Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 20A

Otú E Si Kee Ala Ahụ

Otú E Si Kee Ala Ahụ

Otú e si gwa ndị Izrel a dọọrọ n’agha kpọmkwem ebe ndị ga-abụ ókè ala ha mere ka obi sie ha ike na ha ga-alaghachi n’obodo ha. Gịnị na gịnị ka ọhụụ a na-akụziri anyị taa? Ka anyị leba anya n’ihe abụọ e kwuru na ya:

Onye ọ bụla nwere ebe bụ́ nke ya, nweekwa ọrụ bara uru

Onye ọ bụla n’ime ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta ga-enwe ebe a ga-ekenye ya n’Ala Nkwa ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Onye ọ bụla n’ime ndị niile na-efe Jehova so nweta ala. Onye ọ bụla n’ime anyị, ma onye ukwu ma onye nta, nwechara ebe bụ́ nke ya n’ala ahụ, nweekwa ọrụ bara uru. Jehova ji ndị niile na-efe ya kpọrọ ihe. N’anya ya, e nweghị onye ka ibe ya.

Ala ha ga-enweta ga-aha nhata

Ọhụụ Ezikiel hụrụ gosiri na ebo nke ọ bụla ga na-enweta akụ̀ ndị Ala Nkwa ahụ ga na-emepụta. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Jehova na-agọzi ndị niile na-efe ya n’ala o nyere ha.