Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 4A

“M Nọ Na-ele Ndị Mmụọ Ozi Ahụ”

“M Nọ Na-ele Ndị Mmụọ Ozi Ahụ”

Ọ ga-abụrịrị na Ezikiel ahụtụla nnukwu oké ehi na ọdụm a kpụrụ akpụ, ndị nwere isi mmadụ nakwa nku, n’ebe ha kwụ ka ndị nche n’ihu obí eze na ụlọ arụsị dị iche iche. Ihe ndị ahụ a kpụrụ akpụ dị n’ọtụtụ ebe n’Asiria nakwa na Babịlonia oge ochie. Ọ na-afọ obere ka ụfọdụ n’ime ha ruo mita isii (amaụkwụ iri abụọ) n’ogo. Ha na-eyi egwu. O doro anya na ha riri Ezikiel na ndị ọzọ hụrụ ha ọnụ. N’agbanyeghị otú ihe ndị a si dị egwu, ha adịghị ndụ. Ha bụ nkume nkịtị.

Ma ndị mmụọ ozi anọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ “dị ndụ.” Ha dị nnọọ iche n’ihe ndị ahụ a kpụrụ akpụ. Ihe a Ezikiel hụrụ n’ọhụụ metụrụ ya n’ahụ́ nke na ọ kpọrọ ndị mmụọ ozi ahụ ‘ihe ndị dị ndụ,’ ọ dịkarịa ala ugboro asaa n’isi nke mbụ n’akwụkwọ Ezikiel. (Ihe ndị e dere n’ala ala peeji Ezik. 1:5-22.) Ọ ga-abụ na otú ndị mmụọ ozi anọ ahụ Ezikiel hụrụ n’okpuru ocheeze Chineke si na-agakọ ọnụ mere ka o doo ya anya na ọ bụ Jehova na-eduzi ihe niile o kere eke. Taa, ọhụụ ahụ na-emekwa ka o doo anyị anya na Jehova dị ike, bụrụkwa Onye ukwu na Ọkaakaa eluigwe na ụwa.—1 Ihe 29:11.