Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 12

“M Ga-eme Ka Ha Bụrụ Otu Mba”

“M Ga-eme Ka Ha Bụrụ Otu Mba”

EZIKIEL 37:22

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Jehova kwere nkwa na ọ ga-akpọkọta ndị ya; amụma gbasara osisi abụọ

1, 2. (a) Gịnị nwere ike ime ka obi mapụ ndị ahụ a dọọrọ n’agha? (b) Gịnị mere ihe Ezikiel malitere ime ga-eji tụọ ha n’anya? (ch) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

 JEHOVA mere ka Ezikiel mee ihe ụfọdụ n’ihu ndị a dọọrọ n’agha nọ na Babịlọn mgbe ọ na-ebu amụma dị iche iche. Mgbe ọ na-ebu amụma nke mbụ, nke abụọ, nke atọ, nakwa ndị ọzọ, o mere ihe ndị gosiri ihe Chineke ga-eme ndị ya maka na ha nupụụrụ ya isi. (Ezik. 3:24-26; 4:1-7; 5:1; 12:3-6) N’eziokwu, amụma niile Ezikiel buru, ndị o mere ihe ndị mmadụ hụrụ anya mgbe ọ na-ebu ha, gosiri na Jehova ga-ewesa ndị Juu ezigbo iwe.

2 Chezienụ otú obi ga-esi mapụ ha mgbe Ezikiel pụtakwara n’ihu ha chọọ ime ihe ọzọ ga-egosi amụma Jehova sịrị ya buo. Ha nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee ozi ọjọọ ọ chọkwara izi anyị ugbu a?’ Ma, ihe Ezikiel ga-eme ga-atụ ha n’anya. Ihe ọ maliteziri ime mgbe ọ na-ebu amụma a dị nnọọ iche. Amụma a anaghị ekwu na Jehova ga-ata ha ahụhụ. Kama, ọ na-ekwu na Jehova ga-emere ha ihe ọma. (Ezik. 37:23) Olee ozi Ezikiel ziri ndị ahụ a dọọrọ n’agha? Gịnị ka ọ pụtara? Olee otú o si gbasa ndị na-efe Chineke n’oge a? Ka anyị chọpụta.

“Ha Ga-abụkwa Otu n’Aka M”

3. (a) Gịnị ka osisi “nke Juda” nọchiri anya ya? (b) Gịnị mere anyị ji kwuo na “osisi nke Josef, nke na-anọchi anya Ifrem” pụtara alaeze ebo iri bụ́ Izrel?

3 Jehova gwara Ezikiel ka o were osisi abụọ ma dee “nke Juda” n’otu, deekwa “nke Josef, nke na-anọchi anya Ifrem” na nke ọzọ. (Gụọ Ezikiel 37:15, 16.) Gịnị ka osisi abụọ a nọchiri anya ha? Osisi “nke Juda” nọchiri anya alaeze ebo abụọ bụ́ Juda na Benjamin. Ọ bụ ndị eze si n’agbụrụ Juda na-achị ebo abụọ ahụ. Ọ bụkwa n’ebo ahụ ka ndị nchụàjà bi ma na-eje ozi n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (2 Ihe 11:13, 14; 34:30) N’ihi ya, ọ bụ n’alaeze ebo Juda ka e nwere ndị eze si n’agbụrụ Devid, nweekwa ndị nchụàjà si n’ezinụlọ Livaị. “Osisi nke Josef, nke na-anọchi anya Ifrem” pụtara alaeze ebo iri bụ́ Izrel. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Eze mbụ chịrị alaeze ebo iri bụ Jeroboam. O si n’ebo Ifrem. Ebo Ifrem mechara bụrụ ebo a kacha mara n’Izrel. (Diut. 33:17; 1 Eze 11:26) Chetakwa na ndị eze si n’agbụrụ Devid na ndị nchụàjà bụ́ ndị Levi esoghị n’alaeze ebo iri nke Izrel.

