Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 10

‘Unu Ga-adị Ndụ Ọzọ’

‘Unu Ga-adị Ndụ Ọzọ’

EZIKIEL 37:5

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ọhụụ “ọkpụkpụ kpọrọ nkụ” ndị e mere ka ha dị ndụ na otú o si mezuo karịa otú o mezuburu

1-3. Gịnị mere obi ji jọọ ndị Juu bi na Babịlọn njọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

 KEMGBE afọ ise, Ezikiel nọ na-ebu amụma na a ga-ebibi Jeruselem. Ma, ndị Juu ekwetaghị na e nwere ihe ga-eme. N’agbanyeghị ihe Ezikiel nọ na-eme, ihe atụ ọ nọ na-eme, na ozi ọ nọ na-ezi ndị ibe ya a dọọrọ n’agha, ha ekwetaghị na Jehova ga-ekwe ka e bibie Jeruselem. Mgbe ha nụdịrị na ndị agha Babịlọn agbaala Jeruselem gburugburu, obi ka siri ha ike na e nweghị ihe ga-eme ndị bi na ya. Ma ugbu a, e nweghịzi onye Juu nọ na Babịlọn obi dị mma.

2 Ihe a bụ afọ abụọ ndị agha Babịlọn nọchibidoro Jeruselem. Ugbu a, otu onye Juu nke si na Jeruselem gbapụ rutere Babịlọn ma kọọ ihe merenụ, sị: “E wegharala Jeruselem!” Ozi a gbawara ndị Juu a dọọrọ n’agha obi. O siiri ha ike ikweta na e bibiela ọmarịcha obodo ha na ụlọ nsọ dị na ya nakwa ọmarịcha ala ha. Obi adaala ha mbà n’ihi na ihe ha nọ na-atụ anya ya kemgbe emezughị.—Ezik. 21:7; 33:21.

3 Ma n’oge a ike ụwa gwụrụ ndị Juu, e gosiri Ezikiel ọhụụ ga-eme ka ha nwee olileanya. Gịnị ka a gwara ndị ahụ a dọọrọ n’agha obi gbawara? Olee otú ọhụụ ahụ si gbasa ndị Chineke n’oge a? Oleekwa otú o nwere ike isi baara anyị uru n’otu n’otu? Iji mata azịza ajụjụ ndị a, ka anyị leba anya n’ihe Jehova gosiri Ezikiel.

“Buo Amụma Banyere Ọkpụkpụ Ndị A” Nakwa “Amụma Ihe Ifufe Ga-eme”

4. Gịnị ka Ezikiel kacha chọpụta n’ọhụụ ọ hụrụ?

4 Gụọ Ezikiel 37:1-10. N’ọhụụ a, a kpọọrọ Ezikiel kpọsa n’otu ndagwurugwu ọkpụkpụ juru. Jehova nyere ya iwu ka ọ “gagharịa gburugburu” ọkpụkpụ ndị ghasasịrị na ndagwurugwu ahụ. Ka Ezikiel na-agagharị na ndagwurugwu ahụ, ihe abụọ ọ kacha chọpụta gbasara ọkpụkpụ ndị ahụ bụ otú ha dị na otú ha hà. Ọ sịrị na “ha dị nnọọ ọtụtụ” nakwa na “ha kpọrọ ezigbo nkụ.”

