IGBE 19A
Mmiri nke Nọchiri Anya Ngọzi Si n’Aka Jehova
Ka anyị leba anya n’ụfọdụ amaokwu Baịbụl ndị kwuru banyere “osimiri” ma ọ bụ “mmiri” nke nọchiri anya ngọzi si n’aka Jehova. Amaokwu ndị ahụ na-agba anyị ume n’ihi na ha na-eme ka anyị mata otú Jehova si agọzi anyị. Olee otú ha si eme ya?
JOEL 3:18 Amụma a kwuru banyere iyi nke si n’ụlọ Jehova na-asọpụta. Ọ na-ede “Ndagwurugwu Osisi Akeshịa,” bụ́ ebe kpọrọ nkụ. Ihe ọ pụtara bụ na Joel na Ezikiel hụrụ osimiri ndị na-eme ka ihe ndị dị n’ebe kpọrọ nkụ ha na-asọga dịrị ndụ. N’amụma abụọ ahụ, osimiri si n’ụlọ Jehova, ma ọ bụ n’ụlọ nsọ, na-asọpụta.
ZEKARAYA 14:8 Zekaraya onye amụma hụrụ “mmiri na-enye ndụ” nke si na Jeruselem na-asọpụta. Otu ọkara mmiri ahụ na-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ma ọ bụ Oké Osimiri Nnu, ọkara nke ọzọ ana-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ, ma ọ bụ Oké Osimiri Mediterenian. Jeruselem bụ “obodo Eze ukwu,” bụ́ Jehova Chineke. (Mat. 5:35) Obodo a Zekaraya kpọrọ aha na-echetara anyị na Jehova ga-achịwa ụwa niile n’ọdịnihu. O teela anyị ghọtara na mmiri e kwuru okwu ya n’amụma a na-egosi na Jehova ga-agọzi ụzọ ndị abụọ na-erubere ya isi na paradaịs. Ha bụ ndị na-agaghị anwụ n’oge oké mkpagbu na ndị a ga-emecha kpọlite n’ọnwụ.
MKPUGHE 22:1, 2 Jọn onyeozi hụrụ mmiri ihe atụ nke yiri mmiri Ezikiel hụrụ. Ma, e nwere ihe dịtụ iche na nke a. Ọ bụ n’ocheeze Jehova ka o si na-asọpụta, ọ bụghị n’ụlọ nsọ. N’ihi ya, o yiri ka ọhụụ a na-ekwu banyere ngọzi ga-esi n’aka Jehova bịa mgbe Kraịst ga-achị otu puku afọ.
N’agbanyeghị na e nwere ihe dịtụ iche ná ngọzi ọchịchị Jehova na-agọzi ndị mmadụ na ngọzi osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ nọchiri anya ya, ha niile si n’aka Jehova. Ọ bụkwa ndị niile na-erubere ya isi na-enweta ya.
ABỤ ỌMA 46:4 Ị̀ hụrụ na o yiri ka amaokwu a ò kwuru ihe abụọ dị mkpa, ya bụ, ofufe na ọchịchị? Amaokwu a kwuru na e nwere osimiri nke na-eme ka ndị bi “n’obodo Chineke” ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-abụ na obodo a pụtara Alaeze Chineke na ọchịchị ya, ọ ga-abụkwa na “nnukwu ụlọikwuu nke Onye Kacha Elu” pụtara ezigbo ofufe.
Amaokwu ndị a na-eme ka obi sie anyị ike na e nwere ụzọ abụọ Jehova ga-esi agọzi ndị mmadụ na-erubere ya isi. Nke mbụ bụ na ọchịchị ya ga-abara anyị uru ruo mgbe ebighị ebi, nke abụọ abụrụ na ezigbo ofufe anyị na-efe ya ga-abakwara anyị uru ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ugbu a na anyị ga na-agbasi mbọ ike na-eme ihe ga-eme ka Jehova Chineke na Ọkpara ya na-enye anyị “mmiri na-enye ndụ,” ya bụ, ihe ọma niile ha na-enye anyị ka anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.—Jere. 2:13; Jọn 4:10.