Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 2A

Ịghọta Amụma Ndị Dị n’Akwụkwọ Ezikiel

Ịghọta Amụma Ndị Dị n’Akwụkwọ Ezikiel

NKỌWA—GỊNỊ BỤ AMỤMA?

Na Baịbụl, ọ bụ okwu Hibru bụ́ na·vaʼʹ ka a sụgharịrị “amụma.” Isi ihe ọ pụtara bụ ịkọsa ozi si n’ike mmụọ nsọ, amamikpe, ntụziaka, ma ọ bụ iwu si n’aka Chineke. O nwekwara ike ịpụta ịkọsa ihe Chineke kwuru ga-eme n’ọdịnihu. Chineke mere ka Ezikiel dee ụdị amụma niile a.—Ezik. 3:10, 11; 11:4-8; 14:6, 7; 37:9, 10; 38:1-4.

OTÚ E SI BUO AMỤMA NDỊ AHỤ

  • ỌHỤỤ

  • IHE ATỤ

  • IHE NGOSI

N’akwụkwọ Ezikiel, e nwere amụma ndị bụ ọhụụ, ihe atụ, na ilu. E nwekwara amụma ụfọdụ e mere ka ihe ngosi.

OTÚ HA SI MEZUO

Ụfọdụ amụma ndị Ezikiel buru mezuru ihe karịrị otu ugboro. Dị ka ihe atụ, amụma ndị kwuru otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke otú kwesịrị ekwesị mezutụrụ mgbe ndị Chineke lọghachiri n’Ala Nkwa ahụ. Ma, dị ka e kwuru n’Isi nke 9 n’akwụkwọ a, ọtụtụ n’ime amụma ndị ahụ mezuru n’oge anyị a, ha ga-emezukwa ọzọ n’ọdịnihu.

N’oge gara aga, anyị chere na ọtụtụ ihe e kwuru n’amụma Ezikiel nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha. Ma n’akwụkwọ a, e kwughị na mmadụ, ihe, ebe, ma ọ bụ ihe mere n’oge gara aga nwere ihe ọ nọchiri anya ya n’oge a, ọ gwụla ma Akwụkwọ Nsọ ò mere ka o doo anya na e nwere ihe ọ nọchiri anya ya. a Kama, e kwuru otú ọtụtụ n’ime amụma Ezikiel buru ga-esi mezuo karịa otú ha mezuburu. E kwukwara ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe Ezikiel dere, n’ihe ndị o ziri ozi mere, n’ebe dị iche iche ọ kpọrọ aha, nakwa n’ihe ndị o dere merenụ.

a Gụọ Ụlọ Nche Mach 15, 2015, peeji nke 9-11, paragraf nke 7-12 nakwa “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” nke dị na peeji nke 17-18 n’otu Ụlọ Nche a, ka ị hụ ihe a kọwara gbasara ikwu na e nwere ihe akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl nọchiri anya ha.