Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 19

“Ihe Ọ Bụla nke Dị n’Ebe Iyi ahụ Sọrutere Ga-adị Ndụ”

“Ihe Ọ Bụla nke Dị n’Ebe Iyi ahụ Sọrutere Ga-adị Ndụ”

EZIKIEL 47:9

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Otú ọhụụ osimiri si n’ụlọ nsọ na-asọpụta si mezuo n’oge ochie, otú o si emezu taa, nakwa otú ọ ga-esi emezu n’odịnihu

1, 2. Gịnị ka Ezikiel 47:1-12 gwara anyị na Ezikiel hụrụ? Gịnịkwa ka ọ chọpụtara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

 EZIKIEL hụrụ ihe ọzọ tụrụ ya n’anya n’ọhụụ ụlọ nsọ ọ hụrụ. Ọ hụrụ mmiri si n’ụlọ nsọ ahụ na-asọpụta. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ezikiel sooro mmiri ahụ na-egbuke egbuke ka ọ hụ ebe ọ na-asọga. (Gụọ Ezikiel 47:1-12.) Mmiri ahụ si n’okpuru ọnụ ụzọ ụlọ nsọ na-agbapụta, sizie n’ọnụ ụzọ àmà dị n’ebe ọwụwa anyanwụ n’ụlọ nsọ na-asọpụta. Mmụọ ozi duuru Ezikiel pụọ n’ụlọ nsọ. Ka ha na-aga, mmụọ ozi ahụ nọ na-atụ mmiri ahụ atụ̀. Ọ gwara Ezikiel ugboro ugboro ka ọ gafee mmiri ahụ, Ezikiel chọpụtakwara na mmiri ahụ nọ na-eto n’ike n’ike. Obere oge, mmiri ahụ toro bụrụzie iyi nke Ezikiel na-enweghị ike iji ụkwụ gafee, naanị ogwugwu ka ọ ga-egwu ya.

2 A gwara Ezikiel na mmiri ahụ na-asọba n’Oké Osimiri Nnu. N’ebe ọ bụla ọ sọrutere n’osimiri ahụ, ọ na-agwọ ya, mee ka azụ̀ ju ya. Ezikiel hụrụ na ụdị osisi dị iche iche na-eto n’akụkụ abụọ nke osimiri ahụ. Ha na-amị mkpụrụ ọhụrụ a na-eri eri kwa ọnwa, akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. O doro anya na ihe niile a Ezikiel hụrụ mere ka o nwee olileanya, obi eruokwa ya ala. Ma, olee otú Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha si ghọta ọhụụ a? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi ghọta ya n’oge a?

Olee Otú Ndị Izrel A Dọọrọ n’Agha Si Ghọta Osimiri Ezikiel Hụrụ n’Ọhụụ?

3. Gịnị mere na ndị Juu oge ochie echeghị na osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụ osimiri nkịtị?

3 O doro anya na ndị Juu oge ochie echeghị na osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụ osimiri nkịtị. Kama, ọ ga-abụ na amaokwu ndị ahụ chetaara ha amụma ọzọ Joel onye amụma buru na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe. Ọ ga-abụ na e dere amụma a ihe karịrị narị afọ abụọ (200) tupu oge Ezikiel. (Gụọ Joel 3:18.) Mgbe ndị Juu a dọọrọ n’agha gụrụ ihe a Joel si n’ike mmụọ nsọ dee, ha atụghị anya ka ‘mmanya dị ụtọ si n’ugwu na-atapụsị’ ma ọ bụ ka ‘mmiri ara ehi na-eru’ n’ugwu nta. Ha atụghịkwa anya na iyi nkịtị “ga-esi n’ụlọ Jehova na-asọpụta.” Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Juu ha na Ezikiel nọ. Ha echeghị na osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụ osimiri nkịtị. a Gịnịzi ka Jehova na-agwa ndị ya? Baịbụl na-enyere anyị aka ịghọta ihe ụfọdụ e kwuru n’ọhụụ ahụ. Ma, anyị ga-eleba anya n’ihe atọ doro anya, na-agbakwa ume anyị na-amụta n’ọhụụ a.

