Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 9

“M Ga-eme Ka Unu Nwee Otu Obi”

“M Ga-eme Ka Unu Nwee Otu Obi”

EZIKIEL 11:19

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe amụma ndị dị n’akwụkwọ Ezikiel kwuru gbasara otú a ga-esi mee ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe

1-3. Olee otú ndị Babịlọn si akwa ndị na-efe Jehova emo? Gịnị mere ha ji eme ya?

 WEREGODỊ ya na i so ná ndị Juu bi na Babịlọn, ndị ji obi ha niile na-efe Chineke. A dọọrọ gị na ndị obodo unu n’agha bịa n’obodo a kemgbe ihe dị ka afọ iri ise gara aga. Gị na ndị ibe gị na-efe Jehova ga-ezukọta ka unu fee Jehova n’Ụbọchị Izu Ike, otú unu si emebu. Mgbe ị na-aga n’ebe unu ga-ezukọ, ị gafere okporo ámá ndị na-ekwo ekwo ma hụ nnukwu ụlọ arụsị dị iche iche, hụkwa ọtụtụ ihu arụsị. Ị hụrụ na ọtụtụ ndị na-aga n’ebe ndị ahụ, na-achụ àjà ma na-abụrụ chi ha dị iche iche abụ, dị ka Maduk.

2 Ugbu a, ị gafeela ebe ndị ahụ ndị mmadụ juru, rutezie ebe ndị ibe gị na-efe Jehova nọ. a Unu chọtara ebe dị jụụ. O nwere ike ịbụ n’akụkụ mmiri, ka unu kpee ekpere, bụọ abụ ma chebara ihe e dere n’Okwu Chineke echiche. Ka unu na-ekpe ekpere, ị nọ na-anụ mkpọtụ ụgbọ epeepe ndị a kwọ na-aga n’elu mmiri. Obi dị gị ụtọ na obi ruru unu ala n’ebe a. Ị na-ekpe ekpere ka ndị nwe obodo ghara ịchọta unu, bịa tisaa nnọkọ a otú ha na-emekarị. Gịnị mere ha ji eme ya?

3 Ndị Babịlọn emeriela mba dị iche iche n’agha. Ha na-ekwukwa na ọ bụ chi ụgha ha mere ha ji akpa ike otú a. Ndị Babịlọn chere na mbibi ha bibiri Jeruselem gosiri na chi ha bụ́ Maduk ka Jehova ike. N’ihi ya, ha na-eji ndị Juu ibe gị na Chineke unu eme ihe ọchị. Mgbe ụfọdụ, ha na-akwa unu emo, sị: “Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ ndị a na-abụ na Zayọn.” (Ọma 137:3) Ihe e kwuru n’ọtụtụ abụ ọma bụ otú Zayọn si merie ndị iro Jehova. Ọ ga-abụ na ndị Babịlọn na-achọ ka ha jiri abụ ọma ndị ahụ mere ihe ọchị. Ma, e nwekwara abụ ọma ndị kwuru gbasara ndị Babịlọn. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Ha emeela ka Jeruselem bụrụzie obodo e bibiri ebibi. . . . Ndị gbara anyị gburugburu na-akparị anyị ma na-akwa anyị emo.”—Ọma 79:1, 3, 4.

4, 5. Gịnị bụ olileanya amụma Ezikiel mere ka ndị Chineke nwee? Gịnịkwa ka anyị ga-eleba anya na ya n’isi nke itoolu a? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 E nwekwara ndị Juu ndị kwụsịrị ife Jehova fewe arụsị. Ha na-achịkwa gị ọchị maka na i nwere okwukwe na Jehova nakwa ná ndị amụma ya. Ihe ọ sọrọ ha mee, ife Chineke otú ọ chọrọ na-eme ka obi na-atọ gị na ndị ezinụlọ gị ụtọ. Ikpekọ ekpere ọnụ na ịbụkọ abụ ọnụ na-eme ka obi ruo unu ala. Ịgụ Okwu Chineke na-emekwa ka ahụ́ ruo unu ala. (Ọma 94:19; Rom 15:4) Weregodị ya na n’otu ụbọchị, otu n’ime ndị gị na ha so efe Jehova wetara ihe pụrụ iche ná nnọkọ unu, ya bụ, akwụkwọ mpịakọta e dere amụma Ezikiel. Obi na-atọ gị ụtọ ịnụ nkwa Jehova kwere na ọ ga-eme ka ndị ya laghachi n’obodo ha. Obi bụ gị sọ aṅụrị ka a na-agụpụta amụma a, gị ana-atụ anya na otu ụbọchị, gị na ndị ezinụlọ gị ga-alaghachi n’obodo unu, soro mee ka amụma a pụrụ iche mezuo.

5 N’amụma Ezikiel, e kwere nkwa ugboro ugboro na a ga-eme ka a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe. Ka anyị leba anya ná nkwa ndị ahụ na-eme ka ndị Chineke nwee olileanya. Olee otú nkwa ndị ahụ si mezuoro ndị ahụ a dọọrọ n’agha? Olee otú amụma ndị ahụ si mezuo n’oge anyị a? N’ụfọdụ n’ime amụma ndị ahụ, anyị ga-eleba anya n’otú ha ga-esi emezu nke ikpeazụ ha n’ọdịnihu.

