Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Anyị Ghọtakwuru

Ihe Ndị Anyị Ghọtakwuru

Kemgbe ọtụtụ afọ, a gbanweela otú anyị sibu ghọta ọtụtụ amụma Ezikiel buru. E dekwara ihe ndị a gbanwere n’Ụlọ Nche. N’akwụkwọ a bụ́ A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ a gbanwere otú anyị sibu ghọta ha. Lee ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a.

Gịnị ka ihu ndị mmụọ ozi anọ ahụ nọchiri anya ya?

Otú anyị sibu ghọta ya: Nke ọ bụla n’ime ihu anọ nke ndị mmụọ ozi ahụ, ma ọ bụ ndị cherob ahụ, nọchiri anya otu n’ime àgwà anọ bụ́ isi e ji mara Jehova.

Otú anyị sizi ghọta ya: Ọ bụ eziokwu na nke ọ bụla n’ime ihu anọ ndị mmụọ ozi ahụ nọchiri anya otu n’ime àgwà anọ bụ́ isi e ji mara Jehova, ihu anọ niile ahụ nọchiri anya àgwà niile Jehova nwere. Ihu anọ ahụ na-echetakwara anyị na Jehova dị nnọọ ebube, nweekwa ike na-enweghị atụ.

Ihe mere e ji gbanwee ya: Na Baịbụl, e kwuo na ihe dị anọ, ọ na-apụtakarị na ihe ahụ zuru ezu ma ọ bụ na e nweghị ihe a gụpụrụ na ya. N’ihi ya, ihu anọ niile ahụ anaghị anọchi anya naanị àgwà anọ e ji mara Chineke, kama ha bụ àgwà ndị e ji tọọ ntọala ọmarịcha àgwà ndị ọzọ e ji mara Jehova. Ihe ọzọ bụ na nke ọ bụla n’ime ha niile bụ ihu ihe na-anọchi anya ebube, ike, na ume. N’agbanyeghị ya, ndị cherob anọ ahụ, ndị dị ebube, ndị nwere ihu anọ ihu anọ, nọcha n’okpuru ocheeze Jehova. Ihe a gosiri na Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa, Onye na-achị onye ọ bụla.

Ònye ka nwoke ahụ ji mpi ịnk odeakwụkwọ nọchiri anya ya?

Otú anyị sibu ghọta ya: Nwoke ahụ ji mpi ịnk nọchiri anya ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ. Ndị e tere mmanụ ji ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na-aka ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ akara ihe atụ.—Mkpu. 7:9.

Otú anyị sizi ghọta ya: Nwoke ahụ ji mpi ịnk odeakwụkwọ nọchiri anya Jizọs Kraịst. Ọ ga-aka ndị so n’oké ìgwè mmadụ akara n’oge “oké mkpagbu” mgbe a ga-ekpe ha ikpe ma kpebie na ha bụ atụrụ.—Mat. 24:21.

Ihe mere e ji gbanwee ya: Jehova nyefere ikpe niile n’aka Ọkpara ya. (Jọn 5:22, 23) Matiu 25:31-33 kwuru na ọ bụ Jizọs ga-ekpe ikpe ikpeazụ, kpebie ndị bụ́ “atụrụ” na ndị bụ́ “ewu.”

Ohola na Oholiba, ụmụnne abụọ bụ́ ndị akwụna, hà nọchiri anya Ndị Kraịst adịgboroja, karịchaa, Chọọchị Katọlik na ndị nke Protestant?

Otú anyị sibu ghọta ya: Ohola (ya bụ, Sameria, isi obodo Izrel) bụ nke nnukwu. Ọ nọchiri anya Chọọchị Katọlik. Oholiba (ya bu, Jeruselem, isi obodo Juda) bụ nke obere. Ọ nọchiri anya chọọchị ndị nke Protestant.

Otú anyị sizi ghọta ya: Ụmụnne abụọ a bụ́ ndị akwụna anọchighị anya nke ọ bụla n’ime chọọchị Ndị Kraịst adịgboroja. Kama, akụkọ ha na-akụziri anyị otú obi na-adị Jehova mgbe ndị nọbu na-erubere ya isi kwụsịrị ife ya fewe chi ọzọ. Ọ naghị ele okpukpe ụgha ọ bụla anya ọma.

