Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 20

‘Kee Ala ahụ Ka Onye Ọ Bụla Nweta nke Ya’

‘Kee Ala ahụ Ka Onye Ọ Bụla Nweta nke Ya’

EZIKIEL 45:1

IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe ike ala ahụ pụtara

1, 2. (a) Gịnị ka Jehova gwara Ezikiel? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

 EZIKIEL ka hụchara ọhụụ nke mere ka o cheta ihe mere n’oge Mosis na Joshụa, ya bụ, ihe dị ka narị afọ itoolu (900) tupu mgbe ahụ. N’oge ahụ, Jehova gwara Mosis ebe ndị ga-abụ ókè Ala Nkwa ahụ, mechaakwa gwa Joshụa otú a ga-esi keere ebo ndị e nwere n’Izrel ala ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 34:1-15; Josh. 13:7; 22:4, 9) Ma ugbu a, ya bụ, n’afọ 593 T.O.N.K., Jehova gwaziri Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha ka ha keere ebo ndị e nwere n’Izrel Ala Nkwa ahụ ọzọ.—Ezik. 45:1; 47:14; 48:29.

2 Gịnị ka Jehova si n’ọhụụ ahụ gwa Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha? Gịnị mere o ji bụrụ na ọhụụ a na-agba ndị na-efe Chineke taa ume? Ọhụụ a ọ̀ ga-emezu n’ọdịnihu karịa otú o mezuburu?

Ọhụụ nke Kwuru Ihe Anọ Mere Ka Obi Sie Ndị Chineke Ike

3, 4. (a) Olee ihe anọ na-emesi obi ike e kwuru n’ọhụụ ikpeazụ Ezikiel hụrụ? (b) Olee ihe na-emesi obi ike anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

3 E dere ọhụụ ikpeazụ Ezikiel hụrụ n’akwụkwọ Ezikiel isi 40 ruo n’isi 48. (Ezik. 40:1–48:35) E nwere ihe anọ e kwuru na ya mere ka obi sie ndị Izrel ike na ha ga-alaghachi n’obodo ha. Gịnị ka ha bụ? Nke mbụ bụ na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’ụlọ nsọ ya. Nke abụọ bụ na ndị nchụàjà na ndị ọzụzụ atụrụ, bụ́ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ga na-edu ndị Izrel. Nke atọ bụ na ndị niile ga-alọghachi n’Izrel ga-eketa ala. Nke anọ abụrụ na Jehova ga-anọnyere ha, ya na ha ebiri.

4 Isi nke 13 na 14 n’akwụkwọ a kwuru otú ihe nke mbụ na nke abụọ ahụ na-emesi obi ike ga-esi emezu, ya bụ, na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe nakwa na ndị ọzụzụ atụrụ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ga na-edu ndị ya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe nke atọ, ya bụ, nkwa e kwere na ndị Chineke ga-eketa ala. N’Isi nke 22, anyị ga-ekwuzi gbasara nkwa Jehova kwere na ya na ndị ya ga-ebi.—Ezik. 47:13-21; 48:1-7, 23-29.

‘A Na-ekere Unu Ala A Ka Ọ Bụrụ Ala Unu Ketara’

5, 6. (a) N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, olee ebe bụ́ ala e keere ndị Izrel? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere e ji mee ka Ezikiel hụ ala a ga-ekere ndị Izrel n’ọhụụ?

5 Gụọ Ezikiel 47:14. Jehova si n’ọhụụ gosi Ezikiel ala nke ga-adị “ka ogige Iden” n’oge na-adịghị anya. (Ezik. 36:35) Jehova kwuziri: “Ala a ka unu ga-ekere onwe unu ka ọ bụrụ ihe ebo iri na abụọ nke Izrel ketara.” (Ezik. 47:13) “Ala a” a ga-ekere ha bụ ala ndị Izrel a dọọrọ n’anya ga-alaghachi na ya. N’Ezikiel 47:15-21, Jehova kwuziri kpọmkwem ebe ókè ala ahụ ga-amalite nakwa ebe ọ ga-ejedebe.

6 Gịnị mere e ji mee ka Ezikiel hụ ala a ga-ekere ndị Izrel n’ọhụụ? A gwara Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha kpọmkwem ebe ndị ga-abụ ókè ala ha. Ihe a mere ka obi sie ha ike na ha ga-alaghachi n’obodo ha. Chegodị otú obi ga-esi atọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha nụrụ ihe a na-emesi obi ike Jehova gwara ha ma kọwaara ha nke ọma. Ma, ndị Chineke n’oge ochie hà nwetara ala ahụ e keere ha ka ọ bụrụ ihe ha ketara? Ee, ha nwetara ya.

7. (a) Gịnị malitere ime n’afọ 537 T.O.N.K., gịnịkwa ka ọ na-echetara anyị? (b) Olee ajụjụ anyị ga-ebu ụzọ zaa?

7 N’afọ 537 T.O.N.K., ya bụ, ihe dị ka afọ iri ise na isii Ezikiel hụchara ọhụụ ahụ, ọtụtụ puku ndị Izrel a dọọrọ n’agha malitere ịlaghachi n’ala ha n’Izrel ma biri na ya. Ihe a dị ịtụnanya nke mere n’oge ochie na-echetara anyị otú ụdị ihe a si na-emere ndị Chineke n’oge anyị a. E nwere ike ikwu na ha eketakwala ala. Olee otú ha si keta ya? Jehova mere ka ndị na-efe ya nweta ala, ya bụ, ka ha nwee ike ife ya ezigbo ofufe, ya na ha adịrị ná mma. N’ihi ya, nlaghachi ndị Izrel laghachiri n’Ala Nkwa ahụ nwere ike ịkụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara nlaghachi ndị Chineke laghachiri n’ala ha, ya bụ, otú ha si maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’oge a. Ma ka anyị buru ụzọ zaa ajụjụ bụ́, “Gịnị mere anyị ga-eji ekwu na e nwere ala ndị Chineke laghachiri na ya n’oge anyị a?”

8. (a) Olee mba Jehova ji dochie anya mba Izrel oge ochie? (b) Gịnị bụ ala ahụ dị iche? (ch) Olee mgbe ọ malitere ịdị, oleekwa ndị bi na ya?

8 N’ọhụụ Ezikiel hụburu, Jehova mere ka ọ mata na amụma ndị kwuru na ndị Izrel ga-amaliteghachi ife ya ezigbo ofufe ga-emezu karịa otú o mezuburu ma ‘Devid ohu ya,’ bụ́ Jizọs Kraịst, malite ịchị. (Ezik. 37:24) Ihe a mezuru n’afọ 1914. Tupu mgbe ahụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ mba dị nsọ, anọchiela mba Izrel oge ochie. (Gụọ Matiu 21:43; 1 Pita 2:9.) Ma, ihe Jehova mere abụghị naanị iji mba ahụ dị nsọ dochie anya mba Izrel oge ochie, kama o jikwa ala dị iche dochie anya ala ndị Izrel oge ochie. (Aịza. 66:8) Anyị mụtara n’Isi nke 17 n’akwụkwọ a na kemgbe afọ 1919, ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ bi n’ala ahụ, ya bụ, na ha na-efe Jehova ezigbo ofufe, ha na ya adịrịkwa n’ezigbo mma. (Gụọ igbe 9B, nke isiokwu ya bụ, “Ihe Mere n’Afọ 1919.”) Ka oge na-aga, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ya bụ, “atụrụ ọzọ,” malitekwara ịbanye n’ala ahụ. (Jọn 10:16) Ọ bụ eziokwu na ala ahụ na-asakwu mbara taa, ọ bụ mgbe agha Amagedọn gachara ka ngọzi si na ya ga-ezu ezu.

E Kere Ala Otú E Kwuru, Ha Niile Há Nhata

9. Gịnị ka Jehova kwuru gbasara otú a ga-esi eke ala ahụ?

9 Gụọ Ezikiel 48:1, 28. Mgbe Jehova kwuchara ebe ala ahụ ga-ebido na ebe ọ ga-akwụsị, o kwuziri otú a ga-esi ekere ya ndị Izrel. O kwukwara na ala ebo nke ọ bụla n’ebo iri na abụọ e nwere n’Izrel ga-eketa ga-aha. E nweghị nke ga-aka ibe ya malite n’ebe ugwu ruo n’ebe ndịda. Ebo Dan ga-adị n’elu elu ebe ugwu, ebo Gad adịrị ná ngwụcha ngwụcha ebe ndịda. Ala nke ọ bụla n’ime ala iri na abụọ ndị ahụ ga-amalite n’ebe ọwụwa anyanwụ gara ùhiè ùhiè ruo n’ebe ọdịda anyanwụ n’Oké Osimiri Mediterenian.—Ezik. 47:20; i nwere ike ile map dị n’igbe isiokwu ya bụ “Otú E Si Kee Ala Ahụ.”