“A Ga-adọrọ Ha n’Agha, Ha Agaa Biri n’Ala Ọzọ”

6. Olee otú Chineke si dọọ ndị ya nupụụrụ ya isi aka ná ntị ugboro ugboro?

6 Jehova si n’ọnụ Ezikiel gwa ndị ya hoo haa otú ọ ga-esi ata ha ahụhụ maka na ha nupụụrụ ya isi. Jehova sịrị: “A ga-adọrọ ha n’agha, ha agaa biri n’ala ọzọ.” (Ezik. 12:11) Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 6 n’akwụkwọ a, Ezikiel medịrị ihe ndị gosiri ahụhụ Jehova ga-ata ndị nnupụisi ahụ. Mana, ihe ahụ abụghị nke mbụ Jehova na-adọ ndị Izrel aka ná ntị. N’oge Mosis, ya bụ, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu puku (1,000) afọ tupu oge Ezikiel, Jehova dọrọ ndị ya aka ná ntị na ọ bụrụ na ha anọgide na-enupụrụ ya isi, a ga-adọrọ ha n’agha laa mba ọzọ. (Diut. 28:36, 37) Ndị amụma ndị dị ka Aịzaya na Jeremaya dọkwara ndị Chineke aka ná ntị na a ga-adọrọ ha n’agha.—Aịza. 39:5-7; Jere. 20:3-6.

7. Olee ụzọ dị iche iche Jehova si taa ndị ya ahụhụ?

7 Ma, ọ dị mwute na aka ná ntị ahụ a dọrọ ha dị ka ịwụsa mmiri n’elu okwute. Ka oge na-aga, obi gbawara Jehova n’ihi otú ndị ya si soro ndị na-azụ ha na-enupụrụ ya isi, na-ekpere arụsị, na-eme omume rụrụ arụ ma na-arụrụ aka. Chineke kweziri ka ụnwụ daa n’obodo ha. Ụnwụ ahụ bụ nnukwu ọdachi na ihe ihere ebe ọ bụ na ala ha bụ “ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ezik. 20:6, 7) Jehova kweziri ka a taa ndị ya na-enupụrụ ya isi ahụhụ, ya bụ, ka a dọrọ ha n’agha laa mba ọzọ, otú ọ gwaburu ha na ọ ga-eme. N’afọ 607 T.O.N.K., Nebukadneza, eze Babịlọn, bịara sụọ ha akwụ, bibie Jeruselem na ụlọ nsọ dị na ya. A dọọrọ ọtụtụ puku ndị Juu, ndị fọrọnụ, n’agha laa Babịlọn. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e ji ha na-eme ihe ọchị ma na-emesi ha ike, otú anyị kwuru ná mmalite isiokwu a.

8, 9. Olee otú Chineke si dọọ ọgbakọ Ndị Kraịst aka ná ntị banyere ndị ga-akwụsị iso Kraịst ma duhiewe ndị ọzọ?

8 À dọọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst n’agha otú a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn? Ee. Dị ka e meere ndị Juu oge ochie, a dọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst aka ná ntị tupu oge eruo. Obere oge Jizọs malitechara ozi ya, ọ sịrị: “Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu ka à ga-asị na ha bụ atụrụ, ma ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji.” (Mat. 7:15) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dọọkwa Ndị Kraịst aka ná ntị yiri nke ahụ. Ọ sịrị: “Ama m na mgbe m na-anọghịzi ya, anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri ga-abata ebe unu nọ. Ha agaghịkwa emere ìgwè atụrụ Chineke ebere. Ụfọdụ ndị n’ime unu ga-ebidokwa ịna-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.”—Ọrụ 20:29, 30.

9 A kụziiri Ndị Kraịst otú ha ga-esi amata ndị ọjọọ ahụ ma zere ha. A gwara ndị okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka ha si n’ọgbakọ chụpụ ndị kwụsịrị iso Kraịst ma na-eduhie ndị ọzọ. (1 Tim. 1:19; 2 Tim. 2:16-19; 2 Pita 2:1-3; 2 Jọn 10) Ma, ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst mere ka ndị Izrel na ndị Juda oge ochie. Ha ji nwayọọ nwayọọ jụ aka ná ntị a nọ na-adọ ha. N’ihe dị ka n’afọ 100 O.N.K., ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ akwụsịla iso Kraịst. Ọ bụ Jọn onyeozi bụ onyeozi ikpeazụ ka nọ ndụ n’ihe dị ka n’afọ 100 O.N.K. O kwuru na ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ n’oge ahụ na-arụrụ aka ma na-enupụ isi. Ọ bụ naanị ya bụ onye fọrọ ndụ nọ na-egbochi ihe ọjọọ ahụ na-emenụ. (2 Tesa. 2:6-8; 1 Jọn 2:18) Gịnị meziri mgbe Jọn nwụrụ?

10, 11. Olee otú ihe atụ Jizọs mere gbasara ọka wit na ata si mezuo malite na mgbe afọ 100 O.N.K. gachara gawazie?

10 Mgbe Jọn nwụchara, ihe atụ Jizọs mere gbasara ọka wit na ata malitere imezu. (Gụọ Matiu 13:24-30.) Dị ka Jizọs kwuru, Setan kụrụ ata, ma ọ bụ Ndị Kraịst adịgboroja, n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị Kraịst adịgboroja a malitekwara imebisị ọgbakọ n’ike n’ike. Ha ji ikpere arụsị, ememme na omenala ndị ọgọ mmụọ, nkụzi ụgha ndị si n’aka ndị ọkachamara ndị na-ekweghị na Chineke, nakwa okpukpe ụgha ndị na-akwado Setan metọọ ọgbakọ ahụ Ọkpara Chineke malitere. O doro anya na obi gbawara Jehova ịhụ ka e metọrọ ọgbakọ ahụ. Gịnịzi ka Jehova mere? O kwere ka a dọrọ Ndị Kraịst n’agha otú ahụ e mere ndị Izrel nupụụrụ ya isi. Malite n’ihe dị ka afọ 100 O.N.K. gawa, o siziri ike ịmata ezigbo Ndị Kraịst ndị yiri ọka wit n’ihi na Ndị Kraịst adịgboroja karịziri akarị. E nwere ike ikwu na Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, dọọrọ ezigbo Ndị Kraịst n’agha. Ndị Kraịst adịgboroja ahụ soziiri okpukpe ụgha ndị ọzọ mewe otú masịrị ha. Mgbe Ndị Kraịst adịgboroja ahụ bịara dịkwuo ọtụtụ, e bidoziri inwe chọọchị dị iche iche sị na ha bụ Ndị Kraịst.

