Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 14

“Iwu Gbasara Ụlọ Nsọ A”

“Iwu Gbasara Ụlọ Nsọ A”

EZIKIEL 43:12

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe ndị dịrị ndụ n’oge Ezikiel mụtara n’ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ nakwa ihe anyị mụtara na ya taa

1, 2. (a) Gịnị ka anyị mụtara n’ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’Isi nke 13? (b) Olee ajụjụ abụọ anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

 N’ISI nke 13, anyị mụtara na ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ abụghị nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ Pọl onyeozi kwuru gbasara ya ọtụtụ narị afọ Ezikiel dịchara ndụ. Anyị mụtakwara na Jehova gosiri Ezikiel ọhụụ ahụ ka ọ kụziere ndị ya na ọ dị ezigbo mkpa ka ha na-efe ya ezigbo ofufe otú o kwuru ka e si na-efe ya. Ọ bụ naanị mgbe ha na-efe Jehova otú ahụ ka ha na ya ga-adịghachi ná mma. Ọ bụ ya mere Jehova ji kwusie okwu ike gbasara ife ya ezigbo ofufe. O kwuru “iwu gbasara ụlọ nsọ a” ugboro abụọ n’otu amaokwu.—Gụọ Ezikiel 43:12.

2 E nwere ajụjụ abụọ anyị ga-eleba anya ugbu a. Nke mbụ bụ: Gịnị na gịnị ka ọ ga-abụ na ọhụụ Ezikiel hụrụ kụziiri ndị Juu dịrị ndụ n’oge ya gbasara otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya ezigbo ofufe? Anyị mata azịza ajụjụ a, anyị ga-enwezi ike ịza ajụjụ nke abụọ bụ́: Gịnị ka ọhụụ a na-akụziri anyị n’oge ikpeazụ a jọgburu onwe ya?

Gịnị Ka Ndị Juu Oge Ochie Mụtara n’Ọhụụ Ezikiel Hụrụ?

3. Gịnị mere ihere ga-eji mee ndị Juu mgbe ha nụrụ na Ezikiel hụrụ ọhụụ ahụ n’elu n’ugwu dị elu?

3 Iji zaa ajụjụ nke mbụ, ka anyị leruo ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ e kwuru gbasara ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ anya. Ugwu dị elu. Mgbe ndị Juu nụrụ na Ezikiel hụrụ ọhụụ ahụ n’elu ugwu dị elu, ọ ga-abụ na ha chetara ihe na-eme obi ụtọ Aịzaya buru n’amụma gbasara ime ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe. (Aịza. 2:2) Ma, gịnị ka ịhụ ụlọ Jehova n’elu ugwu dị nnọọ elu kụziiri ha? Ọ kụziiri ha na a ga-ebuli ezigbo ofufe elu, ya bụ, na a ga-eme ka ọ bụrụ ihe kacha mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. N’eziokwu, ezigbo ofufe dị n’ebe dị ezigbo elu kemgbe ụwa n’ihi na Onye o si n’aka “dị ezigbo elu karịa chi niile ọzọ.” (Ọma 97:9) Ma, ndị Juu anaghị eme ihe ha kwesịrị ime. Ha nọ na-emerụ ofufe Jehova, kwụsịkwa ife ya ezigbo ofufe ruo ọtụtụ narị afọ. Ma mgbe ndị hụrụ Chineke n’anya ghọtara na e buliri ụlọ nsọ Chineke elu, mee ka ọ dị ebube otú o kwesịrị ịdị, ya bụ, mee ka ofufe Chineke bụrụ ihe kacha mkpa, ihere mere ha.

4, 5. Gịnị ka ọnụ ụzọ ámá ndị dị ezigbo elu dị n’ụlọ nsọ ahụ kwesịrị ịkụziri ndị Ezikiel kọọrọ ọhụụ ahụ?