4. (a) Olee ụdị ngọzi si n’aka Jehova ọ ga-abụ na osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ mere ka ndị Juu na-atụ anya ya? (b) Gịnị mere ihe “osimiri” na “mmiri” na-anọchịkarị anya ya na Baịbụl ga-eji mesie anyị obi ike na Jehova ga-agọzi anyị? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Mmiri nke Nọchiri Anya Ngọzi Si n’Aka Jehova.”)

4 Osimiri nke nọchiri anya ngọzi. Na Baịbụl, osimiri na mmiri na-anọchikarị anya ngọzi si n’aka Jehova. N’ọhụụ ahụ, Ezkiel hụrụ ka mmiri si n’ụlọ nsọ na-asọpụta. N’ihi ya, ndị Chineke ga-aghọta na ọ bụrụ na ha ana-efe Chineke ezigbo ofufe, ọ ga na-agọzi ha n’ụba. Olee ụdị ngọzi ọ bụ? Ndị nchụàjà ga-amalitekwa ịkụziri ha iwu Chineke. Ebe ọ bụ na a ga-amalitekwa ịchụ àjà n’ụlọ nsọ, obi ga-esi ha ike na a ga na-ekpuchiri ha mmehie. (Ezik. 44:15, 23; 45:17) N’ihi ya, ha ga-abụzi ndị dị ọcha, ka à ga-asị na e ji mmiri si n’ụlọ nsọ sachaa ha.

5. Olee otú osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ si mee ka obi sie ndị Chineke ike na a ga-enwe ngọzi ga-ezuru ha niile?

5 Ngọzi a Jehova ga-agọzi ndị ya ọ̀ ga-ebu ibu nke na ọ ga-ezuru ha niile? Ọ bụrụ na Ezikiel nọ na-eche ihe a, obi ruru ya ala mgbe ọ hụrụ ka mmiri nke na-agbapụta obere obere ghọziri iyi naanị n’ihe dị ka kilomita abụọ malite n’ebe o si na-agbapụta. (Ezik. 47:3-5) Ndị Juu ahụ ndị lọtara n’ala ha nwere ike ịmụba, ma ngọzi Jehova ga-amụbakwa zuoro ha niile. Osimiri ahụ gosiri na ngọzi ndị ahụ ga-eju eju bara abara.

6. (a) Olee nkwa na-akasi obi e kwere n’ọhụụ ahụ? (b) Oleekwa ihe ọzọ e kwuru n’ọhụụ ahụ? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

6 Mmiri na-enye ndụ. N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, osimiri ahụ sọọrọ banye n’Oké Osimiri Nnu, mee ka ọtụtụ ihe dị n’osimiri ahụ dị ndụ. Mmiri ahụ mere ka ụdị azụ̀ dị iche iche dị na mmiri ahụ dị ndụ nke na e jizi ha tụnyere azụ̀ ndị na-adị n’Oké Osimiri Mediterenian. E nwedịrị ebe a na-akụ azụ̀ n’Oké Osimiri Nnu, n’agbata obodo abụọ dịtụ anya n’ibe ya. Mmụọ ozi ahụ sịrị: “Ihe ọ bụla nke dị n’ebe iyi ahụ sọrutere ga-adị ndụ.” Ma, ihe a ọ̀ pụtara na mmiri si n’ụlọ Jehova ruru ebe niile n’Oké Osimiri Nnu? Mba. Mmụọ ozi ahụ kọwara na e nwere ebe ụfọdụ bụ́ apịtị apịtị mmiri ahụ na-enye ndụ na-erughị. Ebe ndị ahụ “ga-abụ nnu nnu.” b (Ezik. 47:8-11) Ọhụụ a na-egosi na Chineke na-ekwe ndị ya nkwa na mgbe ha ga-amaliteghachi ife ya ezigbo ofufe, ndụ ha ga-aka mma, ihe adịkwara ha ná mma. Ma, e kwukwara na ọ bụghị mmadụ niile ga-anabata ngọzi si n’aka Jehova. A gaghịkwa agwọ mmadụ niile.

