Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 4

Ole Ndị Bụ “Ndị Mmụọ Ozi ahụ Nwere Ihu Anọ”?

Ole Ndị Bụ “Ndị Mmụọ Ozi ahụ Nwere Ihu Anọ”?

EZIKIEL 1:15

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ndị mmụọ ozi ahụ na ihe anyị ga-amụta gbasara ha

1, 2. Gịnị mere Jehova ji eji ihe ndị ohu ya nọ n’ụwa na-ahụ anya akụziri ha ihe mgbe ụfọdụ?

 WEREGODỊ ya na ị na-ahụ ka ụmụaka na ndị mụrụ ha nọkọtara ọnụ na-amụ Baịbụl. Papa ha gosiri ha ihe e sere ese iji nyere ha aka ịghọta ihe ọ na-akụziri ha na Baịbụl. Otú ụmụaka ahụ si mụmụọ ọnụ ọchị na ihe ndị ha ji obi ha niile kwuo gosiri na ha aghọtala ihe papa ha na-akụziri ha. Ihe nwoke ahụ gosiri ụmụ ya nyeere ha aka ịghọta ihe ọ na-akụziri ha banyere Jehova. Ha agaraghị aghọta ihe ahụ ma a sị na o gosighị ha ihe e sere ese.

2 Jehova meekwara ụdị ihe ahụ. O ji ihe ndị a na-ahụ anya nyere ụmụ ya nọ n’ụwa aka ịghọta ihe ndị ha na-anaghị ahụ anya dị adị ha na-agaraghị aghọta. Dị ka ihe atụ, Jehova mere ka Ezikiel hụ ihe ụfọdụ pụrụ iche n’ohụụ ka o nwee ike ịghọta eziokwu ụfọdụ gbasara ya. N’Isi nke 3, anyị lebara anya n’otu n’ime ihe ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ugbu a, anyị ga-amụ gbasara ihe ọzọ Ezikiel hụrụ ma hụ otú ịghọta ihe ihe ahụ pụtara ga-esi enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso.

“M Hụrụ . . . Ndị Yiri Ndị Mmụọ Ozi Anọ”

3. (a) Gịnị ka Ezikiel 1:4, 5 kwuru na Ezikiel hụrụ n’ọhụụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka ị chọpụtara n’otú Ezikiel si kọwaa ihe ndị ọ hụrụ?

3 Gụọ Ezikiel 1:4, 5. Ezikiel kwuru na ya hụrụ “ndị yiri ndị mmụọ ozi anọ.” Ha yiri ma mmụọ ozi ma mmadụ ma anụmanụ. Ị̀ hụrụ otú Ezikiel si kọwaa ihe ọ hụrụ? Ọ sịrị na ọ hụrụ “ndị yiri” ndị mmụọ ozi. Ọ bụrụ na ị gụọ ọhụụ niile e dere n’Ezikiel Isi nke 1, ị ga-achọpụta na Ezikiel kwuru ọtụtụ ugboro na ihe ọ hụrụ “yiri” ma ọ bụ “dị ka.” (Ezik. 1:13, 24, 26) O doro anya na Ezikiel ghọtara na ihe ndị ọ hụrụ bụ naanị ihe ndị dị ka ma ọ bụ ihe ndị yiri ihe ndị anyị na-anaghị ahụ anya dị n’eluigwe.

4. (a) Olee otú ihe ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ dị ya n’ahụ́? (b) Olee ihe ọ ga-abụ na Ezikiel ma gbasara ndị cherob?

4 O doro anya na ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na ihe ọ nụrụ riri ya ọnụ. O kwuru na ndị mmụọ ozi anọ ahụ “na-acha ọkụ ka icheku ọkụ” nakwa na ha “na-egbu ka àmụ̀mà” n’ihi otú ha si apụ ngwa ngwa ma na-alọghachi ngwa ngwa. Nku ha “na-ada ka mmiri na-asọsi ike.” Ha gawa, “mkpọtụ ha na-adị ka nke ndị agha.” (Ezik. 1:13, 14, 24-28; gụọ igbe isiokwu ya bụ “M Nọ Na-ele Ndị Mmụọ Ozi Ahụ.”) N’ọhụụ ọzọ Ezikiel mechara hụ, o kwuru na ndị mmụọ ozi ahụ bụ “ndị cherob” ma ọ bụ ndị mmụọ ozi dị ike. (Ezik. 10:2) Ebe ọ bụ na Ezikiel si n’ezinụlọ ndị nchụàjà, ọ ga-abụ na ọ ma na ndị cherob na-anọkarị n’ebe Chineke nọ nakwa na ha bụ ndị ozi Chineke.—1 Ihe 28:18; Ọma 18:10.