4 Ọnụ ọzọ ámá ndị dị ezigbo elu. Ná mmalite ọhụụ ahụ, Ezikiel nọ na-ele mmụọ ozi du ya anya ka ọ na-atụ ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ atụ̀. Ogo ha dị ihe dị ka otu narị (100) amaụkwụ n’ogologo. (Ezik. 40:14) Ụlọ ndị nche dịcha na ha. Gịnị ka ndị ji uche ha na-ahụ otú ụlọ nsọ a dị mụtara n’ihe ndị a Ezikiel hụrụ? Jehova gwara Ezikiel, sị: “Ebe ị ga-aka eleru anya ala bụ n’ọnụ ụzọ e si abanye n’ụlọ nsọ.” Gịnị mere o ji gwa ya ihe a? Ọ bụ maka na ndị Juu nọ na-akpọbata ndị “a na-ebighị úgwù ma n’obi ma n’anụ ahụ́” n’ụlọ nsọ Chineke. Gịnị ka ihe a ha na-eme kpatara? Jehova sịrị: “Ha na-emerụ ụlọ nsọ m.”—Ezik. 44:5, 7.

5 Ndị ahụ “a na-ebighị úgwù . . . n’anụ ahụ́” dara iwu doro anya Chineke nyere ndị ya malite n’oge Ebreham. (Jen. 17:9, 10; Lev. 12:1-3) Ma, nsogbu nke ndị ‘a na-ebighị úgwù n’obi’ kadị njọ. Ha dị isi ike. Ha gbara isi akwara, jụ irube isi ná ntụziaka na iwu Jehova nyere. E kwesịghị ikwe ka ha bata n’ụlọ nsọ ebe a na-efe Jehova. Jehova kpọrọ mmadụ ime ihu abụọ asị. Ma, ndị na-efe ya emeela ka ndị na-eme ihu abụọ na-abataju n’ụlọ ya. Ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ na ụlọ nche ndị dị na ha Ezikiel hụrụ na-akụziri ndị Juu otu ihe doro anya, ya bụ, na Chineke agaghịzi agbachi ha nkịtị ka ha na-emerụ ụlọ nsọ ya. Ndị niile chọrọ ịbata n’ụlọ Chineke ga na-efe ya otú o kwuru ka e si na-efe ya. Naanị ya ga-eme ka Jehova nabata ofufe ha.

6, 7. (a) Olee ihe Jehova ji mgbidi gbara ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ gburugburu gwa ndị ya? (b) Gịnị ka ndị Jehova na-emebu n’ụlọ ya? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

6 Mgbidi nke gbara ụlọ nsọ ahụ gburugburu. Ihe ọzọ dị mkpa Ezikiel hụrụ bụ mgbidi nke gbara ụlọ nsọ ahụ na ogige ya gburugburu. Ezikiel kwuru na mgbidi nke dị n’akụkụ ọ bụla n’ụlọ nsọ ahụ dị narị okporo ahịhịa amị ise (500) n’ogologo ma ọ bụ puku amaụkwụ ise na otu narị (5,100), ya bụ, ihe dị ka otu kilomita na ọkara. (Ezik. 42:15-20) Ma, ụlọ nsọ ahụ na ogige ya dị naanị narị kubit ise (500), ma ọ bụ narị amaụkwụ asatọ na iri ise (850), n’akụkụ ya nke ọ bụla. Ihe ọ pụtara bụ na e nwere nnukwu mbara ala gbara ụlọ nsọ ahụ gburugburu, mgbidi agbazie ha niile gburugburu. a Gịnị mere o ji dị otú ahụ?

7 Jehova sịrị: “Ugbu a, ọ bụrụ na ha akwụsị ịna-akpa àgwà ka ndị akwụna, ya bụ, ghara ịhapụ m na-efe arụsị ndị ha weere ka ndị eze ha, mụ na ha ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Ezik. 43:9) Jehova ji nnukwu mbara ala ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-agwa ndị ya, sị: “Unu ejila ihe ọ bụla ruru unyi abịa n’ebe m nọ. Unu ewetakwala ya nso ebe a.” Ọ bụrụ na ha akwụsị ife arụsị ma fewe Jehova ezigbo ofufe, ọ ga-agọzi ha. Otú ọ ga-esi eme ya bụ na ọ ga-anọnyere ha.

8, 9. Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya ka ndị na-efe Jehova mụtara na mba ọ baara ụmụ nwoke ndị na-edu ndị ya?