4. Gịnị ka ihe ọzọ Ezikiel mere osisi abụọ ahụ nọchiri anya ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 A gwakwara Ezikiel ka o jikọta osisi abụọ ahụ “ka ha bụrụ otu osisi.” Ka ndị ahụ a dọọrọ n’agha nọ na-ele Ezikiel anya, ha jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ na ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara?” Ọ gwara ha na ihe ahụ ọ na-eme nọchiri anya ihe Jehova ga-eme. Jehova kwuru ihe ọ ga-eme osisi abụọ ahụ, sị: “M ga-emekwa ka ha bụrụ otu osisi. Ha ga-abụkwa otu n’aka m.”Ezik. 37:17-19.

5. Gịnị ka ihe ahụ Ezikiel mere pụtara? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ijikọta Osisi Abụọ Ọnụ.”)

5 Jehova kọwaziri ihe ijikọta osisi abụọ ahụ ọnụ pụtara. (Gụọ Ezikiel 37:21, 22.) A ga-akpọlata ndị a dọọrọ n’agha si n’alaeze ebo abụọ bụ́ Juda na ndị a dọọrọ n’agha si n’alaeze ebo iri bụ́ Izrel (ya bụ, Ifrem) n’ala Izrel. N’ebe ahụ, ha ga-abụzi “otu mba.”—Jere. 30:1-3; 31:2-9; 33:7.

6. Olee amụma abụọ e dere n’Ezikiel isi 37?

6 Amụma abụọ e dere n’Ezikiel isi 37 gbasara ịmaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe, ya bụ, amụma ọkpụkpụ kpọrọ nkụ na nke osisi abụọ, dị ịtụnanya. Jehova ga-egosi na ya bụ Chineke nke na-eme ka ndị ya dịghachi ndụ (amaokwu nke 1-14), bụrụkwa Chineke nke na-eme ka ndị ya dịrị n’otu (amaokwu nke 15-28). Ihe amụma abụọ a na-emetụ n’ahụ́ na-ekwu bụ na e nwere ike ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ, meekwa ka ndị na-adịghị n’otu dịrị n’otu.

Olee Otú Jehova Si “Kpọkọta Ha”?

7. Olee otú ihe e dere ná 1 Ihe E Mere 9:2, 3 si gosi na “ihe niile kwere Chineke omume”?

7 N’anya ụmụ mmadụ, ịhapụ ndị ahụ a dọọrọ n’agha ka ha lawa na ime ka ha dịrị n’otu yiri ihe na-agaghị eme eme. a Ma, “ihe niile kwere Chineke omume.” (Mat. 19:26) Jehova mezuru amụma o buru. N’afọ 537 T.O.N.K., ndị Babịlọn tọhapụrụ ndị Juu ha dọọrọ n’agha. Ndị si n’alaeze ebo abụọ ahụ mechara lọghachi Jeruselem ma nye aka mee ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe. Baịbụl gosiri na ihe a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ụfọdụ ndị Juda, ụfọdụ ndị Benjamin, ụfọdụ ndị Ifrem, na ụfọdụ ndị Manase gara biri na Jeruselem.” (1 Ihe 9:2, 3; Ezra 6:17) N’eziokwu, ndị si n’alaeze ebo iri bụ́ Izrel na ndị si n’alaeze ebo abụọ bụ́ Juda bịara dịrị n’otu otú Jehova buru n’amụma.

8. (a) Gịnị ka Aịzaya buru n’amụma? (b) Olee ihe abụọ dị mkpa e kwuru n’Ezikiel 37:21?

