Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE MBỤ

“Eluigwe Meghere”

“Eluigwe Meghere”

EZIKIEL 1:1

IHE NKEBI A NA-EKWU: Ịmata ihe ụfọdụ na-eme n’ebe Jehova bi

E nweghị mmadụ nwere ike ịhụ Jehova Chineke onye pụrụ ime ihe niile ma dị ndụ. (Ọpụ. 33:20) Ma, Jehova mere ka Ezikiel hụ ọhụụ dị iche iche ndị gosiri ndị nọ ná nzukọ Jehova n’eluigwe. Ọhụụ ndị ahụ na-eme ka anyị na-atụ egwu Chineke. Ma, ọ na-emekwa ka obi na-atọkwu anyị ụtọ na anyị na-efe onye naanị ya bụ ezi Chineke.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 3

‘Chineke Mere Ka M Hụwa Ọhụụ’

Ọhụụ nke mbụ Ezikiel hụrụ enyeghị ya ọnụ okwu. Ọhụụ ahụ nwere ọtụtụ ihe ọ na-akụziri ndị niile ji obi ha na-efe Chineke n’oge a.

ISI NKE 4

Ole Ndị Bụ “Ndị Mmụọ Ozi ahụ Nwere Ihu Anọ”?

Jehova ji ihe ndị a na-ahụ anya o gosiri Ezikiel mee ka anyị ghọta ihe ndị dị adị anyị na-agaraghị aghọta n’onwe anyị.