5. Olee iwu abụọ Jehova nyere Ezikiel? Gịnịzi mere mgbe Ezikiel mere ihe Jehova gwara ya?

5 Jehova nyeziri Ezikiel iwu abụọ ga-eme ka ọkpụkpụ ndị ahụ jiri nwayọọ nwayọọ dịghachi ndụ. Iwu nke mbụ bụ: “Buo amụma banyere ọkpụkpụ ndị a.” Ezikiel ga-agwa ọkpụkpụ ndị ahụ ka ‘ha dị ndụ.’ (Ezik. 37:4-6) Ozugbo Ezikiel buru amụma ahụ, ọ “nụwara mkpọtụ ọkpụkpụ ndị na-akụkọta n’ibe ha. Ọkpụkpụ ndị ahụ bidoro ijikọta onwe ha ọnụ.” “Akwara na anụ ahụ́” maliteziri ikpuchi ọkpụkpụ ndị ahụ, “akpụkpọ ahụ́ kpuchikwara ha.” (Ezik. 37:7, 8) Iwu nke abụọ o nyere Ezikiel bụ: “Buo amụma ihe ifufe ga-eme.” Ọ ga-agwa ifufe ka o “fee n’elu” ndị ahụ e gburu egbu. Mgbe o buru amụma, ‘ume ndụ banyere n’ime ha, ha adịrị ndụ, jirikwa ụkwụ ha guzoro, bụrụ ndị agha hiri ezigbo nne.’—Ezik. 37:9, 10.

“Ọkpụkpụ Anyị Akpọọla Nkụ. Anyị Enweghịzi Olileanya”

6. Gịnị ka Jehova kwuru nke nyeere Ezikiel aka ịghọta ọhụụ ahụ?

6 Jehova gwaziri Ezikiel otú e kwesịrị isi ghọta ọhụụ ahụ. Ọ sịrị ya: “Ọkpụkpụ ndị a bụ ndị Izrel niile.” N’eziokwu, mgbe ndị ahụ a dọọrọ n’agha nụrụ na e bibiela Jeruselem, ọ dị ha ka à ga-asị na ha anwụọla. Ha beziri ákwá, sị: “Ọkpụkpụ anyị akpọọla nkụ. Anyị enweghịzi olileanya. E bibiela anyị kpamkpam.” (Ezik. 37:11; Jere. 34:20) Ákwá a ha nọ na-ebe meziri ka Jehova mee ka ndị Izrel mata na ha ka nwere olileanya n’agbanyeghị na ọhụụ ọkpụkpụ ahụ na-agbawa obi.

7. Gịnị ka Jehova mere ka Ezikiel mata nke e dere n’Ezikiel 37:12-14? Oleekwa otú o si mee ka obi sie ndị ya a dọọrọ n’agha ike?

7 Gụọ Ezikiel 37:12-14. Jehova ji ọhụụ a mee ka obi sie ndị ahụ a dọọrọ n’agha ike na ọ ga-eme ka ha dị ndụ, kpọghachikwa ha n’ala ha ma mee ka ha biri n’ebe ahụ. Jehova kpọkwara ha “ndị m.” O doro anya na ihe ndị a Jehova gwara ndị ahụ a dọọrọ n’agha obi jọrọ njọ gbara ha ume. Ma, gịnị mere obi ga-eji esi ha ike na nkwa a Chineke kwere na ha ga-alaghachi n’ala ha ga-emezu? Ọ bụ maka na ọ bụ Jehova kwere nkwa a. Ọ sịrị: “Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a, meekwa ya.”

8. (a) Olee otú “ndị Izrel niile” si dị ka ndị nwụrụ anwụ? (b) Olee otú Ezikiel 37:9 si gosi ihe mere ka ndị Izrel na Jehova kwụsị ịdị ná mma? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

8 Olee otú ihe na-agbawa obi Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ahụ si mezuo n’isi mba Izrel oge ochie? O mezuru n’afọ 740 T.O.N.K., mgbe e bibiri alaeze ebo iri nke Izrel ma dọrọ ha n’agha. Ndị Izrel na Jehova adịghịzi ná mma n’oge ahụ. Ha yiziri ndị nwụrụ anwụ. A dọọrọ ndị Juda n’agha mgbe ihe dị ka otu narị afọ na iri atọ (130) gafere, “ndị Izrel niile” anọrọzie ná mba ọzọ. (Ezik. 37:11) Ndị niile ahụ a dọọrọ n’agha na Jehova adịghịzi ná mma. Ha dịzi ka ọkpụkpụ ndị ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. a Cheta na ihe Ezikiel hụrụ abụghị naanị ọkpụkpụ, kama ọ bụ ọkpụkpụ kpọrọ ezigbo nkụ. Otú a ha si kpọọ nkụ gosiri na ọ dịla ezigbo anya ndị ahụ a dọọrọ n’agha na Jehova na-adịghịzi ná mma, ọ ga-adịkwa otú ahụ ruo ogologo oge. N’eziokwu, a gụkọta oge ndị Izrel na ndị Juda nọrọ n’ebe a dọọrọ ha n’agha, ọ karịrị narị afọ abụọ (200). Ọ malitere n’afọ 740 ruo 537 T.O.N.K.—Jere. 50:33.