8 A dọsiri ndị na-edu ndị Chineke aka ná ntị ike. Jehova dọsikwara ụmụ nwoke ndị na-edu ndị ya aka ná ntị ike otú gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ basiiri ndị Livaị mba ike, bụ́ ndị kwụsịrị ife ya mgbe ndị Izrel malitere ikpere arụsị. Ma, ọ jara ụmụ Zedọk mma, bụ́ ‘ndị nọ na-arụ ọrụ e kwesịrị ịrụ n’ụlọ nsọ ya mgbe ndị Izrel kwụsịrị ife ya.’ Ọ bụ otú ndị nke ọ bụla si kpaa àgwà ka Jehova si meso ha. Ihe a gosiri na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ebere. (Ezik. 44:10, 12-16) Jehova bakwaara ndị isi Izrel ezigbo mba otú ọ baara ndị Livaị.—Ezik. 45:9.

9 Jehova si otú a mee ka o doo anya na ụmụ nwoke ndị na-edu ndị ya na ndị na-elekọta ha ga-aza ya ajụjụ maka otú ha si rụọ ọrụ o nyere ha. O nweghị onye n’ime ha Jehova na-enweghị ike ịbara mba, dọọ aka ná ntị, ma ọ bụ dụọ ọdụ. Ọ bụ ha kwesịrị ịna-ebute ụzọ n’ife Jehova otú o kwuru ka e si na-efe ya.

10, 11. Gịnị gosiri na ụfọdụ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta mụtara ihe a chọrọ ka ha mụta n’ọhụụ Ezikiel hụrụ?

10 Ndị ahụ si ebe a dọọrọ ha n’agha lọta hà mere ihe ha mụtara n’ọhụụ Ezikiel hụrụ? N’eziokwu, anyị amaghị kpọmkwem ihe ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị rubeere Jehova isi n’oge ahụ nọ na-eche gbasara ọhụụ a pụrụ iche. Ma, Okwu Chineke gwara anyị ọtụtụ ihe banyere ihe ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta mere nakwa otú ha si were ife Jehova ezigbo ofufe. Hà mere ihe ọhụụ Ezikiel hụrụ kụziiri ha? Ee. Ha metụrụ ya, karịchaa, ma e jiri ha tụnyere ndị nna nna ha ndị nupụrụ isi tupu a dọrọ ha n’agha laa Babịlọn.

11 Ụmụ nwoke ndị ji obi ha niile na-efe Jehova gbasiri mbọ ike kụziere ndị Jehova ihe ọ chọrọ ka ha na-eme, dị ka ihe o ji ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ kụziere ndị ya. Ụfọdụ ụmụ nwoke ahụ bụ Hagaị onye amụma, Zekaraya onye amụma, Ezra bụ́ onye nchụàjà na odeakwụkwọ, nakwa Nehemaya bụ́ gọvanọ. (Ezra 5:1, 2) Ha kụziiri ndị Chineke na ife ya ezigbo ofufe kwesịrị ịbụ ihe kacha ha mkpa nakwa na ha kwesịrị iji ya kpọrọ ihe karịa akụnụba ma ọ bụ ihe ọ bụla ha chọrọ inweta ná ndụ. (Hag. 1:3, 4) Ha gbara mbọ hụ na ndị Chineke na-efe ya ezigbo ofufe. Dị ka ihe atụ, Ezra na Nehemaya basiiri ndị Juu mba ike, gwa ha ka chụlaa ụmụ nwaanyị mba ọzọ ha lụrụ, ndị na-eme ka ha ghara ịna-efe Chineke ezigbo ofufe. (Gụọ Ezra 10:10, 11; Nehe. 13:23-27, 30) Gịnị ka ndị Juu mere gbasara ikpere arụsị? O yiri ka mgbe ha si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, ha kpọziri ikpere arụsị asị, bụ́ mmehie ji ha aka ọjọọ kemgbe. Ndị nchụàjà na ndị isi hà mere ihe ha mụtara n’ọhụụ ahụ? Ọhụụ ahụ gosiri na ha so ná ndị Jehova dọrọ aka ná ntị ma baara mba. (Nehe. 13:22, 28) Ọtụtụ n’ime ha nabatara aka ná ntị a dọrọ ha ma mee ihe ha kwesịrị ime.—Ezra 10:7-9, 12-14; Nehe. 9:1-3, 38.