8 Ihe dị ka narị afọ abụọ (200) tupu oge a, Aịzaya onye amụma buru amụma ihe ga-eme ndị Izrel na ndị Juda mgbe ha nọchara n’ebe a dọọrọ ha n’agha. Ọ sịrị na Jehova ga-amalite ịkpọkọta “ndị Izrel a chụsara achụsa, sikwa n’ebe niile n’ụwa kpọkọta ndị Juda a chụsara achụsa,” ma ndị ‘ga-esi n’Asiria pụta.’ (Aịza. 11:12, 13, 16) N’eziokwu, Jehova si “ná mba dị iche iche ndị Izrel gara kpọpụta ha” otú o buru n’amụma. (Ezik. 37:21) Anyị kwesịrị iburu ihe abụọ dị mkpa n’obi. Nke mbụ bụ na Jehova akpọghịzi ndị Izrel a dọọrọ n’agha “ndị Juda” na “ndị Ifrem.” Kama, ọ kpọrọ ha “ndị Izrel,” ya bụ, otu ndị. Ihe ọzọ bụ na e kwuru na ndị Izrel ‘ga-esi ebe niile ha nọ’ ná mba dị iche iche lọta, ọ bụghị naanị n’otu mba, ya bụ, Babịlọn.

9. Olee otú Jehova si nyere ndị ya a dọọrọ n’agha lọtaranụ aka ka ha dịrị n’otu?

9 Mgbe ndị ahụ a dọọrọ n’agha lọtara n’Izrel, olee otú Jehova si nyere ha aka ka ha dịrị n’otu? Jehova nyere ndị Izrel ndị ọzụzụ atụrụ ga-eme ka ha na ya dịrị ná mma. Ụfọdụ n’ime ha bụ Zerubabel, Joshụa Onyeisi Nchụàjà, Ezra, na Nehemaya. Jehova nyekwara ha ndị amụma, dị ka Hagaị, Zekaraya, na Malakaị. Ụmụ nwoke ndị a nwere okwukwe. Ha gbara mbọ nyere ndị Izrel aka ka ha na-eso ntụziaka Chineke. (Nehe. 8:2, 3) Jehova chebekwara ndị Izrel ka ihe ọjọọ ndị iro ha chọrọ ime ha ghara inwe isi.—Esta 9:24, 25; Zek. 4:6.

Jehova nyere ndị ya ndị ọzụzụ atụrụ ga-eme ka ha dịrị n’otu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

10. Olee otú ihe Setan chọrọ si meere ya?

10 Ma, n’agbanyeghị ihe niile Jehova mere iji nyere ndị Izrel aka, ọtụtụ n’ime ha mechara kwụsị ife ya ezigbo ofufe. E dere ihe ha mere n’akwụkwọ Baịbụl ndị dị ka Ezra na Nehemaya. (Ezra 9:1-3; Nehe. 13:1, 2, 15) N’eziokwu, n’ime otu narị (100) afọ ndị Izrel lọtachara, ha kwụsịrị ife Jehova ezigbo ofufe, nke na Jehova gwara ha, sị: “Lọghachikwutenụ m.” (Mal. 3:7) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, okpukpe ndị Juu ekewaala, nwee òtù dị iche iche. Ndị ọzụzụ atụrụ na-edu ha anaghịkwa efe Jehova. (Mat. 16:6; Mak 7:5-8) Ihe Setan chọrọ emeerela ya. Ndị Chineke adịghịzi n’otu. Ma, amụma Jehova buru na ndị ya ga-adị n’otu ga-emezurịrị. Olee otú ọ ga-esi mezuo?

“Devid Bụ́ Ohu M Ga-abụ Eze Ha”

11. (a) Gịnị ka Jehova mere ka a mata gbasara amụma o buru na ndị ya ga-adị n’otu? (b) Gịnị ka Setan gbara mbọ ime ọzọ mgbe e si n’eluigwe chụdata ya n’ụwa?

