ISI NKE 7
Mba Dị Iche Iche ‘Ga-amara na M Bụ Jehova’
IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe anyị mụtara n’otú ndị Izrel na mba ndị kwutọrọ aha Jehova si mekọọ ihe
1, 2. (a) Olee otú ndị Izrel si dịrị ka otu atụrụ nke ọtụtụ anụ ọhịa wolf gbara gburugburu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka ndị Izrel na ndị eze ha kwere ka o mee?
RUO ọtụtụ narị afọ, ndị Izrel dị ka otu atụrụ nke ọtụtụ anụ ọhịa wolf gbara gburugburu. Ndị Amọn, ndị Moab, na ndị Ịdọm nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ ókèala ndị Izrel. Ha si ebe ahụ na-eyi ndị Izrel egwu. Ndị Filistia nọ n’ebe ọdịda anyanwụ. O teela ha bụ ndị iro ndị Izrel. Obodo Taya dị n’ebe ugwu ókèala ndị Izrel. Ọ bụ nnukwu obodo e ji ịzụ ahịa mara, ndị bi na ya bakwara ọgaranya. Mba ochie bụ́ Ijipt dị n’ebe ndịda. Ndị Ijipt weere eze ha bụ́ Fero ka chi.
2 Mgbe ndị Izrel tụkwasịrị Jehova obi, o chebere ha ka ndị iro ha ghara ime ha ihe ọ bụla. Ma ọtụtụ ugboro, ndị Izrel na ndị eze ha kwere ka mba ndị gbara ha gburugburu mee ka ha kwụsị ife Chineke. Otu n’ime ndị eze mere otú ahụ bụ Eze Ehab. Ọ chịrị alaeze Izrel nke dị ebo iri. Ọ chịrị n’oge Eze Jehoshafat na-achị Juda. Ehab lụrụ Jezibel nwa eze Saịdọn, onye na-achị obodo Taya n’oge ahụ. Jezibel gbasiri mbọ ike mee ka ndị Izrel fewe Bel. O mekwara ka di ya metọọ ezigbo ofufe a na-efe Jehova otú a na-emetụbeghị mbụ.—1 Eze 16:30-33; 18:4, 19.
3, 4. (a) Ole ndị ka Ezikiel maliteziri ibu amụma gbasara ha? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?
3 Jehova agwabuola ndị ya ihe ọjọọ ndị ga-eme ha ma ha nupụrụ ya isi. Ugbu a, ike idi ihe ọjọọ ndị ha na-eme agwụla ya. (Jere. 21:7, 10; Ezik. 5:7-9) N’afọ 609 T.O.N.K., ndị Babịlọn bu ọgụ bịa nke ugboro atọ n’Ala Nkwa ahụ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri kemgbe ha bịara nke ugboro abụọ. Na nke ugbu a, ha ga-akwatu mgbidi Jeruselem ma bibie ndị nupụụrụ Nebukadneza isi. Mgbe ndị Babịlọn nọchibidoro Ala Nkwa ahụ, amụma dị iche iche Ezikiel si n’ike mmụọ nsọ buo mezuwere n’ike n’ike. Ọ bụ mgbe ahụ ka Ezikiel maliteziri ibu amụma ndị ga-emezu n’isi mba ndị gbara Ala Nkwa ahụ gburugburu.
Mba ndị kwutọrọ aha Jehova ga-eji isi ha buru ihe ha metara
4 Jehova gwara Ezikiel na ndị iro ndị Juda ga na-aṅụrị ọṅụ mgbe a ga-ebibi Jeruselem nakwa na ha ga-emesi ndị Juda na-agba ọsọ ndụ ike. Ma, mba ndị kwutọrọ aha Jehova ma mesie ndị ya ike ma ọ bụ mee ka ndị ya kwụsị ife ya ga-eji isi ha buru ihe ha metara. Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’otú ndị Izrel na mba ndị ahụ si mekọọ ihe? Oleekwa otú amụma ndị Ezikiel buru gbasara mba ndị ahụ si eme ka anyị nwee olileanya taa?
