Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 2B

Oge Ihe Dị Iche Iche Mere ná Ndụ Ezikiel

Oge Ihe Dị Iche Iche Mere ná Ndụ Ezikiel

Ezikiel pụtara “Chineke Na-enye Ike.” Ọ bụ eziokwu na Ezikiel ji amụma ndị o buru dọọ ndị mmadụ aka ná ntị, ihe niile o dere dabara n’ihe aha ya pụtara. Ihe ndị ahụ mere ka okwukwe ndị chọrọ ife Chineke ezigbo ofufe sie ike.

NDỊ AMỤMA HA NA EZIKIEL DỊKỌRỌ NDỤ

  • JEREMAYA

    si n’ezinụlọ ndị nchụàjà. Ọ bụ na Jeruselem ka ọ kacha buo amụma (647-580 T.O.N.K.)

  • HỌLDA

    buru amụma n’oge a chọtara akwụkwọ Iwu Mosis n’ụlọ nsọ n’ihe dị ka afọ 642 T.O.N.K.

  • DANIEL

    si n’ezinụlọ ndị eze Juda. A kpọọrọ ya gaa Babịlọn n’afọ 617 T.O.N.K.

  • HABAKỌK

    buru amụma na Juda. Ọ ga-abụ na o buru ya obere oge Jehoyakim malitere ịchị

  • OBEDAYA

    buru amụma ihe a ga-eme Ịdọm. Ọ ga-abụ na o buru amụma n’oge e bibiri Jeruselem

OLEE MGBE HA BURU AMỤMA? (OGE A NIILE BỤ T.O.N.K.)

IHE NDỊ BỤ́ ISI MERE NÁ NDỤ EZIKIEL (OGE A NIILE BỤ T.O.N.K.)

  1. dk.643: Mgbe a mụrụ ya

  2. 617: A dọọrọ ya n’agha laa Babịlọn

  3. 613: Ọ malitere ibu amụma; Jehova mere ka ọ hụ ọhụụ

  4. 612: Ọ hụrụ ọhụụ ebe ndị hapụrụ Chineke nọ n’ụlọ nsọ na-efe arụsị

  5. 611: Ọ malitere ikwu ikpe a ga-ama Jeruselem

  6. 609: Nwunye ya nwụrụ. Ndị agha malitere ịnọchibido Jeruselem nke ikpeazụ ya

  7. 607: O nwetara ozi na e bibiela Jeruselem

  8. 593: Ọ hụrụ ụlọ nsọ n’ọhụụ

  9. 591: O buru amụma na Nebukadneza ga-alụso Ijipt agha. O dechara akwụkwọ ya

NDỊ EZE JUDA NA NDỊ EZE BABỊLỌN

  1. 659-629: Josaya nyeere ndị mmadụ aka ka ha fee Chineke otú kwesịrị ekwesị. Ma ọ nwụrụ mgbe ọ gara ịlụso Fero Niko agha

  2. 628: Jehoahaz bụ eze ọjọọ chịrị ọnwa atọ. Fero Niko nwụchiri ya

  3. 628-618: Jehoyakim bụ eze ọjọọ. Fero Niko mere ka Jehoyakim nọrọ n’okpuru ya

  4. 625: Nebukadneza meriri ndị agha Ijipt

  5. 620: Nebukadneza lụsoro Juda agha nke mbụ ya, meekwa Jehoyakim eze ga-anọ n’okpuru ya na Jeruselem

  6. 618: Jehoyakim nupụụrụ Nebukadneza isi. Ma ọ ga-abụ na ọ nwụrụ mgbe Nebukadneza bịara agha nke ugboro abụọ n’Ala Nkwa ahụ

  7. 617: Jehoyakin, onye a na-akpọkwa Jekonaya, bụ eze ọjọọ chịrị ọnwa atọ ma chịliere Nebukadneza aka elu

  8. 617-607: Zedekaya bụ eze ọjọọ, bụrụkwa onye ụjọ. Nebukadneza mere ya eze ga-anọ n’okpuru ya

  9. 609: Zedekaya nupụụrụ Nebukadneza isi. Nebukadneza lụsoziri Juda agha nke ugboro atọ ya

  10. 607: Nebukadneza bibiri Jeruselem. O jidere Zedekaya, rụkpọọ ya anya, kpụrụzie ya laa Babịlọn