Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 5

“Hụ Ezigbote Arụ Ha Na-akpa”

“Hụ Ezigbote Arụ Ha Na-akpa”

EZIKIEL 8:9

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Otú ndị bi na Juda si kwụsị ife Chineke, kpawazie arụ

1-3. Gịnị ka Jehova chọrọ ka Ezikiel hụ n’ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem? Gịnị mere o ji chọọ ka ọ hụ ihe ndị ahụ? (Lee ihe e dere ná mbido Nkebi nke 2 na ihe e sere na ya.)

 EZIKIEL bụ nwa onye nchụàjà. N’ihi ya, ọ ma Iwu Mosis nke ọma. Ọ ma gbasara ụlọ nsọ dị na Jeruselem, marakwa otú e kwesịrị isi na-efe Jehova n’ụlọ nsọ ahụ. (Ezik. 1:3; Mal. 2:7) Ma n’afọ a bụ́ afọ 612 T.O.N.K., ihe na-eme n’ụlọ nsọ Jehova ga-awụ Ezikiel na onye Juu ọ bụla na-erubere Chineke isi akpata oyi n’ahụ́.

2 Jehova chọrọ ka Ezikiel hụ ihe ndị na-eme ihere a na-eme n’ụlọ nsọ ahụ nakwa ka ọ gwa “ndị okenye Juda,” bụ́ ndị Juu ibe ya a dọọrọ n’agha, ihe ndị ọ na-ahụ. Ndị okenye a zukọtara n’ụlọ ya. (Gụọ Ezikiel 8:1-4; Ezik. 11:24, 25; 20:1-3) N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka Ezikiel si n’ụlọ ya dị na Tel-ebib, n’akụkụ osimiri Kiba nke dị na Babịlọn, gaa Jeruselem. Jeruselem dị n’ebe ọdịda anyanwụ. Isi Babịlọn gaa ya ga-ewe ọtụtụ narị kilomita. Jehova mere ka Ezikiel nọrọ n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ogige nke dị n’ime n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem. Ọnụ ụzọ ámá ahụ chere ihu n’ebe ugwu. Jehova sizi n’ebe ahụ Ezikiel nọ kpọrọ ya gagharịa n’ụlọ nsọ ahụ.

3 Ezikiel hụrụ ihe anọ na-awụ akpata oyi ndị gosiri na ndị Juda akwụsịla ife Chineke, kpawazie arụ. Olee otú ha si kwụsị ife Jehova ezigbo ofufe? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ọhụụ a Ezikiel hụrụ? Ka anyị chọpụta ihe ndị Ezikiel hụrụ mgbe a kpọgharịrị ya n’ụlọ nsọ ahụ. Ma, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe Jehova chọrọ n’aka ndị na-efe ya.

‘Abụ M Chineke nke Chọrọ Ka A Na-efe Naanị Ya Ofufe’

4. Gịnị ka Jehova chọrọ n’aka ndị na-efe ya?

4 Ihe dị ka narị afọ itoolu (900) tupu a mụọ Ezikiel, Jehova kwuru hoo haa ihe ọ chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme. N’iwu nke abụọ n’ime Iwu Iri ahụ, Jehova gwara ndị Izrel, a sị: “Mụnwa bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.” (Ọpụ. 20:5) Ihe a Jehova kwuru gosiri na ọ gaghị achọ ka onye ọ bụla na-efe ya na-efekwa chi ọ bụla ọzọ. N’Isi nke 2 n’akwụkwọ a, anyị mụtara na ihe mbụ onye na-efe Chineke ezigbo ofufe ga-eme bụ ife naanị Jehova. Ọ bụ ife Jehova ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya. (Ọpụ. 20:3) E kwuo ya ná nkenke, Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya dị nsọ, ya bụ, ka ha ghara itinye aka n’ụdị ofufe na-adịghị ya mma. N’afọ 1513 T.O.N.K., ndị Izrel ji obi ha niile kweta ka ha na Jehova gbaa ndụ. A na-akpọ ọgbụgba ndụ ahụ ọgbụgba ndụ Iwu. Ha kwetara na ọ bụ naanị Jehova ka ha ga-efe ofufe. (Ọpụ. 24:3-8) Jehova anaghị emebi ndụ ya na onye ọ bụla gbara, ọ naghịkwa achọ ka ndị ha na ya gbara ndụ mebie ọgbụgba ndụ ha na ya.—Diut. 7:9, 10; 2 Sam. 22:26.

5, 6. Gịnị mere o ji bụrụ naanị Jehova ka ndị Izrel kwesịrị ife?

5 Ọ̀ dị mma na Jehova chọrọ ka ndị Izrel na-efe naanị ya? N’eziokwu, ọ dị mma. Ọ bụ ya bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, Ọkaakaa eluigwe na ụwa, Onye na-enye ndụ na Onye ji anyị ndụ. (Ọma 36:9; Ọrụ 17:28) Ọ bụkwa Jehova napụtara ndị Izrel. Mgbe ọ na-enye ha Iwu Iri ahụ, o chetaara ha sị: “Abụ m Jehova Chineke gị, onye kpọpụtara gị n’Ijipt, bụ́ ebe ị nọ na-agba ohu.” (Ọpụ. 20:2) N’eziokwu, ọ bụ naanị Jehova ka ndị Izrel kwesịrị iji obi ha niile na-efe.

6 Jehova anaghị agbanwe agbanwe. (Mal. 3:6) Kemgbe ụwa, ọ na-achọ ka a na-efe naanị ya. Chezienụ echiche otú ihe anọ na-awụ akpata oyi ọ chọrọ igosi Ezikiel dị ya n’obi.

Ihe Mbụ E Gosiri Ya: Arụsị Na-akpasu Iwe

7. (a) Gịnị ka ndị Juu hapụrụ Jehova nọ na-eme n’ọnụ ụzọ àmà dị n’ebe ugwu n’ụlọ nsọ? Gịnị ka Jehova mere n’ihi ihe a ha nọ na-eme? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee otú o si bụrụ na ndị Izrel kpasuru Jehova iwe? (Gụọ ihe nke 2 e dere n’ala ala peeji.)

7 Gụọ Ezikiel 8:5, 6. O doro anya na ihe Ezikiel hụrụ wụrụ ya akpata oyi. N’ọnụ ụzọ àmà dị n’ebe ugwu n’ụlọ nsọ, ọ hụrụ ka ndị Juu ndị hapụrụ Jehova nọ na-efe arụsị. O nwere ike ịbụ na arụsị ahụ bụ ogwe osisi nke nọchiri anya Ashera. Ashera bụ chi ndị Kenan weere ka nwunye Bel. Ihe ọ sọkwara arụsị ahụ bụrụ, ndị Izrel mebiri ọgbụgba ndụ ha na Jehova mgbe ha fere arụsị ahụ. Ofufe a ha fere arụsị kama ife Jehova, Onye ọ bụ naanị ya ka e kwesịrị ife ofufe, mere ka iwe wee Jehova. Iwe a kwesịrị ekwesị. b (Diut. 32:16; Ezik. 5:13) Chegodị echiche: Ruo ihe karịrị narị afọ anọ (400), e weere ụlọ nsọ ahụ ka ụlọ Jehova. (1 Eze 8:10-13) Ma ugbu a, ebe ọ bụ na ndị ahụ na-efe arụsị nọ n’ime ụlọ nsọ ahụ na-efe arụsị, ha mere ka Jehova ‘gbaara ụlọ nsọ ya ọsọ.’

8. Gịnị ka arụsị na-akpasu iwe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị?

8 Gịnị ka arụsị na-akpasu iwe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị? Ndị Juda ndị kwụsịrị ife Jehova na-echetara anyị ndị chọọchị. Ha na-etinye aka n’ikpere arụsị. N’ihi ya, ofufe ha sịrị na ha na-efe Chineke bụ n’efu. Ebe ọ bụ na Jehova anaghị agbanwe agbanwe, o doro anyị anya na ndị chọọchị akpasuola Jehova ezigbo iwe otú ahụ ndị Juda hapụrụ ife Jehova kpasuru ya iwe. (Jems 1:17) N’eziokwu, e nweghị ihe jikọrọ Jehova na Ndị Kraịst ụgha ndị a niile.

9, 10. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe e kwuru gbasara ndị nọ n’ụlọ nsọ na-efe arụsị?

