Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 16B

Ịka Ndị Na-asụ Ude Akara na Ịkụgbu Ndị Mmadụ—Mgbe Ọ Ga-eme na Otú Ọ Ga-esi Eme

Ịka Ndị Na-asụ Ude Akara na Ịkụgbu Ndị Mmadụ—Mgbe Ọ Ga-eme na Otú Ọ Ga-esi Eme

Ọhụụ e dere n’Ezikiel isi 9 ga-emezukwa n’oge anyị a. Ịghọta otú ihe ndị ahụ ga-esi emezu ga-eme ka anyị nwee obi ike ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso

“Ndị obi na-adịghị mma, ndị na-asụkwa ude”

MGBE Ọ GA-EME: N’oge ikpeazụ, tupu oké mkpagbu

OTÚ O SI EME: Ndị ji obi ha niile chọọ ife Chineke na-esi n’ihe ndị ha na-ekwu na ihe ndị ha na-eme egosi na ha kpọrọ ihe ọjọọ a na-eme n’ụwa a asị. Ha na-anabata ozi ọma a na-ekwusa, na-agbalị ịna-akpa àgwà ka Kraịst, mee baptizim iji gosi na ha enyefeela Jehova onwe ha, jirikwa obi ha niile na-akwado ụmụnna Kraịst

‘Ịka akara’

MGBE Ọ GA-EME: N’oge oké mkpagbu

OTÚ Ọ GA-ESI EME: Nwoke ji mpi ịnk odeakwụkwọ nọchiri anya Jizọs Kraịst mgbe ọ ga-abịa ikpe mba niile ikpe. A ga-aka ndị so ‘n’oké igwe mmadụ’ akara ma ọ bụ kpebie na ha bụ atụrụ. Ihe a ga-egosi na a ga-azọpụta ha n’agha Amagedọn

‘Ịkụgbu ndị mmadụ’

MGBE Ọ GA-EME: N’agha Amagedọn

OTÚ Ọ GA-ESI EME: Jizọs Kraịst ga-eduru ndị agha ya nọ n’eluigwe, ya bụ, ndị mmụọ ozi na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ya na ha ga-eso chịa, lụso ndị ajọ omume ọgụ ma bibie ha kpamkpam, mezie ka ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe nweta ụwa ọhụrụ