11 N’ọtụtụ narị afọ Ndị Kraịst adịgboroja nọ na-akpa ike n’ụwa, e nwere ụfọdụ ezigbo Ndị Kraịst nọnụ, ndị bụ́ ọka wit Jizọs kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ. Ha mere ihe ndị Juu a dọọrọ n’agha mere, otú e kwuru n’Ezikiel 6:9. Ha chetara ezi Chineke. Ụfọdụ n’ime ha kpebisiri ike na ha agaghị ekweta ụgha Ndị Kraịst adịgboroja na-akụzi. E ji ha mere ihe ọchị, kpagbuokwa ha. Jehova ò bu n’obi ịhapụ ndị ya ka ha nọrọzie n’okpukpe ụgha? Mba. Jehova were iwe otú kwesịrị ekwesị, ruokwa oge kwesịrị ekwesị, otú o mere n’oge ndị Izrel. (Jere. 46:28) Jehova mekwara ka ndị ya nwee olileanya. Ka anyị laghachi n’akụkọ ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha laa Babịlọn n’oge ochie ma hụ otú Jehova si mee ka ha nwee olileanya na a ga-emecha hapụ ha ka ha laghachi n’obodo ha.

Babịlọn Ukwu ahụ kpagburu ezigbo Ndị Kraịst ruo ọtụtụ narị afọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10, 11)

“Iwe M Ga-adajụ”

12, 13. Gịnị mere iwe Jehova wesoro ndị ya a dọọrọ n’agha n’oge Ezikiel ji mechaa dajụọ?

12 Jehova gwara ndị ya hoo haa na ọ ga-ewesa ha iwe. Ma, o mekwara ka obi sie ha ike na iwe kwesịrị ekwesị ọ na-ewe agaghị adịru ebighị ebi. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị: “M mechaa ha ihe a iji gosi na iwe ji m, obi ga-ajụrụ m. Iwe m ga-adajụ, obi ga-adịkwa m mma. Ha ga-amarakwa na mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe ndị a n’ihi na m chọrọ ka a na-efe naanị m.” (Ezik. 5:13) Gịnị mere iwe Jehova ga-eji mechaa dajụọ?

13 Ọ bụ n’ihi na n’ime ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha, e nwekwara ndị na-erubere Jehova isi. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova si n’ọnụ Ezikiel buo amụma na ụfọdụ n’ime ndị ya ga-anọ n’ebe a dọọrọ ha n’agha chegharịa. Ndị Juu ahụ chegharịrịnụ ga-echeta ihe na-eme ihere ha mere mgbe ha nupụụrụ Jehova isi. Ha ga-arịọkwa Jehova ka ọ gbaghara ha ma meere ha amara. (Ezik. 6:8-10; 12:16) Ezikiel, Daniel, na ndị enyi ya atọ so ná ndị na-erubere Jehova isi. Daniel nọrọ ogologo ndụ nke na ọ hụrụ ma mgbe a dọọrọ ndị Izrel n’agha ma mgbe ha laghachiri n’obodo ha. Na Daniel isi 9, ị ga-ahụ ekpere Daniel ji obi ya niile kpee iji gosi na o chegharịala ná mmehie ndị Izrel mere. O doro anya na ihe ndị ahụ o kwuru bụ ihe dị n’obi ọtụtụ puku ndị Izrel a dọọrọ n’agha ndị nọ na-achọ ka Jehova gbaghara ha ma bidokwa gọziwe ha. Ị̀ hụla ihe mere nkwa ndị e kwere ịtọhapụ ndị Izrel na ime ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe, bụ́ ndị e si n’ike mmụọ nsọ dee n’akwụkwọ Ezikiel, ji mee ndị Chineke obi ụtọ?

14. Gịnị mere Jehova ga-eji eme ka ndị ya laghachi n’obodo ha?

14 Ma, e nwere ihe ọzọ ka mkpa mere a ga-eji tọhapụ ndị Jehova ma mee ka ha maliteghachi ife ya ezigbo ofufe. Ọ bụghị maka na e kwesịrị ịtọhapụ ha, kama ọ bụ maka na oge eruola ọzọ ka Jehova mee ka e doo aha ya nsọ n’anya mba niile. (Ezik. 36:22) Ọ ga-edo ndị Babịlọn anya na chi ọjọọ ha niile, dị ka Maduk, enweghị ebe ha ruru Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova. Ka anyị leba anya ná nkwa ise Jehova si n’ike mmụọ nsọ gwa Ezikiel ka ọ gwa ndị Izrel ibe ya a dọọrọ n’agha. Anyị ga-ebu ụzọ kwuo otú nkwa nke ọ bụla si baara ndị ahụ na-erubere Jehova isi uru, anyị ahụzie otú ha ga-esi emezu karịa otú ha mezuburu.