9 Gịnị ka anyị mụtara n’ihe e kwuru gbasara ndị nọ n’ụlọ nsọ na-efe arụsị? Anyị mụtara na ọ bụrụ na anyị chọrọ ife naanị Jehova, anyị ‘ga-agbara ikpere arụsị ọsọ.’ (1 Kọr. 10:14) Anyị nwere ike ịsị, ‘Emekataghị m jiri arụsị ma ọ bụ ihe yiri ya fee Jehova.’ Ma, e nwere ụzọ dị iche iche mmadụ nwere ike isi fee arụsị. Ụfọdụ doro ewu na ọkụkọ anya, ma ndị ọzọ anaghị edocha anya. Otu akwụkwọ na-akọwa ihe e kwuru na Baịbụl sịrị na ‘ọ bụrụ na mmadụ ji ihe ọ bụla o nwere ma ọ bụ ikike o nwere kpọrọ ihe karịa ife Chineke, onye ahụ na-efe arụsị.’ Ihe ọ pụtara bụ na ihe mmadụ nwere, ego, mmekọahụ, na ihe mmadụ ji atụrụ ndụ nwere ike ịbụ arụsị. N’eziokwu, arụsị nwere ike ịbụ ihe ọ bụla kacha mmadụ mkpa ná ndụ, nke mere ka ọ ghara ịna-efe naanị Jehova, bụ́ Onye e kwesịrị ife. (Mat. 6:19-21, 24; Efe. 5:5; Kọl. 3:5) Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ikpere arụsị n’ụzọ ọ bụla n’ihi na ọ bụ naanị Jehova ka anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-efe.—1 Jọn 5:21.

10 Ihe mbụ Jehova gosiri Ezikiel bụ “ezigbote arụ” ndị Izrel na-akpa. Ma, Jehova gwara onye amụma ya a na-erubere ya isi, sị: “Ị ka ga-ahụkwa arụ ndị ọzọ ka ndị a njọ.” Olee ihe ga-adị njọ karịa ịnọ n’ime ụlọ nsọ Jehova na-efe arụsị na-akpasu iwe?

Ihe nke Abụọ E Gosiri Ya: Ndị Okenye Iri Asaa Ndị Na-amụrụ Chi Ụgha Ịnsens

11. Olee ihe ndị Ezikiel hụrụ wụrụ ya akpata oyi n’ahụ́ mgbe ọ banyere n’ogige dị n’ime ime n’ụlọ nsọ, n’ebe dị nso n’ebe a na-achụ àjà?

11 Gụọ Ezikiel 8:7-12. Ezikiel mere ka oghere dị ná mgbidi ụlọ nsọ ahụ sakwuo mbara, ya esi na ya banye n’ogige nke dị n’ime ime n’ụlọ nsọ ahụ, n’ebe dị nso n’ebe a na-achụ àjà. Ezikiel hụziri ihe a tụrụ atụ́ n’ahụ́ ụlọ nsọ ahụ, ya bụ, “ihe ọ bụla na-arị arị na anụmanụ ndị na-asọ oyi nakwa arụsị niile na-asọ oyi.” c Ha wụrụ ya akpata oyi n’ahụ́. Ha nọchiri anya chi ụgha dị iche iche. Ihe ọzọ Ezikiel hụrụ wụdịrị ya akpata oyi n’ahụ́ karịa. Ọ hụrụ “ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel” ka ha guzo “n’ọchịchịrị” na-amụrụ chi ụgha dị iche iche ịnsens. N’iwu Mosis, ịmụ ịnsens na-esi ísì ọma nọchiri anya ekpere ndị na-erubere Chineke isi nke Chineke na-anabata. (Ọma 141:2) Ma, ịnsens ndị okenye iri asaa ahụ na-amụrụ chi ụgha adịghị nsọ, ọ na-esikwa Jehova ísì ọjọọ. Jehova weere ekpere ha ka ihe rere ure na-esi ísì ọjọọ. (Ilu 15:8) Ndị okenye ahụ nọ na-aghọgbu onwe ya, na-eche, sị: “Jehova anaghị ahụ anyị.” Ma, Jehova na-ahụ ha. O gosikwara Ezikiel kpọmkwem ihe ha nọ na-eme n’ụlọ nsọ ya.

Jehova na-ahụ ihe ọ bụla rụrụ arụ a na-eme “n’ọchịchịrị” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-erubere Chineke isi mgbe niile, ma “n’ọchịchịrị”? Ole ndị, karịchaa, kwesịrị ịna-eme otú ahụ?

12 Gịnị ka anyị mụtara n’ihe Ezikiel kwuru gbasara ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel ndị nọ na-amụrụ chi ụgha dị iche iche ịnsens? Anyị na-amụta na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nụ ekpere anyị, chọọkwa ka ọ nabata ofufe anyị, anyị kwesịrị ịna-erubere ya isi mgbe niile, ma “n’ọchịchịrị.” (Ilu 15:29) Anyị kwesịrị ịna-echeta na Jehova na-ahụ ihe niile anyị na-eme. Ọ bụrụ na anyị kwetara na Jehova dị adị, anyị agaghị anọ ná nzuzo mee ihe anyị ma ga-ewute ya. (Hib. 4:13) Ndị okenye, karịchaa, kwesịrị ịna-akpa àgwà otú Baịbụl kwuru, ka Ndị Kraịst ibe ha nwee ike ịna-amụta ihe n’aka ha. (1 Pita 5:2, 3) Ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-atụ anya na okenye nke na-apụta n’ihu ha ma na-edu ha mgbe ha zukọtara ife Chineke n’ọmụmụ ihe na-emekwa ihe Baịbụl kwuru, ma n’ọchịchịrị, ya bụ, mgbe ndị ọzọ na-anaghị ahụ ya.—Ọma 101:2, 3.

Ihe nke Atọ E Gosiri Ya: ‘Ụmụ Nwaanyị Ndị Na-ebere Chi Bụ́ Tamọz Ákwá’

13. Gịnị ka Ezikiel hụrụ ụmụ nwaanyị ndị kwụsịrị ife Chineke nọ na-eme n’otu n’ime ọnụ ụzọ ámá dị n’ụlọ nsọ?

13 Gụọ Ezikiel 8:13, 14. Mgbe Jehova gosichara Ezikiel ihe nke mbụ na nke abụọ jọgburu onwe ya ndị Izrel nọ na-eme, Jehova gwara ya ọzọ, sị: “Ị ka ga-ahụ arụ ndị ọzọ ha na-akpa ka nke a njọ.” Gịnị bụ ihe ọzọ onye amụma a hụrụ? “N’ọnụ ụzọ ámá ụlọ Jehova, nke dị n’ebe ugwu,” ọ hụrụ “ụmụ nwaanyị nọ ọdụ ebe ahụ na-ebere chi bụ́ Tamọz ákwá.” Tamọz bụ chi ndị Mesopotemia. A kpọrọ ya Dumuzi n’ihe ndị Sume dere. E weere Tamọz ka di chi nwaanyị na-enye nwa, nke aha ya bụ Ishta. d Ọ ga-abụ na ákwá a ụmụ nwaanyị Izrel na-ebe so n’otú ndị na-efe Tamọz si eruru ya uju. Ákwá a ha nọ na-ebe n’ụlọ nsọ Jehova pụtara na ha nọ na-eme omenala ndị ọgọ mmụọ n’ụlọ nsọ Jehova. Ma, ịnọ n’ụlọ Jehova na-eme ihe ndị okpukpe ụgha na-eme agaghị eme ka Chineke nabata ya. N’eziokwu, Jehova weere ihe ụmụ nwaanyị ahụ kwụsịrị ife ya na-eme ka “arụ.”

14. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si were ihe ụmụ nwaanyị ahụ kwụsịrị ife ya nọ na-eme?

14 Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si were ihe ụmụ nwaanyị ahụ nọ na-eme? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ofufe anyị dị Chineke mma, e kwesịghị inwe ihe ga-ejikọta ya na omenala ndị ọgọ mmụọ. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iso na-eme omenala ma ọ bụ ememme ọ bụla ndị na-ekpere arụsị malitere. Ànyị kwesịrị inyewe onwe anyị nsogbu maka otú ememme ma ọ bụ omenala si malite? Ee. Taa, ndị mmadụ nwere ike iche na ihe dị iche iche a na-eme ma e mewe ememme ndị dị ka Krismas ma ọ bụ Ista enweghị ihe o mere. Ma, anyị ekwesịghị ichefu na Jehova hụrụ mgbe ndị ọgọ mmụọ malitere ime ememme ndị ahụ ọtụtụ ndị na-emezi n’oge a. Jehova emekataghị were ihe ndị ndị na-ekpere arụsị na-eme ka ihe na-adịchaghị oké njọ maka na o teela e mewere ya ma ọ bụkwanụ maka na a gbalịala ka e webata ya n’ofufe a na-efe ya.—2 Kọr. 6:17; Mkpu. 18:2, 4.

