Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 6

“Ọgwụgwụ Unu Eruola”

“Ọgwụgwụ Unu Eruola”

EZIKIEL 7:3

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Otú ikpe Jehova mara Jeruselem si mezuo

1, 2. (a) Olee ihe gbagwojuru ndị mmadụ anya Ezikiel nọ na-eme? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka ihe ndị ahụ ọ nọ na-eme na-egosi?

 IHE Ezikiel onye amụma nọ na-eme gbagwojuru onye ọ bụla anya. Akụkọ ya ruru n’ebe niile ndị Juu ibe ya a dọọrọ n’agha bi na Babịlọn. Kemgbe otu izu, ọ nọ ọdụ n’ebe ndị ibe ya a dọọrọ n’agha bi, na-ele n’anya n’anya. Ọ tụpụrụghị onye ọ bụla ọnụ. Ma, o biliri banye n’ụlọ ya gbachigide onwe ya ụzọ. Ka ndị agbata obi ya nọ na-ele ihe na-emenụ, na-echekwa ihe ha pụtara, onye amụma a si n’ụlọ ya pụta, buru otu brik dowe n’ihu ya, malite ise ihe n’elu ya. Ezikiel maliteziri ịrụ obere mgbidi, o kwughịkwa ihe ọ bụla.—Ezik. 3:10, 11, 15, 24-26; 4:1, 2.

2 Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị nọ na-abịakwu na-ele ihe Ezikiel na-eme. O nwekwara ike ịbụ na ha nọ na-ajụ onwe ha, sị, ‘Gịnị ka ihe a niile pụtara?’ Ma, ọ bụ mgbe e mechara ka ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha ga-aghọta ihe ndị a gbagwojuru ha anya Ezikiel onye amụma nọ na-eme. Ha ga-aghọta na ihe ndị a na-egosi ihe dị egwu Jehova Chineke ga-eme ha maka na ha kpasuru ya iwe. Gịnị ga-eme ha? Olee otú ihe ahụ si kpaa ndị Izrel oge ochie aka ọjọọ? Oleekwa otú ihe ahụ merenụ si gbasa ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe taa?

“Buru Otu Brik . . . Were Ọka Wit . . Were Mma Agha Dị Nkọ”

3, 4. (a) Olee ihe atọ Chineke chọrọ ime Jeruselem Ezikiel mere ka a mata? (b) Gịnị ka Ezikiel mere nke gosiri na a ga-anọchibido Jeruselem?

3 N’ihe dị ka n’afọ 613 T.O.N.K., Jehova gwara Ezikiel ka o mee ihe atọ ga-egosi ihe ọ ga-eme Jeruselem. Ihe atọ ahụ bụ nnọchibido a ga-anọchibido obodo ahụ, ahụhụ ndị bi na ya ga-ata, na mbibi a ga-ebibi obodo ahụ na ndị bi na ya. a Ka anyị lebakwuo anya n’ihe atọ ndị a.

4 Nnọchibido a ga-anọchibido Jeruselem. Jehova gwara Ezikiel, sị: “Buru otu brik busa n’ihu gị. . . . Mee ka à ga-asị na ị na-anọchibido ya.” (Gụọ Ezikiel 4:1-3.) Brik ahụ nọchiri anya Jeruselem, Ezikiel anọchie anya ndị agha Babịlọn Jehova ga-eji mezuo uche ya. Jehova gwakwara Ezikiel ka ọ rụọ obere mgbidi, ka o jiri ájá rụọ mgbidi, rụọkwa ihe e ji akwatu mgbidi. Ihe ndị a ga-agba brik ahụ gburugburu. Ha nọchiri anya ihe dị iche iche ndị Babịlọn ga-eji agba Jeruselem na ndị bi na ya gburugburu ma lụso ha agha. Iji gosi na ndị agha Babịlọn siri ezigbo ike ka ígwè, a gwara Ezikiel ka o were “ite ígwè e ji eghe ihe” ma ọ bụ ígwè dị mbadamba dowe n’agbata ya na obodo ahụ. A gwaziri ya ka o ‘chee obodo ahụ ihu.’ Ihe ndị a o mere ka à ga-asị na ọ na-alụso obodo ahụ ọgụ bụ ihe ndị Izrel ga-eji mara na e nwere ihe ga-eme nke ha na-echetụbeghị n’echiche. Jehova ga-eji ndị agha ndị iro ha nọchibido Jeruselem, bụ́ isi obodo ndị Chineke, ebe ụlọ nsọ Chineke dị.