15. Olee ihe ga-agbanwe n’otú ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta ga-esi na-efe ofufe?

15 NKWA NKE 1. A ga-akwụsị ikpere arụsị, kwụsịkwa ime ihe ndị ọzọ na-asọ oyi gbasara okpukpe ụgha. (Gụọ Ezikiel 11:18; 12:24.) E kwuru n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a na a nọ na Jeruselem nakwa n’ụlọ nsọ dị na ya na-eme ihe ndị jọgburu onwe ha ndị na-ekpe okpukpe ụgha na-eme, dị ka ikpere arụsị. N’ihi ya, ndị Izrel bụzi ndị rụrụ arụ, ha na Jehova adịghịzi ná mma. Jehova si n’ọnụ Ezikiel buo amụma na oge na-abịa mgbe ndị ahụ a dọọrọ n’agha ga-efe Chineke ezigbo ofufe, nke a na-emerụghị emerụ. Ọ bụ naanị mgbe ndị Izrel mere ihe a dị ezigbo mkpa, ya bụ, mgbe ha maliteghachiri ife Chineke ezigbo ofufe, ka ngọzi ndị ọzọ ga-eru ha aka.

16. Olee nkwa Jehova kwere gbasara ala ndị Izrel?

16 NKWA NKE 2. Ha ga-alaghachi n’ala ha. Jehova gwara ndị ahụ a dọọrọ n’agha, sị: ‘M ga-enye unu ala Izrel.’ (Ezik. 11:17) Nkwa a pụrụ iche n’ihi na ndị Babịlọn, ndị na-akwa ndị Chineke a dọọrọ n’agha emo, mere ka ha ghara ịtụ anya na ha ga-emecha laghachi n’obodo ha. (Aịza. 14:4, 17) Ma, ọ bụrụ na ha alaghachi ma nọgide na-erubere Jehova isi, ala ha ga na-eme nri nke ọma, mee ka ha nwee ihe ndị ha ga na-eri na ezigbo ọrụ ndị ha ga na-arụ. Ihere na nsogbu ụkọ nri na-akpata ga-abụzi ihe mgbe ochie.—Gụọ Ezikiel 36:30.

17. N’ihe gbasara àjà a na-achụrụ Jehova, gịnị ga-eme?

17 NKWA NKE 3. A ga-amaliteghachi ịchụ àjà n’ebe ịchụàjà Jehova. E kwuru n’Isi nke 2 n’akwụkwọ a na ịchụ àjà na inye onyinye bụ ụzọ dị mkpa Iwu Mosis kwuru e si efe Chineke ezigbo ofufe. Ọ bụrụhaala na ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta ana-erubere Jehova isi ma na-efe naanị ya, ọ ga-anabata àjà ndị ha ga na-achụrụ ya. A ga-esi otú ahụ na-ekpuchiri ha mmehie ha, ha na Jehova adịrị n’ezigbo mma. Jehova kwere nkwa, sị: “Ndị Izrel niile ga-efe m n’obodo a . . . Ihe unu na-eme ebe ahụ ga-atọ m ụtọ. M ga-atụkwa anya ka unu nye m onyinye, jirikwa mkpụrụ mbụ ndị mịịrị unu, ya bụ, ihe niile dị nsọ unu nwere, chụọrọ m àjà ebe ahụ.” (Ezik. 20:40) A ga-eme ka ndị Chineke maliteghachi ife ya ezigbo ofufe, ngọzi ezoweziere ha ka mmiri.

18. Olee otú Jehova ga-esi lekọta atụrụ ya?

18 NKWA NKE 4. A ga-ewepụ ndị ọzụzụ atụrụ ọjọọ. Isi ihe mere ndị Chineke ji mewe ihe ndị jọgburu onwe ha bụ ndị ọjọọ na-elekọta ha. Jehova kwere nkwa na ọ ga-eme ka ihe a gbanwee. O kwuru gbasara ndị ọzụzụ atụrụ ọjọọ ahụ, sị: ‘M ga-akwụsị ha ịzụ atụrụ m. M ga-anapụta atụrụ m n’ọnụ ha.’ Ma, Jehova gwara ndị na-erubere ya isi, sị: “M ga-elekọta atụrụ m.” (Ezik. 34:10, 12) Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-eme ka ụmụ nwoke na-erubere ya isi, ndị a tụkwasịrị obi, bụrụ ndị na-azụ atụrụ ya.

19. Gịnị ka Jehova kwere ndị ya ná nkwa gbasara ịdị n’otu?

19 NKWA NKE 5. Ndị na-efe Jehova ga-adị n’otu. Tupu a dọrọ ndị Chineke n’agha, chegodị otú obi ga na-esi ajọ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke njọ maka na ndị Chineke adịghị n’otu. Ndị amụma ụgha na ndị ọzụzụ atụrụ na-anaghị akwụwa aka ọtọ mere ka ndị Chineke nupụrụ ezigbo ndị amụma na-anọchi anya Jehova isi. Ndị Chineke bịaziri nọrọ n’òtù dị iche iche ndị na-emegide ibe ha. Otu n’ime ihe ndị kacha eme obi ụtọ ná nlaghachi ndị Chineke ga-alaghachi n’obodo ha bụ nkwa Chineke si n’ọnụ Ezikiel kwe ha. Ọ sịrị: “M ga-eme ka unu nwee otu obi, meekwa ka mmụọ m na-akpa ike n’ahụ́ unu.” (Ezik. 11:19) Ọ bụrụhaala na ndị Juu ahụ lọtara alọta na Jehova Chineke adịrị n’udo, ha na ibe ha adịrịkwa ná mma, e nweghị onye iro ga-emerili ha. Ndị Juu niile ka nwere ike ịnọ n’obodo ha na-eto Jehova, kama ịkparị ya na imechu ya ihu.