11 Gụọ Ezikiel 37:24. Jehova mere ka a mata na amụma gbasara ime ka ndị ya dị n’otu ga-emezucha naanị mgbe “Devid bụ́ ohu” ya, ya bụ, Jizọs, ga-amalite ịchị. Ọ bụ n’afọ 1914 ka ọ malitere ịchị. b (2 Sam. 7:16; Luk 1:32) Tupu oge ahụ, e jirila “Izrel nke Chineke,” ya bụ, ndị e tere mmanụ, dochie anya mba Izrel. (Jere. 31:33; Gal. 3:29; 6:16) Setan malitekwara ịgba mbọ ka ndị Chineke ghara ịdị n’otu, karịchaa, kemgbe e si n’eluigwe chụdata ya n’ụwa. (Mkpu. 12:7-10) Dị ka ihe atụ, mgbe Nwanna Russell nwụchara n’afọ 1916, Setan ji ihe ụmụnna ndị kwụsịrị ife Chineke nọ na-eme chọọ ime ka ndị e tere mmanụ gharazie ịdị n’otu. Ma mgbe obere oge gafere, ụmụnna ndị ahụ kwụsịrị ife Chineke, sizie n’ọgbakọ pụọ. Setan mekwara ka a tụọ ụmụnna ndị na-edu ọgbakọ Jehova mkpọrọ. Ma, ihe a emeghị ka a ghara inwezi ndị na-efe Jehova. Ụmụnna ndị e tere mmanụ, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova, nọgidere na-adị n’otu.

12. Gịnị mere mbọ Setan gbara ime ka Izrel nke Chineke ghara ịdị n’otu ji kụọ afọ n’ala?

12 Izrel nke Chineke emeghị ka mba Izrel. Ha ekweghị ka Setan mee ka ha ghara ịdị n’otu. Gịnị mere mbọ Setan gbara ji kụọ afọ n’ala? Ọ bụ n’ihi na ndị e tere mmanụ gbasiri mbọ ike na-eso ntụziaka Jehova. Ọ bụ ya mere Eze ha bụ́ Jizọs Kraịst, onye ka na-emeri Setan, ji na-echebe ha.—Mkpu. 6:2.

Jehova Ga-eme Ka Ndị Ya “Bụrụ Otu”

13. Gịnị bụ isi ihe amụma e buru gbasara ijikọta osisi abụọ ọnụ na-akụziri anyị?

13 Olee otú amụma e buru gbasara ime ka osisi abụọ bụrụ otu si gbasa oge anyị a? Cheta na e buru amụma a iji gosi otú ụzọ ndị abụọ ga-esi dịrị n’otu. Ihe amụma a kacha gosi anyị bụ na ọ bụ Jehova na-eme ka ndị ya dịrị n’otu. Gịnị bụ isi ihe amụma a na-akụziri anyị gbasara ife Chineke ezigbo ofufe? E kwuo ya ná nkenke, ọ na-akụziri anyị na Jehova ga-eme ka ndị na-efe ya “bụrụ otu.”—Ezik. 37:19.

14. Kemgbe afọ 1919, olee otú amụma e buru gbasara ijikọta osisi abụọ ọnụ si na-emezu karịa otú o mezuburu?

14 Kemgbe afọ 1919, mgbe e merela ka ndị Chineke dị ọcha, ha amalite ife Jehova ezigbo ofufe, amụma e buru gbasara ijikọta osisi abụọ ọnụ malitere imezu karịa otú o mezuburu. N’oge ahụ, ọtụtụ n’ime ndị e mere ka ha dịrị n’otu nwere olileanya ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 20:6) Ndị ahụ e tere mmanụ yiri osisi “nke Juda,” ya bụ, mba ndị eze si n’agbụrụ Devid na ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị si. Ma ka oge na-aga, ọtụtụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa nọ na-esonyere ndị e tere mmanụ. Ndị ahụ nwere olileanya ibi n’ụwa yiri “osisi nke Josef, nke na-anọchi anya Ifrem,” ya bụ, mba ndị eze si n’agbụrụ Devid na ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị na-esoghị na ha. Taa, ụzọ ndị abụọ a na-efekọ Jehova ọnụ. Ọ bụ eze ha bụ́ Jizọs Kraịst na-edu ha.—Ezik. 37:24.