9. Olee ihe ndị mere “Izrel nke Chineke” ndị yikwara ihe mere Izrel oge ochie?

9 Amụma ndị e buru gbasara ndị Izrel, dị ka ndị nke Ezikiel buru, mechara mezuo karịa otú ha mezuburu. (Ọrụ 3:21) Otú ahụ “e gburu” mba Izrel oge ochie, ha anọrọ otú ahụ ruo ogologo oge, ka ‘e gbukwara’ “Izrel nke Chineke,” ya bụ, ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. A dọkwaara ha n’agha, ha anọrọ otú ahụ ruo ogologo oge. (Gal. 6:16) N’eziokwu, ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọrọ ogologo oge n’ebe a dọọrọ ha n’agha nke na e nwere ike iji ofufe ha na-efe Jehova tụnyere ọkpụkpụ “kpọrọ ezigbo nkụ.” (Ezik. 37:2) Anyị kọwara n’Isi nke 9 na a dọọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ n’agha mgbe afọ 100 O.N.K. gachara. Ha nọkwara n’ebe ahụ ruo ọtụtụ narị afọ, otú ihe atụ Jizọs mere gbasara ọka wit na ata gosiri.—Mat. 13:24-30.

Ọkpụkpụ ndị “kpọrọ ezigbo nkụ” Ezikiel hụrụ n’ọhụụ gosiri na ndị ohu Jehova e tere mmanụ ga-anọ ogologo oge n’ebe a dọọrọ ha n’agha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8, 9)

‘Ọkpụkpụ Bidoro Ijikọta Onwe Ha Ọnụ’

10. (a) Gịnị ka e buru n’amụma n’Ezikiel 37:7, 8 gbasara ndị Chineke? (b) Olee ihe ndị ji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị na-atụ egwu Chineke a dọọrọ n’agha nwee okwukwe?

10 N’oge ochie, Jehova buru amụma na a ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị ya dịghachi ndụ. (Ezik. 37:7, 8) Olee ihe ụfọdụ mere ka ndị na-atụ egwu Chineke a dọọrọ n’agha jiri nwayọọ nwayọọ nwee olileanya na ha ga-alaghachi n’Izrel? Otu n’ime ha bụ amụma ndị e buru tupu oge ahụ. Dị ka ihe atụ, Aịzaya buru amụma na a ga-enwe “ome dị nsọ,” ya bụ, ndị fọdụrụ, ga-alaghachi n’ala ahụ. (Aịza. 6:13; Job 14:7-9) O doro anya na ọtụtụ amụma ndị Ezikiel buru, ndị kwuru na ndị Chineke ga-alaghachi n’obodo ha, so mee ka ha nwee olileanya. Daniel na ụmụ nwoke ndị ji obi ha niile na-efe Chineke na Babịlọn mekwara ka ndị Izrel nwee olileanya. Mmeri e meriri Babịlọn n’afọ 539 T.O.N.K. mekwuru ka ndị ahụ a dọọrọ n’agha nwee olileanya na ha ga-alaghachi n’obodo ha.

11, 12. (a) Olee otú e si jiri nwayọọ nwayọọ mee ka “Izrel nke Chineke” dịghachi ndụ? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “E Ji Nwayọọ Nwayọọ Maliteghachi Ife Chineke Ezigbo Ofufe.”) (b) Olee ajụjụ mmadụ nwere ike ịjụ n’ihi ihe e dere n’Ezikiel 37:10?

