama Ebel edebeghị iwu doro anya Chineke nyere, papa ya nupụkwaara Chineke isi, maka na ha chọrọ ịna-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jen. 2:​16, 17; 3:6) N’eziokwu, Ebel nwere obi ike. Ọ bụ ya mere o ji mee ihe dị iche n’ihe ndị ezinụlọ ya mere.

12. Olee ezigbo ihe dị iche na Ken na Ebel?

12 Ihe ọzọ anyị ga-eleba anya bụ otú Pọl onyeozi si gosi na e nwere ihe jikọrọ okwukwe na ezi omume. Pọl dere, sị: “Ọ bụ okwukwe ka Ebel ji chụọrọ Chineke àjà ka nke Ken mma. Ọ bụkwa okwukwe ahụ mere e ji gbaara ya àmà na ọ bụ onye ezi omume.” (Hib. 11:4) Ihe Pọl kwuru gosiri na obi Ebel adịghị ka nke Ken. N’oge niile Ebel dị ndụ, o ji obi ya niile nwee okwukwe na Jehova. Okwukwe ya mekwara ka o kweta na otú Jehova si eme ihe dị mma.

13. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Ebel?

13 Ihe anyị na-amụta n’aka Ebel bụ na ọ bụ naanị mgbe onye na-efe Chineke bu ezigbo ihe n’obi na-efe ya, ya bụ, mgbe o ji obi ya niile nwee okwukwe na Jehova ma na-eso ntụziaka ya niile, ka a ga-ekwu na ọ na-efe Chineke otú kwesịrị ekwesị. Ihe ọzọ anyị mụtara bụ na ọ bụghị naanị otu ugboro ma ọ bụ naanị n’otu ihe ka anyị ga-egosi na anyị na-efe Chineke. Ihe niile anyị na-eme ná ndụ ga-egosi na anyị na-efe ya.

Ndị Nna Ochie Ndị Fere Chineke Ezigbo Ofufe

14. Gịnị mere Jehova ji nabata àjà Noa, Ebreham, na Jekọb chụụrụ ya?

14 Ebel bụ mmadụ mbụ na-ezughị okè fere Jehova ezigbo ofufe. Ma, ọ bụghị naanị ya mere otú ahụ. Pọl onyeozi gwara anyị ndị ọzọ fere Jehova otú kwesịrị ekwesị. Ụfọdụ n’ime ha bụ Noa, Ebreham, na Jekọb. (Gụọ Ndị Hibru 11:​7, 8, 17-21.) Onye ọ bụla n’ime ndị nna ochie ahụ nwere mgbe ọ chụụrụ Jehova àjà, Jehova anabata àjà ya. Gịnị mere o ji nabata onyinye ha? Ọ bụ maka na ọ bụghị naanị àjà ka ha chụụrụ ya. Kama, onye ọ bụla n’ime ha mere ihe anọ ahụ gbara ọkpụrụkpụ onye chọrọ ife Chineke ezigbo ofufe kwesịrị ime. Ka anyị hụ otú ha si mee ya.

Noa ji àjà ọ chụrụ gosi na ọ bụ Jehova ka e kwesịrị ife (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15, 16)

15, 16. Olee otú Noa si mee ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya?

15 A mụrụ Noa otu narị afọ na iri abụọ na isii (126) Adam nwụchara. Ma, ndị juru n’ụwa n’oge ahụ anaghị efe Chineke. b (Jen. 6:11) N’ime ezinụlọ niile e nwere n’ụwa tupu Chineke ejiri mmiri bibie ụwa, ọ bụ naanị Noa na ndị ezinụlọ ya na-efe Jehova otú kwesịrị ekwesị. (2 Pita 2:5) Mgbe e bibichara ụwa ma zọpụta Noa na ndị ezinụlọ ya, otú obi dị Noa mere ka ọ rụọ ebe ịchụàjà ma chụọrọ Jehova àjà. Ọ bụ ya bụ ebe ịchụàjà mbụ e kwuru okwu ya na Baịbụl. Ihe a Noa ji obi ya niile mee gosiri ndị ezinụlọ ya nakwa mmadụ niile ndị ezinụlọ ya ga-emecha mụọ na ọ bụ naanị Jehova bụ onye e kwesịrị ife. N’ime anụmanụ niile Noa nwere ike iji chụọ àjà, ọ họọrọ “ụfọdụ n’anụ niile dị ọcha nakwa ụfọdụ n’anụ niile na-efe efe dị ọcha.” (Jen. 8:20) Anụ ndị a o ji chụọ àjà bụ anụ ndị kacha mma n’ihi na Jehova ekwuola na anụ ndị ahụ dị ọcha.​—Jen. 7:2.