Ihe mere e ji gbanwee ya: E nweghị ihe ọ bụla Baịbụl kwuru gosiri na Ohola na Oholiba nọchiri anya Ndị Kraịst adịgboroja. E nwere mgbe Izrel na Juda bụ ndị nwunye Jehova, ma e nweghị mgbe e nwere ike ikwu na Ndị Kraịst adịgboroja bụ nwunye Jehova. Ihe ọzọ bụ na mgbe e ji ndị Chineke, bụ́ ndị nupụụrụ ya isi, tụnyere ndị akwụna n’Ezikiel isi 16 na isi 23, e kwuru na a ka nwere olileanya na ha ga-agbanwe, ha na Chineke adịrịkwa ná mma. Ma, Ndị Kraịst adịgboroja, bụ́ ndị so na Babịlọn Ukwu ahụ, enweghị ụdị olileanya a.

Ndị Kraịst adịgboroja hà nọchiri anya Jeruselem oge ochie?

Otú anyị sibu ghọta ya: Ndị Kraịst adịgboroja nọchiri anya ndị bi na Jeruselem, ndị nupụụrụ Chineke isi. N’ihi ya, mbibi e bibiri Jeruselem nọchiri anya mbibi a ga-ebibi Ndị Kraịst adịgboroja.

Otú anyị sizi ghọta ya: Ihe ndị bi na Jeruselem na-enupụrụ Chineke isi nọ na-eme, ma ikpere arụsị ma ime mpụ, na-echetara anyị ihe Ndị Kraịst adịgboroja na-eme taa. Ma, anyị anaghịzi ekwu na Ndị Kraịst adịgboroja nọchiri anya Jeruselem oge ochie.

Ihe mere e ji gbanwee ya: E nweghị ihe doro anya Baịbụl kwuru mere a ga-eji kwuo na Ndị Kraịst adịgboroja nọchiri anya Jeruselem oge ochie. E nwere mgbe ndị bi na Jeruselem fere Chineke ezigbo ofufe tupu ha efewezie chi ọzọ. Ma, e nwebeghị mgbe Ndị Kraịst adịgboroja fere Chineke ezigbo ofufe. E nwekwara mgbe Jehova gbaghaara ndị bi na Jeruselem, ma Chineke agaghị agbaghara Ndị Kraịst adịgboroja.

Olee otú ọhụụ ọkpụkpụ kpọrọ nkụ Ezikiel hụrụ na ndagwurugwu si mezuo?

Otú anyị sibu ghọta ya: N’afọ 1918, a dọọrọ ndị e tere mmanụ a nọ na-akpagbu n’agha laa Babịlọn Ukwu ahụ. N’oge ahụ, ha dịzi ka ndị nwụrụ anwụ, ọ fọkwara obere ka ọrụ ha kwụsịchaa. Ha anọteghị aka n’ebe ahụ a dọọrọ ha n’agha. Ha si n’ebe ahụ lọta n’afọ 1919 mgbe Jehova mere ka ha dịrị ndụ, ha amalite ikwusa ozi ọma Alaeze.

Otú anyị sizi ghọta ya: Ọ bụ ọtụtụ afọ tupu afọ 1918 ka a dọọrọ ndị Chineke n’agha, ha nọkwa ka ndị nwụrụ anwụ n’ebe ahụ ruo ogologo oge. Ọ bụ mgbe afọ 100 O.N.K. gachara ka a dọọrọ ha n’agha. A tọhapụrụ ha n’afọ 1919. Ogologo oge a dabara n’ogologo oge ọ ga-ewe ọka wit na ata Jizọs ji mee ihe atụ itokọ.

Ihe mere e ji gbanwee ya: Ndị Izrel oge ochie nọrọ ọtụtụ afọ n’ebe a dọọrọ ha n’agha, malite n’afọ 740 T.O.N.K. ruo n’afọ 537 T.O.N.K. Amụma Ezikiel kwuru na ọkpụkpụ ndị ahụ “kpọrọ nkụ” ma ọ bụ na ha “kpọrọ ezigbo nkụ.” Ihe a gosiri na o teela ndị ọkpụkpụ ahụ nọchiri anya ha nwụrụ. E kwukwara na ọkpụkpụ ndị ahụ ga-eji nwayọọ nwayọọ dịghachi ndụ, ọ ga-ewekwa oge.

