Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 3

Olee Ụdị Ndụ Adam na Iv Biri na Paradaịs?

Olee Ụdị Ndụ Adam na Iv Biri na Paradaịs?

Jehova nyere Adam na Iv ọtụtụ ihe ọma. Jenesis 1:28

Jehova kere nwaanyị mbụ bụ́ Iv, kpọrọ ya kpọnye Adam ka ọ bụrụ nwunye ya.—Jenesis 2:21, 22.

Jehova kere ha ka ha zuo okè.

Ha biri n’ogige Iden, bụ́ ebe mara ezigbo mma. E nwere osimiri, osisi ndị na-amị mkpụrụ, na ụmụ anụmanụ n’ebe ahụ.

Jehova gwara ha okwu ma kụziere ha ihe. A sị na ha gere ya ntị, ha gaara adị ndụ ebighị ebi n’ụwa bụ́ Paradaịs.

Chineke sịrị ha erila mkpụrụ si n’otu osisi dị n’ogige Iden ahụ. Jenesis 2:16, 17

Jehova gosiri Adam na Iv otu osisi na-amị mkpụrụ n’ogige Iden ahụ ma gwa ha na ha ga-anwụ ma ha rie mkpụrụ ya.

Otu n’ime ndị mmụọ ozi Chineke kere nupụụrụ ya isi. Mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi bụ Setan bụ́ Ekwensu.

Setan achọghị ka Adam na Iv rubere Jehova isi. N’ihi ya, o ji agwọ gwa Iv na ọ bụrụ na o rie mkpụrụ osisi ahụ, na ọ gaghị anwụ, kama na ọ ga-adị ka Chineke. Ihe ahụ Setan gwara ya bụ ụgha.—Jenesis 3:1-5.