10. Olee otú ọhụụ a si mesie ndị ahụ a dọọrọ n’agha obi ike?

10 Olee otú ọhụụ a si mesie ndị ahụ a dọọrọ n’agha obi ike? Ọ ga-abụ na otú Ezikiel si kọwaa ihe niile gbasara ala ahụ a ga-eke mere ka obi sie ha ike na a ga-asa anya ná mmiri kee ala ahụ. Ala há nhata ebo iri na abụọ ahụ ga-eketa na-egosikwa na onye ọ bụla n’ime ndị ahụ ga-esi n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta n’Izrel ga-enwetarịrị ala nke ya. E nweghị onye ga-alọta a hapụ ikenye ya ala ma ọ bụ ya aghara inwe ebe ọ ga-ebi.

11. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ọhụụ Ezikiel hụrụ gbasara ike ala? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Otú E Si Kee Ala Ahụ.”)

11 Olee ihe ndị na-agba ume anyị nwere ike ịmụta n’ọhụụ ahụ taa? Ọ bụghị naanị ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị isi nwetara ebe ha ga-ebi n’Ala Nkwa ahụ, ndị niile ọzọ si n’ebo iri na abụọ n’Izrel nwetakwara. (Ezik. 45:4, 5, 7, 8) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọ bụghị naanị ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ na ndị okenye ndị ọzọ, bụ́ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ,’ nwetara ala, ndị ọzọ niile so n’oké ìgwè mmadụ sokwa nweta ala. a (Mkpu. 7:9) Onye ọ bụla n’ime anyị, ma onye ukwu ma onye nta, nwere ebe bụ́ nke ya n’ala a, nweekwa ọrụ ọ ga na-arụ na ya. N’eziokwu, ihe a na-eme obi ụtọ.

N’agbanyeghị ụdị ọrụ anyị na-arụ ná nzukọ Jehova, Jehova ji mbọ anyị na-agba kpọrọ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

Gịnị Ka Ihe Abụọ E Kwuru Gbasara Ike Ala Na-akụziri Anyị?

12, 13. Gịnị ka Jehova kwuru hoo haa gbasara otú a ga-esi ekere ebo dị iche iche ala ahụ?

12 Ọ ga-abụ na ihe ụfọdụ Jehova kwuru gbasara otú a ga-esi kee ala ahụ juru Ezikiel anya n’ihi na ha dị iche n’ihe Chineke gwara Mosis. Ka anyị hụ ihe abụọ dị iche na ha. Nke mbụ bụ otú a ga-esi eke ala ahụ, nke abụọ abụrụ ndị ga-eketa ala ahụ.

13 Nke mbụ bụ otú a ga-esi eke ala ahụ. A gwara Mosis ka o kenye ebo ndị dị ọtụtụ ala buru ibu, kenye ndị na-adịghị ọtụtụ ala na-ebughị ibu. (Ọnụ Ọgụ. 26:52-54) Ma n’ọhụụ Ezikiel hụrụ, Jehova kwuru hoo haa ka e kenye ebo nke ọ bụla ihe “ibe ya ga-eketa.” (Ezik. 47:14) N’ihi ya, malite n’ókè ebe ùgwù ruo n’ókè ebe ndịda, ala ebo nke ọ bụla n’ebo iri na abụọ ahụ ga-eketa ga-aha nhata. Ndị Izrel niile, n’agbanyeghị ebo ha si, ga na-enweta akụ̀ ndị Ala Nkwa ahụ, nke mmiri na-ede nke ọma, ga na-emepụta. Ebo nke ọ bụla ga-enweta ihe ibe ya nwetara.

