Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 14A

Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Ọhụụ Ụlọ Nsọ Ezikiel Hụrụ

Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Ọhụụ Ụlọ Nsọ Ezikiel Hụrụ

E Buliri Ezigbo Ofufe Elu, Gbaakwa Ya Ogige

E buliri ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ elu, ya adị “n’elu otu ugwu dị nnọọ elu” (1). Ànyị ebuliela ezigbo ofufe elu, mee ka ọ bụrụ ihe kacha anyị mkpa?

Mgbidi (2) gbara ụlọ nsọ na mbara ala (3) ọ dị n’etiti ya gburugburu. Mgbidi a na-echetara anyị na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla merụọ ofufe anyị na-efe Jehova. Ezikiel 42:20 sịrị na e nwere mgbidi e ji mee ka “ebe nsọ” dị iche ‘n’ebe nkịtị.’ Ọ bụrụ na e mere ka “ebe nsọ” na “ebe nkịtị” dị iche n’agbanyeghị na ihe a na-anọ ‘n’ebe nkịtị’ eme adịghị njọ, ọ̀ bụ na ndị na-efe Jehova n’oge a ekwesịghị ịgbara ihe ọjọọ na omume rụrụ arụ ọsọ?

Ngọzi Ndị Ga-adịru Ebighị Ebi

Mmiri si n’ụlọ nsọ ahụ na-agbapụta obere obere ma jiri nke nta nke nta bụrụzie osimiri nke mere ka ihe ndị dị n’ala ahụ dịrị ndụ, ala ahụ ana-emekwa nri nke ọma (4). Anyị ga-ekwu gbasara ngọzi ndị a n’Isi nke 19 n’akwụkwọ a.

Jehova Chọrọ Otu Ihe n’Aka Mmadụ Niile

Nnukwu ọnụ ụzọ ámá ndị dị ná mpụta (5) na ndị dị n’ime (9) na-echetara anyị na Jehova chọrọ ka ndị niile na-efe ya ezigbo ofufe na-eme omume dị mma. Cheta na ọnụ ụzọ ámá ndị dị ná mpụta na ndị dị n’ime hà. Ihe a dabara adaba n’ihi na ọ bụ otu ihe ka Jehova chọrọ n’aka ndị niile na-efe ya n’agbanyeghị ọrụ onye nke ọ bụla na-arụ ma ọ bụ ebe ọ na-arụ.

Iri Nri na Tebụl Jehova

Ụlọ ndị a na-anọ eri ihe (8) na-echetara anyị na n’oge ochie, ndị Izrel nwere ike iri ụfọdụ n’ime ihe ndị ha wetara ka e jiri chụọ àjà n’ụlọ nsọ. E nwere ike ịsị na ha na Jehova na-erikọ nri. A naghị eme otú ahụ n’ụlọ nsọ ihe atụ, bụ́ ebe Ndị Kraịst na-efe Chineke taa, maka na a chụọla “otu àjà” maka mmehie. (Hib. 10:12) Ma, anyị na-achụrụ Chineke àjà otuto.—Hib. 13:15.

Nkwa Chineke Kwere Ga-emezurịrị

Ike nwere ike ịgwụ gị ma ị gụwa otú e si tụọ ọtụtụ ihe atụ̀ n’ọhụụ ahụ nakwa otú nke ọ bụla n’ime ha hà. Ma, e nwere ihe dị mkpa ha na-akụziri anyị. Ha na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emezurịrị ihe o bu n’obi, ya bụ, ime ka a maliteghachi ife ya ezigbo ofufe. E nweghịkwa ihe ga-agbanwe ya otú a na-enweghị ihe ga-agbanwe otú ihe ndị ahụ a tụrụ atụ̀ hà. Ezikiel ekwughị na ọ hụrụ mmadụ n’ọhụụ ahụ, ma o dere na Jehova dọsiri ndị nchụàjà, ndị isi, na ndị Izrel ndị ọzọ aka ná ntị ike. Ndị niile na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme ihe ọ chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme.