Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 11

Jehova Ọ̀ Na-anụ Ekpere Anyị?

Jehova Ọ̀ Na-anụ Ekpere Anyị?

Chineke na-anụ ekpere anyị. 1 Pita 3:12

Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ chọrọ ka anyị na-agwa ya ihe dị anyị n’obi.

Na-ekpegara naanị Jehova ekpere.

E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịrịọ Chineke n’ekpere. 1 Jọn 5:14

Kpee ekpere ka e mee uche Chineke n’ụwa dị ka a na-eme ya n’eluigwe.

Na-ekpe ekpere n’aha Jizọs. Ime otú ahụ na-egosi na obi dị gị ụtọ maka ihe o meere gị.

Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka i mee ihe ziri ezi. I nwekwara ike ịrịọ ya ka o nye gị nri, ka o mee ka i nweta ọrụ, ụlọ, uwe, nakwa ka ahụ́ sie gị ike.