7. Olee otú osisi ndị ahụ Ezikiel hụrụ n’akụkụ osimiri si mee ka obi sie ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta ike?

7 Osisi na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. Olee uru osisi ndị dị n’akụkụ osimiri ahụ bara? Ọ̀ bụ na ha emeghị ka ọhụụ Ezikiel hụrụ makwuo mma? Ha mekwara ka ọ bakwuo uru. O doro anya na obi tọrọ Ezikiel na ndị Juu ibe ya ụtọ iche banyere mkpụrụ na-atọ ụtọ osisi ndị ahụ ga na-amị. Ha ga na-amị mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa. Ọmarịcha ihe a Ezikiel hụrụ mekwuru ka obi sie ha ike na ha ga na-eriju nri si n’Okwu Chineke afọ. Gịnị ọzọ ka ọ ga-emere ha? Ọ̀ kwa i chetara na akwụkwọ osisi ahụ “na-agwọ ọrịa”? (Ezek. 47:12) Jehova ma na ihe kacha mkpa bụ ime ka ya na ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta dị n’ezigbo mma. O kwekwara nkwa ime ya. N’Isi nke 9 n’akwụkwọ a, a kọwara otú o si mee ya n’amụma ndị ọzọ e buru gbasara ime ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe.

8. Gịnị gosiri na ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ka ga-emezu karịa otú o mezuburu?

8 Ma, anyị kwukwara n’Isi nke 9 na amụma ahụ mezuru naanị obere n’isi ndị ahụ si ebe a dọọrọ ha n’agha lọta. Ọ bụ ha mere ka ọ ghara imezucha. Olee otú Jehova ga-esi na-agọzi ha mgbe ha laghachiri n’omume ọjọọ ha, na-enupụ isi ma leghara ezigbo ofufe anya? Àgwà ọjọọ ụfọdụ ndị Juu nọ na-akpa wutere ndị nke na-erubere Jehova isi, gbawaakwa ha obi. Ma, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova ma na nkwa ya na-emezurịrị. Ha niile na-emezu. (Gụọ Joshụa 23:14.) N’ihi ya, otu ụbọchị, ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ka ga-emezu karịa otú o mezuburu. Ma, olee mgbe ọ ga-abụ?

Osimiri ahụ Na-asọ Taa

9. Olee mgbe ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ụlọ nsọ ga-emezu karịa otú o mezuburu?

9 N’Isi nke 14 n’akwụkwọ a, anyị mụtara na ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ ga-emezu “n’oge ikpeazụ” karịa otú o mezuburu. N’oge ahụ, a ga-ewere ezigbo ofufe ka ihe dị ezigbo mkpa. (Aịza. 2:2) Olee otú ihe ahụ Ezikiel hụrụ si emezu ugbu a?

10, 11. (a) Olee ngọzi ndị anyị na-enweta taa? (b) Olee otú ngọzi a si n’aka Jehova si na-agbasa ka o ruo ọtụtụ ndị aka n’oge ikpeazụ a?

10 Osimiri nke nọchiri anya ngọzi. Olee ngọzi mmiri ahụ si n’ụlọ Jehova na-asọpụta na-echetara anyị taa? N’eziokwu, ọ na-echetara anyị ihe niile Jehova na-enye anyị, ndị na-abara anyị uru. Nke kacha n’ime ha bụ àjà mgbapụta Jizọs. Àjà a na-asachapụ anyị ma na-eme ka Jehova na-agbaghara mmehie anyị. Eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke yikwara mmiri na-enye ndụ nke na-eme ka anyị dị ọcha. (Efe. 5:25-27) Olee otú ngọzi ndị ahụ si asọ ka mmiri n’oge anyị a?