5. Kọwaa ihe Ezikiel mere nke gosiri ihe a ga-eme ndị bi na Jeruselem.

5 Ahụhụ ndị bi na Jeruselem ga-ata. Jehova gwara Ezikiel, sị: ‘Were ọka wit, ọka bali, akịdị, lentil, ọka milet, na ọka spelt, [ya bụ, ọka yiri ọka wit] mee achịcha.’ “Ị ga na-atụ̀ nri ị ga-eri atụ̀. Shekel iri abụọ ka ị ga-eri n’otu ụbọchị.” Jehova gwaziri Ezikiel, sị: “M ga-eme ka a ghara inwe ebe e si enweta nri.” (Ezik. 4:9-16) Na nke ugbu a, ọ bụghịzi ndị agha Babịlọn ka Ezikiel nọchiri anya ha, kama ọ bụ ndị bi na Jeruselem. Ihe a Ezikiel mere na-egosi na nri ga-adị ụkọ n’obodo ahụ mgbe a ga-anọchibido ya. N’oge ahụ, ndị mmadụ ga na-agwakọta ihe ndị ha na-anaghị ejibu eme achịcha jiri ha na-eme achịcha. Ihe a gosiri na ọ bụ ihe ndị mmadụ hụrụ ka ha ga-eri. Olee otú agụụ ga-anyụru ndị mmadụ ịkpakwụ? Ezikiel kwuweziri okwu ka à ga-asị na ọ na-agwa Jeruselem okwu ihu na ihu. Ọ sịrị: “Ndị nna bi n’ime gị ga-eri ụmụ ha. Ụmụ ga-erikwa ndị nna ha.” N’ikpeazụ, ọtụtụ ndị ga-ahụsi anya maka na ụnwụ ga-asụ ha akwụ ka “à ga-asị na a gbara ha akụ́ nke ga-ebibi ha.” Ndị mmadụ ‘ga-atakwa ahụ́.’—Ezik. 4:17; 5:10, 16.

6. (a) Olee ụzọ ndị abụọ Ezikiel nọchiri anya ha otu mgbe? (b) Chineke gwara Ezikiel ka o ‘jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ntutu ya ma kee ya ụzọ atọ.’ Gịnị ka ihe a ọ gwara ya mee na-egosi?

6 Mbibi a ga-ebibi Jeruselem na ndị bi na ya. Na nke ugbu a, e nwere ihe abụọ Ezikiel onye amụma mere otu mgbe. Nke mbụ bụ na Ezikiel mere ihe gosiri ihe Jehova ga-eme. Jehova gwara ya, sị: “Were mma agha dị nkọ mere agụba.” (Gụọ Ezikiel 5:1, 2.) Aka Ezikiel ji jide mma agha ahụ nọchiri anya aka Jehova, ya bụ, ihe Jehova ga-eji ndị Babịlọn mee Jeruselem. Na nke abụọ, Ezikiel mere ihe gosiri otú ndị Juu ga-esi ahụsi anya. Jehova gwara ya, sị: “Kpụọ isi gị na afụ ọnụ gị.” Isi ahụ Ezikiel kpụrụ nọchiri anya otú a ga-esi alụso ndị Juu agha ma gbuo ha. A gwakwara Ezikiel ka o ‘jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ntutu ya ma kee ya ụzọ atọ.’ Ihe a a gwara ya na-egosi na ihe niile Jehova kwuru ga-eme Jeruselem ga-emezu, mezuchaakwa otú o kwuru.

