Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE ATỌ

‘M Ga-akpọkọta Unu’—E Kwere Nkwa na A Ga-eme Ka A Maliteghachi Ife Chineke Ezigbo Ofufe

‘M Ga-akpọkọta Unu’—E Kwere Nkwa na A Ga-eme Ka A Maliteghachi Ife Chineke Ezigbo Ofufe

EZIKIEL 20:41

IHE NKEBI A NA-EKWU: Amụma ndị Ezikiel buru gosiri na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe

Ndị Izrel nọ ná nsogbu. Ha adịghịzi n’otu maka na ha hapụrụ ife Chineke fewe arụsị. Ha na-ata ahụhụ maka ihe ọjọọ ndị ha mere. Ha tere aha Chineke unyi, metọọkwa ezigbo ofufe ha na-efe ya. N’oge ahụ nsogbu zuru ha ahụ́, Jehova mere ka Ezikiel buo amụma ndị gosiri ihe ọma Jehova ka ga-emere ha. Jehova ji ihe atụ dị iche iche na ọhụụ ndị na-emetụ n’ahụ́ o gosiri Ezikiel gbaa ndị Izrel a dọọrọ n’agha ume nakwa onye ọ bụla ọ na-agụ agụụ ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 8

“M Ga-ahọpụta . . . Ohu M Ka Ọ Na-azụ Ha”

Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka Ezikiel buo amụma gbasara Mezaya, onye ga-emecha bụrụ Onye Ọchịchị na Onye na-azụ atụrụ Jehova, onye ga-eme ka a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe ruo ebighị ebi.

ISI NKE 9

“M Ga-eme Ka Unu Nwee Otu Obi”

Amụma ndị e buuru ndị Juu ji obi ha niile na-efe Jehova, bụ́ ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn, hà gbasara anyị n’oge a?

ISI NKE 10

‘Unu Ga-adị Ndụ Ọzọ’

N’ọhụụ, Ezikiel hụrụ ọkpụkpụ kpọrọ nkụ ndị juru na ndagwurugwu ndị mechara dịrị ndụ ọzọ. Gịnị ka ọhụụ a pụtara?

ISI NKE 11

“M Họpụtara Gị Ka Ị Bụrụ Onye Nche”

Gịnị bụ ọrụ onye nche a? Olee aka ná ntị a gwara ya ka ọ dọọ ndị mmadụ?

ISI NKE 12

“M Ga-eme Ka Ha Bụrụ Otu Mba”

Jehova kwere nkwa na ọ ga-eme ka ndị ya dịrị n’otu.

ISI NKE 13

‘Kọọ Otú Ụlọ Nsọ A Dị’

Gịnị ka ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ pụtara?

ISI NKE 14

“Iwu Gbasara Ụlọ Nsọ A”

Gịnị ka ndị Juu nọ n’oge Ezikiel mụtara n’ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ? Gịnịkwa ka anyị na-amụta n’ọhụụ ahụ?