Ndị Ikwu Ndị Izrel Kwara Ha “Ezigbo Emo”
5, 6. Gịnị jikọrọ ndị Amọn na ndị Izrel?
5 Ndị Amọn, ndị Moab, na ndị Ịdọm bụ ndị ikwu ndị Izrel. Ha na ha bụ otu ọbara. N’agbanyeghị na mba ndị ahụ na ndị Izrel bụ ụmụnne, o teela ha mesiwere ndị Chineke ike ma na-akwa ha “ezigbo emo.”—Ezik. 25:6.
6 Ka anyị kwuo gbasara ndị Amọn. Ọ bụ Lọt nwa nwanne Ebreham na nwa ya nwaanyị nke obere mụtara nna ndị Amọn. (Jen. 19:38) Asụsụ ndị Amọn yiri nnọọ asụsụ ndị Hibru nke na ọ ga-abụ na ndị Izrel na-aghọta ya. Ebe ọ bụ na ha bụ ụmụnne, Jehova gwara ndị Izrel ka ha ghara ịlụso ndị Amọn agha. (Diut. 2:19) N’agbanyeghị ya, n’oge Ndị Ikpe, ndị Amọn sooro Eglọn, Eze Moab, na-emesi ndị Izrel ike. (Ikpe 3:12-15, 27-30) Ndị Amọn mechakwara lụso ndị Izrel agha mgbe e mere Sọl eze. (1 Sam. 11:1-4) N’oge Eze Jehoshafat na-achị, ndị Amọn sokwa ndị Moab bịa ọzọ ka ha weghara Ala Nkwa ahụ.—2 Ihe 20:1, 2.
7. Olee otú ndị Moab si meso ụmụnne ha bụ́ ụmụ Izrel?
7 Ọ bụ Lọt na ada ya nwaanyị mụtara nna ndị Moab. (Jen. 19:36, 37) Jehova gwara ndị Izrel ka ha ghara ịlụso ndị Moab agha. (Diut. 2:9) Ma, ndị Moab kpasoro ndị Izrel àgwà ọjọọ. Mgbe ụmụnne ha bụ́ ndị Izrel si n’ebe ha nọbu na-agba ohu n’Ijipt na-apụta, kama inyere ha aka, ha gbara mbọ ime ka ha ghara ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Belak Eze Moab goro Belam ka ọ bụọ ndị Izrel ọnụ. Belam kụziiri Belak otú ha ga-esi rafuo ụmụ nwoke Izrel, mee ka ha kwaa iko ma kpeere arụsị. (Ọnụ Ọgụ. 22:1-8; 25:1-9; Mkpu. 2:14) Ndị Moab nọ na-emesi ndị Izrel ike ruo ọtụtụ narị afọ, ruokwa n’oge Ezikiel onye amụma.—2 Eze 24:1, 2.
8. Gịnị mere Jehova ji kpọọ ndị Ịdọm na ndị Izrel ụmụnne? Ma, gịnị ka ndị Ịdọm mere?
8 Ndị Ịdọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, ejima Jekọb. Jehova kpọrọ ndị Ịdọm na ndị Izrel ụmụnne maka na ha si n’otu afọ. (Diut. 2:1-5; 23:7, 8) Ma, ndị Ịdọm nọ na-emegbu ndị Izrel malite n’oge ha si n’Ijipt pụta ruokwa n’oge e bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.N.K. (Ọnụ Ọgụ. 20:14, 18; Ezik. 25:12) N’oge ahụ, ndị Ịdọm nọ na-aṅụrị ọṅụ na ndị Izrel na-ata ahụhụ. Ha nọ na-agwa ndị Babịlọn ka ha bibie Jeruselem. Ma, nke ka njọ bụ na ha nọchiiri ndị Izrel na-agba ọsọ ndụ ụzọ, kpụrụ ha kpụnye ndị iro ha.—Ọma 137:7; Obed. 11, 14.
9, 10. (a) Gịnị mere Amọn, Moab, na Ịdọm? (b) Olee ihe atụ ndị gosiri na ọ bụghị ndị niile bụ́ ndị obodo ndị ahụ mesiri ndị Chineke ike?
9 Jehova mere ka ndị ikwu ndị Izrel taa ahụhụ maka otú ha si meso ndị ya. Ọ sịrị: “M ga-enyefe . . . ndị Amọn n’aka ndị Ọwụwa Anyanwụ, ka mba dị iche iche ghara icheta ndị Amọn ọzọ.” Ọ sịkwara: “M ga-emekwa Moab ihe m kpebiri ime ya. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.” (Ezik. 25:10, 11) Ihe dị ka afọ ise e bibichara Jeruselem, amụma ndị ahụ malitere imezu mgbe ndị Babịlọn meriri ndị Amọn na ndị Moab. Mgbe Jehova na-ekwu gbasara ndị Ịdọm, ọ sịrị na ya “ga-egbu ma mmadụ ma anụ ụlọ,” kwuokwa na ya ‘ga-eme ka obodo ha tọgbọrọ nkịtị.’ (Ezik. 25:13) E mechaziri e nweghị obodo a na-akpọ Amọn, Moab, na Ịdọm otú e buru n’amụma.—Jere. 9:25, 26; 48:42; 49:17, 18.
10 Ma, ọ bụghị ndị niile bụ́ ndị obodo ndị ahụ mesiri ndị Chineke ike. Dị ka ihe atụ, Zilek onye Amọn na Itma onye Moab so ná ndị a kpọrọ ndị dike ná ndị agha Eze Devid. (1 Ihe 11:26, 39, 46; 12:1) Rut nwaanyị Moab mechara fewe Jehova. O jikwa obi ya niile fee ya.—Rut 1:4, 16, 17.
Anyị agaghị emebi iwu Jehova, ọ bụrụgodị n’obere ihe
11. Olee ihe ndị anyị na-amụta n’otú ndị Izrel na ndị Amọn, ndị Moab, na ndị Ịdọm si mekọọ ihe?
11 Olee ihe ndị anyị na-amụta n’otú ndị Izrel na mba ndị ahụ si mekọọ ihe? Nke mbụ bụ na mgbe ndị Izrel kwere ka ndị ikwu ha rafuo ha, ha malitere ife arụsị, dị ka chi ndị Moab bụ́ Bel nke Pịọ nakwa Molek bụ́ chi ndị Amọn. (Ọnụ Ọgụ. 25:1-3; 1 Eze 11:7) Ihe mere ndị Izrel nwekwara ike ime anyị. Ndị ikwu anyị na-abụghị ndị Jehova nwere ike inyewe anyị nsogbu ka anyị mee ihe na-adịghị Jehova mma. Dị ka ihe atụ, e nwere ike ha agaghị aghọta ihe mere na anyị anaghị agba Ista, na anyị anaghị enye onyinye ma na-anata onyinye n’oge Krismas ma ọ bụ ihe mere na anyị anaghị eme ememme ụfọdụ na-ewu ewu ndị okpukpe ụgha na-eme. Ọ bụrụgodị na ha ebughị ihe ọjọọ n’obi, ha nwere ike ime ka anyị mee ihe na-adịghị mma, ọ bụrụgodị ime ya obere oge. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị ghara ikwe ka nsogbu ha na-enye anyị mee ka anyị mee ihe na-adịghị mma. Ihe mere ndị Izrel gosiri na ọ bụrụgodị n’obere ihe ka anyị mebiri iwu Jehova, o nwere ike ime ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma.
12, 13. Olee ụdị nsogbu e nwere ike ịna-enye anyị? Ma gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-erubere Jehova isi?
12 E nwekwara ihe ọzọ anyị ga-amụta n’otú ndị Amọn, ndị Moab, na ndị Ịdọm si meso ndị Izrel. Ndị ezinụlọ anyị na-anaghị efe Jehova nwere ike ịna-emesi anyị ike. Jizọs kwuru na mgbe ụfọdụ, ozi ọma anyị na-ekwusa nwere ike “ikewa ezinụlọ.” Ọ sịrị na “nwoke ga na-emegide nna ya, nwa nwaanyị ana-emegide nne ya.” (Mat. 10:35, 36) Jehova gwara ndị Izrel ka ha ghara isesa ndị ikwu ha okwu. Anyị anaghịkwa achọ ndị ezinụlọ anyị na-esoghị anyị efe Jehova okwu. Ma, o kwesịghị iju anyị anya ma ndị ezinụlọ anyị megidewe anyị.—2 Tim. 3:12.
13 Ọ bụrụgodị na ndị ikwu anyị anaghị enye anyị nsogbu ka anyị kwụsị ife Jehova, anyị ekwesịghị ikwe ka ọ bụrụ ihe ha chọrọ ka anyị ga na-eme kama ime ihe Jehova chọrọ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ maka na ọ bụ Jehova ka anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-efe. (Gụọ Matiu 10:37.) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na anyị erubere Jehova isi, ụfọdụ n’ime ndị ikwu anyị nwere ike ime ka Zilek, Itma, na Rut, soro anyị fewe Jehova ezigbo ofufe. (1 Tim. 4:16) Obi ga-atọkwa ha ụtọ na ha na-efe onye naanị ya bụ ezi Chineke. Chineke ga-ahụ ha n’anya, na-echebekwa ha.
A Ga-ata Ndị Iro Jehova ‘Ezigbo Ahụhụ’
14, 15. Olee otú ndị Filistia si meso ndị Izrel?
14 Ọ bụ n’ala mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Krit ka ndị Filistia si kwapụ kwaga n’ala Jehova mechara kwe Ebreham na ụmụ ya nkwa na ọ ga-enye ha. Ma Ebreham ma Aịzik na ndị Filistia mekọrọ ihe. (Jen. 21:29-32; 26:1) Mgbe ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa, ndị Filistia abụrụla mba siri ike nke nwere ndị agha bụ́ azụ eru ala. Ndị Filistia fere chi dị iche iche, dị ka Belzibọb na Degọn. (1 Sam. 5:1-4; 2 Eze 1:2, 3) Mgbe ụfọdụ, ndị Izrel sooro ha fee chi ndị ahụ.—Ikpe 10:6.
15 Jehova kwere ka ndị Filistia chịa ndị Izrel ruo ọtụtụ afọ maka na ha nupụụrụ ya isi. (Ikpe 10:7, 8; Ezik. 25:15) Ha machiri ndị Izrel ime ọtụtụ ihe iji mesie ha ike, a gbuokwa ọtụtụ n’ime ha. (1 Sam. 4:10) Ma mgbe ndị Izrel chegharịrị ma lọghachikwute Jehova, ọ napụtara ha. Ọ họpụtara ụfọdụ ụmụ nwoke ndị dị ka Samsịn, Sọl, na Devid ka ha napụta ndị ya. (Ikpe 13:5, 24; 1 Sam. 9:15-17; 18:6, 7) ‘E ji ezigbo iwe taa ndị Filistia ahụhụ’ otú Ezikiel kwuru mgbe ndị Babịlọn lụsoro ha agha nakwa mgbe ndị Grik mechara lụso ha agha.—Ezik. 25:15-17.
16, 17. Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’otú ndị Izrel na ndị Filistia si mekọọ ihe?
