Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IGBE 13A

Ụlọ Nsọ Abụọ Dị Iche na Ihe Ha Na-akụziri Anyị

Ụlọ Nsọ Abụọ Dị Iche na Ihe Ha Na-akụziri Anyị

Ụlọ Nsọ Ezikiel Hụrụ n’Ọhụụ:

  • Ọ bụ ndị Juu a dọọrọ n’agha nọ na Babịlọn ka Ezikiel kọọrọ ya

  • O nwere ebe ịchụàjà a na-achụ ọtụtụ àjà na ya

  • O mere ka a mata otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya

  • Ọ na-echetara anyị na e mere ka ndị Chineke maliteghachi ife ya ezigbo ofufe n’afọ 1919

Nnukwu Ụlọ Nsọ Ihe Atụ:

  • Ọ bụ Pọl kọwaara ya Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru

  • O nwere ebe ịchụàjà nke a chụrụ àjà “naanị otu ugboro” na ya (Hib. 10:10)

  • O mere ka a mata ihe ụlọikwuu na ụlọ nsọ e nwere n’oge ochie nọchiri anya ya. Ha nọchiri anya ihe niile Jehova haziri ka e nwee ike na-efe ya ezigbo ofufe. Ọ bụ àjà mgbapụta Kraịst chụrụ mere ka ihe niile a nwee isi

  • Ọ na-echetara anyị ọrụ Kraịst, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà Ka Ukwuu, rụrụ malite n’afọ 29 ruo 33 O.N.K.