11 Olee otú e si mee ka “Izrel nke Chineke,” ya bụ, ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ, jiri nwayọọ nwayọọ dịghachi ndụ ka ndị Izrel oge ochie? Mgbe ha nọrọla ọtụtụ narị afọ n’ebe a dọọrọ ha n’agha, bụ́ ebe ha nọ ka ndị nwụrụ anwụ, a “nụwara mkpọtụ ọkpụkpụ ndị na-akụkọta n’ibe ha.” Ihe a mere mgbe ndị na-atụ egwu Chineke malitere ịgba mbo ka e fewe ya ezigbo ofufe. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka n’afọ 1530, William Tyndale sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Bekee. Iwe were ndị ụkọchukwu Chọọchị Katọlik maka na ndị na-agụghị akwụkwọ nweziri ike ịgụ Baịbụl. N’ihi ya, e gburu Tyndale. Ma, ndị ọzọ nwere obi ike nọgidere na-asụgharị Baịbụl n’asụsụ ndị ọzọ. Ihe a mere ka ọtụtụ ndị nwee ike ịna-agụ Okwu Chineke.

12 Mgbe e mechara, Charles T. Russell na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ malitere ịgbasi mbọ ike ka ha kụziwe eziokwu si na Baịbụl. N’oge ahụ, ọ dị ka à ga-asị na “akwara na anụ ahụ́” kpuchiwere ọkpụkpụ ndị ahụ. Akwụkwọ Zion’s Watch Tower na akwụkwọ ndị ọzọ nyeere ndị ji obi ha niile chọọ ife Chineke aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl, meekwa ka ha soro ndị Chineke tere mmanụ fewe Chineke. N’agbata afọ 1914 na 1917, ihe ndị ọzọ nyekwuuru ndị Chineke tere mmanụ aka. Ụfọdụ n’ime ha bụ “Foto Ihe Nkiri nke Okike” na akwụkwọ The Finished Mystery. Obere oge e wepụtachara ihe ndị a, oge Chineke ruru ka ndị ya ‘jiri ụkwụ ha guzoro.’ (Ezik. 37:10) Olee mgbe ha ji ụkwụ ha guzoro, oleekwa otú o si mee? Ihe ndị mere na Babịlọn oge ochie ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.

‘Ha Malitere Ịdị Ndụ, Jirikwa Ụkwụ Ha Guzoro’

13. (a) Olee otú ihe e dere n’Ezikiel 37:10, 14 si malite imezu n’afọ 537 T.O.N.K.? (b) Olee amaokwu Baịbụl ndị gosiri na e nwere ndị si n’alaeze ebo iri laghachiri n’Izrel?

13 Ọ bụ n’afọ 537 T.O.N.K. ka ọhụụ ahụ malitere imezu n’isi ndị Juu nọ na Babịlọn. Olee otú o si mezuo? Jehova mere ka ha dịrị ndụ, meekwa ka ha ‘jiri ụkwụ ha guzoro.’ Otú o si mee ya bụ na ọ napụtara ha n’ebe a dọọrọ ha n’agha, meekwa ka ha laghachi n’Izrel. Ndị Izrel ndị dị puku mmadụ iri anọ na abụọ, narị atọ na iri isii (42,360) na ihe dị ka puku mmadụ asaa (7,000) na-abụghị ndị Izrel si Babịlọn lawa Jeruselem ka ha gaa rụghachi ya na ụlọ nsọ dị na ya ma biri n’Izrel. (Ezra 1:1-4; 2:64, 65; Ezik. 37:14) Mgbe ihe dị ka afọ iri asaa gafere, ndị Juu a dọọrọ n’agha, ndị dị ihe dị ka otu puku mmadụ na narị asaa na iri ise (1,750), so Ezra laghachi Jeruselem. (Ezra 8:1-20) Ndị Juu niile laghachirinụ karịrị puku mmadụ iri anọ na puku anọ (44,000). N’eziokwu, ha bụ ‘ndị agha hiri nne.’ (Ezik. 37:10) Okwu Chineke gosikwara na e nwere ndị si n’alaeze ebo iri laghachiri n’Izrel, soro rụghachi ụlọ nsọ ahụ. Ha bụ ụmụ ụmụ ndị ndị agha Asirịa dọọrọ n’agha n’afọ 740 T.O.N.K.—1 Ihe 9:3; Ezra 6:17; Jere. 33:7; Ezik. 36:10.