11 N’afọ 1919, ọ bụ naanị ihe dị ka puku mmadụ ise (5,000) na-efe Jehova. Obi dịkwa ha ụtọ maka eziokwu ndị dị na Baịbụl a kọwaara ha n’oge ahụ. Ka oge na-aga, ha nọ na-adịkwu ọtụtụ. Taa, ndị na-efe Jehova akarịala nnọọ nde asatọ (8,000,000). Eziokwu ndị dị na Baịbụl ọ̀ na-eru ha niile aka? Eenụ! Eziokwu Baịbụl ndị a kọwaarala anyị juru eju bara abara. Kemgbe otu narị (100) afọ, ndị Chineke enwetala nde kwuru nde Baịbụl, akwụkwọ, magazin, broshọ, na traktị dị iche iche. Otú ahụ osimiri Ezikiel hụrụ si na-eto n’ike n’ike ka eziokwu Baịbụl si na-agbasa n’ike n’ike ka o ruo ndị chọrọ ịmata banyere Chineke n’ụwa niile aka. O teela a malitere ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ugbu a, ha dịzi na jw.org, e nwekwara ha n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Olee uru eziokwu ndị a na-abara ndị hụrụ Chineke n’anya?

12. (a) Olee otú anyị sirila hụ ka eziokwu ndị dị na Baịbụl si ruo ndị mmadụ n’obi ma mee ka ha nwee okwukwe na Jehova? (b) Olee ihe ọzọ dị ezigbo mkpa anyị mụtara n’ọhụụ ahụ? (I nwere ike ịgụ ihe e dere n’ala ala peeji.)

12 Mmiri na-enye ndụ. A gwara Ezikiel, sị: “Ihe ọ bụla nke dị n’ebe iyi ahụ sọrutere ga-adị ndụ.” Chegodị otú eziokwu ndị dị na Baịbụl si abara ndị niile na-efe Chineke ezigbo ofufe n’oge a uru. Eziokwu ndị ahụ eruola ọtụtụ nde mmadụ n’obi ma mee ka ha nwee okwukwe na Jehova. Ma, ihe ọzọ dị ezigbo mkpa anyị na-amụta n’ọhụụ ahụ bụ na ọ bụghị onye ọ bụla ga-anabata eziokwu ndị ahụ. E nwere ndị obi ha dị ka ebe ndị mmiri na-adọ nakwa ebe ndị dị apịtị apịtị n’Oké Osimiri Nnu Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ha anaghị anabata eziokwu, ha anaghịkwa eme ihe ha na-amụta. c Ka a ghara inwe mgbe anyị ga-eme otú ahụ.—Gụọ Diuterọnọmi 10:16-18.

13. Gịnị na gịnị ka osisi ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị taa?

13 Osisi na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. È nwere ihe na-agba ume osisi ndị Ezikiel hụrụ n’akụkụ osimiri ahụ na-akụziri anyị taa? Ee. Ọ̀ kwa i chetara na ha na-amị mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa nakwa na akwụkwọ ha na-agwọ ọrịa? (Ezik. 47:12) Ha na-echetara anyị na Chineke anyị na-efe ji Okwu ya bụ́ Baịbụl na-enyeju anyị afọ ma na-agwọ anyị, ya bụ, na-eme ka anyị na ya dịrị ná mma. Taa, e nwere ike ikwu na ọrịa ji ndị mmadụ, agụụ na-agụgbukwa ha, n’ihi na ha anaghị aghọta eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ma, chegodị ọtụtụ ihe Jehova na-enye anyị. È nweela mgbe ị gụchara otu isiokwu n’akwụkwọ anyị ma ọ bụ bụchaa abụ ná ngwụcha mgbakọ ma ọ bụkwanụ lechaa vidio ma ọ bụ ihe omume tiivi anyị, obi adị gị ezigbo ụtọ na Jehova ji ya gọzie gị? N’eziokwu, a na-enyeju anyị afọ. (Aịza. 65:13, 14) Eziokwu ndị anyị na-aghọta na Baịbụl hà na-eme ka ndụ anyị ka mma, anyị ana-emekwa ihe dị Jehova mma? Ezigbo ndụmọdụ ndị si n’Okwu Chineke na-enyere anyị aka izere mmehie ndị dị ka ịkwa iko, anyaukwu, na enweghị okwukwe. Jehova hazikwara otú a ga-esi na-enyere Ndị Kraịst mere mmehie dị oké njọ aka. (Gụọ Jems 5:14.) N’eziokwu, a gọziela anyị otú osisi ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ gosiri.

