Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 18A

Jehova Na-adọ Ndị Mmadụ Aka ná Ntị Maka Ọgụ Dị Egwu A Ga-alụ

Jehova Na-adọ Ndị Mmadụ Aka ná Ntị Maka Ọgụ Dị Egwu A Ga-alụ

E nwere ọtụtụ amụma e buru na Baịbụl gbasara ọgụ ikpeazụ a ga-alụ, nke Jehova ga-eji kpochapụ ndị na-emegide ya na ndị ya. E dere ụfọdụ amụma ndị ahụ n’ebe a. Chọpụta otú aka ná ntị ndị ahụ si yie ibe ha. Ị ga-ahụkwa na Jehova mere ka onye ọ bụla nwee ike ịnụ ozi ọma na ịgbanwe.

N’IZREL OGE OCHIE

EZIKIEL: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ka e jiri mma agha mee Gọg ihe n’ugwu m niile.’”—Ezik. 38:18-23.

JEREMAYA: “[Jehova] ga-eji aka ya kpee mmadụ niile ikpe. Ọ ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ndị ajọ omume.”—Jere. 25:31-33.

DANIEL: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze . . . malite ịchị. . . . Alaeze ahụ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa.”—Dan. 2:44.

N’OGE NDỊOZI JIZỌS

JIZỌS: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere.”—Mat. 24:21, 22.

PỌL: “Jizọs . . . na ndị mmụọ ozi ya dị ike . . . ga-abọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke.”—2 Tesa. 1:6-9.

PITA: “Ụbọchị Jehova ga-abịa otú onye ohi si abịa. . . . A ga-agbakwa ụwa na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya ọkụ.”—2 Pita 3:10.

JỌN: “Ogologo mma agha dị nkọ si n’ọnụ [Jizọs] pụta. Ọ ga-eji ya gbuo mba niile.”—Mkpu. 19:11-18.

N’OGE ANYỊ A

Baịbụl bụ akwụkwọ a kacha asụgharị ma na-ekesa ebe niile

NDỊ NA-EFE JEHOVA TAA . . .

  • Na-enye ndị mmadụ ọtụtụ nde akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ narị asụsụ

  • Na-eji ọtụtụ nde awa ekwusa ozi ọma kwa afọ