Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 10CH

Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ka Anyị Guzorokwa n’Ụkwụ Anyị

Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ka Anyị Guzorokwa n’Ụkwụ Anyị

Ọ BỤRỤ na anyị echebara ihe ọhụụ e dere n’Ezikiel 37:1-14 na-akụziri anyị echiche, okwukwe anyị ga-esikwu ike. Ihe a ọ na-akụziri anyị nwere ike inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka. Gịnị ka ọ bụ?

Oge ụfọdụ, nsogbu na ọnwụnwa ndị na-abịara anyị nwere ike ime ka ike gwụ anyị, ya esiere anyị ike ịna-efe Jehova. Ma n’ụdị oge a, okwukwe anyị ga-esikwu ike ma anyị chebara ihe Ezikiel kọwara ọ hụrụ n’ọhụụ a echiche. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Ọ bụ maka na ọhụụ ahụ na-akụziri anyị na Chineke, onye nwere ike ikunye ume ndụ n’ọkpụkpụ nwụrụ anwụ, nwekwara ike inye anyị ike anyị ga-eji merie nsogbu ndị na-abịara anyị, ma nsogbu ndị anyị chere na anyị agaghị emerili.—Gụọ Abụ Ọma 18:29; Fil. 4:13.

Ihe a na-echetara anyị na ọtụtụ narị afọ tupu oge Ezikiel, Mosis onye amụma kwuru na ọ bụghị naanị na Jehova nwere ike inyere ndị na-efe ya aka, kama ọ chọkwara ịna-enyere ha aka. Mosis dere, sị: “Chineke bụ ebe mgbaba kemgbe oge ochie. O ji ogwe aka ya na-adịru mgbe ebighị ebi na-akwado gị.” (Diut. 33:27) N’eziokwu, obi siri anyị ike na ọ bụrụ na anyị agakwuru Jehova Chineke n’oge nsogbu, ọ ga-eji ‘ogwe aka ya kwado’ anyị, kulite anyị, ma nyere anyị aka ka anyị guzorokwa n’ụkwụ anyị.—Ezik. 37:10.