Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 1A

Gịnị Bụ Ofufe?

Gịnị Bụ Ofufe?

E nwere ike ịsị na ofufe pụtara “ịsọpụrụ chi na ịhụ chi n’anya.” Na Baịbụl, okwu Hibru na okwu Grik a sụgharịrị “ofufe” nwere ike ịpụta ịkwanyere ihe e kere eke ezigbo ùgwù ma ọ bụ irubere ya isi. (Mat. 28:9) Okwu ndị ahụ nwekwara ike ịpụta ofufe a na-efe Chineke ma ọ bụ chi ọzọ. (Jọn 4:23, 24) Ọ bụ ihe a na-ekwu n’ebe okwu a gbara ka e ji ama ihe ọ pụtara.

Ọ bụ naanị Jehova, Onye kere ihe niile nakwa Ọkaakaa eluigwe na ụwa, ka e kwesịrị ife ofufe. (Mkpu. 4:10, 11) Anyị na-efe Jehova ma anyị kweta na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa kwesịrị ịchị anyị ma na-akwanyere aha ya ùgwù. (Ọma 86:9; Mat. 6:9, 10) Ihe abụọ a so n’ihe a kacha kwuo okwu ha n’akwụkwọ Ezikiel, ya bụ, ọchịchị Jehova na aha ya. Okwu bụ́ “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova” gbara ugboro narị abụọ na iri na asaa (217) naanị n’akwụkwọ Ezikiel, okwu bụ́ ‘unu ga-amara na m bụ Jehova’ agbaa ugboro iri ise na ise.—Ezik. 2:4; 6:7.

Ọ bụghị naanị n’obi anyị ka anyị ga na-efe Chineke. Onye chọrọ ife Chineke ezigbo ofufe ga na-egosi ya n’omume. (Jems 2:26) Mgbe anyị nyefere Chineke onwe anyị, anyị kwere ya nkwa na anyị ga na-erubere ya isi ma na-akwanyere aha ya ezigbo ùgwù n’ihe ọ bụla anyị na-eme, ebe ọ bụ ya bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị. Ì chetara na mgbe Setan nwara Jizọs ọnwụnwa nke atọ, ihe Jizọs zara ya gosiri na e nwere ihe jikọrọ ife Chineke ofufe na ‘ijere ya ozi dị nsọ’? (Ihe e dere n’ala ala peeji Mat. 4:10.) Ebe anyị na-efe Jehova, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ijere ya ozi. a (Diut. 10:12) Anyị na-ejere Chineke ozi dị nsọ mgbe anyị hapụrụ ihe ọ bụla ọzọ mewe ihe ndị gbasara ofufe anyị na-efe Chineke. Gịnị bụ ihe ndị ahụ anyị na-eme?

E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi na-ejere Jehova ozi dị nsọ. Ọ naghị eji nke ọ bụla n’ime ha egwu egwu. Anyị na-ejere ya ozi dị nsọ mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, mgbe anyị gara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, nakwa mgbe anyị so na-arụ ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe ma na-elekọta ha. Anyị na-ejekwa ozi dị nsọ mgbe anyị na-enwe ofufe ezinụlọ, mgbe anyị na-akwado ọsọ enyemaka a na-agbatara ụmụnna anyị nọ ná mkpa, nakwa mgbe anyị wepụtara onwe anyị na-arụ ọrụ ná mgbakọ ma ọ bụ na-eje ozi na Betel. (Hib. 13:16; Jems 1:27) Ọ bụrụ na ihe kacha dịrị anyị n’obi bụ ife Chineke otú ọ chọrọ, anyị ga ‘na-ejere ya ozi ehihie na abalị.’ Ife Chineke anyị, bụ́ Jehova, na-eme anyị obi ụtọ.—Mkpu. 7:15.

a Otu n’ime okwu Hibru ndị e nwere ike ịsị na ha pụtara ofufe pụtakwara “ije ozi.” N’ihi ya, ije ozi bụ otu ụzọ e si efe ofufe.—Ihe e dere n’ala ala peeji Ọpụ. 3:12.