16 Noa ji anụ ndị ahụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ahụ ọ rụrụ. Jehova ọ̀ nabatara otú a o si fee ya? Ee. Baịbụl kwuru na Jehova nụrụ ísì ọma àjà ahụ na-esi ma gọzie Noa na ụmụ ya. (Jen. 8:21; 9:1) Ma, ihe kacha mee ka Jehova nabata àjà Noa chụrụ bụ ihe Noa bu n’obi chụọ àjà ahụ. Àjà ahụ Noa chụrụ bụ ihe ọzọ gosiri na o nwere okwukwe siri ezigbo ike na Jehova nakwa na o kwetara na otú Jehova si eme ihe dị mma. Otú Noa si rubere Jehova isi ná ndụ ya niile nakwa otú o si nabata ntụziaka Jehova mere ka Baịbụl kwuo na o “so ezi Chineke jee ije.” Ọ bụ ya mere e ji kpọọ Noa onye ezi omume. E nweghị mgbe a ga-echefu aha ọma a o meere onwe ya.​—Jen. 6:9; Ezik. 14:14; Hib. 11:7.

17, 18. Olee otú Ebreham si mee ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya?

17 Mgbe Ebreham nọ ndụ, ọtụtụ ndị na-efe arụsị. N’obobo ya, bụ́ Ọọ, e nwere otu nnukwu ụlọ arụsị a rụụrụ chi ọnwa aha ya bụ Nanna. c E nwedịrị mgbe nna Ebreham na-efe chi ụgha. (Josh. 24:2) Ma, Ebreham kpebiri na ya ga-efe Jehova. O nwere ike ịbụ n’aka nna ya ochie bụ́ Shem, nwa Noa, ka o si mụta gbasara ezi Chineke. Ha abụọ dịkọrọ ndụ otu narị afọ na iri ise (150).

18 Ebreham nọrọ ogologo ndụ. Ọ chụkwara àjà ọtụtụ ugboro n’oge ọ nọ ndụ. Ma, ọ bụ naanị Jehova, bụ́ onye e kwesịrị ife, ka ọ chụụrụ àjà ndị ahụ. (Jen. 12:8; 13:18; 15:​8-10) Ebreham ọ̀ chọrọ inye Jehova onyinye kacha mma o nwere? Nkweta o kwetara iji Aịzik, bụ́ nwa ya ọ hụrụ n’anya, chụọ àjà zara ajụjụ a. N’oge ahụ, Jehova gwara ya hoo haa otú ọ ga-esi jiri nwa ya chụọrọ ya àjà. (Jen. 22:​1, 2) Ebreham dịkwa njikere ime ihe niile otú Jehova gwara ya. Ọ bụ Jehova mere ka Ebreham gharazie igbu nwa ya. (Jen. 22:​9-12) Jehova nabatara ofufe Ebreham fere ya maka na Ebreham bu ezigbo ihe n’obi fee ya. Pọl dere, sị, “Ebreham nwere okwukwe na Jehova, e jiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume.”​—Rom 4:3.

Jekọb gosiri ndị ezinụlọ ya otú e si efe Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19, 20)

19, 20. Olee otú Jekọb si mee ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya?