20, 21. Olee otú nkwa ndị Chineke kwere si mezuo n’isi ndị Juu a dọọrọ n’agha lọghachiri n’obodo ha?

20 Nkwa ise ndị ahụ hà mezuru n’isi ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta? Anyị kwesịrị icheta ihe Joshụa, nwoke nwere okwukwe n’oge ochie, kwuru. Ọ sịrị: “O nweghị otu n’ime ọmarịcha nkwa niile Jehova bụ́ Chineke unu kwere unu nke na-emezughị. Ha niile emezuolara unu. O nweghị nke n’ime ha na-emezughị.” (Josh. 23:14) Ebe Jehova mezuru nkwa ya n’oge Joshụa, ọ ga-emezukwa nkwa o kwere ndị Juu ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta n’obodo ha.

21 Ndị Juu ahụ kwụsịrị ikpere arụsị, kwụsịkwa ihe ndị ọzọ jọgburu onwe ha ha na-eme ma ha fewe arụsị. N’agbanyeghị na o yiri ihe na-enweghị ike ime eme, ha laghachiri n’obodo ha, malite ịkọ ihe n’ala ha, ihe ana-agazikwara ha n’ebe ahụ. Otu n’ime ihe ndị mbụ ha mere bụ ịrụghachi ebe ịchụàjà Jehova na Jeruselem ma malite ịchụrụ ya àjà ọ na-anabata n’ebe ahụ. (Ezra 3:2-6) Jehova nyere ha ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ. Otu n’ime ha bụ onye nchụàjà a tụkwasịrị obi na odeakwụkwọ aha ya bụ Ezra. Ndị ọzọ bụ ndị gọvanọ aha ha bụ Nehemaya na Zerubabel, Nnukwu Onye Nchụàjà aha ya bụ Joshụa, nakwa ndị amụma obi siri ike aha ha bụ Hagaị, Zekaraya, na Malakaị. Ọ bụrụhaala na ndị Chineke ana-erubere ya isi ma na-eso ntụziaka ya, ha ga-adị n’otu otú ha na-adịbeghị kemgbe ogologo oge.—Aịza. 61:1-4; gụọ Jeremaya 3:15.

22. Olee otú anyị si mara na amụma ndị e buru gbasara ime ka a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe ka ga-emezu karịa otú ha mezuburu?

22 O doro anya na otú mbụ Jehova si mezuo nkwa ndị o kwere gbasara ime ka a maliteghachi ife ya ezigbo ofufe gbara ndị Juu ume. Ma, otú amụma ndị ahụ si mezuo enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere otú ha ka ga-esi emezu. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ maka na ọ bụ naanị mgbe ndị Juu na-erubere Jehova isi ma na-eme ihe o kwuru ka Jehova mezuru nkwa ndị ahụ. Ndị Juu mechakwara nupụwere Jehova isi ọzọ ma jụ ime ihe o kwuru. Ma dị ka Joshụa kwuru, okwu Jehova na-emezu mgbe niile. N’ihi ya, nkwa ndị Jehova kwere ka ga-emezu karịa otú ha mezuburu. Ha ga-abakwara ndị mmadụ uru ruo mgbe ebighị ebi. Ka anyị hụ otú ha si mee.

‘Ihe Unu Na-eme Ga-atọ M Ụtọ’

23, 24. Olee mgbe ‘oge a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ’ malitere, oleekwa otú o si malite?

23 Ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl mere ka o doo anyị anya na oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ a malitere n’afọ 1914. Ma, ihe a anaghị eme ka obi na-ajọ ndị na-efe Jehova njọ. N’eziokwu, Baịbụl gosiri na e nwere ihe na-eme obi ụtọ malitere n’afọ 1914, bụ́ ‘oge a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ.’ (Ọrụ 3:21) Olee otú anyị si mara? Ì chetara ihe mere n’eluigwe n’afọ 1914? E chiri Jizọs Kraịst bụ́ Mezaya Eze. Olee otú ihe ahụ merenụ si bụrụ mmalite nke oge a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ? Cheta na Jehova kwere Eze Devid nkwa na ndị si n’ezinụlọ ya ga na-achị ruo mgbe ebighị ebi. (1 Ihe 17:11-14) Ọchịchị ha kwụsịtụrụ n’afọ 607 T.O.N.K. mgbe ndị Babịlọn bibiri Jeruselem ma mee ka ndị eze si n’ezinụlọ Devid kwụsị ịchị.

24 Nwa nke mmadụ, bụ́ Jizọs, si n’ezinụlọ Devid. N’ihi ya, o ruuru ya ịbụ eze ga-anọ n’ocheeze Devid chịa. (Mat. 1:1; 16:13-16; Luk 1:32, 33) N’afọ 1914, mgbe Jehova mere ka Jizọs nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe, ‘oge a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ’ malitere. Oge ruziri ka Jehova si n’aka eze ahụ zuru okè mee ka a maliteghachi ife ya ezigbo ofufe.

25, 26. (a) Olee mgbe e si n’ebe a dọọrọ ndị Chineke n’agha na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ ha? Olee otú anyị si mara? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Mere n’Afọ 1919?”) (b) Gịnị malitere imezu n’afọ 1919 gawazie?

25 Otu n’ime ihe mbụ Kraịst mere mgbe ọ ghọrọ eze bụ iso Nna ya leba anya n’otú ndị Chineke nọ n’ụwa si na-efe Nna ya. (Mal. 3:1-5) Ihe Jizọs kwuru n’ihe atụ ọka wit na ata gosiri na o teela o siwere ike ịmata ihe dị iche n’ọka wit na ata, ya bụ, ihe dị iche n’ezigbo Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị nke adịgboroja. b Ma, ozugbo a malitere iwe ihe ubi n’afọ 1914, ihe dị iche na ha abụọ bịaziri doo anya. Ọtụtụ iri afọ tupu afọ 1914, Ndị Mmụta Baịbụl ndị ji obi ha niile na-efe Chineke nọ na-agba ihe ọjọọ niile Ndị Kraịst adịgboroja nọ na-eme n’anwụ. Ha malitekwara isi n’òtù a rụrụ arụ na-apụta. Oge Jehova ga-eme ka ha maliteghachi ife ya ezigbo ofufe eruola. N’ihi ya, ná mmalite afọ 1919, bụ́ afọ ole na ole oge owuwe ihe ubi malitechara, e si na Babịlọn Ukwu ahụ, ebe a dọọrọ ndị Chineke n’agha, tọhapụ ha kpamkpam. (Mat. 13:30) Otú a ka ha si nwere onwe ha.

26 Amụma ndị Ezikiel buru gbasara otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe maliteziri imezu karịa otú ndị Chineke hụrụla ha si mezuo n’oge ochie. Ka anyị hụzie otú nkwa ise ndị ahụ anyị lebara anya si mezuo karịa otú ha mezuburu.

27. Olee otú Chineke si mee ka ndị ya kwụsị ikpere arụsị?

27 NKWA NKE 1. A ga-akwụsị ikpere arụsị, kwụsịkwa ihe ndị ọzọ na-asọ oyi a na-eme sị na a na-ekpere Chineke. N’agbata afọ 1870 na afọ 1900, Ndị Kraịst ndị ji obi ha niile na-efe Chineke na-ezukọta ọnụ, ha malitekwara ịhapụ ihe ndị okpukpe ụgha na-eme. Ha kwụsịrị ife chi atọ n’ime otu. Ha kwụsịkwara ịkụzi na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ nakwa na e nwere ọkụ ala mmụọ, maka na nkụzi niile a esighị na Baịbụl. Kama, ọ bụ ndị na-ekpe okpukpe ụgha malitere ha. Ọ bịakwara doo ha anya na iji ihe a kpụrụ akpụ efe Chineke bụ ikpere arụsị. Ndị Chineke ji nwayọọ nwayọọ ghọta na iji obe efe Chineke bụkwa ikpere arụsị.—Ezik. 14:6.

28. Olee otú ihe si dịrị ndị Jehova mgbe ha hapụrụ Babịlọn Ukwu ahụ?

28 NKWA NKE 2. E mere ka ndị Chineke maliteghachi ife ya ezigbo ofufe. Mgbe Ndị Kraịst ndị ji obi ha niile na-efe Chineke hapụrụ okpukpe ụgha dị iche iche so na Babịlọn Ukwu ahụ, ha malitere ife Chineke ezigbo ofufe otú ezigbo Ndị Kraịst n’oge ochie mere. N’ihi ya, Jehova gọziri ha ma na-akụziri ha ihe, ha ana-eriju nri si n’Okwu Chineke afọ. Ihe a mere ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma, e nweghịkwa ihe kọrọ ha. (Gụọ Ezikiel 34:13, 14.) N’Isi nke 19 n’akwụkwọ a, anyị ka ga-ahụkwu na Jehova agọziela ndị ya. Ọ na-eme ka nri si n’Okwu Chineke na-ezoro ha ka mmiri. Nri a na-eme ka ya na ha na-adịkwu ná mma.—Ezik. 11:17.

29. Olee otú e si mee ka a gbapụ ọrụ ikwusa ozi ọma ọsọ n’afọ 1919?

29 NKWA NKE 3. A maliteghachiri ịchụ àjà n’ebe ịchụàjà Jehova. N’oge ndịozi, a kụziiri Ndị Kraịst na àjà ha ga na-achụrụ Chineke abụghị anụmanụ nkịtị. Kama, ọ bụ onyinye ka nnọọ mma, ya bụ, ihe ndị ha na-ekwu mgbe ha na-eto Jehova na ihe ndị ha na-akụziri ndị ọzọ gbasara ya. (Hib. 13:15) N’ime ọtụtụ narị afọ ahụ a dọọrọ ndị Chineke n’agha, e nweghị nzukọ na-eduzi ha n’ife Chineke ofufe nakwa n’ikwusa ozi ọma. Ma, mgbe ọ fọrọ obere ka ndị Chineke si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, ha amalitela ịchụrụ ya àjà ndị ahụ. Ha nọ na-ekwusasi ozi ọma ike, jirikwa obi ụtọ na-eto Chineke n’ọmụmụ ihe ha. Malite n’afọ 1919 gawa, “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ji ọrụ ikwusa ozi ọma kpọrọkwuo ihe ma hazie otú ka mma a ga-esi na-ekwusa ya, ka e nwee ike kwusaara ya mmadụ niile. (Mat. 24:45-47) Ihe a meziri ka ndị na-efe Jehova ma na-eto aha nsọ ya na-adịkwu ọtụtụ n’ebe ịchụàjà ya.

30. Gịnị ka Jizọs mere iji hụ na e nwere ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ ga na-azụ ndị Chineke?

30 NKWA NKE 4. A ga-ewepụ ndị ọzụzụ atụrụ ọjọọ. Kraịst mere ka ndị Chineke nwere onwe ha n’aka ndị ọzụzụ atụrụ obi tara mmiri e nwere na chọọchị ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst. N’ọgbakọ Kraịst, e wepụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ndị kpara àgwà ka ndị ọzụzụ atụrụ ọjọọ ahụ, ka ha kwụsị idu ndị Chineke. (Ezik. 20:38) Ebe Jizọs bụ Ezigbo Onye Ọzụzụ Atụrụ, o mere ka a na-elekọta atụrụ ya nke ọma. N’afọ 1919, ọ họpụtara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche ka o lekọtawa atụrụ ya. Ọ bụ ụmụnna ole na ole ahụ bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, na-ahụ na e nyere ndị Chineke nri si n’Okwu Chineke. N’ihi ya, a na-elekọta ndị Chineke nke ọma. Ka oge na-aga, a zụrụ ndị okenye ka ha na-enye aka n’ilekọta “ìgwè atụrụ Chineke.” (1 Pita 5:1, 2) A na-ejikarị ihe e si n’ike mmụọ nsọ dee n’Ezikiel 34:15, 16 echetara Ndị Kraịst na-azụ atụrụ Chineke otú Jehova Chineke na Jizọs Kraịst chọrọ ka ha si na-edu atụrụ Chineke.

31. Olee otú Jehova si mezuo amụma e buru n’Ezikiel 11:19?

31 NKWA NKE 5. Ndị na-efe Jehova ga-adị n’otu. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Ndị Kraịst adịgboroja ekewaala ugboro ugboro, e nwezie ọtụtụ iri puku chọọchị dị iche iche. E nweekwala òtù dị iche iche a na-enweghị ike ịgụta ọnụ ndị na-agba ibe ha mgba okpuru. Ma, Jehova meere ndị na-efe ya ezigbo ofufe ihe dị iche. N’eziokwu, ọ rụụrụ ha ọrụ ebube. O mere ka nkwa o si n’ọnụ Ezikiel kwe ha mezuo otú dị ebube. Jehova sịrị: “M ga-eme ka unu nwee otu obi.” (Ezik. 11:19) N’ụwa niile, e nwere ọtụtụ nde mmadụ na-eso ụzọ Kraịst ndị si n’agbụrụ dị iche iche, ndị kpetụrụla ụdị okpukpe dị iche iche, ma ndị nwere ego ma ndị na-enweghị ego, ma ndị a ma ama ma ndị a na-amaghị ama. N’agbanyeghị ya, a na-akụziri ha niile otu eziokwu. Ha niile jikwa otu obi na-arụ otu ọrụ. N’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, o kpesiri ekpere ike ka ndị na-eso ụzọ ya dịrị n’otu. (Gụọ Jọn 17:11, 20-23.) N’oge anyị a, Jehova emezuola arịrịọ ahụ Jizọs rịọrọ otú na-enweghị atụ.

32. Olee otú obi dị gị banyere otú amụma ndị e buru gbasara otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe si na-emezu? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ịdọrọ Ndị Chineke n’Agha na Ịmaliteghachi Ezigbo Ofufe.”)

32 Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na ị dị ndụ n’oge a pụrụ iche e mere ka ndị Chineke maliteghachi ife ya ezigbo ofufe? Ihe dị iche iche anyị na-eme n’ofufe Jehova n’oge a na-egosi na amụma ndị Ezikiel buru na-emezu. Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị na-efe Jehova na-eme na-amasị ya ugbu a, otú o si n’ọnụ Ezikiel kwuo, sị: ‘Ihe unu na-eme ga-atọ m ụtọ.’ (Ezik. 20:40) Ị̀ ghọtara na ọ bụ ihe ọma ka Jehova meere gị kwe ka i soro ná ndị ya dị n’òtù, ndị ọ na-enyeju afọ, ndị na-etokwa ya n’ụwa niile, ya bụ, ndị e si n’ebe a dọọrọ ha n’agha ọtụtụ narị afọ tọhapụ? Ma, ụfọdụ amụma ndị Ezikiel buru gbasara otú a ga-esi maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe ka ga-emezu n’ọdịnihu karịa otú ha mezuburu.

“Ka Ogige Iden”

33-35. (a) Olee otú ndị Juu a dọọrọ n’agha si ghọta amụma e buru n’Ezikiel 36:35? (b) Olee otú ndị Jehova kwesịrị isi ghọta amụma ahụ taa? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ ‘Oge A Ga-eme Ka Ihe Niile Dị Ọhụrụ.’)

33 Anyị amụtala na ‘oge a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ’ malitere mgbe e mere ka onye si n’ezinụlọ Devid, bụ́ ezinụlọ ndị eze, malitekwa ịchị, ya bụ, mgbe e chiri Jizọs eze n’afọ 1914. (Ezik. 37:24) Jehova nyeziri Kraịst ikike ka o mee ka ndị Jehova maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe mgbe ha sirila n’ebe a dọọrọ ha n’agha ọtụtụ narị afọ lọta. Ma, ọ̀ pụtara na ọrụ Kraịst ga-arụ n’ime ka a maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe agwụla? Mbanụ! Ọ ga-arụkwu ya otú pụrụ iche n’ọdịnihu. Amụma Ezikiel gwakwara anyị ihe ndị ga-eme anyị obi ụtọ gbasara ọrụ a.

34 Dị ka ihe atụ, chebagodịrị ihe a e si n’ike mmụọ nsọ dee echiche: “Ndị mmadụ ga-asịkwa: ‘Ala nke tọgbọbu nkịtị dịzi ka ogige Iden.’ ” (Ezik. 36:35) Olee otú Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha si ghọta nkwa ahụ? O doro anya na ha anaghị atụ anya na ala ha ga-abụzi ogige Iden, nke ga-eme ka ndị mmadụ chewe na ọ bụ ya bụ ogige Iden mbụ, ma ọ bụ paradaịs, Jehova ji aka ya kụọ. (Jen. 2:8) Kama, o doro anya na ha ghọtara na Jehova na-eme ka obi sie ha ike na a ga-eme ka ha laghachi n’ala mara mma, nke ga na-emekwa nri nke ọma.