Ihe nke Anọ E Gosiri Ya: Ụmụ Nwoke Iri Abụọ na Ise Ndị “Na-akpọrọ Anyanwụ Isiala”

15, 16. Gịnị ka ụmụ nwoke iri abụọ na ise nọ na-eme n’ogige nke dị n’ime ime n’ụlọ nsọ? Gịnị mere ihe a ha nọ na-eme ji wute Jehova?

15 Gụọ Ezikiel 8:15-18. Mgbe Jehova chọrọ igosi Ezikiel ihe nke anọ, bụ́ nke ikpeazụ n’ihe ndị ahụ ọ na-egosi ya, ọ gwara ya ihe ọ gwaburu ya mbụ. Ọ sịrị ya: “Ị ka ga-ahụ arụ ndị ọzọ ha na-akpa ka ndị a njọ.” Ọ ga-abụ na Ezikiel jụrụ onwe ya, sị: “Olee ihe nwere ike ịdị njọ karịa ihe ndị a m hụrụla?” Ebe Ezikiel nọ ugbu a bụ n’ogige nke dị n’ime ime n’ụlọ nsọ ahụ. N’ebe ahụ, ya bụ, n’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ahụ, ọ hụrụ ụmụ nwoke iri abụọ na ise ka ha “chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ na-akpọrọ anyanwụ isiala.” Otú ụmụ nwoke a si na-akparị Jehova jọgburu onwe ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

16 Weregodị ya na ị na-ahụ ihe na-emenụ. Ọnụ ụzọ ụlọ nsọ Chineke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ bụrụ na ndị bịara ife Chineke abatawa n’ụlọ nsọ ahụ, ha ga-eche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ, gbanye ebe ọwụwa anyanwụ azụ. Ma, ụmụ nwoke iri abụọ na ise ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ‘gbanyere ụlọ nsọ ahụ azụ,’ chee ihu n’ebe ọwụwa anyanwu ka ha nwee ike ife anyanwụ. Ihe a ha mere bụ ịgbakụta Jehova azụ n’ihi na ụlọ nsọ ahụ bụ ‘ụlọ Jehova.’ (1 Eze 8:10-13) Ụmụ nwoke iri abụọ na ise ahụ ahapụla Jehova fewe arụsị. Ha ejighị Jehova kpọrọ ihe, ha nupụkwara isi n’iwu o nyere na Diuterọnọmi 4:15-19. N’eziokwu, ha mejọrọ Chineke, onye ọ bụ naanị ya ka e kwesịrị ife ofufe.

Ndị na-efe Jehova kwesịrị ịna-efe naanị ya

17, 18. (a) Gịnị ka ihe a kọrọ gbasara ndị na-efe anyanwụ n’ụlọ nsọ na-akụziri anyị? (b) Ole ndị ka ha na ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-adịghịzi ná mma? Kọwaa.

17 Gịnị ka ihe a a kọrọ gbasara ndị na-efe anyanwụ na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o mee ka anyị mara ihe ndị dị n’Okwu ya ma ghọta ha. Cheta na “Jehova Chineke bụ anyanwụ anyị,” Okwu ya bụkwa “ìhè” anyị ji ahụ ụzọ. (Ọma 84:11; 119:105) Ọ na-eji Okwu ya na ihe dị iche iche nzukọ ya na-ewepụta e ji amụ Baịbụl eme ka anyị mara ihe. Ihe ndị a na-enyere anyị aka ime mkpebi ndị na-eme ka ndụ anyị nwee isi ugbu a, ọ ga-emekwa ka anyị nweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ihe ndị a, chọwa ka ụwa a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ, anyị na-agbanye Jehova azụ. Anyị mee otú ahụ, anyị na-akpasu Jehova ezigbo iwe, na-eme ka obi gbawaa ya. E nweghị mgbe anyị ga-achọ ime Chineke anyị ụdị ihe a. Ọhụụ Ezikiel na-adọkwa anyị aka ná ntị ka anyị zere ndị gbakụtara eziokwu azụ, ya bụ, ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.—Ilu 11:9.

