Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE ABỤỌ

‘Unu Merụrụ Ụlọ Nsọ M’—A Kwụsịrị Ife Chineke Ezigbo Ofufe

‘Unu Merụrụ Ụlọ Nsọ M’—A Kwụsịrị Ife Chineke Ezigbo Ofufe

EZIKIEL 5:11

IHE NKEBI A NA-EKWU: Ndị bi na Juda na Jeruselem kwụsịrị ife Chineke, mewezie arụ

Jehova hụrụ ndị Izrel n’anya ma na-elekọta ha maka na ha bụ ‘ndị ya pụrụ iche.’ (Ọpụ. 19:5) Ma, ihe ha mere bụ ịnọ n’ụlọ nsọ Jehova na-efe chi ụgha dị iche iche. Ihe a ha mere gbawara Jehova obi, meekwa ka a kọchaa ya. Gịnị mere ndị Izrel ji mewe ụdị ihe ọjọọ a? Olee ihe anyị ga-amụta n’amụma Ezikiel buru gbasara mbibi a ga-ebibi Jeruselem? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’otú ndị Izrel na mba ndị gbara ha gburugburu si mekọọ ihe?

NÁ NKEBI A

ISI NKE 5

“Hụ Ezigbote Arụ Ha Na-akpa”

Ezikiel hụrụ ihe ndị na-awụ akpata oyi gosiri na mba Izrel akwụsịla ife Chineke, kpawazie arụ.

ISI NKE 6

“Ọgwụgwụ Unu Eruola”

Ezikiel ji ihe ndị o mere buo amụma otú Jehova ga-esi ewesa Jeruselem iwe.

ISI NKE 7

Mba Dị Iche Iche ‘Ga-amara na M Bụ Jehova’

Mba ndị kwutọrọ aha Jehova ma mesie ndị ya ike ma ọ bụ mee ka ndị ya kwụsị ife ya ga-eji isi ha buru ihe ha metara. Gịnị ka anyị mụtara n’otú ndị Izrel na mba ndị ahụ si mekọọ ihe?