14, 15. (a) Gịnị ka ebe ndị bụ́ apịtị apịtị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị? (b) Olee uru osimiri ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ baara anyị taa?

14 E nwekwara ihe ebe ndị ahụ bụ́ apịtị apịtị na-akụziri anyị. Ọ na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ịjụ ngọzi si n’aka Jehova. Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị ekweghị ka a gwọọ anyị otú ọtụtụ ndị n’ụwa a na-eme. (Mat. 13:15) Kama ime ka ha, obi dị anyị ezigbo ụtọ na mmiri nke nọchiri anya ngọzi na-abara anyị uru. Mgbe ọ bụla a na-akụziri anyị eziokwu si n’Okwu Chineke, mgbe anyị na-akụziri ya ndị ọzọ, mgbe ndị okenye ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi zụrụ na-enye anyị ndụmọdụ, na-akasi anyị obi ma ọ bụ na-enyere anyị aka, anyị nwere ike icheta osimiri ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ihe ndị dị n’ebe ọ bụla ọ sọrutere na-adị ndụ, na-emekwa nke ọma.

15 Ma, ọhụụ osimiri Ezikiel hụrụ ọ̀ ka ga-emezu n’ọdịnihu? Anyị ga-achọpụta na osimiri ahụ ga na-asọsi ike na paradaịs karịa otú ọ sọtụrụla.

Otú Ọhụụ ahụ Ga-esi Emezu na Paradaịs

16, 17. (a) Olee otú o si bụrụ na mmiri nke ndụ ga na-eto n’ike n’ike na paradaịs? (b) Olee otú osimiri ahụ nke nọchiri anya ngọzi ga-esi baara anyị uru na paradaịs?

16 Ị̀ na-ahụ onwe gị na paradaịs ka gị na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị na-ekpori ndụ? Ịmụ gbasara osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ nwere ike inyere gị aka ka obi sikwuo gị ike na ihe ndị ị na-ahụ ga-eme. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ka anyị leba anya ọzọ n’ihe atọ e kwuru n’ọhụụ a ndị gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya.

17 Osimiri nke nọchiri anya ngọzi. E nwere ike ikwu na mmiri ahụ Ezikiel hụrụ ga-etokwu n’ike n’ike na paradaịs n’ihi na ọ ga-eme ka ndị mmadụ na Chineke dịrị ná mma, gwọọkwa ha. Mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ, Alaeze Chineke ga-eme ka àjà mgbapụta ya baara ndị na-erubere Chineke isi uru karịa otú ọ bara ugbu a. Ha ga-eji nwayọọ nwayọọ zuo okè. Ọrịa agaghịzi adị. A gaghịzi enwe ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ụlọ ọgwụ. Ndị mmadụ agaghịzi na-emefusị ego iji gwọọ ọrịa. A ga-enwe ọtụtụ nde mmadụ ndị agha Amagedọn na-agaghị egbu. Ọ bụ ha bụ “oké ìgwè mmadụ” ndị ga-esi ‘n’oké mkpagbu pụta.’ Ha ga-enweta mmiri nke ndụ. (Mkpu. 7:9, 14) Ma n’agbanyeghị ọtụtụ ngọzi ha ga-enweta ozugbo Alaeze Chineke malitere ịchị, ngọzi ndị ahụ ga-adị ka mmiri na-agbapụta obere obere ma e jiri ha tụnyere ndị ha ka ga-enweta. Mmiri ahụ ga-eto n’ike n’ike ma gbooro ndị mmadụ mkpa ha niile, otú Ezikiel hụrụ n’ọhụụ.