16 Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’otú ndị Izrel na ndị Filistia si mekọọ ihe? Ụfọdụ mba ndị kacha ike chịtụrụla ndị mmadụ emesiela ndị Jehova ike n’oge a. Anyị adịghị ka ndị Izrel. Anyị nọgidesiri ike na-erubere Jehova isi. Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị ka ndị na-achọghị ka anyị fee Jehova ezigbo ofufe emeriela. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1918, ndị ọchịchị mba Amerịka nwara ka ha kwụsị ọrụ ndị Jehova. Otú ha si mee ya bụ na ha tụrụ ndị na-elekọta nzukọ Jehova mkpọrọ ihe dị ka afọ iri abụọ. N’oge a na-alụ agha ụwa nke abụọ, òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị Nazi dị na Jamani gbara mbọ ikpochapụ ndị Chineke. Ha tụrụ ọtụtụ puku n’ime ha mkpọrọ, gbuokwa ọtụtụ narị n’ime ha. Mgbe a lụchara agha ahụ, mba ndị so na Sọviet Yuniọn malitere ịchụgharị Ndịàmà Jehova ruo ọtụtụ afọ. Ha zigara ọtụtụ ụmụnna anyị n’ebe ha ga-arụgbu onwe ha n’ọrụ, chụgakwa ndị ọzọ n’obodo ndị dị ezigbo anya.
17 Ndị ọchịchị nwere ike ịna-amachi anyị ikwusa ozi ọma, na-atụ ndị Chineke mkpọrọ, ma na-egbu ụfọdụ n’ime anyị. Ihe ndị a hà kwesịrị ime ka ụjọ tụwa anyị ma ọ bụ mee ka anyị ghara inwezi okwukwe? Mbanụ! Jehova na-echebe ndị na-erubere ya isi. (Gụọ Matiu 10:28-31.) Anyị ahụla otú ndị ọchịchị ndị siri ezigbo ike si mie ala, ma ndị Jehova anọrọ na-aga n’ihu n’ihu. N’oge na-adịghị anya, ihe mere ndị Filistia ga-eme ọchịchị ụmụ mmadụ niile. A ga-eme ka ha mara onye Jehova bụ. Ha agaghịzi adị otú ahụ ndị Filistia na-adịghịzi.
“Nnukwu Akụ̀” Ha Echebeghị Ha
18. Olee ihe e ji mara Taya oge ochie?
18 Obodo Taya b oge ochie bụ otu n’ime nnukwu obodo ndị e ji ịzụ ahịa mara n’oge ochie. Ndị Taya na-esi n’Oké Osimiri Mediterenian eji ụgbọ mmiri aga ebe dị iche iche ha na-azụ ahịa n’ebe ọdịda anyanwụ. N’ebe ọwụwa anyanwụ, e nwekwara ọtụtụ okporo ụzọ ndị Taya na-esi aga ahịa ná mba ndị dị anya. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Taya si ná mba ndị a dị anya na-akpakọju akụnụba n’elu ndị nke ha nwere enwe. Ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa na Taya bara nnọọ ọgaranya nke na ha na-ele onwe ha anya ka ụmụ ndị eze.—Aịza. 23:8.
19, 20. Gịnị dị iche ná ndị Taya na ndị Gibiọn?
19 N’oge Devid chịrị Izrel nakwa n’oge Solomọn na-achị, ndị Izrel na ndị Taya zụkọrọ ahịa. Ndị Taya buteere ndị Izrel osisi e ji rụọ obí Devid nakwa ndị nke e mechara jiri rụọ ụlọ nsọ Solomọn. Ha kpọnyekwara ndị Izrel ndị omenkà ndị nyere aka rụọ ụlọ ndị ahụ. (2 Ihe 2:1, 3, 7-16) N’oge ahụ, ndị Izrel ji obi ha niile rubere Jehova isi, Jehova nọkwa na-agọzi ha. (1 Eze 3:10-12; 10:4-9) Chegodị otú ọtụtụ puku ndị Taya si nwee ohere ịmara onye Jehova bụ na ife ya ezigbo ofufe. Ha nwekwara ohere iji anya ha hụ ọtụtụ uru mmadụ na-erite ma o fewe ezi Chineke.
