Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 1

“Ọ Bụ Jehova Bụ́ Chineke Gị Ka I Kwesịrị Ife Ofufe”

“Ọ Bụ Jehova Bụ́ Chineke Gị Ka I Kwesịrị Ife Ofufe”

MATIU 4:10

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe mere e ji kwesị ịmaliteghachi ife ezigbo Chineke

1, 2. Olee otú Jizọs si bịa n’ala ịkpa Judia n’ihe dị ka ngwụcha Ọktoba ma ọ bụ mbido Nọvemba afọ 29? Oleekwa ihe mere ya n’ebe ahụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

 N’IHE dị ka ngwụcha Ọktoba ma ọ bụ mbido Nọvemba afọ 29 O.N.K., Jizọs nọ n’ala ịkpa Judia. Ebe a dị nso n’ebe ugwu Oké Osimiri Nnu. Ọ bụ okwute okwute na ndagwurugwu ndagwurugwu. Ọ bụ mmụọ nsọ du Jizọs bịa ebe a ozugbo e mechara ya baptizim, teekwa ya mmanụ. Ọ nọọla ụbọchị iri anọ n’ebe a, na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere ma na-atụgharị uche. O nwere ike ịbụ na Jehova gwara Ọkpara ya okwu n’oge a iji kwadebe ya maka ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya.

2 Ọ bụ n’oge a ike gwụchara Jizọs maka na agụụ ji ya aka ọjọọ ka Setan bịakwutere ya. Ihe mechaziri mee mere ka anyị ghọta na e nwere okwu dị mkpa nke gbasara onye ọ bụla chọrọ ife Chineke ezigbo ofufe, ma gịnwa.

“Ọ Bụrụ na Ị Bụ Ọkpara Chineke . . . ”

3, 4. (a) Olee ihe mbụ Setan kwuru n’ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ ọ nwara Jizọs? Oleekwa ihe ọ ga-abụ na ọ chọrọ ime ka Jizọs chewe? (b) Olee otú Setan si esiri ndị mmadụ ụdị ọnyà ahụ taa?

3 Gụọ Matiu 4:1-7. Setan ji aghụghọ bịa n’ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ ọ nwara Jizọs. Ọ sịrị Jizọs: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke.” Ọ̀ bụ na o doghị Setan anya na Jizọs bụ Ọkpara Chineke? N’eziokwu, Setan a, onye bụ́bu otu n’ime ụmụ Chineke, ma na Jizọs bụ onye mbụ Chineke kere. (Kọl. 1:15) O dokwara anya na Setan ma na Jehova si n’eluigwe gwa Jizọs n’oge e mere ya baptizim, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:17) Ma, ọ ga-abụ na Setan chọrọ ime ka Jizọs chewe ma Nna ya ọ̀ hụkwara ya n’anya n’eziokwu ma ọ bụkwanụ ma ò kwesịrị ịtụkwasị Nna ya obi. N’ọnwụnwa nke mbụ ọ nwara Jizọs ka o mee ka nkume ghọọ achịcha, ihe ọ na-ajụ Jizọs bụ: ‘Ebe ị bụ Ọkpara Chineke, gịnị mere na Nna gị enyeghị gị nri n’ala ịkpa a?’ N’ọnwụnwa nke abụọ ọ nwara Jizọs ka o si n’elu ihe a rụbichiri n’elu ụlọ nsọ wụda, ihe ọ na-ajụ Jizọs bụ: ‘Ebe ị bụ Ọkpara Chineke, obi ọ̀ kara gị na Nna gị ga-echebe gị?’