“Nke Ọ Bụla Nwere Ihu Anọ”

5. (a) Olee otú o si bụrụ na ndị mmụọ ozi anọ ahụ na ihu anọ ha na-egosi ike Jehova na ebube ya? (b) Gịnị mere ihe a Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ji echetara anyị ihe aha Chineke pụtara? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

5 Gụọ Ezikiel 1:6, 10. Ezikiel kwukwara na nke ọ bụla n’ime ndị cherob ahụ nwere ihu anọ, ya bụ, ihu mmadụ, ihu ọdụm, ihu oké ehi, na ihu ugo. O doro anya na ihu anọ a Ezikiel hụrụ kụziiri ya ọtụtụ ihe gbasara ike Jehova na-enweghị atụ na ebube ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Nke ọ bụla n’ime ihu niile ahụ bụ ihu ihe na-anọchi anya ebube, ike, na ume. Ọdụm bụ anụ ọhịa dị ebube. Oké ehi bụ anụ ụlọ na-akpa ike. Ugo bụ nnụnụ nwere ume dị egwu. Mmadụ enweghị atụ n’ime ihe niile Chineke kere n’ụwa. Ọ bụ ya na-achị ihe ndị ọzọ niile e kere eke n’ụwa. (Ọma 8:4-6) Ma n’ọhụụ ahụ, Ezikiel hụrụ na ndị cherob anọ ahụ, ndị dị ebube, ndị nwere ihu anọ ihu anọ, nọ n’okpuru ocheeze Jehova, bụ́ Ọkaakaa eluigwe na ụwa. Ihe a bụ otú dabara adaba Jehova si gosi na ya nwere ike iji ihe o kere eke mezuo uche ya. a Ihe otu ọbụ abụ kwuru gbasara Jehova bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ dị ebube karịa eluigwe na ụwa.”—Ọma 148:13.

Gịnị ka ndị mmụọ ozi anọ ahụ na ihu anọ ha na-egosi gbasara ike Jehova, ebube ya, na àgwà ya ndị ọzọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5, 13)

6. Ọ̀ ga-abụ gịnị nyeere Ezikiel aka ịghọta ihe ihu anọ ahụ nọchiri anya ha?

6 Obere oge Ezikiel hụchara ọhụụ ahụ, ọ ga-abụ na o chebaara ihe ọ hụrụ echiche. O nwere ike ịbụ na o chetara na ndị fere Chineke tupu oge ya ji ụfọdụ ụmụ anụmanụ maa atụ. Dị ka ihe atụ, nna ochie bụ́ Jekọb ji Juda nwa ya tụnyere ọdụm, jirikwa Benjamin nwa ya tụnyere anụ ọhịa wolf. (Jen. 49:9, 27) Gịnị mere o ji mee otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na àgwà a ga-eji mara ụmụ nwoke ndị a bụ ụdị àgwà e ji mara ọdụm na anụ ọhịa wolf. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ihe atụ a Mosis si n’ike mmụọ nsọ dee mere ka Ezikiel ghọta na ihu ndị cherob ahụ nọchikwara anya àgwà ndị pụrụ iche. Gịnị bụ àgwà ndị ahụ?

Àgwà Ndị E Ji Mara Jehova na Ezinụlọ Ya Dị n’Eluigwe

7, 8. Olee àgwà ndị a na-ekwukarị na ihu anọ ndị cherob ahụ nọchiri anya ha?

