Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 7B

Okwu Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ Dị n’Akwụkwọ Ezikiel

Okwu Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ Dị n’Akwụkwọ Ezikiel

“Nwa nke Mmadụ”

IHE KARỊRỊ UGBORO IRI ITOOLU

A kpọrọ Ezikiel “nwa nke mmadụ” ihe karịrị ugboro iri itoolu. (Ezik. 2:1) Jehova ji ya chetara Ezikiel na ọ bụ mmadụ nkịtị, n’agbanyeghị na e nyere ya nnukwu ọrụ. Ọ dịkwa mma ịmara na a kpọrọ Jizọs “Nwa nke mmadụ” ihe dị ka ugboro iri asatọ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ihe a gosiri na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ nnọọ mmadụ nkịtị. Ọ bụghị mmụọ ozi yi ahụ́ mmadụ.—Mat. 8:20.

“. . . Ga-amarakwa na M Bụ Jehova”

IHE KARỊRỊ UGBORO IRI ISE

N’akwụkwọ Ezikiel, Chineke gwara ndị mmadụ ihe karịrị ugboro iri ise na ha ‘ga-amarakwa na ya bụ Jehova.’ Jehova ji ihe a Ezikiel dere gosi na ọ bụ naanị ya ka e kwesịrị ife ezigbo ofufe.—Ezik. 6:7.

“Ọkaakaa Onyenwe Anyị Jehova”

UGBORO NARỊ ABỤỌ NA IRI NA ASAA

Okwu bụ́ “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova” gbara ugboro narị abụọ na iri na asaa (217). Ihe a mere ka aha Chineke pụta ìhè otú kwesịrị ekwesị, gosikwa na Jehova karịrị ihe niile e kere eke.—Ezik. 2:4.