7. Gịnị mere Jehova ji gwa Ezikiel ka o kee ntutu ya ụzọ atọ nakwa ka ihe ọ ga-eme otu ụzọ dị iche n’ihe ọ ga-eme ibe ya?

 7 Gịnị mere Jehova ji gwa Ezikiel ka o kewaa ntutu isi ya ọ kpụrụ akpụ ụzọ atọ nakwa ka ihe ọ ga-eme otu ụzọ dị iche n’ihe ọ ga-eme ibe ya? (Gụọ Ezikiel 5:7-12.) Ezikiel ‘nọ n’ime obodo ahụ’ gbaa otu ụzọ n’ime ntutu isi ahụ ọkụ iji gosi ndị na-ahụ ihe ọ na-eme na ụfọdụ ndị bi na Jeruselem ga-anwụ n’ime obodo ahụ. Ezikiel nọ na-egbu otu ụzọ ọzọ n’ime ntutu isi ya mma agha ‘gbaa obodo ahụ gburugburu’ iji gosi na a ga-egbu ụfọdụ ndị bi na Jeruselem n’ebe na-abụghị n’ime obodo ahụ. Ezikiel ghasasịrị ntutu ndị nke fọrọ afọ ka ikuku buru ha iji gosi na a ga-achụsasị ndị fọrọ na Jeruselem ná mba dị iche iche. Ma, a ga-eji “mma agha chụwa ha.” Ihe ọ pụtara bụ na ebe ọ sọkwara ndị ahụ fọrọ afọ hà biri, obi agaghị eru ha ala.

8. (a) Olee otú ihe Ezikiel mere si gosi na ndị Juu ka nwetụrụ olileanya? (b) Olee otú amụma e buru gbasara ntutu “ole na ole” si mezuo?

8 Ma, n’ihe ahụ Jehova gwara Ezikiel mee, e nwere ihe gosiri na ndị Juu nwetụrụ olileanya. Jehova gwara ya gbasara ụfọdụ n’ime ntutu ahụ ọ kpụpụtara, sị: “Chịrị ole na ole . . . , jirikwa uwe gị fụchie ha.” (Ezik. 5:3) Ihe ahụ Jehova gwara ya gosiri na a ga-azọpụta ụfọdụ ndị Juu a chụsara ná mba dị iche iche. Mmadụ ole na ole n’ime ndị ahụ a dọọrọ n’agha ga-eso ná ndị ga-alọghachi na Jeruselem ma ha nọchaa afọ iri asaa n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn. (Ezik. 6:8, 9; 11:17) Amụma a ò mezuru? Ee. Mgbe afọ iri asaa gwụrụ, afọ ole na ole agaakwa, Hagaị onye amụma kwuru na ụfọdụ n’ime ndị Juu ahụ a chụsasịrị achụsasị lọghachiri na Jeruselem n’eziokwu. Ọ bụ ha bụ “ndị agadi hụrụ ụlọ nke mbụ ahụ,” ya bụ, ụlọ nsọ Solomọn rụrụ. (Ezra 3:12; Hag. 2:1-3) Jehova mere ka a ka nwee ndị na-efe ya ezigbo ofufe, otú o kwere nkwa. Anyị ga-elebakwu anya n’otú Jehova si mee ya n’Isi nke 9 n’akwụkwọ a.—Ezik. 11:17-20.

Olee Ihe Amụma A Na-akụziri Anyị Gbasara Ihe Ndị Ga-eme n’Ọdịnihu?

9, 10. Olee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ga-eme n’ọdịnihu ihe a gwara Ezikiel mee na-echetara anyị?

9 Ihe ndị ahụ Ezikiel mere na-echetara anyị ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Baịbụl buru amụma na ha ga-eme n’ọdịnihu. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ha? Jehova ga-eme ụdị ihe ahụ o mere na Jeruselem oge ochie. Ọ ga-eji ndị ọchịchị mee ihe ndị mmadụ na-echetụbeghị n’echiche, ya bụ, ibibi okpukpe ụgha niile dị n’ụwa. (Mkpu. 17:16-18) Otú ahụ mbibi e bibiri Jeruselem si bụrụ “ọdachi a na-enwetụbeghị ụdị ya” ka “oké mkpagbu” na agha Amagedọn ga-esochi ya ga-abụkwa ihe “a na-enwetụbeghị ụdị ya.”—Ezik. 5:9; 7:5; Mat. 24:21.

