Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 1B

Ihe Akwụkwọ Ezikiel Na-ekwu

Ihe Akwụkwọ Ezikiel Na-ekwu

E nwere ike ikebi ihe dị n’akwụkwọ Ezikiel ụzọ anọ otú a:

ISI NKE 1 RUO NKE 3

N’afọ 613 T.O.N.K., mgbe Ezikiel na ndị Juu a dọọrọ n’agha bi na Babịlọn, Jehova mere ka Ezikiel hụ ọhụụ dị iche iche. Jehova nyekwara ya ọrụ iburu ndị Juu bi n’akụkụ osimiri Kiba amụma.

ISI NKE 4 RUO NKE 24

N’agbata afọ 613 na 609 T.O.N.K., Ezikiel buru amụma dị iche iche kwuru ikpe Jehova mara Jeruselem na ndị nnupụisi bi na ya na-efe arụsị.

ISI NKE 25 RUO NKE 32

Malite n’afọ 609 T.O.N.K., ya bụ, afọ ndị Babịlọn malitere ịnọchibido Jeruselem nnọchibido ikpeazụ, Ezikiel malitere ibu amụma ikpe Jehova mara mba ndị gbara Jeruselem gburugburu, bụ́ ndị iro ndị Chineke. Mba ndị ahụ bụ Amọn, Ịdọm, Ijipt, Moab, Filistia, Saịdọn, na Taya.

ISI NKE 33 RUO NKE 48

Malite n’afọ 606 T.O.N.K., mgbe e bibirila Jeruselem na ụlọ nsọ ya nke dị ọtụtụ narị kilomita ma e si n’ebe Ezikiel nọ gawa ya, Ezikiel buweziri amụma na-eme obi ụtọ ndị mere ka e nwee olileanya na a ga-amaliteghachi ife Jehova Chineke ezigbo ofufe.

E nwere ike ikwu na a haziri akwụkwọ Ezikiel n’usoro ihe ndị e dere na ya si mee nakwa n’isiokwu n’isiokwu. E bu ụzọ dee amụma ndị kwuru na a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya tupu e buo ọtụtụ amụma ndị kwuru na a ga-amaliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe. Ọ dabara adaba otú a n’ihi na amụma ndị ahụ e buru na a ga-amaliteghachi ife Jehova pụtara na a kwụsịla ife ya n’ụlọ nsọ.

Ihe ọzọ bụ na ọ bụ n’agbata amụma Ezikiel ndị kwuru gbasara ikpe a mara Jeruselem na ndị nke kwuru na a ga-amaliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe ka a ga-ahụ amụma ndị nke kwuru ikpe a mara mba ndị iro gbara ndị Chineke gburugburu (isi nke 25 ruo nke 32). Otu ọkachamara kwuru gbasara amụma Ezikiel ndị kwuru ikpe Chineke mara mba dị iche iche. Ọ sịrị: “Mgbe e buchara amụma ndị ahụ kwuru banyere iwe Chineke, ọ dabara adaba na e buweziri amụma ndị nke kwuru banyere ebere Ọ ga-emere ndị Ya, n’ihi na ịta ndị iro ha ahụhụ bụ otú ọ ga-esi anapụta ndị Ya.”

Gaghachi n’isi nke 1, paragraf nke 18