Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 19B

Mmiri Na-agbapụta Obere Obere Ghọziri Iyi

Mmiri Na-agbapụta Obere Obere Ghọziri Iyi

Ezikiel hụrụ mmiri si n’ụlọ nsọ Jehova na-agbapụta obere obere ruo mgbe ọ bụzi nnukwu mmiri naanị n’ihe dị ka kilomita abụọ malite n’ebe o si na-agbapụta. N’akụkụ osimiri ahụ, ọ hụrụ ọmarịcha osisi ndị a na-eri mkpụrụ ha eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. Gịnị ka ihe a niile pụtara?

Osimiri nke Na-eweta Ngọzi

N’OGE OCHIE: Ozugbo ndị ahụ a dọọrọ n’agha lọtara n’obodo ha, Jehova gọziri ha mgbe ha maliteghachiri ife Jehova ezigbo ofufe n’ụlọ nsọ ya

N’OGE A: N’afọ 1919, a maliteghachiri ife Jehova ezigbo ofufe. Ihe a mere ka Jehova gọziwe ndị niile na-erubere ya isi nke ukwuu

N’ỌDỊNIHU: A lụchaa agha Amagedọn, ngọzi Jehova ga-eme ka ụmụ mmadụ zuo okè, meekwa ka ha na ya dị n’ezigbo mma

Mmiri nke Na-enye Ndụ

N’OGE OCHIE: Jehova gọziri ndị Juu na-erubere ya isi, ma mgbe ha nọ na-amụba. O mere ka ha na-efe ya ezigbo ofufe, ha na ya adịrịkwa ná mma

N’OGE A: Ka Jehova na-agọzikwu ndị ya, ha na ya ana-adịkwu ná mma, ọtụtụ ndị amụtala banyere Jehova ma soro na-efe ya ofufe otú ọ chọrọ

N’ỌDỊNIHU: Ọtụtụ nde mmadụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-esoro ndị agha Amagedọn na-agaghị egbu nweta ngọzi si n’aka Jehova nke ga-eju eju bara abara

Osisi na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa

N’OGE OCHIE: Jehova kụziiri ndị ya iwu ya ma mee ka ha fewe ya ezigbo ofufe mgbe ha lọtara n’obodo ha. O nyekwaara ha aka ka ha kwụsị ikpere arụsị na itinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ofufe rụrụ arụ

N’OGE A: Ọtụtụ eziokwu ndị dị na Baịbụl a na-akọwara ndị Chineke na-enyere ha aka ka ha na-erubere ya isi, na-ezere mmehie ndị dị oké njọ ma ghara ịna-akpa àgwà otú ọtụtụ ndị na-anaghị efe Chineke na-akpa

N’ỌDỊNIHU: Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ya na ha ga-eso chịa ga-enyere ụmụ mmadụ ndị na-erube isi aka ka ha zuo okè, ahụ́ esie ha ike, ha adịrịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi