Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ ỌZỌ A KỌWARA​—NKE B

Ì Kwesịrị Ịkwụsị Mkparịta Ụka Ahụ?

Ì Kwesịrị Ịkwụsị Mkparịta Ụka Ahụ?

Ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi ya niile jụọ anyị ajụjụ ma ọ bụ kwuo ihe na-echegbu ya, obi na-adị anyị ụtọ ka anyị na ya kwuru okwu na-aga. Anyị chọrọ ka anyị na ndị “na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi” na-ekwurịta okwu.​—Ọrụ 13:48.

Ọ bụrụ na iwe na-ewe mmadụ, ma ọ bụ na ọ na-arụ ụka, ma ọ bụkwanụ na ọ chọghị ikwu okwu n’oge ahụ, gịnị ka ị ga-eme? Meda obi kwụsị mkparịta ụka ahụ. (Ilu 17:14) Gbalịa ka ị kwanyere ya ùgwù ma dị obiọma. O nwere ike ime ka onye ahụ chọọ ka anyị na ya kparịta mgbe ọzọ.​—1 Pita 2:12.