Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 4

Gịnị Ka Ntị Adam na Iv Gere Setan Kpatara?

Gịnị Ka Ntị Adam na Iv Gere Setan Kpatara?

Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi ma nwụọ. Jenesis 3:6, 23

Iv gere agwọ ahụ ntị wee rie mkpụrụ osisi ahụ. O mechara nyetụ Adam, Adam eriekwa.

Ihe ahụ ha mere adịghị mma. Ọ bụ mmehie. Chineke chụpụrụ ha na Paradaịs ahụ ha bi.

Ihe siiri ha na ụmụ ha ike. Ha kara nká, mechaakwa nwụọ. Ha agaghị biri n’ala ndị mmụọ; ha kwụsịrị ịdị ndụ.

Ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ, otú ahụ ájá na-adịghị ndụ. Jenesis 3:19

Ihe mere anyị ji anwụ bụ na anyị niile bụ ụmụ Adam na Iv. Ndị nwụrụ anwụ anaghị ahụ ụzọ, ha anaghị anụ ihe, ha anaghịkwa eme ihe ọ bụla.—Ekliziastis 9:5, 10.

Jehova ebughị n’obi ka ndị mmadụ na-anwụ anwụ. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụrụ na ha egee ya ntị, ha ga-adị ndụ ebighị ebi.