Gịnị ka ijikọta osisi abụọ ọnụ pụtara?

Otú anyị sibu ghọta ya: Ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, adịghị n’otu n’oge Agha Ụwa Mbụ. Ma mgbe obere oge gafere, ha dịghachiri n’otu n’afọ 1919.

Otú anyị sizi ghọta ya: Amụma a na-akụziri anyị na Jehova ga-eme ka ndị na-efe ya bụrụ otu. Mgbe afọ 1919 gachara nakwa ka oge nọ na-aga, ọtụtụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa nọ na-esonyere ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ. Ụzọ ndị abụọ a na-efekọ Jehova ọnụ.

Ihe mere e ji gbanwee ya: Amụma a ekwughị gbasara otu osisi a gbajiri abụọ, mechazie jikọta ha ọnụ. N’ihi ya, amụma a anaghị ekwu gbasara otu ndị a ga-ekewa abụọ, e mechazie e mee ka ha dịghachi n’otu. Kama, ọ na-ekwu otú ụzọ ndị abụọ dị iche ga-esi bụrụ otu.

Ònye bụ Gọg onye Megọg?

Otú anyị sibu ghọta ya: Gọg onye Megọg bụ aha a kpọrọ Setan mgbe a chụpụchara ya n’eluigwe.

Otú anyị sizi ghọta ya: Gọg onye Megọg bụ mba dị iche iche ndị ga-agbakọ aka ọnụ lụso ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe ọgụ n’oge oké mkpagbu.

Ihe mere e ji gbanwee ya: Ihe e kwuru gbasara Gọg n’amụma ahụ, ya bụ, na nnụnụ na-eri anụ ga-eji ya mere anụ oriri nakwa na a ga-enye ya otu ebe a na-eli ozu n’ụwa gosiri na Gọg abụghị mmụọ. Ihe ọzọ bụ na ọgụ Gọg ga-alụso ndị Chineke yikwara ọgụ akwụkwọ Daniel na Mkpughe kwuru na mba dị iche iche ga-alụso ndị Chineke.—Dan. 11:40, 44, 45; Mkpu. 17:14; 19:19.

Ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ, nke e dukwa ya gagharịa na ya, ọ̀ bụ nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Pọl mechara kọwaa?

Otú anyị sibu ghọta ya: Ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na ụlọ nsọ ihe atụ Pọl onyeozi kọwara bụ otu.

Otú anyị sizi ghọta ya: Ihe Ezikiel hụrụ abụghị ụlọ nsọ ihe atụ nke malitere n’afọ 29, kama, ọhụụ ọ hụrụ gosiri otú ndị Izrel kwesịrị isi na-efe Chineke ezigbo ofufe otú Iwu Mosis kwuru ma ha si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta. Ihe Pọl lekwasịrị anya mgbe o si n’ike mmụọ nsọ na-akọwa ụlọ nsọ ihe atụ ahụ bụ ọrụ Jizọs, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà Ka Ukwuu, rụrụ malite n’afọ 29 ruo n’afọ 33. E kwughị banyere nnukwu onye nchụàjà n’ọhụụ Ezikiel hụrụ ụlọ nsọ, kama, ọhụụ ahụ na-echetara anyị na e mere ka ndị Chineke maliteghachi ife ya ezigbo ofufe n’afọ 1919. N’ihi ya, anyị anaghịzi ekwu na ihe niile Ezikiel hụrụ n’ụlọ nsọ n’ọhụụ nakwa otú e si tụọ ihe ndị dị na ya atụ̀ nwere ihe ha nọchiri anya ha. Kama, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’isi ihe ọhụụ Ezikiel hụrụ na-akụziri anyị gbasara otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya ezigbo ofufe.

Ihe mere e ji gbanwee ya: Ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na ụlọ nsọ ihe atụ ahụ dị nnọọ iche. E nwere ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ mere ha ji dị iche. Dị ka ihe atụ, e ji ọtụtụ anụmanụ chụọ àjà n’ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ. Ma n’ụlọ nsọ ihe atụ, ọ bụ naanị otu àjà ka a chụrụ “naanị otu ugboro.” (Hib. 9:11, 12) Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ narị afọ tupu Kraịst abịa, Jehova achọbeghị ka a mata eziokwu miri emi gbasara ụlọ nsọ ihe atụ ahụ.