18 Anyị ahụla na Ezikiel hụrụ ụzọ ihe anọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́, ya bụ, ebe ndị Juda nọ na-ekpere arụsị ma na-efe chi ụgha. Ihe ndị ahụ gosiri otú ha hapụruru Chineke. Ebe ọ bụ na ndị Izrel etinyela aka n’ikpere arụsị, ha na Chineke adịghịzi ná mma. Mgbe ọ bụla mmadụ tinyere aka n’ikpere arụsị, ọ na-amalite ime omume rụrụ arụ. Ka a sịkwa ihe mere ndị Izrel ahụ kwụsịrị ife Chineke ji mee omume dị iche iche jọgburu onwe ha. Omume ọjọọ ha nọ na-eme mere ka ha na Chineke na ndị mmadụ ibe ha ghara ịdị ná mma. Ka anyị hụzie otú Ezikiel si jiri ike mmụọ nsọ e nyere ya kọwaa otú omume ndị Juda kwụsịrị ife Jehova si jọgbuo onwe ya.

‘Ha Na-eme Omume Rụrụ Arụ n’Ime Gị’

19. Olee otú Ezikiel si kọwaa otú omume ndị ha na Jehova gbara ndụ jọruru ná njọ?

19 Gụọ Ezikiel 22:3-12. Onye ukwu na onye nta na-eme omume rụrụ arụ ná mba ahụ. ‘Ndị isi’ ma ọ bụ ndị na-achị achị ji ikike ha nwere na-egbu ndị aka ha dị ọcha. O doro anya na ndị Izrel sooro ndị na-achị ha na-enupụrụ iwu Chineke isi. N’ezinụlọ, ụmụ ‘na-eleda ndị mụrụ ha anya.’ Ọtụtụ ndị na-edinakwa ndị ezinụlọ ha. Ndị nnupụisi ndị juru n’Izrel na-erigbu ndị mbịarambịa, na-emegbukwa ụmụ na-enweghị nna na ụmụ nwaanyị isi mkpe. Ụmụ nwoke Izrel na-edina ndị nwunye ụmụ nwoke ibe ha. Anyaukwu bara ndị Izrel n’ụmị. Ọ bụ ya mere ha ji na-ana aka azụ, na-egwu ibe ha wayo, na-anakwa ọmụrụ nwa. O doro anya na o wutere Jehova na ndị ya na ha gbara ndụ na-eleda iwu ya anya. Ha aghọtaghị na ọ bụ maka na ọ hụrụ ha n’anya mere o ji nye ha iwu ndị ahụ. Ihe ọjọọ ha na-eme wutere Jehova. Ọ bụ ya mere o ji gwa Ezikiel ka ọ gwa ndị a na-eme omume rụrụ arụ, sị: “Unu echefuola m kpamkpam.”

Ndị chọọchị emeela ka tigbuo zọgbuo na omume rụrụ arụ na-akakwu njọ n’ụwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20)

20. Gịnị mere ihe Ezikiel kwuru banyere omume rụrụ arụ ndị Juda mere ji abara anyị uru taa?

20 Gịnị mere ihe Ezikiel kwuru banyere omume rụrụ arụ ndị Juda mere ji abara anyị uru taa? Omume rụrụ arụ ndị Juda kwụsịrị ife Chineke nọ na-eme na-echetara anyị omume rụrụ arụ ọtụtụ ndị taa na-eme. Ikike ndị ọchịchị nwere na-aba ha isi, ha na-ejikwa ya emegbu ndị ogbenye. Ndị isi okpukpe dị iche iche, karịchaa, ndị ụkọchukwu, agọziela ndị agha mba dị iche iche mgbe ha na-aga agha. Agha ndị ahụ ataakwala isi ọtụtụ nde mmadụ. Ndị ụkọchukwu emeekwala ka ndị mmadụ ghara iji ihe doro anya na ihe dị mma Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji na-emekwu omume rụrụ arụ n’eleghị anya n’azụ. O doro anya na Jehova ga-agwa ndị chọọchị otu ihe ahụ ọ gwara ndị Juda kwụsịrị ife ya, sị: “Unu echefuola m kpamkpam.”