Na paradaịs, osimiri ahụ nke nọchiri anya ngọzi si n’aka Jehova ga-eme ka ahụ́ sie onye ọ bụla ike, mmadụ niile abụrụ okoro na agbọghọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

18. Olee otú o si bụrụ na “osimiri nke mmiri nke ndụ” ga-abụzi nnukwu mmiri na-asọsi ike n’ọchịchị otu puku afọ Kraịst?

18 Mmiri na-enye ndụ. N’ọchịchị otu puku afọ Kraịst, “osimiri nke mmiri nke ndụ” ga-abụzi nnukwu mmiri na-asọsi ike. (Mkpu. 22:1) A ga-akpọlite ijeri kwuru ijeri mmadụ n’ọnwụ ma mee ka ha dị ndụ ebighị ebi na paradaịs. Ihe ọma Jehova ga-eji Alaeze ya meere ndị mmadụ bụ ime ka ọtụtụ ndị nwụrụ kemgbe dịrị ndụ. (Aịza. 26:19) Ma, ndị niile a ga-akpọlite n’ọnwụ hà ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

19. (a) Olee ihe gosiri na a ga-enwe eziokwu ọhụrụ si n’aka Chineke na paradaịs? (b) Olee otú o si bụrụ na ụfọdụ ndị “ga-abụ nnu nnu” n’ọdịnihu?

19 Onye ọ bụla n’ime ha ga-eji aka ya họrọ. N’oge ahụ, a ga-emeghe akwụkwọ mpịakọta ndị ọhụrụ. N’ihi ya, ihe so na mmiri nke ndụ Jehova ga-enye anyị bụ eziokwu ọhụrụ, ma ọ bụ ntụziaka ọhụrụ. Ọ̀ bụ na ihe ọma a ga-eme anaghị eme gị obi ụtọ? Ma, ụfọdụ ndị agaghị anabata ngọzi a, kama ha ga-ahọrọ inupụrụ Jehova isi. N’ọchịchị otu puku afọ Kraịst, ụfọdụ ndị ga-enupụ isi. Ma, a gaghị ekwe ka ha kpata ọgba aghara na paradaịs. (Aịza. 65:20) Ihe a na-echetara anyị ebe ndị dị apịtị apịtị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. A gaghị eme ka ebe ndị ahụ dị mma. Ha “ga-abụ nnu nnu.” Ndị niile kpọchiri ntị jụ ịṅụ ezigbo mmiri nke ndụ mere ezigbo iberiibe. Kraịst chịchaa otu puku afọ, a ga-enwe ndị nnupụisi ga-akwado Setan. Ndị niile na-anabataghị ezigbo ọchịchị Jehova ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi otú Setan ga-anwụ.—Mkpu. 20:7-12.

20. Olee ndokwa ga-abara anyị uru a ga-eme n’ọchịchị otu puku afọ Kraịst nke na-echetara anyị osisi ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ?

20 Osisi na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. Jehova achọghị ka onye ọ bụla n’ime anyị ghara inweta ndụ ebighị ebi. Iji nyere anyị aka inweta ya, ọ ga-emekwa ka e nwee ndokwa yiri osisi ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ma na paradaịs, ihe ọma ndị Jehova ga-emere anyị ga-eme ka anyị na ya dịrị ná mma, meekwa ka ahụ́ dị anyị mma. Jizọs Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ya na ha ga-abụ eze ga-anọ n’eluigwe na-achị ruo otu puku afọ. Ebe ọ bụ na Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ bụ ndị nchụàjà, ha ga-eme ka àjà mgbapụta Kraịst baara ndị mmadụ uru, meekwa ka ha zuo okè. (Mkpu. 20:6) Ndokwa a nke ga-eme ka anyị na Jehova dịrị ná mma, meekwa ka ahụ́ dị anyị mma na-echetara anyị osisi ndị Ezikiel hụrụ n’akụkụ osimiri, ndị na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. Ọhụụ a Ezikiel hụrụ yiri amụma ọzọ mara ezigbo mma Jọn onyeozi dere. (Gụọ Mkpughe 22:1, 2.) Akwụkwọ nke osisi ndị Jọn hụrụ “bụ maka ịgwọ mba niile.” Ọrụ Jizọs na ndị nchụàjà dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-arụ ga-abara ọtụtụ nde mmadụ na-erubere Chineke isi uru.

