Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 9D

Amụma Ndị Gbasara Ịdọrọ Ndị Chineke n’Agha na Ịmaliteghachi Ezigbo Ofufe

Amụma Ndị Gbasara Ịdọrọ Ndị Chineke n’Agha na Ịmaliteghachi Ezigbo Ofufe

Ọtụtụ amụma e buru gbasara ịdọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn n’oge ochie mezuru nke ugboro abụọ ha mgbe Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst n’agha. Mmezu nke ugboro abụọ a karịrị otú ha sibu mezuo. Lee ụfọdụ n’ime ha.

1. AKA NÁ NTỊ A DỌRỌ HA

2. CMGBE A DỌỌRỌ HA N’AGHA

3. A MALITEGHACHIRI EZIGBO OFUFE

MMEZU NKE MBỤ

Tupu afọ 607 T.O.N.K.—Aịzaya, Jeremaya, na Ezikiel dọrọ ndị Jehova aka ná ntị; ma ọtụtụ kwụsịrị ife Chineke na-efe chi ọzọ

Afọ 607 T.O.N.K.—E bibiri Jeruselem; a dọọrọ ndị Chineke n’agha laa Babịlọn

Malite n’afọ 537 T.O.N.K. gawa—Ndị na-erubere Chineke isi laghachiri Jeruselem, rụghachi ụlọ nsọ, malitekwa ife Chineke ezigbo ofufe

MMEZU KA NKE MBỤ

Tupu afọ 100 O.N.K.—Jizọs, Pọl, na Jọn dọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst aka ná ntị, ma ọtụtụ kwụsịrị iso ụzọ Kraịst na-eduhie ndị ọzọ

Malite n’ihe dị ka afọ 100 O.N.K. gawa—Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ezigbo Ndị Kraịst n’agha

Malite n’afọ 1919 gawa—Ebe ọ bụ na e chiela Jizọs eze, o mere ka a tọhapụ ha, ha amalitezie ife Chineke ezigbo ofufe