35 Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta nkwa ahụ taa? Anyị anaghị atụ anya na ụwa ọjọọ a Setan bụ́ Ekwensu na-achị ga-adị ka ogige Iden ugbu a. Kama, anyị ghọtara na okwu ndị ahụ na-emezu n’ihe gbasara ofufe anyị na-efe Chineke taa. Ebe ọ bụ na anyị na-ejere Jehova ozi, anyị na-efe ya ezigbo ofufe otú ọ na-anabata. Ife ya bụkwa ihe mbụ ná ndụ anyị. Otú a anyị si efe ya na-eme ka ofufe anyị na-akakwu mma ka oge na-aga. Ma, oleekwanụ otú nkwa a ga-esi emezu n’ọdịnihu?

36, 37. Olee nkwa ndị ga-emezu na paradaịs n’ọdịnihu?

36 A lụchaa agha Amagedọn, Jizọs ga-eme ka ụwa a soro n’ihe ndị a ga-eme ka ha dị ọhụrụ. Mgbe ọ ga-achịwa otu puku afọ, ọ ga-eme ka ndị mmadụ mee ka ụwa niile dịrị ka ogige Iden, ya bụ, ka ọ bụrụ paradaịs, otú Jehova bu n’obi kemgbe ka ụwa dịrị. (Luk 23:43) N’oge ahụ, mmadụ niile ga-adị n’otu. Ha ga na-elekọtakwa ụwa, ụwa ana-emepụtara ha nri n’ụba. A gaghị enwe ihe ọ bụla ga-eyi ndị mmadụ egwu ma ọ bụ mee ka obi koro ha n’elu. Chegodị otú ihe ga-adị mgbe a ga-emezu nkwa a Chineke kwere: “Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo. M ga-emekwa ka anụ ọhịa ọjọọ gharazie ịdị n’ala ha. Ihe a ga-eme ka obi na-eru ha ala n’ala ịkpa ha bi, ha ana-ehikwa ụra n’oké ọhịa.”—Ezik. 34:25.

37 Chegodị otú ihe ga-adị mgbe ahụ? Ị ga-enwe ike ịga ebe ọ bụla n’ụwa a sara mbara n’atụghị ụjọ. E nweghị ihe anụmanụ ọ bụla ga-eme gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka obi kwụsị iru gị ala. Naanị gị nwere ike ịbanye n’ime ime ọhịa, kirie otú ebe niile si maa mma. I nwedịrị ike ihi ụra nke ọma n’ebe ahụ. I hichaa, gị eteta, n’enweghị ihe ga-eme gị.

Chegodị otú ihe ga-adị mgbe mmadụ ga-enwedị ike ‘ihi ụra n’oké ọhịa’ n’enweghị ihe ga-eme ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 36, 37)

38. Olee otú obi ga-adị gị ma ị hụ ka nkwa e kwere n’Ezikiel 28:26 na-emezu?

38 Anyị ga-ahụkwa mgbe a ga-emezu nkwa a: “Obi ga-eru ha ala n’ebe ahụ ha ga-ebi. Ha ga-arụ ụlọ, kụọkwa ubi vaịn. Mgbe m ga-ata ndị niile na-akwa ha emo ahụhụ, obi ga-eru ha ala. Ndị Izrel ga-amarakwa na m bụ Jehova Chineke ha.” (Ezik. 28:26) E bibichaa ndị niile bụ́ ndị iro Jehova, udo ga-adị ebe niile n’ụwa, obi ga-erukwa anyị ala. Ka anyị na-elekọta ụwa, anyị ga-enwekwa ike ilekọta onwe anyị na ndị anyị hụrụ n’anya. Anyị ga-arụkwa ezigbo ụlọ ndị anyị ga-ebi, kụọkwa mkpụrụ ndị anyị ga na-elekọta.

39. Gịnị mere obi kwesịri iji sie gị ike na amụma niile Ezikiel buru gbasara paradaịs ga-emezucha?

39 Nkwa ndị a hà dị gị ka nrọ nkịtị? Biko, echefula ihe ndị ị hụrụla n’oge a ‘a na-eme ka ihe niile dị ọhụrụ.’ N’agbanyeghị otú Setan si jiri iwe na-emegide ndị Chineke, e nyere Jizọs ike, ya emee ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’oge a kacha njọ e nwetụrụla n’ụwa. Ihe a na-eme ka o doo anyị anya na nkwa niile Chineke si n’ọnụ Ezikiel kwe ga-emezucha.

a Ọtụtụ n’ime ndị Juu a dọọrọ n’agha bi n’obere obodo ndị dịtụ anya n’obodo Babịlọn. Dị ka ihe atụ, Ezikiel na ndị ibe ya bi n’akụkụ osimiri Kiba. (Ezik. 3:15) Ma, e nwekwara ndị Juu ole na ole a dọọrọ n’agha bi n’ime obodo Babịlọn. Ụfọdụ n’ime ha bụ ‘ndị si n’ezinụlọ eze na ụmụ ndị a ma ama.’—Dan. 1:3, 6; 2 Eze 24:15.

b Dị ka ihe atụ, anyị enweghị ike ikwu ndị bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ime ndị gbara mbọ ka a gbanwee ihe ndị a na-eme na ihe ndị a na-akụzi na chọọchị n’ihe dị ka narị afọ ise (500) gara aga.