Ka Nehemaya na ndị Juu na-arụkọ ọrụ, ọ kụziiri ha gbasara ezigbo ofufe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

12. Olee otú Jehova si gọzie ndị ya mgbe ha si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta?

12 Jehova gọziri ndị ya maka ihe a ha mere. Ha na Jehova bịara dị n’ezigbo mma, ala ha ana-eme nri nke ọma, ihe ana-agakwa nke ọma n’obodo ha otú ọ na-adịbeghị kemgbe ọtụtụ afọ. (Ezra 6:19-22; Nehe. 8:9-12; 12:27-30, 43) N’ihi gịnị? N’ihi na ha malitere ife Jehova ezigbo ofufe otú o kwuru ka e si na-efe ya. Ọtụtụ n’ime ha ji obi ha niile nabata ihe ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ kụziiri ha. Ná nchịkọta, anyị nwere ike ikwu na e nwere ụzọ abụọ gbara ọkpụrụkpụ ọhụụ ahụ si baara ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta uru. (1) Ọ kụziiri ha otú ha ga-esi na-efe Chineke ezigbo ofufe otú o kwuru ka e si na-efe ya. (2) O mere ka obi sie ha ike na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe, meekwa ka ha mata na Jehova ga na-agọzi ndị ya ma ọ bụrụhaala na ha na-efe ya ezigbo ofufe. Ma ajụjụ anyị kwesịrị ịmata azịza ya bụ: Ọhụụ Ezikiel hụrụ ọ̀ na-emezu n’oge a?

Ihe Ọhụụ Ezikiel Hụrụ Na-akụziri Anyị Taa

13, 14. (a) Olee otú anyị si mara na ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ụlọ nsọ na-emezu n’oge a? (b) Olee uru abụọ ọhụụ ahụ na-abara anyị taa? (Gụọkwa igbe nke 13A isiokwu ya bụ, “Ụlọ Nsọ Abụọ Dị Iche na Ihe Ha Na-akụziri Anyị.”)

13 Ànyị ji n’aka na ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ gbasara anyị taa? Ee. Cheta na Ezikiel hụrụ ụlọ nsọ Chineke “n’elu otu ugwu dị nnọọ elu.” Ihe a dabara n’amụma Aịzaya buru na “ugwu nke ụlọ Jehova dị n’elu ya ga-akwụsi ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile.” O kwukwara hoo haa na ọ bụ “n’oge ikpeazụ” ka amụma a ga-emezu. (Ezik. 40:2; Aịza. 2:2-4; i nwere ike ịgụ Maịka 4:1-4.) Amụma ndị a na-emezu n’oge ikpeazụ kemgbe afọ 1919. Ọ bụ mgbe ahụ ka e mere ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe, ofufe ya abụrụzie ihe kacha mkpa. Ọ dịzi ka ihe dị n’ugwu dị nnọọ elu. b

14 O doro nnọọ anya na ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ gbasara ife Chineke ezigbo ofufe taa. Otú ahụ ọhụụ ahụ si baara ndị Juu a dọọrọ n’agha uru abụọ n’oge ochie ka ọ bakwaara anyị taa. (1) Ọ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-efe Jehova ezigbo ofufe otú o kwuru ka e si na-efe ya. (2) Ọ na-eme ka obi sie anyị ike na a ga-amaliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe nakwa na ọ ga na-agọzi ndị ya.

Otú Jehova Chọrọ Ka E Si Na-efe Ya Ezigbo Ofufe Taa

15. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ka anyị na-eleba anya n’ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịmụta n’ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ?

15 Ka anyị kwuzie banyere ihe ụfọdụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ahụ. Weregodị ya na anyị so Ezikiel ka e du ya na-agagharị ná nnukwu ụlọ nsọ ahụ. Chetakwa na ụlọ nsọ a abụghị nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ. Kama, anyị chọrọ ikwu ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ọhụụ ahụ, ndị gbasara ofufe anyị na-efe Chineke taa. Gịnị na gịnị ka anyị nwere ike ịmụta?

16. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe niile a tụrụ atụ̀ n’ọhụụ Ezikiel hụrụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

16 Gịnị mere e ji tụọ ụlọ nsọ atụ̀? Ka Ezikiel nọ na-ele anya, mmụọ ozi ahụ yiri ọla kọpa nọ na-atụ ụlọ nsọ. Ọ tụrụ mgbidi ụlọ nsọ ahụ, ọnụ ụzọ ámá ndị dị na ya, ụlọ ndị nche ndị dị na ya, ogige ndị dị na ya, nakwa ebe ịchụàjà ya. Ike nwere ike ịgwụ mmadụ ma ọ gụwa otú e si tụọ ha nakwa otú nke ọ bụla hà. (Ezik. 40:1–42:20; 43:13, 14) Ma, chegodị ezigbo ihe e ji ya na-akụziri anyị. Jehova ji ihe ndị ahụ mee ka o doo anya na ife ya otú o kwuru ka e si na-efe ya dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ya na-ekwu otú ọ chọrọ ka e si na-efe ya, ọ bụghị mmadụ nkịtị ga-ekwu ya. N’ihi ya, ndị na-ekwu na e nwere ike ife Chineke otú ọ bụla ekwuteghị ya. Jehova ji otú mmụọ ozi ahụ si tụọ ụlọ nsọ ahụ na ihe ndị dị na ya nke ọma na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-emerịrị ka a maliteghachi ife ya ezigbo ofufe. Otú e si tụọ ihe ndị ahụ ma kwuo otú ha hà, ya edoo anya, ka nkwa Chineke ga-esikwa mezuo otú o kwuru. Ezikiel si otú ahụ gosi na amụma e buru na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’oge ikpeazụ ga-emezurịrị.

Gịnị ka ị mụtara n’otú e si tụọ ihe ndị dị n’ụlọ nsọ ma dee otú nke ọ bụla hà? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

17. Gịnị ka mgbidi gbara ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ gburugburu na-echetara anyị?

17 Mgbidi nke gbara ụlọ nsọ gburugburu. Anyị kwuburu na Ezikiel hụrụ mgbidi gbara ụlọ nsọ ahụ na mbara ala ya niile gburugburu. Mgbidi ahụ na-echetara ndị Chineke na ha ekwesịghị iji ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị emerụ ezigbo ofufe ha na-efe Jehova, ha ekwesịghịkwa imerụ ụlọ ya. (Gụọ Ezikiel 43:7-9.) Ndụmọdụ a gbasakwara anyị taa. Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha, dọọrọ ndị Chineke n’agha ruo ọtụtụ narị afọ. Mgbe a tọhapụrụ ha, Kraịst họpụtara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche n’afọ 1919. Ọ bụ kemgbe ahụ ka ndị na-efe Chineke kacha agbasi mbọ ike ka a ghara inwe ihe ga-ejikọ ha na ozizi ụgha, ikpere arụsị, na ịgọ mmụọ. Anyị na-akpachara anya ka anyị ghara ime ihe ga-emerụ ezigbo ofufe anyị na-efe Chineke. Ihe ọzọ bụkwa na anyị anaghị azụ ahịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Anyị anaghị ewebata ụdị ihe a n’ofufe anyị na-efe Chineke.—Mak 11:15, 16.

18, 19. (a) Gịnị ka ọnụ ụzọ ámá ndị dị ezigbo elu Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị? (b) Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị na-ejighị iwu Jehova kpọrọ ihe na-achọ iduhie gị? Nye ihe atụ.

18 Ọnụ ọzọ ámá ndị dị ezigbo elu. Gịnị ka anyị ga-amụta ma anyị chebara ọnụ ụzọ ámá ndị dị ezigbo elu Ezikiel hụrụ n’ọhụụ echiche? O doro anya na otú ha si dị ezigbo elu kụziiri ndị Juu a dọọrọ n’agha na Jehova chọrọ ka ha na-eme omume dị ezigbo mma. Ebe Jehova chọrọ ihe a n’aka ndị na-efe ya n’oge ochie, oleekwanụ maka ndị na-efe ya taa? Anyị na-efe Jehova ná nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ya. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme omume dị mma ma ghara ịna-eme ihu abụọ. (Rom 12:9; 1 Pita 1:14, 15) N’oge ikpeazụ a, Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-edu ndị ya ka ha nwee ike ịna-eme omume dị mma otú ọ chọrọ. c Dị ka ihe atụ, a na-achụpụ ndị na-eme mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ. (1 Kọr. 5:11-13) Ihe ọzọ bụ na ụlọ ndị nche ndị dị n’ebe e si abata n’ọnụ ụzọ ámá na-echetara anyị na Jehova anaghị anabata ofufe onye ọ bụla na-anaghị eme ihe ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, onye na-ebi ndụ ihu abụọ nwere ike ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, Jehova agaghị anabata ofufe ya, ọ gwụla ma ò mewere ihe Jehova chọrọ. (Jems 4:8) Jehova si otú a na-echebe ọgbakọ ya, bụ́ ebe a na-efe ya ezigbo ofufe, n’ime ụwa ọjọọ a omume ndị mmadụ retọrọ eretọ.