19 Jekọb biri ọtụtụ afọ na Kenan, bụ́ ala Jehova kwere nkwa inye Ebreham na ụmụ ya. (Jen. 17:​1, 8) Otú ndị bi na Kenan si efe arụsị jọgburu onwe ya nke na Jehova sịrị na ala ahụ “ga-agbọpụ ha.” (Lev. 18:​24, 25) Mgbe Jekọb dị afọ iri asaa na asaa, ọ hapụrụ Kenan, lụọ nwaanyị ma mechaa kpọrọ ndị ezinụlọ ya dịzi ọtụtụ laghachi Kenan. (Jen. 28:​1, 2; 33:18) Ma, ụfọdụ ndị ezinụlọ ya mụtara ife arụsị. N’agbanyeghị ya, mgbe Jehova gwara Jekọb ka ọ gaa Betel rụọrọ ya ebe ịchụàjà, o mere ihe a gwara ya ozugbo. O bu ụzọ gwa ndị ezinụlọ ya, sị: “Tụfuonụ chi ndị mba ọzọ unu ji. Dowenụ onwe unu ọcha.” Jekọb meziri ihe niile Jehova gwara ya.​—Jen. 35:​1-7.

20 Jekọb rụrụ ọtụtụ ebe ịchụàjà n’Ala Nkwa ahụ. Ma, ọ bụ naanị Jehova bụ onye ọ chụụrụ àjà ma fee. (Jen. 35:14; 46:1) Ihe o ji chụọ àjà ndị ahụ, otú o si chụọ ha, na ihe o bu n’obi chụọ ha kwesịrị ekwesị. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na Jekọb bụ “nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.” Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na Chineke nabatara ofufe ya. (Jen. 25:27) Otú Jekọb si fee Chineke ná ndụ ya niile gosiri mba Izrel, bụ́ mba si n’agbụrụ ya, otú ha kwesịrị isi fee Chineke.​—Jen. 35:​9-12.

21. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị nna ochie gbasara ife Chineke ezigbo ofufe?

21 Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị nna ochie ahụ gbasara ife Chineke ezigbo ofufe? Otú ihe dị n’oge ahụ ka ọ dịkwa n’oge a. Ọtụtụ ndị anyị na ha bi, ma ndị ezinụlọ anyị, nwere ike ime ka anyị ghara iji obi anyị niile na-efe naanị Jehova. Ihe anyị ga-eme ka ha ghara iduhie anyị bụ inwe okwukwe siri ike na Jehova na ikwetasi ike na ntụziaka ya kacha mma. Anyị ga-egosi na anyị nwere ụdị okwukwe ahụ ma anyị na-erubere Jehova isi ma jiri oge anyị, ume anyị, na ihe ndị anyị nwere, na-ejere ya ozi. (Mat. 22:​37-40; 1 Kọr. 10:31) Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmara na ọ bụrụ na anyị ejiri ike anyị niile na-efe Jehova, na-efe ya otú o kwuru ka e si na-efe ya ma buru ezigbo ihe n’obi na-efe ya, ọ ga-ewere anyị ka ndị ezi omume.​—Gụọ Jems 2:​18-24.

Mba nke Ji Ife Chineke Ezigbo Ofufe Kpọrọ Ihe

22-24. Olee otú Iwu Mosis si mee ka ndị Izrel mata onye ha kwesịrị ịchụrụ àjà, ihe ha ga-eji chụọ àjà, nakwa otú ha ga-esi chụọ ya?

22 Jehova nyere ụmụ Jekọb Iwu ga na-eduzi ha. N’Iwu ahụ, ọ gwara ha hoo haa ihe ọ chọrọ ka ha na-eme. Ọ bụrụ na ha erubere Jehova isi, ha ga-abụ ‘ndị ya pụrụ iche’ na “mba dị nsọ.” (Ọpụ. 19:​5, 6) Ka anyị hụ otú Iwu ahụ si mee ka ha mata ihe anọ ahụ gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya.