4 Setan na-esiri ndị mmadụ ụdị ọnyà ahụ taa. (2 Kọr. 2:11) Ọ na-echere ruo mgbe ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe dara mbà ma ọ bụ mgbe ike gwụrụ ha, ya anwaa ha ọnwụnwa. Ọtụtụ mgbe, ọ na-eji aghụghọ abịa. (2 Kọr. 11:14) Ọ na-agbalị ime ka anyị kweta na Jehova emekataghị hụ anyị n’anya ma ọ bụ nwee mmasị n’ebe anyị nọ. Onye ọnwụnwa ahụ na-achọ ime ka anyị kweta na anyị ekwesịghị ịtụkwasị Jehova obi, na ọ gaghị emezu nkwa ndị o kwere anyị n’Okwu ya. Ma ihe ndị a ọ na-ekwu bụ okpookpo ụgha. (Jọn 8:44) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ekwetaghị ụgha ndị ahụ?

5. Gịnị ka Jizọs mere mgbe a nwara ya ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ?

5 Ka anyị leba anya n’ihe Jizọs mere mgbe a nwara ya ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ. Obi siri Jizọs ezigbo ike na Nna ya hụrụ ya n’anya, o jikwa obi ya niile tụkwasị Nna ya obi. Jizọs kwuru ihe dị n’Okwu Nna ya, jiri ya gosi Setan ozugbo na ya ekwetaghị ụgha ya. Ọ dabara nnọọ adaba na aha Chineke, bụ́ Jehova, dị n’amaokwu ndị Jizọs ji zaa Setan okwu. (Diut. 6:16; 8:3) Otú a Ọkpara Chineke si kpọọ ezigbo aha Nna ya gosiri n’eziokwu na ọ tụkwasịrị Nna ya obi n’ihi na aha ahụ na-egosi na Jehova ga-emezurịrị nkwa ọ bụla o kwere. a

6, 7. Olee otú anyị ga-esi merie ọnwụnwa Setan?

6 Anyị ga-emerili ọnwụnwa Setan ma anyị tụkwasị Okwu Jehova obi nakwa ma anyị na-echebara ihe aha Chineke pụtara echiche. Baịbụl gwara anyị na Jehova hụrụ ndị na-efe ya n’anya, na-echekwa gbasara ha, ma ndị nke obi gbawara. Ọ bụrụ na anyị ekweta na anyị so ná ndị Jehova bu n’obi kwuo ihe ndị a na Baịbụl, anyị agaghị ekweta ụgha Setan na-agha na Jehova emekataghị hụ anyị n’anya. (Ọma 34:18; 1 Pita 5:8) Ọ bụrụkwa na anyị ana-echeta na Jehova na-emezu ihe aha ya pụtara, anyị ga-eji obi anyị niile tụkwasị ya obi na ọ ga-emezu nkwa niile o kwere.—Ilu 3:5, 6.

7 Ma gịnị mere Setan ji anwa anyị? Ọ̀ bụ gịnị ka ọ na-achọ? Ọnwụnwa nke atọ Setan nwara Jizọs mere ka a mata azịza ajụjụ ndị a.

“Daa n’Ala Fee M Ofufe”

8. N’ọnwụnwa nke atọ Setan nwara Jizọs, olee otú o si gosi ihe ọ chọrọ?

8 Gụọ Matiu 4:8-11. N’ọnwụnwa nke atọ Setan nwara Jizọs, o kwuru hoo haa ihe ọ chọrọ, kama ịgbawa okwu gburugburu. Setan gosiri Jizọs “alaeze niile nke ụwa na ebube ha” (o nwere ike ịbụ n’ọhụụ). Ma, o gosighị ya ihe ndị na-adịghị mma na ya. Ọ sịziri Jizọs: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.” b Ihe Setan chọrọ bụ ofufe. Ọ chọrọ ka Jizọs hapụ Nna ya werezie yanwa bụ́ Setan ka chi ya. Ihe Setan chọrọ inye Jizọs yiri ihe ga-eme ka ihe dịrị Jizọs mfe. Ihe ọ na-ekwu bụ na ya ga-enye Jizọs ikike niile na akụnụba niile dị n’ụwa nakwa na Jizọs agaghị ata ahụhụ ọ bụla. A gaghị ekpuwe ya okpu ogwu, a gaghị apịa ya ụtarị, a gaghịkwa akpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ. Ọ bụghị egwuregwu ka Setan na-egwu. Jizọs makwa na ọ bụ Setan ka ọchịchị niile dị n’ụwa dị n’aka. (Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19) N’eziokwu, Setan ga-achọ inye Jizọs ihe ọ bụla ga-emeli ka Jizọs hapụ ife Nna ya ezigbo ofufe.