19 Baịbụl buru amụma na omume ndị mmadụ ga-ajọgbu onwe ya ka ọgwụgwụ ụwa na-eru nso. O kwuru na “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-akakwu njọ, na-eduhie ndị mmadụ, ndị ọzọ ana-eduhiekwa ha.” (2 Tim. 3:13) N’ụwa taa, a na-eduhie ọtụtụ ndị, mee ka ha chewe na iwu Jehova anaghị ekwe anyị megharịa ahụ́, na ọ bụ ihe mgbe ochie, ma ọ bụkwanụ na ọ dịghị mma. Ị̀ ga-ekwe ka e duhie gị? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka i kweta na iwu Chineke nke kagburu nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ adịghị mma, ị̀ ga-ekweta ihe o kwuru? Ka ị̀ ga-ekweta ihe Jehova Chineke kwuru? Okwu ya mere ka o doo anya na ndị na-eme ụdị ihe a “na-eme ihe rụrụ arụ.” Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịkwado omume rụrụ arụ. (Rom 1:24-27, 32) Ọ bụrụ na a chọọ iduhie gị, cheta ihe ọhụụ ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ nakwa ihe ọnụ ụzọ ámá ya ndị dị ezigbo elu na-akụziri anyị, ya bụ, na Jehova anaghị agbanwe ma ọ bụ ewetulata ihe ọ chọrọ n’aka ndị na-efe ya, ọ bụrụgodị na omume rụrụ arụ juru ebe niile. Ànyị na-akwado Nna anyị nke eluigwe ma na-agbachitere ihe ziri ezi?

Anyị “na-achụrụ Chineke àjà otuto” mgbe anyị na-efe ya ezigbo ofufe

20. Olee ihe na-agba ume ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ga-amụta n’ọhụụ Ezikiel hụrụ?

20 Ogige ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ. Mgbe Ezikiel hụrụ nnukwu ogige nke dị ná mpụta ụlọ nsọ ahụ, ọ ga-abụ na obi tọrọ ya ezigbo ụtọ na ọtụtụ ndị na-efe Jehova nwere ike izukọ ebe ahụ n’ihi otú o si saa mbara. Taa, Ndị Kraịst na-efe Chineke n’ebe dị nsọ karịa ebe ahụ. Ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ,’ ya bụ, ndị na-efe Jehova n’ogige nke dị ná mpụta ná nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ya, ga-amụta ihe ga-agba ha ume n’ọhụụ a Ezikiel hụrụ. (Mkpu. 7:9, 10, 14, 15) Ezikiel hụrụ na e nwere ọnụ ụlọ ndị a na-anọ eri ihe n’ogige ndị dị ná mpụta. Ndị na-efe Chineke nwere ike ịnọ n’ebe ndị ahụ soro rie ihe si n’ihe ha wetara e ji chụọ àjà udo. (Ezik. 40:17) E nwere ike ịsị na ha na Jehova na-erikọ nri. Ihe a gosiri na ha na Jehova dị n’udo, bụrụkwa enyi. Taa, anyị anaghị achụ ụdị àjà ndị Juu chụrụ mgbe ha na-edebe Iwu Mosis. Kama, anyị “na-achụrụ Chineke àjà otuto” mgbe anyị na-efe ya ezigbo ofufe, dị ka mgbe anyị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe ma na-ekwupụta ihe anyị kweere ma ọ bụkwanụ mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. (Hib. 13:15) Jehova na-akụzikwara anyị ihe ndị na-abara anyị uru. E nwere ike ịsị na ha dị ka nri. Ọ bụ ya mere obi ji dị anyị otú ọ dị ụmụ Kora, ndị bụrụ abụ ma too Jehova, sị: “Ịnọ otu ụbọchị n’ogige ụlọ gị dị mma karịa ịnọ otu puku ụbọchị n’ebe ọ bụla ọzọ!”—Ọma 84:10.

21. Gịnị ka Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere ike ịmụta n’ihe e kwuru banyere ndị nchụàjà n’ọhụụ Ezikiel hụrụ?