21. Gịnị ka omume rụrụ arụ ndị Juda oge ochie mere na-akụziri anyị?

21 Gịnị ka omume rụrụ arụ ndị Juda oge ochie mere na-akụziri anyịnwa bụ́ ndị Jehova? Ọ na-akụziri anyị na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nabata ofufe anyị, anyị ekwesịghị itinye aka n’omume ọ bụla rụrụ arụ. Ime otú ahụ adịghịkwa mfe n’ụwa a omume ndị mmadụ retọrọ eretọ. (2 Tim. 3:1-5) Ma, anyị ma otú obi na-adị Jehova mgbe ndị mmadụ na-eme ụdị omume rụrụ arụ dị iche iche. (1 Kọr. 6:9, 10) Anyị na-erube isi n’iwu ndị Jehova nyere anyị gbasara omume ọma na omume ọjọọ maka na anyị hụrụ ya n’anya. (Ọma 119:97; 1 Jọn 5:3) Ọ bụrụ na anyị ana-eme omume rụrụ arụ, anyị na-egosi na anyị ahụghị Chineke anyị n’anya, bụ́ Onye dị ọcha ma dị nsọ. E nweghị mgbe anyị ga-achọ ime ihe ga-eme ka Jehova gwa anyị, sị: “Unu echefuola m kpamkpam.”

22. (a) Gịnị ka i kpebisiri ike ime ugbu a anyị lebachara anya n’otú Jehova si gbaa ndị Juda oge ochie n’anwụ? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’Isi nke 6?

22 Anyị amụtala ụfọdụ ihe bara uru ugbu a anyị lebachara anya n’otú Jehova si gbaa ndị Juda n’anwụ maka otú ha si kwụsị ife ya kpawazie arụ. N’eziokwu, anyị ekpebisikwuola ike na ọ bụ naanị Jehova, onye e kwesịrị ife ofufe, ka anyị ga na-efe. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara isi n’ụzọ ọ bụla kpeere arụsị ma ọ bụ mee omume rụrụ arụ. Ma, olee ihe Jehova mere ndị ya nupụụrụ ya isi? Mgbe Jehova kpọgharịchara Ezikiel n’ụlọ nsọ ahụ, ọ gwara Ezikiel hoo haa, sị: “M ga-eji iwe mee ha ihe.” (Ezik. 8:17, 18) Anyị kwesịrị ịmata ihe Jehova mere ndị Juda nupụụrụ ya isi n’ihi na a ga-eme ụwa ọjọọ a otu ihe ahụ. N’Isi nke 6, anyị ga-eleba anya n’otú ikpe Jehova mara Juda si mezuo.

a N’ọtụtụ ebe n’akwụkwọ Ezikiel, ọ bụ ndị bi na Juda nakwa na Jeruselem ka a kpọrọ “ndị Izrel.”—Ezik. 12:19, 22; 18:2; 21:2, 3.

b E nwere ike ịsụgharị okwu Hibru a sụgharịrị “iwe” n’amaokwu a “ekworo.” O gosiri na Jehova weere mmadụ ịhapụ ya fewe chi ọzọ ka ihe jọgburu onwe ya. Ọ bụ ụdị ekworo nwoke na-ekwo ma ọ bụ iwe ọ na-ewe ma nwunye ya gbaa n’èzí. (Ilu 6:34) Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova. Iwe o were mgbe ndị ya na ha gbara ndụ hapụrụ ya fewe arụsị kwesịrị ekwesị. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ekworo Chineke na-ekwo . . . bụ maka na Ọ dị nsọ. Ebe ọ bụ naanị Ya bụ Onye Nsọ . . . , Ọ naghị achọ ka a maa Ya aka.”—Ọpụ. 34:14.

c Ọ ga-abụ na okwu Hibru a sụgharịrị “arụsị na-asọ oyi” bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi ma ọ bụ na ihe rụrụ arụ.

d Ụfọdụ ndị chere na Tamọz bụ aha ọzọ a na-akpọ Nimrọd. Ma, e nweghị ihe e ji n’aka gosiri na ihe a ha chere bụ eziokwu.