7 Olee àgwà ndị dere Baịbụl tupu oge Ezikiel kwuru e ji mara ọdụm, ugo, na oké ehi? Lee ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl: “Obi na-esi ndị ezi omume ike ka ọdụm.” (Ilu 28:1; 2 Sam. 17:10) ‘Ugo na-efeli elu, anya ya na-erukwa n’ebe dị ezigbo anya.’ (Job 39:27, 29) “Otú oké ehi si arụsi ọrụ ike na-eme ka ihe a na-eweta n’ubi buo ibu.” (Ilu 14:4) N’ihi ihe e kwuru n’amaokwu ndị a, ihu ọdụm obi kara nọchiri anya ikpe ziri ezi. Ihu ugo nọchiri anya amamihe e ji ahụ ihe dị n’ihu. Ihu oké ehi nọchiri anya ike na-enweghị atụ. Ọ bụ otú a ka a na-esikarị akọwa ha n’akwụkwọ anyị.

8 Ma gịnị ka “ihu mmadụ” nọchiri anya ya? (Ezik. 10:14) Ọ ga-abụrịrị na ọ nọchiri anya àgwà ụmụ mmadụ e kere n’oyiyi Chineke nwere nke ụmụ anụmanụ na-enweghị. (Jen. 1:27) Ọ bụ naanị ụmụ mmadụ nwere àgwà a n’ụwa. Chineke kwuru gbasara ya n’iwu o nyere, sị: ‘Jiri obi gị niile hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ sịkwara: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.” (Diut. 6:5; Lev. 19:18) Ọ bụrụ na anyị ana-erube isi n’iwu ndị a ma jiri obi anyị niile hụ Chineke na ndị ọzọ n’anya, anyị na-eme ka Jehova. Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:8, 19) N’ihi ya, “ihu mmadụ” nọchiri anya ịhụnanya.

9. Ole ndị nwe àgwà ndị ahụ ihu cherob ndị ahụ nọchiri anya ha?

9 Ole ndị nwe àgwà ndị a e kwuru okwu ha? Ebe ọ bụ ndị cherob ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ nwe ihu ndị ahụ, ọ pụtara na ndị nwe àgwà ndị ahụ bụ ndị niile ndị cherob ahụ nọchiri anya ha, ya bụ, ndị niile bi n’eluigwe na-efe Chineke. (Mkpu. 5:11) Ihe ọzọ bụ na ebe ọ bụ Jehova nyere ndị cherob ahụ ndụ, ọ bụkwa ya mere ka ha nwee àgwà ndị ahụ. (Ọma 36:9) N’ihi ya, ihu ndị cherob ahụ nọchiri anya àgwà dị iche iche Jehova nwere. (Job 37:23; Ọma 99:4; Ilu 2:6; Maị. 7:18) Olee otú Jehova si egosi àgwà ndị a pụrụ iche?

10, 11. Olee otú àgwà anọ pụrụ iche Jehova nwere si abara anyị uru?

10 Ikpe ziri ezi. Ebe ọ bụ na “ikpe ziri ezi na-amasị Jehova,” ‘ọ naghị ele onye ọ bụla anya n’ihu.’ (Ọma 37:28; Diut. 10:17) N’ihi ya, n’agbanyeghị ebe anyị si ma ọ bụ otú ihe si dịrị anyị, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ife ya, nọgide na-ejere ya ozi ma nweta ngọzi ga-adịru ebighị ebi. Amamihe. Ebe ọ bụ na Chineke “ma ihe,” o nyere anyị akwụkwọ ga-eme ka anyị nwee “ezigbo amamihe.” (Job 9:4; Ilu 2:7) Iso ezigbo ndụmọdụ dị na Baịbụl na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị, na-emekwa ka ndụ anyị nwee isi. Ike. Ebe ọ bụ na ‘ike Jehova dị ukwuu,’ ọ na-eji mmụọ nsọ ya enye anyị “ike karịrị ike mmadụ.” Ike a na-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa ọ bụla tara akpụ nwere ike ịbịara anyị.—Nehọ. 1:3; 2 Kọr. 4:7; Ọma 46:1.