10 Ihe e kwuru n’Okwu Chineke gosiri na a gaghị ebibi ndị niile na-ekpe okpukpe ụgha mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha. Ụjọ ga-ejide ha, ha esoro ụdị mmadụ dị iche iche na-achọgharị ebe ha ga-ezo. (Zek. 13:4-6; Mkpu. 6:15-17) Ihe ga-eme ha na-echetara anyị ihe mere ndị a na-ebibighị mgbe e bibiri Jeruselem oge ochie, ya bụ, ndị a chụsasịrị ka à ga-asị na a ghasasịrị ha “ka ikuku buru” ha. Dị ka anyị hụrụ na  paragraf nke 7, ọ bụ eziokwu na e gbughị ha mgbe ahụ e bibiri Jeruselem, Jehova mịịrị “mma agha chụwa ha.” (Ezik. 5:2) Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa ndị a na-agaghị egbu mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha. Ebe ọ bụla ha gbagara ka ha zoo agaghị echebe ha ka mma agha Jehova ghara inweta ha. N’agha Amagedọn, a ga-ebibi ha na ndị ọzọ niile yiri ewu.—Ezik. 7:4; Mat. 25:33, 41, 46; Mkpu. 19:15, 18.

Anyị ga-adịzi ka ndị “ogbi” ma a bịa n’ikwusa ozi ọma

11, 12. (a) N’ihi otú anyị si ghọta amụma Ezikiel buru gbasara nnọchibido a ga-anọchibido Jeruselem, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ikwusa ozi ọma anya? (b) Olee otú ozi anyị na-ezi ndị mmadụ nwere ike isi gbanwee?

11 N’ihi otú anyị si ghọta amụma a, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ikwusa ozi ọma anya? Amụma a na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ime ike anyị niile n’oge a iji nyere ndị mmadụ aka ka ha fewe Jehova. Maka gịnị? Ọ bụ maka na oge fọrọ iji “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ” ebughịzi ibu. (Mat. 28:19, 20; Ezik. 33:14-16) Mgbe Chineke ga-eji “mkpanaka” (ya bụ, ndị ọchịchị) malite ibibi okpukpe ụgha, anyị agaghịzi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ka ha mee ihe ga-eme ka a zọpụta ha. (Ezik. 7:10) Anyị ga-adịzi ka ndị “ogbi” ma a bịa n’ikwusa ozi ọma, otú ahụ e nwere mgbe Ezikiel dara ogbi, ma ọ bụ mgbe ọ kwụsịrị izi ndị mmadụ ozi si n’aka Chineke, n’oge ọ na-ebu amụma. (Ezik. 3:26, 27; 33:21, 22) N’eziokwu, e bibichaa okpukpe ụgha, ndị mmadụ ga-adịzi ka ndị ‘na-achọsi onye amụma ike ka ọ kọọrọ ha ọhụụ,’ ma e nweghị ozi ọ bụla na-azọ ndụ a ga-ezi ha. (Ezik. 7:26) Oge ha gaara eji anụ ozi ahụ ma bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst agaala.

12 Ma, ọ pụtaghị na anyị agaghịzi ekwusa ozi si n’aka Chineke. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’oge oké mkpagbu, anyị nwere ike ịmalite ikwusa ozi amamikpe nke ga na-ada ndị mmadụ ka akụ́ mmiri ígwé e ji ata ha ahụhụ. Ozi ahụ a ga na-ezi ga-eme ka o doo anya na oge a ga-ebibi ụwa ọjọọ a eruola.—Mkpu. 16:21.

“Ọ Dị Nso”

13. Gịnị mere Jehova ji gwa Ezikiel ka o jiri akụkụ aka ekpe ya dinara ala, jirikwa akụkụ aka nri ya dinara?

13 Ihe Ezikiel mere abụghị naanị ibu amụma otú a ga-esi ebibi Jeruselem, o mekwara ihe gosiri mgbe amụma ahụ ga-emezu. Jehova gwara Ezikiel ka o jiri akụkụ aka ekpe ya dinara ala ruo narị ụbọchị atọ na iri itoolu (390), jirikwa akụkụ aka nri ya dinara ala ruo ụbọchị iri anọ. Otu ụbọchị nọchiri anya otu afọ. (Gụọ Ezikiel 4:4-6; Ọnụ Ọgụ. 14:34) Ọ ga-abụ awa ole na ole ka Ezikiel mere ihe ndị a n’ụbọchị nke ọ bụla. Ma, ihe ndị a o mere gosiri kpọmkwem afọ a ga-ebibi Jeruselem. Ọ ga-abụ na narị afọ atọ na iri itoolu (390) ahụ ndị Izrel mehiere malitere n’afọ 997 T.O.N.K., ya bụ, n’afọ alaeze ebo iri na abụọ e nwere n’Izrel kewara ụzọ abụọ. (1 Eze 12:12-20) O nwere ike ịbụ na afọ iri anọ ndị Juda mehiere malitere n’afọ 647 T.O.N.K., ya bụ, n’afọ a gwara Jeremaya ka o buo amụma ma dọọ ndị nọ n’alaeze Juda aka ná ntị n’ezoghị ọnụ na a ga-ebibi ha. (Jere. 1:1, 2, 17-19; 19:3, 4) Ihe ọ pụtara bụ na oge abụọ ahụ ga-ezu n’afọ 607 T.O.N.K., nke bụ́ afọ a kwaturu Jeruselem ma bibie ya, otú Jehova buru n’amụma. b

Olee otú Ezikiel si mee ka a mata kpọmkwem afọ a ga-ebibi Jeruselem? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

14. (a) Olee otú Ezikiel si gosi na obi siri ya ike na Jehova ga-eme ihe o kwuru n’oge o kwuru ọ ga-eme ya? (b) Olee ihe ndị ga-eme tupu e bibie Jeruselem?

14 Mgbe a gwara Ezikiel ka o buo amụma gbasara narị ụbọchị atọ na iri itoolu (390) nakwa ụbọchị iri anọ ahụ, o nwere ike ịbụ na ọ mataghị kpọmkwem afọ a ga-ebibi Jeruselem. Ma, afọ ole na ole tupu e bibie Jeruselem, Ezikiel nọ na-adọ ndị Juu aka ná ntị na oge Jehova ga-ata ha ahụhụ maka mmehie ha eruwela. Ọ nọ na-agwa ha, sị: “Ọgwụgwụ unu eruola.” (Gụọ Ezikiel 7:3, 5-10.) O doro Ezikiel anya na Jehova ga-eme ihe o kwuru n’oge o kwuru ọ ga-eme ya. (Aịza. 46:10) Ezikiel bukwara amụma ihe ndị ga-eme tupu e bibie Jeruselem. Ọ sịrị: “Ọdachi ga-esochi ọdachi.” Ọdachi ndị ahụ ga-aghasa ihe niile n’obodo, mee ka ndị isi okpukpe leghara ndị okpukpe ha anya, meekwa ka ndị ọchịchị gharazie ịna-achịta ndị nọ n’okpuru ha.—Ezik. 7:11-13, 25-27.

Mgbe a nọchibidoro Jeruselem, ọ dịzi ka ‘ite e ji esi nri e sikwasịrị n’ọkụ’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee amụma Ezikiel buru nke malitere imezu n’afọ 609 T.O.N.K.?