23 Jehova mere ka ndị Izrel mata onye ha kwesịrị ife ofufe. Ọ gwara ha, sị: “Enwela chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.” (Ọpụ. 20:​3-5) Ihe ha ga-eji achụrụ ya àjà ga-abụ ihe kacha mma. Dị ka ihe atụ, anụmanụ ndị ha ga-eji chụọ àjà ga-abụ ndị ahụ́ dị mma, ndị na-enweghịkwa nkwarụ ọ bụla. (Lev. 1:3; Diut. 15:21; i nwere ike ịtụle Malakaị 1:​6-8.) A na-enye ndị Livaị ụfọdụ onyinye ndị e wetaara Jehova. Ma hanwa na-enyekwa Jehova onyinye. Ha na-esi “n’onyinye niile kacha mma a na-enye” ha enye Jehova onyinye. (Ọnụ Ọgụ. 18:29) E nyere ndị Izrel ntụziaka doro anya gbasara otú ha kwesịrị isi na-efe Chineke. A gwakwara ha ihe ndị ha ga-eji achụrụ Jehova àjà, ebe ha ga-anọ achụ ha, nakwa otú ha ga-esi achụ ha. Iwu niile e nyere ha karịrị narị isii (600). Iwu ndị a kwuru otú ha ga na-esi akpa àgwà. A gwara ha, sị: “Lezienụ anya ka unu na-eme nnọọ ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu. Unu ahapụla ya mewe ihe ọzọ.”​—Diut. 5:32.

24 È nwere ihe o mere ma onye Izrel nọrọ n’ebe masịrị ya chụọ àjà? Ee. Jehova gwara ndị ya ka ha rụọ ụlọikwuu. Ọ bụzi n’ebe ahụ ka ha ga-anọ na-efe Chineke. (Ọpụ. 40:​1-3, 29, 34) N’oge ahụ, ọ bụrụ na onye Izrel chọrọ ka Chineke nabata àjà ọ chọrọ ịchụ, ọ ga-eweta ya n’ụlọikwuu. dDiut. 12:​17, 18.

25. Olee ihe kacha mkpa n’àjà ọ bụla a na-achụ? Kọwaa.

25 Ma ihe kacha mkpa bụ ihe onye Izrel bu n’obi na-achụrụ Jehova àjà. Ọ ga-abụrịrị maka na o ji obi ya niile hụ Jehova n’anya, jirikwa obi ya niile na-eso ntụziaka ya. (Gụọ Diuterọnọmi 6:​4-6.) Mgbe ọ bụla ndị Izrel na-efe Jehova naanị iji mezuo iwu, Jehova anaghị anabata àjà ha na-achụrụ ya. (Aịza. 1:​10-13) Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma mee ka a mata na mmadụ enweghị ike iji ofufe na-esighị ya n’obi megharịa ya anya. Ọ sịrị: “Ndị a na-asị . . . na ha na-asọpụrụ m, ma obi ha adịghị n’ebe m nọ.”​—Aịza. 29:13.

Otú E Si Fee Chineke n’Ụlọ Nsọ

26. Ná mmalite, olee uru ụlọ nsọ Solomọn rụrụ baara ndị Juu n’ife Chineke ezigbo ofufe?

26 Ọtụtụ narị afọ ndị Izrel banyechara n’Ala Nkwa, Eze Solomọn rụrụ ụlọ nsọ ndị mmadụ ga na-aga efe Chineke ezigbo ofufe. Ụlọ nsọ ahụ ka ụlọikwuu ahụ mma. (1 Eze 7:51; 2 Ihe 3:​1, 6,  7) Ná mmalite, ọ bụ naanị Jehova bụ onye a na-achụrụ àjà niile a na-achụ n’ụlọ nsọ ahụ. Solomọn na ndị ọ na-achị ji ọtụtụ anụmanụ ndị kacha mma chụọrọ Chineke àjà otú Iwu Chineke kwuru. (1 Eze 8:63) Ma ihe mere Jehova ji nabata ofufe e fere ya n’ụlọ nsọ ahụ abụghị maka na ụlọ nsọ ahụ furu nnukwu ego ma ọ bụ maka na e ji ọtụtụ anụmanụ chụọrọ ya àjà. Ihe masịrị ya bụ ihe ndị Izrel bu n’obi nye ya onyinye ndị ahụ. Solomọn kwuru ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu n’oge a na-enyefe Chineke ụlọ nsọ ahụ. Ọ sịrị: “Jirinụ obi unu niile na-efe Jehova bụ́ Chineke anyị. Otú unu ga-esi na-eme ya bụ ịna-eso ntụziaka ya na ịna-edebe iwu ya otú unu na-eme taa.”​—1 Eze 8:​57-61.