9. (a) Gịnị ka Setan chọrọ ka ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe mee? Oleekwa otú o si anwa anyị? (b) Gịnị na gịnị bụ ofufe? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Gịnị Bụ Ofufe?”)

9 Taa, Setan chọkwara ka anyị fewe ya, ma ànyị ma ụma na-efe ya ma ọ̀ bụ na anyị amaghị ụma. Ebe ọ bụ “chi nke oge a,” ọ bụ ya ka ofufe ndị nọ n’okpukpe niile so na Babịlọn Ukwu ahụ na-agara. (2 Kọr. 4:4) Ma ofufe ọtụtụ ijeri mmadụ ndị na-ekpe okpukpe ụgha na-efe ya ezurughị ya. Ọ chọrọ ka ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe nupụrụ Chineke isi. Ọ na-anwa anyị ka anyị chụwa akụnụba, bụrụkwa ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ụwa kama ịgbawa mbọ ka anyị na-ebi ndụ otú Ndị Kraịst kwesịrị ibi, nke nwere ike ime ka anyị ‘taa ahụhụ n’ihi na anyị na-eme ihe dị mma.’ (1 Pita 3:14) Ọ bụrụ na Setan anwata anyị, anyị ahapụ ife Chineke ezigbo ofufe sorozie ụwa Setan, ọ pụtara na anyị na-akpọrọ Setan isiala, na-efe ya ma jiri ya mere chi. Olee otú anyị ga-esi merie ụdị ọnwụnwa a?

10. Gịnị ka Jizọs mere mgbe Setan nwara ya ọnwụnwa nke atọ? Gịnị mere o ji mee otú ahụ?

10 Legodị ihe Jizọs mere mgbe Setan nwara ya ọnwụnwa nke atọ. Jizọs gosiri na ya jisiri Jehova aka ike. Ọ chụpụrụ Onye ọnwụnwa ahụ ozugbo, sị ya: “Si ebe a pụọ, Setan!” Jizọs meziri ihe o meburu n’ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ. O kwuru ihe dị n’akwụkwọ Diuterọnọmi, n’ebe aha Chineke gbara. Ọ sịrị: “E dere, sị: ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.’” (Mat. 4:10; Diut. 6:13) Jizọs si otú a gosi na ya achọghị ịbụ onye ukwu n’ụwa a, nke ọ na-agaghịkwanụ abụ ogologo oge, n’agbanyeghị na ọ gaara eme ka ọ ghara ịta ahụhụ o mechara taa. Ọ ghọtara na ọ bụ naanị Nna ya ka e kwesịrị ife ofufe, ghọtakwa na ọ bụrụgodị na ya efee Setan naanị otu ugboro, ọ pụtara na ọ bụzi Setan ka ọ na-erubere isi. Jizọs kpebisiri ike na ya agaghị eme Onye ọnwụnwa ahụ chi ya. Ebe ọ bụ na Jizọs emeghị ihe Ekwensu chọrọ, ‘Ekwensu hapụrụ ya.’ c

“SI EBE A PỤỌ, SETAN!” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

11. Olee otú anyị nwere ike isi merie Setan na ọnwụnwa ya?

11 Ọ bụ anyị ga-ekpebi ma ànyị ga-emeri ọnwụnwa ụwa ọjọọ Setan na-anwa anyị, otú Jizọs mere. Jehova nyere anyị onyinye magburu onwe ya, ya bụ, ikike ikpebiri onwe anyị ihe anyị chọrọ ime. N’ihi ya, e nweghị onye nwere ike ịmanye anyị ka anyị kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe. Onye ọnwụnwa ahụ enweghịdị ike ịmanye anyị, n’agbanyeghị na ọ bụ mmụọ na-akpa ike. Ọ bụrụ na anyị ‘alụsosie Setan ọgụ ike, siekwa ike n’okwukwe,’ ihe anyị na-asị ya bụ: “Si ebe a pụọ, Setan!” (1 Pita 5:9) Cheta na mgbe Setan hapụrụ Jizọs bụ mgbe Jizọs jirila obi ike gosi na ya achọghị ya. Baịbụl gwakwara anyị, sị: “Na-alụsonụ Ekwensu ọgụ. Ọ ga-esikwa ebe unu nọ gbapụ.”—Jems 4:7.

