IME KA HA BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS
IHE ỌMỤMỤ NKE 10
Kpebisie Ike Inyere Ha Aka
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Anyị kpebisiri ike na ihe anyị ga-eme abụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kama na anyị ga-enye unu onwe anyị maka na anyị hụrụ unu n’anya.”—1 Tesa. 2:8.
Ihe Jizọs Mere
1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 3:1, 2. Zazie ajụjụ ndị a:
-
Olee ihe i chere mere Nikọdimọs ji bịakwute Jizọs n’abalị?—I nwere ike ịgụ Jọn 12:42, 43.
-
Olee otú ozi ọma ahụ Jizọs ziri Nikọdimọs n’abalị si gosi na o kpebisiri ike ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya?
Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
2. Otú anyị si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ ikpebisi ike inyere ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.
Na-eme Ka Jizọs
3. Na-amụrụ mmadụ ihe n’oge dị ya mma nakwa n’ebe masịrị ya. E nwere ike inwe otu ụbọchị ga-akara ya mma n’izu ma ọ bụ oge ga-akara ya mma n’ụbọchị. Ahụ́ ọ̀ ga-aka eru ya ala ịmụ ihe n’ebe ọ na-arụ ọrụ, n’ụlọ ya, ma ọ bụ n’ebe ọhaneze na-anọ? O kwe omume, gbanwee ihe ụfọdụ ka i nwee ike ịmụrụ ya ihe n’oge kaara ya mma nakwa n’ebe masịrị ya.
4. Na-amụchiri ya ihe anya. Ọ bụrụ na ị gaghị anọ ya, akagbula ọmụmụ ihe unu. Kama, lee ma:
5. Rịọ Jehova ka o mee ka ị na-ele ịmụrụ onye ahụ ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ike onye ahụ ghara ịgwụ gị, ọ bụrụgodị na ọ naghị amụchi ihe anya ma ọ bụ na ọ na-egbu oge ime ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl. (Fil. 2:13) O nwere ike ịbụ na onye ahụ ị na-amụrụ ihe nwere ọtụtụ àgwà ndị magburu onwe ha. Rịọ Jehova ka o mee ka i lekwasị anya n’àgwà ndị ahụ.