27. Gịnị ka ndị Izrel na ndị eze ha mere? Gịnịzi ka Jehova mere?

27 Ọ dị mwute na ndị Izrel mechara kwụsị iso ezigbo ndụmọdụ Solomọn nyere ha. Ha kwụsịrị ime ụfọdụ n’ime ihe anọ ahụ gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya. Ndị Izrel na ndị eze ha kwere ka obi ha jọọ njọ, ha akwụsịzie inwe okwukwe na Jehova, kwụsịkwa iso ezigbo ntụziaka Jehova na-enye ha. Jehova zigara ndị amụma ya ọtụtụ ugboro ka ha dọọ ha aka ná ntị maka na ọ hụrụ ha n’anya nakwa ka ha gwa ha nsogbu ihe ọjọọ ha na-eme ga-akpatara ha. (Jere. 7:​13-15, 23-26) Ezikiel bụ otu n’ime ndị amụma ahụ, ọ bụkwa nwoke na-erubere Chineke isi. Ọ dịrị ndụ n’oge ife Chineke ezigbo ofufe siri ezigbo ike.

Ezikiel Hụrụ Mgbe E Merụrụ Ezigbo Ofufe

28, 29. Gịnị ka anyị ma gbasara Ezikiel? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ndị Mere n’Oge Ezikiel.”)

28 Ezikiel ma nnọọ otú e si na-efe Chineke n’ụlọ nsọ Solomọn rụrụ. Nna ya bụ onye nchụàjà. Ọ ga-abụ na nna ya jere ozi n’ụlọ nsọ ahụ mgbe ọ bụla o ruuru ya ije ozi. (Ezik. 1:3) Ọ ga-abụkwa na obi na-atọ Ezikiel ụtọ mgbe ọ bụ nwata. O doro anya na nna ya kụziiri ya gbasara Jehova nakwa Iwu ya. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na a chọtara “akwụkwọ e dere Iwu Mosis” n’ụlọ nsọ mgbe Ezikiel dị ihe dị ka otu afọ. e Ihe Josaya, bụ́ ezigbo eze na-achị mgbe ahụ, nụrụ mgbe a gụrụ akwụkwọ ahụ ruru ya n’obi nke na ọ gbasikwuru mbọ ike ka ndị Izrel fewe Chineke otú Chineke chọrọ.​—2 Eze 22:​8-13.

O doro anya na nna Ezikiel kụziiri ya gbasara Jehova nakwa Iwu ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 28)

29 Ezikiel mere ihe anọ ndị ahụ na-eme ka Chineke nabata ofufe a na-efe ya, otú ndị rubeere Chineke isi tupu oge ya mere. Anyị leba anya n’akwụkwọ Ezikiel, anyị ga-achọpụta na Ezikiel fere naanị Jehova. O ji ihe kacha mma o nwere fee ya, rube isi n’ihe niile Jehova gwara ya, meekwa ha otú Jehova chọrọ ka o si mee ha. Ezikiel mere ihe a niile maka na o ji obi ya niile nwee okwukwe na Jehova. Ma ọtụtụ ndị ya na ha dịkọrọ ndụ emeghị ka ya. Mgbe Ezikiel na-eto, ọ nụrụ amụma dị iche iche Jeremaya nọ na-ebu. Jeremaya malitere ibu amụma n’afọ 647 T.O.N.K. O ji ịnụ ọkụ n’obi dọọ ndị Izrel aka ná ntị gbasara ikpe Jehova ga-ekpe ha.

30. (a) Gịnị ka amụma dị iche iche Ezikiel dere mere ka anyị mata? (b) Gịnị bụ amụma? Oleekwa otú e kwesịrị isi ghọta amụma ndị nke Ezikiel dere? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ịghọta Amụma Ndị Dị n’Akwụkwọ Ezikiel.”)