11 Ịhụnanya. Jehova emekataghị hapụ ndị ji obi ha niile na-efe ya n’ihi na ‘ịhụnanya ya dị ukwuu.’ (Ọma 103:8; 2 Sam. 22:26) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na obi na-ajọ anyị njọ maka na ọrịa ma ọ bụ nká anaghịzi ekwe anyị mee ihe ndị anyị na-emebu n’ozi Jehova, obi na-adị anyị mma maka na anyị ma na Jehova na-echeta ozi niile anyị jeere ya n’oge gara aga maka na anyị hụrụ ya n’anya. (Hib. 6:10) O doro anya na otú Jehova si egosi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, otú o si egosi na o nwere amamihe, ike, na ịhụnanya na-abara anyị ezigbo uru. Àgwà ya anọ a bụ́ isi ka ga-abara anyị uru n’ọdịnihu.

12. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara otú anyị ga-aghọtaru àgwà Jehova?

12 Anyị kwesịrị icheta na naanị ihe anyị bụ́ mmadụ ga-aghọtali gbasara àgwà dị iche iche Jehova nwere “bụ nnọọ obere ihe n’ihe ndị ọ na-eme.” (Job 26:14) “Anyị enweghị ike ịghọta ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” n’ihi na “e nweghị ike ịghọta otú ọ dịruru ukwuu.” (Job 37:23; Ọma 145:3) N’ihi ya, anyị ghọtara na a gaghị agụli àgwà dị iche iche Jehova nwere ọnụ ma ọ bụ kebisịa ha ekebisịa. (Gụọ Ndị Rom 11:33, 34.) N’eziokwu, ọhụụ Ezikiel hụrụ gosiri na e nwere ọtụtụ àgwà Chineke nwere. Ha juru eju bara abara. (Ọma 139:17, 18) Gịnị ka Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ahụ nke gosiri na ihe a bụ eziokwu?

“Ihu Anọ . . . Nku Anọ

13, 14. Gịnị ka ihu anọ ndị cherob ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa mere anyị ga-eji kwuo otú ahụ?

13 N’ọhụụ ahụ, Ezikiel hụrụ na cherob nke ọ bụla nwere ihu anọ, ọ bụghị otu ihu. Gịnị ka ihe a na-egosi? Cheta na Baịbụl kwuo na ihe dị anọ, ọ na-apụtakarị na ihe ahụ zuru ezu ma ọ bụ na e nweghị ihe a gụpụrụ na ya. (Aịza. 11:12; Mat. 24:31; Mkpu. 7:1) Ọ dị mma ịmara na Ezikiel kwuru “anọ” ugboro iri na otu n’ọhụụ a, ma ọ dịkarịa ala. (Ezik. 1:5-18) Gịnịzi ka ihe a na-akụziri anyị? Otú ahụ ndị cherob anọ ahụ nọchiri anya ndị niile na-erubere Chineke isi nọ n’eluigwe, ka ihu anọ niile nke ndị cherob ahụ nọchikwara anya àgwà niile Jehova nwere. b

14 Iji kọwaa otú o si bụrụ na ihu anọ ndị cherob ahụ apụtaghị naanị àgwà anọ, ka anyị leba anya n’ihe e kwuru gbasara wiil anọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Wiil nke ọ bụla buru ezigbo ibu. Ma, wiil anọ niile ahụ abụghị naanị wiil anọ buru ezigbo ibu nke na-enweghị ihe jikọtara otu na ibe ya. Kama, ha dị ka ntọala ụgbọ ịnyịnya ahụ nọ n’elu ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ihu anọ niile nke ndị cherob ahụ, ha abụghị àgwà anọ dị iche iche na-enweghị ihe jikọrọ otu na ibe ya. Kama, ha bụ àgwà ndị e ji tọọ ntọala ọmarịcha àgwà ndị ọzọ e ji mara Jehova.

