Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 8

Olee Uru Ọnwụ Jizọs Baara Gị?

Olee Uru Ọnwụ Jizọs Baara Gị?

Jizọs nwụrụ ka anyị wee dị ndụ. Jọn 3:16

Mgbe Jizọs nwụrụ, ụbọchị atọ agaa, ụfọdụ ụmụ nwaanyị gara n’ili ya, ma ha ahụghị ozu ya. Jehova akpọlitela Jizọs n’ọnwụ.

Jizọs mechara mee ka ndị ozi ya hụ ya.

N’eziokwu, Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ka ọ ghọọ mmụọ dị ike, nke na-anaghị anwụ anwụ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ ya mgbe ọ na-alaghachi n’eluigwe.

Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ma chie ya Eze nke Alaeze Chineke. Daniel 7:13, 14

Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà ka ọ gbapụta ụmụ mmadụ. (Matiu 20:28) Chineke ji àjà ahụ Jizọs chụrụ mee ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi.

Jehova mere ka Jizọs bụrụ Eze ga-achị ụwa. Ndị ga-eso Jizọs chịa bụ otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. A ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha gaa biri n’eluigwe. Ọ bụ ha na Jizọs ga-achị n’Alaeze Chineke. Alaeze Chineke bụ ọchịchị ezi omume nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa.—Mkpughe 14:1-3.

Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Agha, mpụ, ịda ogbenye, na agụụ agaghị adịkwa. Ndị mmadụ ga-enwe ezigbo obi ụtọ.—Abụ Ọma 145:16.