21. Olee otú ihe ndị anyị mụtara gbasara osimiri Ezkiel hụrụ n’ọhụụ dị gị n’obi? Olee ihe ọzọ anyị ga-eleba anya na ya? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Mmiri Na-agbapụta Obere Obere Ghọziri Iyi.”)

21 Ọ̀ kwa ihe ndị anyị mụtara gbasara osimiri Ezkiel hụrụ n’ọhụụ emeela ka obi dị gị ụtọ, meekwa ka i nwee olileanya? N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe ọma ndị ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ị̀ hụrụ na ọ bụ kemgbe ọtụtụ puku afọ gara aga ka Jehova buru ọtụtụ amụma ndị na-enyere anyị aka ịhụ otú paradaịs ga-adị? O nweela ndidi kemgbe ahụ, na-akpọ anyị ka anyị soro ná ndị ga-anọ mgbe nkwa ndị ahụ ga-emezu. Ajụjụ bụzi, Ị̀ ga-adị ndụ mgbe ahụ? I nwere ike ịna-eche ma ị̀ ga-esokwa ná ndị ga-adị ndụ na paradaịs. Ka anyị hụzie otú ihe ndị e kwuru n’amụma ndị ikpeazụ Ezikiel buru si eme ka obi sie anyị ike.

a Ihe ọzọ bụ na ọ ga-abụ na ndị Juu a dọọrọ n’agha, ndị chetara otú obodo ha dị, ma na osimiri a abụghị osimiri nkịtị n’ihi na o si n’ụlọ nsọ dị n’ugwu dị ezigbo elu na-asọpụta. E nweghị ụlọ nsọ dị otú ahụ dị n’ugwu dị ezigbo elu n’ala ha. Ọhụụ ahụ gosikwara na osimiri ahụ na-asọrọ sọba n’Oké Osimiri Nnu n’enweghị ihe nọchiiri ya ụzọ. E nweghị ebe mmiri si otú ahụ asọ.

b Ụfọdụ ndị na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl chere na ihe a Baịbụl kwuru bụ ihe ọma n’ihi na o teela ndị mmadụ si ná nnu e ji echekwa nri, nke a na-egwute n’Oké Osimiri Nnu, na-akpata ezigbo ego. Ma, amaokwu ahụ kwuru hoo haa na “a gaghị eme ka ebe ndị ahụ” dị apịtị apịtị “dị mma.” Ihe ndị dị na ha agaghị adị ndụ n’ihi na mmiri na-enye ndụ, nke si n’ụlọ Jehova, anaghị erute n’ebe ndị ahụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ebe ndị ahụ ịbụ nnu nnu pụtara na ha agaghị adị mma.—Ọma 107:33, 34; Jere. 17:6.

c Ihe atụ Jizọs mere gbasara ụgbụ yiri ihe e kwuru n’ọhụụ a. Ọtụtụ azụ̀ banyere n’ụgbụ ahụ, ma ọ bụghị ha niile “dị mma.” E tufuru ndị na-adịghị mma. Jizọs kwuziri na ọtụtụ n’ime ndị na-abata ná nzukọ Jehova nwere ike imecha kwụsị ife Jehova.—Mat. 13:47-50; 2 Tim. 2:20, 21.