‘Ha Ga-abụ Ndị M’

15. Olee otú amụma e buru n’Ezikiel 37:26, 27 si na-emezu taa?

15 Amụma Ezikiel buru gosiri na ọtụtụ ndị ga-eso ndị e tere mmanụ fewe Chineke ezigbo ofufe. Jehova kwuru banyere ndị ya, sị: ‘M ga-eme ka ha mụbaa, ụlọikwuu m ga-ekpuchikwa ha.’ (Ezik. 37:26, 27; na ihe e dere n’ala ala peeji amaokwu 27.) Ihe ndị a Jehova kwuru na-echetara anyị ihe e gosiri Jọn onyeozi n’ọhụụ ihe dị ka narị afọ asaa (700) Ezikiel nwụchara. E gosiri Jọn na ‘Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze, ga-echebe’ “oké ìgwè mmadụ.” (Mkpu. 7:9, 15) Taa, ndị e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ bụzi otu mba. Ha bụ ndị Chineke. Chineke na-echebekwa ha.

16. Olee amụma Zekaraya buru banyere Izrel nke Chineke na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ịdị n’otu?

16 Zekaraya onye amụma so ná ndị si ebe a dọọrọ ha n’agha lọta. O bukwara amụma na a ga-eme ka Izrel nke Chineke na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa dịrị n’otu. Ọ sịrị na “mmadụ iri” ndị si “ná mba dị iche iche ga-ejide uwe onye Juu” ma sị ya: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.” (Zek. 8:23) Onye a a kpọrọ “onye Juu” abụghị otu onye n’ihi na a kpọkwara ya “unu” n’amaokwu a. Taa, ha nọchiri anya ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa ma ọ bụ Izrel nke Chineke. (Rom 2:28, 29) “Mmadụ iri” ahụ nọchiri anya ndị nwere olileanya ibi n’ụwa. Ha ‘jidere’ ndị e tere mmanụ aka, ‘na-esokwa’ ha. (Aịza. 2:2, 3; Mat. 25:40) Okwu bụ́ “ga-ejide” na “ga-eso unu” gosiri na ụzọ ndị abụọ a bụzi nnọọ otu.

17. Olee otú Jizọs si kọwaa otú anyị si dịrị n’otu taa?

17 Ọ ga-abụ amụma Ezikiel buru gbasara ịdị n’otu ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru na ya bụ onye ọzụzụ atụrụ, onye ga-edu atụrụ ya (ya bụ, ndị e tere mmanụ) na “atụrụ ọzọ” (ya bụ, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa) ka ha bụrụ “otu ìgwè atụrụ.” (Jọn 10:16; Ezik. 34:23; 37:24, 25) N’eziokwu, ihe a Jizọs kwuru na ihe ndị amụma oge ochie kwuru kọwara nnọọ otú ndị Chineke si efekọ Jehova ọnụ n’oge a n’agbanyeghị olileanya onye nke ọ bụla nwere. N’agbanyeghị na okpukpe ụgha ekewaala, nwezie òtù dị iche iche, anyị dị n’otu. Ihe a bụ ọrụ ebube.

Taa, ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” na-efekọ Jehova ọnụ. Ha bụ “otu ìgwè atụrụ” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

“Ụlọ Nsọ M Ga-adị Ebe Ha Nọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

18. Dị ka e kwuru n’Ezikiel 37:28, gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka ndị Chineke ‘ghara ịbụ nke ụwa’?