30 Ihe dị iche iche Ezikiel si n’ike mmụọ nsọ dee mere ka a mata otú ndị Chineke hapụruru Chineke. (Gụọ Ezikiel 8:6.) Mgbe Jehova malitere ịta ndị Juda ahụhụ, Ezikiel so ná ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn. (2 Eze 24:​11-17) Ọ bụ eziokwu na a dọọrọ Ezikiel n’agha, ma a taghị ya ahụhụ. E nwere ọrụ Jehova chọrọ ka ọ rụọ n’ebe ahụ ya na ndị ọzọ a dọọrọ n’agha nọ. Ọhụụ dị iche iche na amụma ndị dị ịtụnanya Ezikiel dere kwuru otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe na Jeruselem. Ma, ihe ndị ahụ Ezikiel dere mekwara ka a mata otú a ga-esi mee ka ndị niile hụrụ Jehova n’anya na-efe ya ezigbo ofufe n’ụwa niile.

31. Gịnị ka akwụkwọ a ga-enyere anyị aka ime?

31 Ka anyị na-eleba anya ná nkebi ndị dị n’akwụkwọ a, anyị ga-amata ihe ụfọdụ na-eme n’eluigwe, bụ́ ebe Jehova bi. Anyị ga-achọpụtakwa otú e si merụọ ofufe a na-efe Jehova, otú Jehova si gbachitere ndị ya ma mee ka ha maliteghachi ife ya, nakwa otú ihe ga-adị n’ọdịnihu mgbe mmadụ niile ga na-efe Jehova. N’Isi nke 3, anyị ga-eleba anya n’ọhụụ nke mbụ Ezikiel hụrụ. Ọ ga-eme ka anyị jiri uche anyị hụ Jehova na ndị nọ ná nzukọ ya n’eluigwe, meekwa ka anyị mata ihe mere o ji bụrụ naanị ya ka e kwesịrị ịna-efe ezigbo ofufe.

a Ọ ga-abụ na a mụrụ Ebel obere oge a chụpụchara Adam na Iv n’ogige Iden. (Jen. 4:​1, 2) Jenesis 4:25 kwuru na Chineke nyere Iv Set ka ọ ‘nọchie Ebel.’ Ọ bụ mgbe Ebel nwụchara ọnwụ ike ka a mụrụ Set. Adam dị otu narị afọ na iri atọ (130) mgbe ahụ. (Jen. 5:3) N’ihi ya, ọ ga-abụ na Ebel dị ihe dị ka otu narị afọ (100) mgbe Ken gburu ya.

b Jenesis 4:26 kwuru na ọ bụ n’oge Ịnọsh, nwa nwa Adam, ka “ndị mmadụ malitere ịkpọ aha Jehova.” Ma, ọ ga-abụ na ha nọ na-akpọ aha Jehova n’ụdị mkparị. O nwere ike ịbụ arụsị dị iche iche ka ha nọ na-akpọ aha Jehova.

c Nanna bụ chi nwoke. Aha ọzọ a na-akpọ ya bụ Sin. Ọ bụ eziokwu na ndị bi n’obodo Ọọ nwere ọtụtụ chi ha na-efe, ọ bụ Nanna ka ha rụụrụ ụlọ arụsị na ebe ịchụàjà dị iche iche.

d Mgbe e si n’ụlọikwuu bupụ Igbe Ọgbụgba Ndụ, ọ ga-abụ na Jehova bidoro ịnabata àjà ndị a nọ n’ebe ndị ọzọ na-abụghị n’ụlọikwuu ahụ achụ.​—1 Sam. 4:​3, 11; 7:​7-9; 10:8; 11:​14, 15; 16:​4, 5; 1 Ihe 21:​26-30.

e Ọ ga-abụ na Ezikiel dị afọ iri atọ mgbe ọ malitere ibu amụma n’afọ 613 T.O.N.K. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na a mụrụ ya n’ihe dị ka afọ 643 T.O.N.K. (Ezik. 1:1) Ọ bụ n’afọ 659 T.O.N.K. ka Josaya malitere ịchị. A chọtakwara akwụkwọ e dere Iwu Mosis n’afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Josaya ma ọ bụkwanụ n’agbata afọ 642 na 641 T.O.N.K. O nwere ike ịbụ akwụkwọ iwu nke Mosis ji aka ya dee ka a chọtara n’oge ahụ.