Jehova Nọ Ndị Niile Na-erubere Ya Isi Nso

15. Olee ihe na-eme obi ụtọ Ezikiel mụtara n’ọhụụ mbụ ọ hụrụ?

15 N’ọhụụ mbụ a Ezikiel hụrụ, ọ mụtara ezigbo ihe mere ya obi ụtọ gbasara adịm ná mma ya na Jehova. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ihe e kwuru ná mmalite akwụkwọ Ezikiel. Mgbe Ezikiel kwuchara na ya nọ “n’ala ndị Kaldia,” ọ sịrị na “Jehova nyekwara ya ike ebe ahụ.” (Ezik. 1:3) Ị̀ hụrụ na Ezikiel kwuru na ya hụrụ ọhụụ ahụ n’ebe ahụ, ya bụ, na Babịlọn, c ọ bụghị na Jeruselem? Gịnị ka ihe a mere ka Ezikiel mata? O mere ka Ezikiel mata na n’agbanyeghị na a dọọrọ ya n’agha nakwa na ọ nọghịzi na Jeruselem na n’ụlọ nsọ dị na ya, ọ pụtaghị na ọ kwụsịla ife Jehova nakwa ya na ya adịghịzi ná mma. Otú a Jehova si mee ka Ezikiel nọrọ na Babịlọn hụ ya n’ọhụụ gosiri na mmadụ ga-efeli Chineke ezigbo ofufe n’agbanyeghị ebe ọ nọ ma ọ bụ otú ihe si dịrị ya. Ọ bụ ụdị obi Ezikiel nwere nakwa mmasị o nwere ife Jehova ga-eme ka ọ na-efe ya.

16. (a) Olee ihe na-akasi obi anyị mụtara n’ọhụụ Ezikiel? (b) Gịnị mere i ji jiri obi gị niile na-ejere Jehova ozi?

16 Olee otú ihe a Ezikiel mụtara si akasi anyị obi taa? Ọ na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị ji obi anyị niile na-efe Jehova, ọ ga-anọ anyị nso n’agbanyeghị ebe anyị bi, nsogbu anyị na ya na-alụ, ma ọ bụ otú ihe si dịrị anyị. (Ọma 25:14; Ọrụ 17:27) Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ ohu ya nke ọ bụla n’anya, ike anyị anaghị agwụ ya ngwa ngwa. (Ọpụ. 34:6) N’ihi ya, e nweghị ebe anyị nọ Jehova na-agaghị ahụ anyị n’anya. (Ọma 100:5; Rom 8:35-39) Ihe ọzọ bụ na ọhụụ a dị ịtụnanya Ezikiel hụrụ banyere otú Jehova si dị nsọ nakwa banyere ike ya na-enweghị atụ na-echetara anyị na ọ bụ Jehova ka anyị kwesịrị ife ofufe. (Mkpu. 4:9-11) N’eziokwu, obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ji ihe ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-enyere anyị aka ịghọta ihe ụfọdụ dị mkpa gbasara onwe ya na àgwà ya dị iche iche. Ịmụtakwu gbasara ọmarịcha àgwà Jehova na-eme ka anyị bịarukwuo ya nso. Ọ na-emekwa ka anyị jiri obi anyị niile na ike anyị niile na-eto ya ma na-ejere ya ozi.—Luk 10:27.

Jehova agaghị akwụsị ịhụ anyị n’anya n’agbanyeghị ebe anyị nọ na otú ihe si dịrị anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

17. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu ndị na-eso nke a?

17 Ma, ọ dị mwute na n’oge Ezikiel, ọtụtụ ndị kwụsịrị ife Chineke ezigbo ofufe. Olee otú ha si mee ya? Gịnịzi ka Jehova mere? Gịnịkwa ka ihe ndị ahụ mere n’oge ochie na-akụziri anyị taa? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị na-eso nke a.

a Otú Ezikiel si kọwaa ndị mmụọ ozi ahụ na-echetara anyị aha Chineke, bụ́ Jehova. Anyị ghọtara na aha a pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Otu n’ime ihe aha a na-egosi bụ na Jehova na-eme ka ihe o kere eke bụrụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ka o wee mezuo uche ya.—Gụọ Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara nke A4 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

b Kemgbe ọtụtụ afọ, akwụkwọ anyị akọwaala ihe dị ka àgwà iri ise n’ime àgwà dị iche iche Jehova nwere.—Gụọ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, n’isiokwu bụ́ “Jehova Chineke,” n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Àgwà Ndị E Ji Mara Jehova.”

c Otu onye na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl sịrị: “Ọ bụ okwu bụ́ ‘ebe ahụ’ kacha gosi otú ihe ahụ merenụ si dị ịtụnanya. . . . Chineke nọ ebe ahụ na Babịlọn. Okwu a na-akasi obi.”