18 Okwu ikpeazụ Ezikiel kwuru n’amụma o buru gbasara ịdị n’otu gosiri na e nweghị ihe ga-eme ka anyị kwụsị ịdị n’otu. (Gụọ Ezikiel 37:28.) Ndị Jehova dị n’otu n’ihi na ụlọ nsọ Jehova dị “ebe ha nọ,” ya bụ, na ha na-efe Chineke ezigbo ofufe. Ụlọ nsọ ya agaghị apụ apụ n’ebe ha nọ ma ọ bụrụhaala na ha edoo onwe ha nsọ ma ọ bụ dịrị iche n’ụwa Setan. (1 Kọr. 6:11; Mkpu. 7:14) Jizọs kwusiri ike na ndị na-eso ụzọ ya ekwesịghị ịbụ nke ụwa. Mgbe ọ na-ekpe ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị: “Nna dị nsọ, chebe ha . . . ka ha wee bụrụ otu . . . Ha abụghị nke ụwa . . . Jiri eziokwu doo ha nsọ.” (Jọn 17:11, 16, 17) Ị̀ hụrụ na Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ “otu” maka na ha “abụghị nke ụwa”?

19. (a) Olee otú anyị si egosi na anyị ‘na-eme ka Chineke’? (b) Ná mgbede ikpeazụ tupu Jizọs anwụọ, gịnị bụ ihe dị mkpa o kwuru banyere ịdị n’otu?

19 Ọ bụ naanị otu ugboro ahụ ka e dere n’Akwụkwọ Nsọ na Jizọs kpọrọ Chineke “Nna dị nsọ.” N’eziokwu, e nweghị onye dị nsọ ka Jehova, ọ na-emekwa ihe ziri ezi. Jehova nyere ndị Izrel oge ochie iwu, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.” (Lev. 11:45) Ebe ọ bụ na anyị ‘na-eme ka Chineke,’ anyị kwesịrị ịna-edebe iwu a n’ihe niile anyị na-eme. (Efe. 5:1; 1 Pita 1:14, 15) E kwuo na mmadụ “dị nsọ,” ọ pụtara na onye ahụ “dị iche.” Ọ bụ ya mere na ná mgbede ikpeazụ tupu Jizọs anwụọ, ọ gwasiri ndị na-eso ụzọ ya okwu ike na ha ga-adị n’otu ma ọ bụrụ na ha adị iche n’ụwa ma ghara ikewa otú ndị ụwa na-eme.

“Chebe Ha n’Ihi Ajọ Onye Ahụ”

20, 21. (a) Gịnị mere obi ji esikwu anyị ike na Jehova na-echebe ndị ya? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ịna-eme?

20 Otú Ndịàmà Jehova n’ụwa niile si dị n’otu taa enweghị atụ. O gosiri na Jehova zara ekpere Jizọs kpere, sị: “Chebe ha n’ihi ajọ onye ahụ.” (Gụọ Jọn 17:14, 15.) Anyị ahụla na mbọ niile Setan na-agba ka o mee ka ndị Chineke ghara ịdị n’otu akụọla afọ n’ala. N’eziokwu, ihe a na-eme ka obi na-esikwu anyị ike na Chineke na-echebe ndị ya. N’amụma Ezikiel buru, Jehova kwuru na osisi abụọ ga-abụ otu n’aka ya. N’ihi ya, ọ bụ Jehova rụrụ ọrụ ebube, mee ka ndị ya dịrị n’otu. Ọ na-echebekwa ha ka Setan ghara ịkpara ha aka.

21 Gịnịzi ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme? Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’otu. Olee ihe dị mkpa onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme ka anyị na-adị n’otu? Ihe anyị ga-eme bụ ịna-efe Jehova ezigbo ofufe mgbe niile n’ụlọ nsọ ihe atụ ya. N’Isi nke 14 na nke 15, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi eme ya.

a Ihe dị ka narị afọ abụọ (200) tupu Ezikiel ebuo amụma a, ndị Asiria dọọrọ alaeze ebo iri (ya bụ, “osisi nke Josef, nke na-anọchi anya Ifrem”) n’agha.—2 Eze 17:23.

b A kọwara amụma a nke ọma n’Isi nke 8 n’akwụkwọ a.