14. Olee otú ihe Jehova kwuru banyere ndị mbịarambịa si dị iche n’ihe Iwu Mosis kwuru?

14 Nke abụọ bụ ndị ga-eketa ala ahụ. Ihe e kwuru n’Iwu Mosis mere ka a na-akwanyere ndị mbịarambịa n’Izrel ùgwù, meekwa ka ha soro na-efe Jehova. Ma, a naghị ekenye ha ala. (Lev. 19:33, 34) Ma, ihe Jehova gwara Ezikiel ugbu a dị iche n’ihe o kwuburu n’Iwu Mosis. Ọ gwara Ezikiel, sị: “N’ebo ọ bụla onye mbịarambịa bi ka unu ga-enye ya ala.” Jehova ji ihe a ọ gwara ya gosi na e nweghịzi ihe dị iche ‘n’ụmụ amaala Izrel’ na ndị mbịarambịa bi n’ala ahụ. (Ezik. 47:22, 23) N’ala ahụ Ezikiel hụrụ, ọ chọpụtara na e nweghị onye ka ibe ya, ha niile na-efekọkwa Jehova ọnụ.—Lev. 25:23.

15. Olee eziokwu na-anaghị agbanwe agbanwe e ji mara Jehova nke anyị chọpụtara n’ihe o kwuru gbasara ike ala ahụ nakwa gbasara ndị ga-ebi na ya?

15 O doro anya na ihe abụọ a gbara ọkpụrụkpụ Jehova gwara Ezikiel gbasara otú a ga-esi kee ala ahụ na ndị ga-ebi na ya mere ka obi sie ndị ahụ a dọọrọ n’agha ike. Ha ma na Jehova ga-ekenye ha niile ala há nhata, ma hà bụ ụmụ afọ Izrel ma hà bụ ndị mbịarambịa na-efe Jehova. (Ezra 8:20; Nehe. 3:26; 7:6, 25; Aịza. 56:3, 8) Ihe ahụ Jehova kwuru gosikwara na o ji ndị niile na-efe ya kpọrọ ezigbo ihe. E nweghị onye ka ibe ya n’anya ya. Ihe a na-agba anyị ume. Ọ bụkwa eziokwu na-anaghị agbanwe agbanwe. (Gụọ Hagaị 2:7.) Taa, ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị ji eziokwu a kpọrọ ihe.

16, 17. (a) Olee uru ịmụ ihe ndị a e kwuru gbasara ala ahụ na ndị ga-ebi na ya baara anyị? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’Isi nke 21?

16 Olee uru ịmụ ihe ndị a e kwuru gbasara ala ahụ na ndị ga-ebi na ya baara anyị? Ọ na-echetara anyị na ihe e kwesịrị iji mara anyị n’ụwa niile taa bụ na anyị na ụmụnna anyị dị n’otu, e nweghịkwa onye n’ime anyị ka ibe ya. Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àna m eme ka Jehova, ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu? M̀ na-eji obi m niile akwanyere ndị mụ na ha na-efekọ Jehova ùgwù n’agbanyeghị agbụrụ ha si ma ọ bụ otú ihe si dịrị ha?’ (Rom 12:10) Obi dị anyị ụtọ na Jehova, Nna anyị nke eluigwe, kwere ka anyị niile bata n’ala o nyere ndị ya, ya bụ, ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma, anyị ejiri obi anyị niile na-efe ya ezigbo ofufe, ya ana-agọzikwa anyị.—Gal. 3:26-29; Mkpu. 7:9.

Ànyị na-eme ka Jehova, ghara ịna-ele ndị mmadụ anya n’ihu ma jiri obi anyị niile na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15, 16)

17 Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe nke anọ na-emesi obi ike e kwuru ná ngwụcha ọhụụ Ezikiel hụrụ, ya bụ, na Jehova ga-anọnyere ndị ahụ a dọọrọ n’agha. Gịnị na gịnị ka nkwa a na-akụziri anyị? A ga-aza ajụjụ a n’Isi nke 21.

a Biko, gụọ Isi nke 14 n’akwụkwọ a ka ị hụ ihe e kwuru gbasara ọrụ pụrụ iche Jehova nyere ndị na-arụ ọrụ ka ndị nchụàjà na ndị isi n’ala ndị Chineke, ya bụ, n’ezigbo ofufe anyị na-efe Jehova.