Ọ bụ anyị ka ọ dị n’aka ikpebi ma ànyị ga-emeri ọnwụnwa ụwa ọjọọ Setan na-anwa anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11, 19)

Onye Iro nke Na-achọghị Ka E Fee Chineke Ezigbo Ofufe

12. Olee otú Setan si gosi n’Iden na ọ bụ ya bụ onye iro na-achọghị ka e fee Chineke ezigbo ofufe?

12 Ọnwụnwa ikpeazụ Setan nwara Jizọs gosiri na ọ bụ ya bụ onye iro mbụ na-achọghị ka e fee Chineke ezigbo ofufe. Ọtụtụ puku afọ gara aga, Setan nọ n’ogige Iden gosi nke mbụ ya na ofufe a na-efe Jehova adịghị ya mma n’obi. N’ihi ya, o duhiere Iv, Iv emezie ka Adam nupụrụ Jehova isi. Setan si otú a chịwazie ha ma na-agwa ha ihe ha na-eme. (Gụọ Jenesis 3:1-5; 2 Kọr. 11:3; Mkpu. 12:9) N’eziokwu, Setan ghọrọ chi ha, ha abụrụ ndị na-efe ya, n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ha amachaghị onye na-eduhie ha. Mgbe Setan mere ka e nupụrụ Chineke isi, ihe o mere abụghị naanị ịma ọchịchị Chineke aka ma ọ bụ ikwu na ọ bụghị Chineke kwesịrị ịchị, ọ gbakwara ofufe Chineke mgba okpuru. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

13. Olee otú okwu gbasara onye kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa si gbasa onye e kwesịrị ife ofufe?

13 Okwu gbasara onye kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa gbasakwara onye e kwesịrị ife ezigbo ofufe. Ọ bụ naanị Ọkaakaa eluigwe na ụwa, ya bụ, Onye “kere ihe niile,” ka e kwesịrị ife ofufe. (Mkpu. 4:11) Mgbe Jehova kere Adam na Iv, ha zuru okè, o mekwara ka ha biri n’ogige Iden. O bu n’obi na ụmụ mmadụ zuru okè ga-emecha ju ụwa niile nakwa na ha ga-eji obi ha niile na-efe ya ezigbo ofufe. (Jen. 1:28) Ma Setan mara ọchịchị Jehova aka maka na ọ chọrọ ka e nye ya ihe e kwesịrị inye naanị Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ́ Jehova, ya bụ, ka e fewe ya.—Jems 1:14, 15.

14. Setan ò meliri ka a kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe? Kọwaa.

14 Ihe a Setan mere ò mere ka a kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe? O nwetara Adam na Iv, ha akwụsị ife Chineke. Kemgbe ahụ, ọ nọ na-agba ofufe Chineke mgba okpuru, na-agbalị ka onye ọ bụla o nwere ike inweta kwụsị ife Jehova Chineke. Tupu oge Ndị Kraịst, Setan nọkwa na-anwa ndị na-efe Jehova ka ha kwụsị ife Jehova. N’oge ndịozi Jizọs, o si n’aka ndị bụ́bu Ndị Kraịst mebie ọgbakọ Ndị Kraịst, ya adịzie ka à ga-asị na e nweghịzi ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe. (Mat. 13:24-30, 36-43; Ọrụ 20:29, 30) Malite n’oge ndịozi Jizọs nwụchara (ihe dị ka otu puku afọ na narị itoolu [1,900] gara aga), Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, dọọrọ ndị na-efe Chineke n’agha. Ma Setan emebibeghị ihe Chineke bu n’obi gbasara ife ya. E nweghị ihe nwere ike ime ka Chineke ghara imezu ihe o bu n’obi. (Aịza. 46:10; 55:8-11) Okwu a gbasara aha Jehova, ọ na-emezukwa ihe aha ya pụtara mgbe niile. E nweghị mgbe ọ na-anaghị emezu ihe o bu n’obi.