20 N’agbanyeghị ohere ọma a ndị Taya nwere, ha nọ na-achụ akụnụba ka a na-anwụ anwụ. Ha emeghị ka ndị bi na Gibiọn, bụ́ obodo siri ike dị na Kenan. Ndị Gibiọn malitere ife Jehova naanị n’ihi ọrụ ebube ndị ha nụrụ na Jehova rụrụ. (Josh. 9:2, 3, 22–10:2) N’eziokwu, ndị Taya mechara megidewe ndị Chineke. Ha redịrị ụfọdụ n’ime ha ka ha gbawa ohu.—Ọma 83:2, 7; Joel 3:4, 6; Emọs 1:9.
Anyị agaghị ewere ihe ndị anyị nwere ka mgbidi na-echebe anyị
21, 22. Gịnị mere ndị bi na Taya? Gịnị kpatara ya?
21 Jehova si n’ọnụ Ezikiel gwa ndị ahụ na-emegide ya, sị: “Taya, m ga-eme gị ihe. M ga-akpọta ọtụtụ mba ka ha lụso gị agha, otú ahụ ebili mmiri si eme n’oké osimiri. Ha ga-ebibi mgbidi Taya, kwatuokwa ụlọ elu ya niile. M ga-ekpopụ ájá dị na ya, meekwa ka ọ bụrụ nkume elu ya na-akwọ mụrụmụrụ.” (Ezik. 26:1-5) Ndị bi na Taya tụkwasịrị akụnụba ha obi na ọ ga-echebe ha otú mgbidi ogo ya dị mita iri anọ na isii si echebe obodo ha mmiri gbara gburugburu. Ihe gaara akara ha mma ma à sị na ha gere ntị na ndụmọdụ Solomọn nyere. Solomọn sịrị: “Akụ̀ onye ọgaranya bụụrụ ya obodo a rụsiri ike. N’anya ya, ọ dị ka mgbidi nke na-echebe ya.”—Ilu 18:11.
22 Jehova ji ndị Babịlọn na ndị Grik mezuo amụma ahụ Ezikiel buru. N’oge o mezuru, ndị bi na Taya chọpụtara na ọ bụ naanị n’anya ha ka akụnụba ha na mgbidi obodo ha na-echebe ha. Mgbe ndị Babịlọn bibichara Jeruselem, ha malitere ịlụso ndị Taya agha ruo afọ iri na atọ, mechazie merie obodo ha nke dị n’elu ala. (Ezik. 29:17, 18) N’afọ 332 T.O.N.K., Alegzanda Onye Ukwu mezuru otu ihe gbara ọkpụrụkpụ n’amụma ahụ Ezikiel buru. c Ndị agha Alegzanda kpokọọrọ okwute, osisi na ájá ndị si n’obodo Taya dị n’elu ala a kwaturu akwatu ma wụnye ha n’ime mmiri. Ha si otú ahụ rụta ụzọ ha si ruo n’obodo Taya nke mmiri gbara gburugburu. (Ezik. 26:4, 12) Alegzanda kwaturu mgbidi obodo ahụ, kwakọrọ ihe ndị dị n’obodo ahụ ma gbuo ọtụtụ puku ndị agha na ụmụ amaala. O rekwara iri puku kwuru iri puku n’ime ha ka ha bụrụ ndị ohu. Ndị bi na Taya bịara mara onye Jehova bụ mgbe o doro ha anya na “nnukwu akụ̀” anaghị echebecha mmadụ.—Ezik. 27:33, 34.