21 Ndị nchụàjà. Ezikiel hụrụ na e nwere ọnụ ụzọ ámá ndị nchụàjà na ndị Livaị na-esi abanye n’ogige nke dị n’ime n’ụlọ nsọ ahụ. Ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ yiri ndị nke ndị na-esighị n’ebo ndị nchụàjà na-esi abanye n’ogige nke dị ná mpụta. Ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ na-echetara ndị nchụàjà na ha kwesịkwara ịna-efe Jehova ezigbo ofufe otú o kwuru ka e si na-efe ya. Oleekwanụ maka taa? E nweghị ezinụlọ bụ ezinụlọ ndị nchụàjà n’ime ndị na-efe Chineke n’oge a. Ma, a gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, ndị eze bụ́kwa ndị nchụàjà.’ ” (1 Pita 2:9) N’Izrel oge ochie, ogige ndị nchụàjà na-anọ efe Chineke dị iche n’ogige ndị Izrel ndị ọzọ na-anọ efe ya. Taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ anaghị anọ n’ebe dị iche efe Jehova, ndị ọzọ anọrọ n’ebe dị iche. Ma, otú ha na Jehova si dị ná mma pụrụ iche n’ihi na Jehova mere ka ha bụrụ ụmụ ya. (Gal. 4:4-6) E nwekwara ezigbo ihe ndị e tere mmanụ nwere ike ịmụta n’ọhụụ Ezikiel hụrụ. Dị ka ihe atụ, ha ghọtara na e nwekwara ike ịbara ndị nchụàjà mba, dọọkwa ha aka ná ntị. Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-echeta na anyị bụ “otu ìgwè atụrụ” nke “otu onye ọzụzụ atụrụ” na-elekọta.—Gụọ Jọn 10:16.

22, 23. (a) Gịnị ka ndị okenye ọgbakọ nwere ike ịmụta n’ihe e kwuru gbasara onyeisi n’ọhụụ Ezikiel hụrụ? (b) Gịnị nwere ike ime n’ọdịnihu?

22 Onyeisi. N’ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ, onye a kpọrọ onyeisi bụ onye na-arụ ọrụ dị mkpa. Onyeisi a esighị n’agbụrụ ndị nchụàjà. Ọ ga-abụkwa na ọ na-eso ntụziaka ndị nchụàjà na-enye n’ụlọ nsọ. Ma, o doro anya na ọ na-eduzi ndị Izrel ma na-enyere ha aka eweta ụfọdụ ihe e ji achụ àjà. (Ezik. 44:2, 3; 45:16, 17; 46:2) Taa, ụmụ nwoke ndị na-arụ ọrụ dị ezigbo mkpa n’ọgbakọ Ndị Kraịst kwesịrị ịmụta ihe n’aka onyeisi a. N’eziokwu, ndị okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ma ndị nlekọta sekit, kwesịrị ịna-eso ntụziaka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye. (Hib. 13:17) Ndị okenye ndị a na-agbasi mbọ ike na-enyere ndị Chineke aka ịchụrụ ya àjà otuto n’ọmụmụ ihe nakwa n’ozi ọma. (Efe. 4:11, 12) Ndị okenye kwesịkwara ịna-echeta na Jehova baara ndị isi ndị Izrel mba mgbe ha ji ikike e nyere ha na-emegbu ndị ya. (Ezik. 45:9) N’ihi ya, ndị okenye ekwesịghị ịna-eche na e kwesịghị ịdụ ha ọdụ ma ọ bụ ịdọ ha aka ná ntị. Kama, a dụọ ha ọdụ, ha na-ewere ya na ọ bụ otú Jehova si anụcha ha ka ha nwee ike ịna-eduzi ma na-elekọta atụrụ ya nke ọma.—Gụọ 1 Pita 5:1-3.

