Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Mmalite

Okwu Mmalite

Chineke yiri nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya. 1 Pita 5:6, 7

Ọ bụ Chineke kere anyị. Ọ na-echekwa banyere anyị. Nna nke maara ihe ma hụ ụmụ ya n’anya na-akụziri ụmụ ya ihe, ọ bụ otú ahụ ka Chineke si akụziri ndị mmadụ n’ebe niile ụzọ kacha mma ha ga-esi ebi ndụ.

Chineke na-eme ka anyị mara eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa, bụ́ ndị na-eme ka anyị nwee ọṅụ na olileanya.

Ọ bụrụ na i gee Chineke ntị, ọ ga-eduzi gị. Ọ ga elekọta gị ma nyere gị aka imeri nsogbu ndị ị na-enwe.

Ma e nwere ihe ọzọ ọ ga-emere gị. Ọ ga-enye gị ndụ ebighị ebi!

Chineke na-agwa onye ọ bụla, sị, ‘Bịakwute m. Gee ntị, dịkwa ndụ.’ Aịzaya 55:3