15 Afọ ole na ole Ezikiel buchara amụma na a ga-ebibi Jeruselem, amụma o buru malitere imezu. N’afọ 609 T.O.N.K., Ezikiel nụrụ na a malitela ịlụso Jeruselem agha. N’oge ahụ, a nọ na-afụ opi, na-akpọ ndị bi na Jeruselem ka ha bịa lụọrọ obodo ha agha. Ma dị ka Ezikiel buru n’amụma, “e nweghị onye na-aga agha.” (Ezik. 7:14) Ndị bi na Jeruselem agbakọtaghị ka ha gbachitere obodo ha ma lụso ndị Babịlọn agha. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị Juu chere na Jehova ga-anapụta ha. Jehova emebuola otú ahụ mgbe ndị Asiria bịara ịlụso ndị bi na Jeruselem agha. N’oge ahụ, Jehova zitere mmụọ ozi ya, ya egbuo ọtụtụ n’ime ndị agha Asiria. (2 Eze 19:32) Ma, e nweghị mmụọ ozi nyeere ha aka ugbu a. Tupu a mara ihe na-eme, obodo ahụ ndị agha gbara gburugburu dịzi ka ‘ite e ji esi nri e sikwasịrị n’ọkụ,’ ndị bi na ya adịkwa ka ‘anụ e beriri eberi’ a chịnyere n’ime ite ahụ. (Ezik. 24:1-10) E bibiri Jeruselem mgbe ndị bi na ya hụsichara anya ruo otu afọ na ọnwa isii a nọchibidoro ya.

“Na-akpakọtaranụ Onwe Unu Akụ̀ n’Eluigwe”

16. Olee otú anyị ga-esi egosi na obi siri anyị ike na Jehova ga-eme ihe o kpebiri n’oge o kpebiri ọ ga-eme ya?

16 Gịnị ka anyị na-amụta n’amụma a Ezikiel buru? È nwere otú o si gbasa ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ na ihe ha na-eme ma e zie ha ya? Jehova ekpebiela mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha, ọ ga-emekwa ya n’oge o kpebiri na ọ ga-eme ya. (2 Pita 3:9, 10; Mkpu. 7:1-3) Anyị amaghị kpọmkwem ụbọchị ọ ga-abụ. Ma, anyị na-eme ka Ezikiel. Anyị na-eme ihe Jehova gwara anyị ka anyị mee, ya bụ, ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị ugboro ugboro, na-asị ha: “Ọgwụgwụ unu eruola.” Gịnị mere anyị ji kwesị ịgwa ha ya ugboro ugboro? Ọ bụ otu ihe ahụ mere Ezikiel ji gwa ya ndị nke oge ya ugboro ugboro. c Ọtụtụ n’ime ndị nụrụ amụma Chineke gwara ya buo na a ga-ebibi Jeruselem ekwetaghị ihe o kwuru. (Ezik. 12:27, 28) Ma, ụfọdụ ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn mechara chegharịa, ha laghachikwara n’obodo ha. (Aịza. 49:8) Taa, ọtụtụ ndị anaghịkwa ekweta na Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a. (2 Pita 3:3, 4) N’agbanyeghị ya, anyị ga na-enyere ndị chọrọ ife Chineke aka ka ha bata n’ụzọ na-eduba ná ndụ ruo mgbe Chineke ga-asị ka anyị kwụsị ikwusa ozi ahụ.—Mat. 7:13, 14; 2 Kọr. 6:2.

Anyị ka ga na-achọ ndị chọrọ ife Chineke n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị anaghị ege anyị ntị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

Gịnị mere ndị bi na Jeruselem n’oge ochie ji ‘tụfusịa ọlaọcha ha n’okporo ámá’? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Olee ihe ndị anyị ga-ahụ ga-eme n’oké mkpagbu na-abịanụ?