23. Gịnị ka ihe mere ndị bi na Taya na-akụziri anyị?
23 Gịnị ka ihe mere ndị bi na Taya na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ikwe ka “akụnụba nke na-aghọgbu ndị mmadụ” mee ka anyị tụkwasị ihe ndị anyị nwere obi, were ha ka à ga-asị na ha bụ mgbidi nke na-echebe anyị. (Mat. 13:22) Anyị “agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Gụọ Matiu 6:24.) Ọ bụ naanị ndị ji obi ha niile na-efe Jehova ka ọ na-echebe. (Mat. 6:31-33; Jọn 10:27-29) Amụma ndị e buru gbasara oge anyị a ga-emezucha otú amụma ndị e buru gbasara Taya mezuru. Mgbe ha ga-emezu, ndị tụkwasịrị akụnụba obi ga-amata onye Jehova bụ n’oge ọ ga-ebibi ndị ji anyaukwu na-azụ ahịa, ndị na-achọkwa ka ha fọjuo naanị akpa ha.
Ọchịchị Mmadụ Bụ “Okporo Ọka”
24-26. (a) Gịnị mere Jehova ji kpọọ Ijipt “okporo ọka”? (b) Olee otú Eze Zedekaya si leghara ntụziaka Jehova anya? Gịnị meziri ya?
24 Malite n’oge Josef dị ndụ ruo n’oge ndị Babịlọn lụsoro Jeruselem agha, ọchịchị ndị Ijipt kpara ezigbo ike n’Ala Nkwa ahụ. Ebe ọ bụ na o teela mba Ijipt dịwara, ọ dị ka à ga-asị na e nweghị ihe nwere ike ime ya. O yiziri nnukwu osisi gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ala. Ma e jiri ya tụnyere Jehova, o sighị ike ọ bụla. Ọ dị ka “okporo ọka.”—Ezik. 29:6.
25 Eze Zedekaya, onye kwụsịrị ife Jehova, aghọtaghị na Ijipt dị ka okporo ọka. Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma gwa Zedekaya ka o rubere eze Babịlọn isi. (Jere. 27:12) Zedekaya jidị aha Jehova ṅụọ iyi na ya agaghị enupụrụ Nebukadneza isi. Ma, o leghaara ihe Jehova kwuru anya, o meghịkwa ihe ọ ṅụụrụ Nebukadneza n’iyi. Ọ rịọrọ ndị Ijipt ka ha nyere ya aka lụso ndị Babịlọn ọgụ. (2 Ihe 36:13; Ezik. 17:12-20) Ma, ndị Izrel ndị tụkwasịrị ndị ọchịchị Ijipt obi kpataara onwe ha nnukwu nsogbu. (Ezik. 29:7) O nwere ike ịdị ndị ọchịchị Ijipt ka hà bụ “nnukwu anụ mmiri” nke na-eyi mba ndị ọzọ egwu. (Ezik. 29:3, 4) Ma Jehova sịrị na ya ga-eme ya ihe ndị dinta na-eme agụiyi ma ha chọọ ijide ya n’osimiri Naịl. Ọ ga-eji nko koro ya n’agba dọpụta ya ma bibie ya. O mere otú ahụ mgbe o zigara ndị Babịlọn ka ha merie Ijipt.—Ezik. 29:9-12, 19.
26 Gịnị meziri Zedekaya onye nnupụisi? Ebe o nupụụru Jehova isi, Ezikiel buru amụma na a ga-ekpupụ “onye ọjọọ” ahụ “bụ́ onyeisi Izrel” okpueze, bibiekwa ọchịchị ya. Ma, Ezikiel kwukwara ihe gosiri na olileanya ka dị. (Ezik. 21:25-27) Jehova mere ka Ezikiel buo amụma na otu eze si n’ezinụlọ ndị eze bụ́ “onye o ruuru” ga-eweghara ocheeze ahụ. N’Isi nke 8 n’akwụkwọ a, anyị ga-ahụ onye o mechara bụrụ.