Onye Na-agbachitere Ofufe Chineke

15. Gịnị na gịnị ka Jehova mere n’Iden iji lebara ndị ahụ nupụụrụ ya isi anya nakwa iji hụ na uche ya mezuru?

15 Ozugbo e nupụụrụ Jehova isi n’ogige Iden, o lebaara ndị ahụ nupụụrụ ya isi anya, meekwa ihe ozugbo iji hụ na uche ya mezuru. (Gụọ Jenesis 3:14-19.) Mgbe Adam na Iv ka nọdị n’ogige Iden, Jehova mara ha na Setan ikpe. Onye o bu ụzọ maa ikpe bụ Setan, onye bu ụzọ nupụrụ ya isi, ya amazie Iv, maakwa Adam. Mgbe Jehova na-ama Setan ikpe, bụ́ onye Adam na Iv na-enweghị ike ịhụ anya, Jehova buru amụma na a ga-amụ “nwa” ga-edozi nsogbu niile nnupụisi ahụ kpatara. “Nwa” ahụ e kwere ná nkwa ga-arụ ọrụ bara ezigbo uru iji hụ na e mezuru ihe Chineke bu n’obi gbasara ife ya ezigbo ofufe.

16. Mgbe e nupụchaara Jehova isi n’Iden, gịnị ka ọ nọ na-eme iji hụ na ihe o bu n’obi mezuru?

16 Mgbe e nupụchaara Jehova isi n’Iden, Jehova ka nọkwa na-eme ihe ndị ga-eme ka uche ya mezuo. O mere ka ndị mmadụ na-ezughị okè mara otú ha ga-esi na-efe ya ezigbo ofufe. Anyị ga-amụ banyere ya n’Isi nke 2. (Hib. 11:4–12:1) Jehova jikwa mmụọ nsọ ya mee ka Aịzaya, Jeremaya, Ezikiel, na ndị ọzọ so dee Baịbụl buo amụma ndị gbasara otú a ga-esi maliteghachi ife ya ezigbo ofufe. O so n’ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Baịbụl kwuru. “Nwa” ahụ e kwere ná nkwa ga-emezu amụma niile ahụ. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ isi sekpụ ntị ná ndị so na “nwa” ahụ. (Gal. 3:16) Ihe Jizọs zara Setan mgbe ọ nwara ya ọnwụnwa nke atọ gosiri na Jizọs na-agbachitere ofufe Chineke. N’eziokwu, ọ bụ Jizọs ka Jehova họọrọ ka o mezuo amụma ndị e buru gbasara ịmaliteghachi ife Jehova otú kwesịrị ekwesị. (Mkpu. 19:10) Jizọs ga-atọhapụ ndị Chineke okpukpe ụgha dọọrọ n’agha ma mee ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe.

Gịnị Ka Ị Ga-eme?

17. Gịnị mere na anyị ejighị amụma ndị kwuru otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke otú kwesịrị ekwesị egwu egwu?

17 Ileba anya n’amụma ndị Baịbụl buru gbasara otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke otú kwesịrị ekwesị na-amasị anyị, ọ na-emekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike. Anyị ejighị amụma ndị ahụ egwu egwu n’ihi na anyị na-atụ anya mgbe ndị niile e kere eke nọ n’eluigwe na n’ụwa ga na-efe Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ́ Jehova ezigbo ofufe. Amụma ndị ahụ na-emekwa ka anyị nwee olileanya n’ihi na ọ bụ na ha ka e kwuru ụfọdụ n’ime ihe ndị kacha agba ume n’Okwu Chineke. È nwere onye n’ime anyị na-achọghị ịhụ mgbe Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere, dị ka ịkpọlite ndị ikwu na ibe anyị n’ọnwụ, ime ka ụwa niile bụrụ paradaịs, na ime ka mmadụ niile zuo okè ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?—Aịza. 33:24; 35:5, 6; Mkpu. 20:12, 13; 21:3, 4.

18. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’akwụkwọ a?

18 N’akwụkwọ a, anyị ga-eleba anya n’amụma ndị ga-eme anyị obi ụtọ e buru n’akwụkwọ Ezikiel. Ọtụtụ n’ime amụma ndị ahụ kwuru otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe. Anyị ga-eleba anya n’otú amụma Ezikiel buru si gbasa amụma ndị ọzọ e buru na Baịbụl, otú Kraịst ga-esi mezuo amụma ndị ahụ, nakwa otú ha si gbasa anyị.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Akwụkwọ Ezikiel Na-ekwu.”

19. Gịnị ka i kpebisiri ike ime? N’ihi gịnị?

19 N’oge ahụ Setan nwara Jizọs n’ala ịkpa Judia n’afọ 29, mbọ Setan gbara ime ka Jizọs kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe kụrụ afọ n’ala. Oleekwanụ maka anyịnwa? Setan eforola ntutu taa na ya ga-eme ka anyị kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe. (Mkpu. 12:12, 17) Akwụkwọ a ga-enyere anyị aka ka anyị kpebisikwuo ike na anyị agaghị ekwe ka Onye ọnwụnwa ahụ obi tara mmiri nweta anyị. Ka anyị gbalịa si n’ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme gosi na anyị ji obi anyị niile kweta ihe Jizọs kwuru, ya bụ, “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe.” Anyị mee otú ahụ, anyị ga-eso hụ mgbe a ga-emezu uche Jehova, nke bụ́ ka ndị niile nọ n’eluigwe na ndị niile nọ n’ụwa jiri otu obi na-efe ya ezigbo ofufe, nke bụ́kwanụ ihe ruuru ya.

a Ụfọdụ ndị ghọtara na aha a bụ́ Jehova pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Ọ dabara adaba n’ihi na ọ na-egosi na Jehova bụ Onye kere ihe niile, bụrụkwa Onye na-emezu ihe o bu n’obi.

b Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru gbasara ihe ahụ Setan kwuru, sị: ‘E ji ọnwụnwa mbụ ahụ a nwara Adam na Iv ma nwata ha mata onye ha ga-ahọrọ ime uche ya. Ọ̀ ga-abụ Setan ka ọ̀ ga-abụ Chineke? Onye ọ bụla e mere uche ya, e feela ya ofufe. N’eziokwu, Setan mere onwe ya chi nke ga-anọchi onye naanị ya bụ Chineke.’

c Otú Luk si dee ọnwụnwa atọ ahụ dị iche n’otú Matiu si dee ha. Ọ ga-abụ na Matiu dere ha n’usoro ha si mee. Lee ihe atọ mere anyị ji kwuo otú ahụ. (1) Ihe mbụ Matiu kwuru mgbe ọ na-akọ gbasara ọnwụnwa nke abụọ bụ “Ekwensu wee kpọrọ ya.” Ọ na-egosi na ọnwụnwa a sochiri nke mbụ. (2) Setan ji aghụghọ bịa n’ọnwụnwa abụọ ọ nwara Jizọs, ihe mbụ o kwuru na ha bụ: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke.” Ọ ga-aka adaba ababa na ọ bụ mgbe Ekwensu jichara aghụghọ nwaa ya ugboro abụọ ka ọ ga-agwazi ya hoo haa ka o nupụ isi n’iwu mbụ Chineke nyere. (Ọpụ. 20:2, 3) (3) Ihe Jizọs kwuru, ya bụ, “Si ebe a pụọ, Setan!” ga-akacha adaba adaba mgbe Setan nwachara ya ọnwụnwa nke atọ bụ́ nke ikpeazụ.—Mat. 4:5, 10, 11.