Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IME KA HA BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

IHE ỌMỤMỤ NKE 11

Mee Ka Ihe Ị Na-akụzi Dị Mfe Nghọta

Mee Ka Ihe Ị Na-akụzi Dị Mfe Nghọta

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “[Na-ekwu] ihe dị mfe nghọta.”​—1 Kọr. 14:9.

Ihe Jizọs Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Matiu 6:25-27. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Olee otú Jizọs si mee ihe atụ gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya?

  2.   Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma ọtụtụ ihe gbasara ụmụ nnụnụ, olee ihe dị mfe o lekwasịrị anya na ya? Olee ihe mere isi otú ahụ akụzi ihe ji dị mma?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Ọ bụrụ na ihe anyị na-akụzi adị mfe nghọta, ndị mmadụ ga na-echeta ya, ya eruokwa ha n’obi.

Na-eme Ka Jizọs

3. Ekwula ọtụtụ okwu. Kama ikwu ihe niile ị ma gbasara isiokwu unu na-amụ, lekwasị anya n’ihe dị n’akwụkwọ unu na-amụ. Ị jụọ ajụjụ, nwee ndidi ka onye ị na-amụrụ ihe zaa. Ọ bụrụ na ọ maghị azịza ya ma ọ bụ ya ekwuo ihe dị iche n’ihe Baịbụl na-akụzi, jụọ ya ajụjụ ndị ọzọ ga-enyere ya aka ichebara ya echiche. Ọ bụrụ na ọ ghọta isi ihe unu na-amụ, gafee n’ọzọ.

4. Jiri ihe ọ mabu nyere ya aka ịghọta ihe ọhụrụ ị na-akụziri ya. Dị ka ihe atụ, tupu gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl amụwa isiokwu kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ, i nwere ike iji obere oge mata ihe ọ mụtarala gbasara ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ.

5. Lezie anya n’ihe i ji eme ihe atụ. Tupu gị emee ihe atụ, jụọ onwe gị, sị:

  1.   a. ‘Ihe atụ a ọ̀ dị mfe nghọta?’

  2.  b. ‘Onye m na-amụrụ Baịbụl ọ̀ ga-aghọta ya ngwa ngwa?’

  3.  ch. ‘Ọ̀ ga-enyere onye m na-amụrụ Baịbụl aka icheta isi ihe a na-amụ, ka ọ̀ bụ naanị ihe atụ ahụ ka ọ ga-echeta?’