27. Gịnị ka otú ndị Izrel na ndị Ijipt si mekọọ ihe na-akụziri anyị?
27 Gịnị ka otú ndị Izrel na ndị Ijipt si mekọọ ihe na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ndị Jehova taa ekwesịghị ịtụkwasị ndị ọchịchị obi, chee na ndị ọchịchị nwere ike ichebe ha. Anyị kwesịrị igosi na anyị “abụghị nke ụwa,” ma n’ihe anyị na-eche n’obi anyị. (Jọn 15:19; Jems 4:4) O nwere ike ịdị ka ọchịchị ụmụ mmadụ ò siri ike, ma o sighị ike ọ bụla. Ọ dị ka okporo ọka otú Ijipt oge ochie dị. Ị̀ hụla ihe mere o ji jọgbuo onwe ya mmadụ ịtụkwasị mmadụ efu obi kama ịtụkwasị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ́ Ọkaakaa eluigwe na ụwa, obi?—Gụọ Abụ Ọma 146:3-6.
Mba Dị Iche Iche “Ga-amara”
28-30. Olee ihe dị iche n’otú mba dị iche iche ga-esi ‘mara Jehova’ na otú anyịnwa si mara ya?
28 N’ọtụtụ ebe n’akwụkwọ Ezikiel, Jehova kwuru na mba dị iche iche ‘ga-amara na m bụ Jehova.’ (Ezik. 25:17) Ihe a Jehova kwuru mezuru n’oge ochie mgbe Jehova bibiri ndị iro ndị ya. Ma, ha ka ga-emezu n’oge anyị a. Olee otú ha ga-esi emezu?
29 Otú ahụ ọ dị ndị Chineke n’oge ochie ka ọ dịkwa anyị taa. Mba ndị chere na anyị dị ka otu atụrụ na-enweghị ike ichebe onwe ya gbara anyị gburugburu. (Ezik. 38:10-13) N’oge na-adịghị anya, mba dị iche iche ga-eji iwe lụso ndị Chineke ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọ bụ ihe anyị ga-amụ n’Isi nke 17 na nke 18 n’akwụkwọ a. Ma, ọ bụ mgbe ha lụsoro ndị Chineke ọgụ a ka ha ga-amata mbe abụọ nke bụ́ oké. Ha ga-amata onye Jehova bụ, ya bụ, ghọta na ọ bụ ya bụ ọkaakaa, mgbe ọ ga-ebibi ha n’agha Amagedọn.—Mkpu. 16:16; 19:17-21.
30 Ma Jehova ga-echebe anyị, gọziekwa anyị. Maka gịnị? Ọ bụ maka na anyị agbaala mbọ n’oge a gosi na anyị ma onye Jehova bụ. Otú anyị si mee ya bụ na anyị tụkwasịrị ya obi, na-erubere ya isi, ma na-efe ya otú ọ chọrọ n’ihi na ọ bụ ya ka e kwesịrị ife ofufe.—Gụọ Ezikiel 28:26.
a Dị ka ihe atụ, ndị Filistia ekweghị ka e nwee ndị na-akpụ ụ́zụ́ n’Izrel. Ndị Izrel niile na-aga na nke ndị Filistia amụ ihe ndị ha ji arụ ọrụ n’ubi. Onye Izrel ga-arụ ọrụ ihe karịrị ụbọchị abụọ iji rụta ego ọ ga-akwụ ka a mụọrọ ya ngwá ọrụ ya.—1 Sam. 13:19-22.
b Ọ ga-abụ na ná mmalite, a rụrụ obodo Taya n’elu nnukwu nkume mmiri gbara gburugburu nke dị n’ebe na-adịghị anya n’ụsọ osimiri. Obodo a dị ihe dị ka kilomita iri ise ma e si n’ebe ugwu Ugwu Kamel gawa ya. Ma, e mechara rụọ obodo Taya nke abụọ n’elu ala. Aha a na-akpọ obodo a n’asụsụ Hibru bụ Sọọ. Ọ pụtara “Oké Nkume.”
c Aịzaya, Jeremaya, Joel, Emọs, na Zekaraya bukwara amụma ihe a ga-eme Taya. Ihe niile ha buru n’amụma gbasara obodo a mezuchara.—Aịza. 23:1-8; Jere. 25:15, 22, 27; Joel 3:4; Emọs 1:10; Zek. 9:3, 4.