Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 10

Olee Ihe Ọma Chineke Ga-emere Ndị Gere Ya Ntị?

Olee Ihe Ọma Chineke Ga-emere Ndị Gere Ya Ntị?

A ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ ka ha biri n’ụwa. Ọrụ Ndịozi 24:15

Chegodị banyere ihe ọma Jehova ga-emere gị ma i gee ya ntị! Ahụ́ ga-agbasi gị ike. Ọ dịghị onye ga-arịa ọrịa. Ndị ọjọọ agaghị adị. Ị ga-atụkwasịkwa onye ọ bụla obi.

Ihe mgbu, iru uju, ma ọ bụ ịkwa ákwá agaghị adịkwa. E nweghị onye ga-aka nká ma ọ bụ nwụọ.

Ndị gị na ha ga-anọ ga-abụ ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị. Ibi na Paradaịs ga-atọgbu onwe ya.

Ọ dịghị ihe ga-eme ka ndị mmadụ tụọ ụjọ. Ha ga-enwe ezigbo obi ụtọ.

Alaeze Chineke ga-akwụsị ahụhụ niile. Mkpughe 21:3, 4