23 Jehova ga na-enye ndị ya ndị nlekọta ma nke a na-akọ, ndị hụkwara ha n’anya, na paradaịs. E nwere ike ịsị na a na-azụ ọtụtụ ndị okenye taa ka ha nwee ike ịbụ ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga na-enyere ndị Chineke aka na paradaịs. (Ọma 45:16) Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma anyị chee uru ụmụ nwoke ndị a ga-abara ndị Chineke n’ụwa ọhụrụ. Mgbe oge Jehova ruru, ọ ka nwere ike ime ka anyị ghọtakwuo ọhụụ a Ezikiel hụrụ nakwa amụma ndị ọzọ e buru gbasara ịmaliteghachi ife ya ezigbo ofufe. O nwere ike ịbụ na ihe ụfọdụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ga-emezu otú ga-eme anyị obi ụtọ n’ọdịnihu na otú anyị na-agaghị aghọtali ugbu a. Ma, anyị ga-amata n’ọdịnihu.

Gịnị ka ọnụ ụzọ àmà ndị dị elu na ogige ha na-akụziri anyị gbasara ife Chineke ezigbo ofufe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18-21)

Jehova Gọziri Ndị Na-efe Ya Ezigbo Ofufe

24, 25. Olee otú ọhụụ Ezikiel hụrụ si gosi na Jehova ga-agọzi ndị ya ma ha na-efe ya ezigbo ofufe?

24 Ná nchịkọta, ka anyị cheta nnukwu ihe pụrụ iche mere n’ọhụụ Ezikiel hụrụ. Jehova bịara n’ụlọ nsọ ahụ ma kwe ndị ya nkwa na ya ga-anọ n’ebe ahụ ma ọ bụrụhaala na ha na-agbasi mbọ ike na-efe ya ezigbo ofufe otú o kwuru. (Ezik. 43:4-9) Ọ bụrụ na Jehova anọnyere ndị ya, olee uru ọ ga-abara ha nakwa ala ha?

25 N’ọhụụ ahụ, e ji ihe abụọ na-eme obi ụtọ gosi otú Jehova ga-esi agọzi ndị ya. (1) Mmiri si n’ụlọ nsọ ahụ na-asọpụta ma na-eme ka ihe dị iche iche dịrị ndụ nakwa ka ala na-eme nri nke ọma. (2) A haziri otú e si kee ala ahazi, kwuo otú ala nke ọ bụla ga-aha, ụlọ nsọ na mbara ala ya adịrị n’etiti. Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ihe ndị a taa? A sị ka e kwuwe, n’oge anyị a, Jehova abatala n’ụlọ nsọ ya, mee ka ọ dị ọcha, meekwa ka e nwee nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ, nke bụ́ otú ka ezigbo mma e si efe ya. (Mal. 3:1-4) N’Isi nke 19 ruo 21 n’akwụkwọ a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ abụọ ahụ Jehova ga-esi agọzị ndị ya.

a Jehova si otú a na-agwa ndị ya na ọ gaghị ekwe ka ha na-eme ihe ọjọọ n’ụlọ nsọ ya otú ha na-emebu. Ọ sịrị: “Ha rụnyere ụzọ ha si abata n’akụkụ ụzọ m si abata, rụnyekwa awara ụzọ ha n’akụkụ awara ụzọ m, nke na ọ bụ naanị ahụ́ ụlọ dị n’agbata mụ na ha. Ha ji arụ niile ha kpara mebie aha nsọ m.” (Ezik. 43:8) Na Jeruselem oge ochie, ọ bụ naanị otu mgbidi kewara ụlọ nsọ Jehova na ụlọ ndị mmadụ. Mgbe ndị Juu kwụsịrị ife Jehova ezigbo ofufe, mewezie ihe ọjọọ, ọ pụtara na ha bu omume ọjọọ ha na arụsị ha bịa n’ebe ụlọ Jehova dị. Jehova achọghị ụdị ihe a.

b Ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ yikwara amụma ndị ọzọ na-emezu n’oge ikpeazụ a e buru gbasara ime ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe. Dị ka ihe atụ, gụọ Ezikiel 43:1-9 na Malakaị 3:1-5 ka ị hụ otú ha si yie; nakwa Ezikiel 47:1-12 na Joel 3:18.

c Ọ bụ n’afọ 29 ka ụlọ nsọ ihe atụ a malitere ịdị, ya bụ, mgbe e mere Jizọs baptizim, ya amalite ịrụ ọrụ Nnukwu Onye Nchụàjà. Ma, mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, a kwụsịrị ife Chineke ezigbo ofufe n’ụwa ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụzi kemgbe afọ 1919 ka a maliteghachiri ife Chineke ezigbo ofufe ma were ofufe ya ka ihe kacha mkpa.