Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 1

Olee Otú Anyị Si Ege Chineke Ntị?

Olee Otú Anyị Si Ege Chineke Ntị?

Chineke si na Baịbụl agwa anyị okwu. 2 Timoti 3:16

Ezi Chineke gwara ndị mmadụ ka ha dee uche ya n’otu akwụkwọ dị nsọ. Aha akwụkwọ ahụ bụ Baịbụl. Ọ bụ ebe e dere ozi dị mkpa Chineke chọrọ ka ị mata.

Chineke ma ihe ga-akacha baara anyị uru. Ọ bụ ya na-enye anyị amamihe. I gee ya ntị, ị ga-enweta ezi amamihe.—Ilu 1:5.

Chineke chọrọ ka mmadụ niile nọ n’ụwa gụọ Baịbụl. E nwere ya ugbu a n’ọtụtụ asụsụ.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ige Chineke ntị, i kwesịrị ịgụ Baịbụl ma ghọta ya.

Ndị mmadụ na-amụ banyere Chineke n’ebe niile. Matiu 28:19

Ndịàmà Jehova nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu.

Ha na-akụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Chineke n’ụwa niile.

Ị gaghị akwụ ụgwọ ọ bụla maka ihe ha ga-akụziri gị. I nwekwara ike ịmụ banyere Chineke n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị n’ebe i bi.