17 Amụma Ezikiel buru na-echetakwara anyị na mgbe a ga-ebibiwe okpukpe ụgha, e nweghị onye n’ime ndị chọọchị ‘ga-alụ agha’ ka ọ gbachitere okpukpe ụgha. Kama, mgbe ọ ga-edowe ha anya na “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị” ha na-akpọ ka o nyere ha aka bụ na nkịtị, “aka ha ga-akụda,” ha ga “na-amakwa jijiji.” (Ezik. 7:3, 14, 17, 18; Mat. 7:21-23) Olee ihe ọzọ ha ga-eme? (Gụọ Ezikiel 7:19-21.) Jehova sịrị: “Ha ga-atụfu ọlaọcha ha n’okporo ámá.” Ihe a e kwuru gbasara ndị bi na Jeruselem oge ochie na-egosikwa anyị ihe ga-eme n’oge oké mkpagbu. N’oge ahụ, ọ ga-edo ndị mmadụ anya na ego agaghị azọpụtali ha n’ọdachi na-abịanụ.

18. Gịnị ka anyị mụtara n’amụma Ezikiel gbasara ihe ndị anyị kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ anyị?

18 Ị̀ hụrụ ihe anyị kwesịrị ịmụta n’amụma Ezikiel a? Anyị mụtara na anyị kwesịrị ịna-ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ ná ndụ anyị. Chebagodịrị ihe a echiche: Ọ bụ mgbe ndị bi na Jeruselem ghọtara na e bibiwela ha na obodo ha nakwa na ihe ndị ha nwere agaghị azọpụtali ha ka ha malitere ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ ná ndụ ha. Ha tụfusịrị ihe ndị ha nwere, malitezie ‘ịchọ onye amụma ka ọ kọọrọ ha ọhụụ.’ Ma, oge ha kwesịrị ime ya agafeela. (Ezik. 7:26) O doro anyịnwa anya na oge a ga-ebibi ụwa ọjọọ a eruwela. Ọ bụ ya mere anyị ji ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ ná ndụ anyị maka na anyị nwere okwukwe na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere. N’ihi ya, anyị na-eji oge anyị niile akpakọtara onwe anyị akụ̀ n’ebe Chineke nọ. Akụ̀ a ga-aba uru ruo mgbe ebighị ebi, a gaghịkwa atụfusị ya “n’okporo ámá.”—Gụọ Matiu 6:19-21, 24.

19. Olee otú amụma Ezikiel buru si gbasa anyị taa?

19 Ná nchịkọta, olee ụzọ ụfọdụ amụma dị iche iche Ezikiel buru gbasara mbibi e bibiri Jeruselem si gbasa anyị taa? Ha na-echetara anyị na oge fọrọ anyị ga-eji nyere ndị mmadụ aka ka ha fewe Jehova ebughịzi ibu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma ka ndị ma na oge agwụla agwụ. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma ndị obi ha dị n’ife Chineke malite ife Nna anyị, Jehova. Ma, anyị ka ga na-adọ ndị na-amalitebeghị ife Jehova aka ná ntị ahụ Ezikiel dọrọ ndị obodo ya, sị: “Ọgwụgwụ unu eruola.” (Ezik. 3:19, 21; 7:3) Anyị ga-agbalịsikwa ike na-atụkwasị Jehova obi mgbe niile ma na-eme ihe ndị gosiri na ife ya ezigbo ofufe bụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.—Ọma 52:7, 8; Ilu 11:28; Mat. 6:33.

a E nwere ezigbo ihe mere a ga-eji kwuo na e nwere ndị hụrụ Ezikiel mgbe ọ na-eme ihe niile ahụ. Ọ̀ bụ gịnị? Ọ bụ na mgbe Jehova na-agwa Ezikiel ka o mee ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ, dị ka ighe achịcha na ibupụta ngwongwo ya, ọ gwara ya hoo haa ka o mee ha “n’ihu ha.”Ezik. 4:12; 12:7.

b Mgbe Jehova kwere ka e bibie Jeruselem, o mezuru ihe o kpebiri ime alaeze Juda dị ebo abụọ nakwa alaeze Izrel dị ebo iri.—Jere. 11:17; Ezik. 9:9, 10.

c Ị̀ hụrụ na naanị n’Ezikiel 7:5-7, Jehova kwuru “na-abịa” nakwa “ga-abịa” ihe ruru ugboro ise?