14. (a) Olee otú ihe e dere n’Ezikiel 37:24 si enyere anyị aka ịghọta oge amụma a kacha mezuo? (b) Gịnị mere n’afọ 1919? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Olee Otú ‘Ọkpụkpụ Ndị Kpọrọ Nkụ’ na ‘Ndị Àmà Abụọ’ Si Yie?”)

14 Olee otú amụma a Ezikiel buru si mezuo karịa otú o mezuburu? Ihe Jehova gwara Ezikiel n’amụma ọzọ yiri nke a gosiri na ọ bụ obere oge Devid Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, malitere ịchị ka amụma a ga-akacha emezu. b (Ezik. 37:24) N’eziokwu, o mezuru n’afọ 1919 mgbe Jehova nyere ndị ya mmụọ nsọ ya. Ha bịaziri “dị ndụ,” e sikwa na Babịlọn Ukwu ahụ, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha, tọhapụ ha. (Aịza. 66:8) Jehova hapụziri ha ka ha biri “n’ala” ha, ya bụ, ka ha nwee ike ịna-efe ya ezigbo ofufe. Ma, olee otú ndị Jehova n’oge a si bụrụ ‘ndị agha hiri nne’?

15, 16. (a) Olee otú ndị Jehova n’oge a si bụrụ “ndị agha hiri nne”? (b) Olee otú amụma a Ezikiel buru si enyere anyị aka idi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ka Anyị Guzorokwa n’Ụkwụ Anyị.”)

15 Obere oge Kraịst họpụtachara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’afọ 1919, ihe Zekaraya buru n’amụma malitere imezu. O buru amụma mgbe ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta. Ọ sịrị na “ọtụtụ ndị na mba ndị dị ike ga-abịa chọọ Jehova.” Zekaraya kpọrọ ndị ahụ ga-achọ Jehova “mmadụ iri ndị na-asụ asụsụ niile e nwere ná mba dị iche iche.” Ha ga-ejidesi uwe “onye Juu,” ya bụ, Izrel nke Chineke, aka ike, na-asị: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.”—Zek. 8:20-23.

16 Taa, ndị so n’Izrel nke Chineke (ya bụ, ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ) na “mmadụ iri” ahụ (ya bụ, ndị so n’atụrụ ọzọ), ndị mechara soro ha, bụzi “ndị agha hiri ezigbo nne.” Ha dị ọtụtụ nde. (Ezik. 37:10) Ebe anyị so ná ndị agha Kraịst ndị na-ehikwu nne, anyị na-esochi Eze anyị, bụ́ Jizọs, anya. Ọ ga na-edu anyị ma mee ka a gọzie anyị n’ọdịnihu.—Ọma 37:29; Ezik. 37:24; Fil. 2:25; 1 Tesa. 4:16, 17.

17. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-eso nke a?

17 Otú a Chineke si mee ka ndị ya maliteghachi ife ya ezigbo ofufe ga-eme ka ha nwee ọrụ dị mkpa ha ga-arụ. Gịnị bụ ọrụ ahụ? Iji mata azịza ajụjụ a, anyị kwesịrị ileba anya n’ọrụ Jehova nyere Ezikiel tupudị e bibie Jeruselem. Anyị ga-eleba ya anya n’Isi nke 11.

a Ọkpụkpụ ndị ahụ abụghị ọkpụkpụ ndị mmadụ ndị nọkatara nwụọ, kama ọ bụ ọkpụkpụ ‘ndị e gburu egbu.’ (Ezik. 37:9) E nwere ike ikwu na e gburu “ndị Izrel niile” mgbe e meriri ndị bi n’alaeze Izrel dị ebo iri ma dọrọ ha n’agha laa Asiria nakwa mgbe e meriri ndị bi n’alaeze Juda dị ebo abụọ ma dọrọ ha n’agha laa Babịlọn.

b E lebara anya n’amụma a e buru gbasara Mezaya n’Isi nke 8 n’akwụkwọ a.