Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 9

Olee Mgbe Ụwa Ga-aghọ Paradaịs?

Olee Mgbe Ụwa Ga-aghọ Paradaịs?

Ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa na-egosi na Alaeze Chineke adịla nso. Luk 21:10, 11; 2 Timoti 3:1-5

Baịbụl buru ọtụtụ ihe na-eme taa n’amụma. O kwuru na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-eme ihe ike, na ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya.

A ga-enwe oké ala ọma jijiji, agha, ụkọ nri, na ọrịa nke zuru ebe niile. Ihe ndị a na-eme taa.

Jizọs kwukwara na a ga-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke n’ụwa dum.—Matiu 24:14.

Alaeze Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ niile. 2 Pita 3:13

N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị niile na-eme ihe ọjọọ.

Chineke ga-emesi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ike.

Ndị ga-afọdụ bụ ndị gere Chineke ntị. Ha ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume, bụ́ ebe egwu na-agaghị adị. Ndị ga-ebi na ya ga-atụkwasị ibe ha obi, hụkwa ibe ha n’anya.